Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 43 p. 234-p. 235 para. 3
  • Iji Ebe Ihe Omume E Kenyere Sitere Mee Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Ebe Ihe Omume E Kenyere Sitere Mee Ihe
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkwadebe Okwu Onye Mmụta Maka Ụlọ Akwụkwọ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu A Ga-agwa Ọgbakọ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Ihe Ndepụta
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • E Mere Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Ihe Pụta Ìhè
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 43 p. 234-p. 235 para. 3

IHE ỌMỤMỤ NKE 43

Iji Ebe Ihe Omume E Kenyere Sitere Mee Ihe

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Kwadebe okwu gị n’isiokwu e kenyere gị, ọ bụrụkwa na e kwuru ebe ihe omume ahụ sitere, si n’ebe ahụ were akụkụ Akwụkwọ Nsọ na isi ihe ndị ị ga-eji mee ihe.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Mgbe anyị ji ebe ihe omume anyị sitere kwadebe okwu anyị, anyị na-egosi nkwanye ùgwù maka usoro inye nri ime mmụọ nke òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche dokwara.

BIBLE ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere ahụ́ mmadụ. Akụkụ ahụ́ ọ bụla dị mkpa, ma ha “nile adịghị arụ otu ọrụ.” N’ikwekọ na nke ahụ, anyị kwesịrị ịrụ ọrụ banyere ihe ùgwù ọ bụla e nyere anyị. Nke a na-achọ na anyị ga-aghọta ma mezie ihe omume ikwu okwu ọ bụla e nyere anyị emezi kama ileda ịdị mkpa nke isiokwu ụfọdụ anya n’ihi na anyị na-eche na isiokwu ndị ọzọ ga-adọrọ mmasị karị. (Rom 12:4-8) Ọ bụ ọrụ òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche inye nri ime mmụọ “n’oge kwesịrị ekwesị.” (Mat. 24:45) Mgbe anyị ji ikike anyị nwere kwadebe okwu dị ka ntụziaka e nyere anyị si dị, anyị na-egosi na anyị ji ndokwa ahụ kpọrọ ihe. Nke a na-atụnye ụtụ n’ịga nke ọma nke ọgbakọ dum.

Ihe A Ga-agụnye. Mgbe e kenyere gị otu isiokwu n’ụlọ akwụkwọ, hụ na ị kwadebere isiokwu ahụ ọ bụghị ihe ọzọ dị iche. N’ọnọdụ ka ukwuu, a ga-agwa gị kpọmkwem ebe ị ga-enweta ihe ọmụma. Ọ bụrụ na a gwaghị gị akwụkwọ ị ga-eji kwadebe okwu gị, ị pụrụ inweta ihe ọmụma site n’ebe masịrị gị. Otú ọ dị, mgbe ị na-akwadebe okwu gị, jide n’aka na ị kwadebere okwu ahụ dum n’isiokwu e kenyere gị. Mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-ewebata, ọ ga-adịkwa mkpa ka i buru ndị ga-ege gị ntị n’uche.

Jiri nlezianya mụọ ebe ahụ ihe ọmụma gị si, na-enyocha akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị na ya. Mgbe ahụ tụlee ụzọ kasị dