IHE ỌMỤMỤ NKE 42
Ndị Na-ege Gị Ntị Mụtara Ihe na Ya
KA NDỊ na-ege gị ntị wee mụta ihe n’okwu gị, ọ dị mkpa ka i mee ihe karịrị ikwu okwu n’isiokwu bara uru. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere o ji dị ndị a na-ege ntị mkpa ịnụ isiokwu a? Olee ihe m gaje ikwu nke ga-eme ka ndị ga-ege ntị nwee mmetụta na ha ritere uru n’ezie n’okwu ahụ?’
N’ụlọ akwụkwọ, ọ bụrụ na e kenyere gị ime ihe ngosi nke otú a pụrụ isi gbaara mmadụ àmà, ọ bụ onye bụụrụ gị onye nwe ụlọ ga-abụ onye na-ege gị ntị. N’ọnọdụ ndị ọzọ, ị pụrụ ịdị na-agwa ọgbakọ dum okwu.
Ihe Ndị Na-ege Gị Ntị Maara. Jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka ndị ga-ege ntị maara banyere isiokwu ahụ?’ Nke ahụ kwesịrị ikpebi ebe ị ga-amalite. Ọ bụrụ na ị na-agwa ọgbakọ nke gụnyere ọtụtụ Ndị Kraịst tozuru okè okwu, ya abụla nanị ikwughachi eziokwu ndị bụ́ isi, nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha maara, ka ị ga-eme. Kọwakwuo eziokwu ndị a bụ́ isi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọtụtụ ndị ọhụrụ nwere mmasị bịakwara, i kwesịrị iburu mkpa ìgwè abụọ ahụ nwere n’uche.
Gbanwee ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba ọsọ n’okwu gị dị ka ihe ndị na-ege gị ntị maara si dị. Ọ bụrụ na i webata nkọwa ụfọdụ ndị o yiri ka ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ha maara, kwuo ha ọsọ ọsọ. Ma jiri nwayọọ mgbe ị na-ewepụta echiche ndị pụrụ ịbụrụ ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-ege gị ntị ihe ọhụrụ, ka ha wee nwee ike ịghọta ha nke ọma.
Ihe Ga-enwe Ihe Mmụta. Ọ bụghị mgbe nile ka inwe ihe mmụta na-apụta inwe ihe ọhụrụ ị ga-ekwu. Ndị ọkà okwu ụfọdụ nwere ụzọ ha na-esi ekwu eziokwu ụfọdụ ndị a maara nke ọma n’ụzọ dị mfe nke na ndị na-ege ntị ga-aghọta ha nke mbụ n’ụzọ zuru ezu.
N’ozi ubi, nanị ihota otu ihe a kọrọ n’akụkọ ụwa iji gosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ ezughị. Jiri Bible gosi ihe ihe ahụ merenụ pụtara. Nke a ga-eme ka onye nwe ụlọ mụta ihe n’ezie. N’otu aka ahụ, mgbe a na-enye nkọwa ụfọdụ banyere iwu na-achịkwa ihe e kere eke ma ọ bụ banyere ihe ọkụkụ ma ọ bụ anụmanụ, ebumnobi gị ekwesịghị ịbụ ikwu ihe ụfọdụ na-adọrọ mmasị banyere nkà mmụta sayensị nke onye nwe ụlọ na-anụtụbeghị. Kama nke ahụ, ebumnobi gị kwesịrị ịbụ ijikọta ihe àmà sitere n’okike na ihe e kwuru n’ime Bible iji gosi na e nwere Onye Okike nke hụrụ anyị n’anya. Nke a ga-enyere onye nwe ụlọ aka ile okwu ahụ anya site n’akụkụ ọzọ.
Ịgwa ndị na-ege ntị isiokwu ha nụworo ọtụtụ ugboro pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ma iji bụrụ onye ozizi dị irè, ọ dị gị mkpa ịmụta ụzọ isi mee nke a n’ụzọ dị irè. Olee otú a pụrụ isi mee ya?
Ime nnyocha ga-enye aka. Kama nanị iwebata eziokwu ndị gbatara gị n’uche n’okwu gị, jiri ihe ndị e ji eme nnyocha a tụlere na peeji nke 33 ruo 38 mee ihe. Buru n’uche aro ndị a tụrụ n’ebe ahụ banyere ebumnobi ndị i kwesịrị ịdị na-agbalị imezu. Ná nnyocha gị, ị pụrụ ịhụ na otu akụkọ mere eme dabara kpọmkwem n’isiokwu gị. Ma ọ bụ, ị pụrụ ịnụ otu ihe a kọrọ n’akụkọ ụwa na nso nso a nke ga-eme ka isi ihe ị na-eme atụmatụ ịtụle pụta ìhè.
Ka ị na-enyocha ihe ọmụma ahụ, kpalie onwe gị iche echiche site n’ịjụ ajụjụ ndị dị ka gịnị? n’ihi gịnị? olee mgbe? ebee? ònye? nakwa n’ụzọ dị aṅaa? Dị ka ihe atụ: N’ihi gịnị ka ihe a ji bụrụ eziokwu? Olee otú m pụrụ isi gosipụta ya? Olee ihe ọtụtụ ndị kwenyere bụ́ ndị na-eme ka o siere ụfọdụ ndị ike ịghọta eziokwu a nke Bible? Gịnị mere o ji dị mkpa? Olee otú nke a kwesịrị isi metụta ndụ mmadụ na-adị? Ihe nlereanya dị aṅaa na-egosi uru dị n’itinye ya n’ọrụ? Olee ihe eziokwu a nke Bible na-ekpughe banyere ụdị onye Jehova bụ? Dabere n’ihe ị na-ekwu maka ya, ị pụrụ ịjụ, sị: Olee mgbe nke a mere? Olee otú anyị pụrụ isi jiri ihe ọmụma a mee ihe taa n’ụzọ bara uru? Ị pụrụ ọbụna ime ka okwu gị kpokwuo ọkụ site n’ịjụ na ịza ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị dị otú ahụ mgbe ị na-ekwu okwu ahụ.
Okwu gị pụrụ ịchọ ka i jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-ege gị ntị maara mee ihe. Olee ihe ị pụrụ ime iji mee ka a mụta ihe site n’ụzọ ị ga-esi kọwaa ha? Agụpụtala ha nanị agụpụta; kọwaa ha.
A pụrụ ịmụtakwu ihe ná ntụle nke otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ a maara nke ọma ma ọ bụrụ na ị tụrisie ya, na-eme ka akụkụ ndị metụtara isiokwu gị pụta ìhè ma kọwaa ha. Were dị ka ihe atụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị ka Maịka 6:8 ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Gịnị bụ “ikpe ziri”? Ụkpụrụ ònye banyere ikpe ziri ezi ka a na-atụle? Olee otú ị ga-esi gosi ihe “ikpe ikpe ziri ezi” pụtara? Ma ọ bụ ihe “ịhụ obiọma n’anya” pụtara? Gịnị bụ ịdị nwayọọ n’obi? Olee otú ị pụrụ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe n’ebe onye mere agadi nọ? Otú ọ dị, ihe ndị dị ka isiokwu gị, ebumnobi gị, ndị na-ege gị ntị, na oge i nwere kwesịrị ikpebi ihe ọmụma ị ga-eji mee ihe n’ezie.
Inye nkọwa dị mfe nke okwu dị iche iche na-enyekarị aka. Nye ụfọdụ ndị, ọ na-atụ ha n’anya ịmụta ihe “alaeze” ahụ e zoro aka na ya na Matiu 6:10 pụtara. Ịbụ onye e chetaara nkọwa nke otu okwu pụrụ inyere ọbụna Onye Kraịst nweworo ahụmahụ aka ịghọta n’ụzọ ziri ezi karị ihe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ na-ekwu n’ezie. Nke a na-edo anya mgbe anyị gụrụ 2 Pita 1:5-8 ma kọwaa ihe dị iche iche a kpọtụrụ aha n’amaokwu ndị ahụ: okwukwe, omume ọma, ihe ọmụma, njide onwe onye, ntachi obi, nsọpụrụ Chineke, mmetụta ụmụnna, na ịhụnanya. Mgbe e ji okwu ndị ihe ha pụtara yitewere ibe ha mee ihe n’otu amaokwu ahụ, gị ịkọwa ha pụrụ inye aka igosi ihe dị iche na ha abụọ. Nke ahụ bụ eziokwu banyere okwu ndị dị ka amamihe, ihe ọmụma, nghọta, na mmata, bụ́ ndị e ji mee ihe n’Ilu 2:1-6.
Ndị na-ege gị ntị pụrụ ịmụta ihe na ya ma ị tụgharịa nnọọ uche n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya mgbe mbụ ha ghọtara na e kwuru na Jenesis 2:7, ná nsụgharị Bible ụfọdụ, na Adam bụ mkpụrụ obi dị ndụ nakwa dị ka Ezikiel 18:4 si kwuo, na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. N’otu oge, Jizọs mere ihe tụrụ ndị Sadusii n’anya site n’izo aka n’Ọpụpụ 3:6, bụ́ nke ha na-ekwu na ha kwenyere na ya, ma jiri ya mee ihe banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.—Luk 20:37, 38.
Mgbe ụfọdụ, ịkọwa ihe gbara otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ gburugburu, ọnọdụ ndị a nọ dee ya, na ịmata onye na-ekwu okwu ma ọ bụ onye ọ na-agwa, na-eme ka a mụta ihe. Ndị Farisii maara Abụ Ọma 110 nke ọma. Ma, Jizọs dọọrọ uche ha gaa n’otu ihe dị mkpa dị n’amaokwu nke mbụ. Ọ jụrụ, sị: “‘Gịnị ka unu chere banyere Kraịst ahụ? Nwa ònye ka ọ bụ?’ Ha sịrị ya: ‘Nwa Devid.’ Ọ sị ha: ‘Ò sizi aṅaa bụrụ na Devid sitere n’ike mmụọ nsọ kpọọ ya “Onyenwe m,” na-asị, “Jehova gwara Onyenwe m, sị: ‘Nọdụ ala n’aka nri m ruo mgbe m ga-edebe ndị iro gị n’okpuru ụkwụ gị’”? Ya mere, ọ bụrụ na Devid kpọrọ ya “Onyenwe m,” olee otú o si bụrụ nwa ya?’” (Mat. 22:41-45) Mgbe ị tụgharịrị uche n’Akwụkwọ Nsọ otú Jizọs si tụgharịa, ị ga-enyere ndị mmadụ aka iji nlezianya ka ukwuu na-agụ Okwu Chineke.
Mgbe ọkà okwu kwuru oge e dere otu akwụkwọ Bible ma ọ bụ oge otu ihe mere, o kwesịkwara ịkọwa ọnọdụ dị n’oge ahụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ndị na-ege ntị ga-aghọta n’ụzọ doro anya karị mkpa akwụkwọ ahụ ma ọ bụ ihe ahụ merenụ dị.
Iji ihe atụnyere ihe pụrụ ime ka a mụtakwuo ihe n’ihe ị na-ekwu. Ị pụrụ iji otu echiche ọtụtụ ndị nwere tụnyere ihe Bible na-ekwu n’otu okwu ahụ. Ma ọ bụ i nwere ike iji ihe ndekọ abụọ yiri ibe ha ndị dị na Bible tụnyere onwe ha. È nwere ọdịiche? N’ihi gịnị? Gịnị ka anyị na-amụta na ha? Gị ime otú a pụrụ ime ka ndị na-ege gị ntị si n’ụzọ ọzọ lee okwu ahụ anya.
Ọ bụrụ na e kenyere gị ịtụle otu akụkụ nke ozi Ndị Kraịst, ị pụrụ ime ka okwu gị nwekwuo ihe mmụta site n’ibu ụzọ nye nchịkọta ya. Tụlee ihe a ga-eme, ihe mere o ji dị mkpa ka e mee ya, na otú o si metụta ihe mgbaru ọsọ anyị n’ozuzu ya dị ka Ndịàmà Jehova. Kọwazie ebe, mgbe, na otú a ga-esi rụọ ọrụ ahụ.
Gịnị ma ọ bụrụ na okwu gị achọọ ka ị tụlee ụfọdụ “ihe ndị miri emi nke Chineke”? (1 Kọr. 2:10) Ọ bụrụ na ị malite site n’ikwu nakwa ịkọwa ihe ụfọdụ bụ́ isi dị n’isiokwu ahụ, a ga-aghọta nkọwa ndị miri emi ngwa ngwa karị. Ọ bụrụkwa na i jiri nchịkọta dị nkenke nke okwu gị mechie, o yikarịrị ka ndị na-ege gị ntị ha ga-enwe afọ ojuju na ha mụtara ihe n’ezie.
Ndụmọdụ n’Ibi Ndụ Ndị Kraịst. Ndị na-ege gị ntị ga-akasị rite uru ma ọ bụrụ na i nyere ha aka ịhụ otú ihe ọmụma dị n’okwu gị si emetụta ndụ ha. Ka ị na-enyocha akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’okwu gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị mere e ji chekwaa ihe ọmụma a n’Akwụkwọ Nsọ ruo n’oge anyị?’ (Rom 15:4; 1 Kọr. 10:11) Chee echiche banyere ọnọdụ ndụ nke ndị na-ege gị ntị na-eche ihu. Tụlee ọnọdụ ndị ahụ kpọmkwem na-adabere na ndụmọdụ na n’ụkpụrụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ. N’okwu gị, tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ iji gosi otú ha pụrụ isi nyere mmadụ aka ime ihe n’ụzọ amamihe dị na ya banyere ọnọdụ ndị dị otú ahụ. Zere ikwu okwu a na-akapịghị ọnụ. Tụlee àgwà na omume ụfọdụ kpọmkwem.
Iji malite, jiri otu ma ọ bụ abụọ n’ime aro ndị a tụrụ n’elu mee ihe n’okwu ị na-akwadebe. Ka ị na-enwetakwu ahụmahụ, jirikwuo ndị ọzọ mee ihe. Ka oge na-aga ị ga-ahụ na ndị na-ege ntị ga na-atụ anya ịnụ okwu gị, na-enwe obi ike na ha ga-anụ ihe ga-abara ha uru n’ezie.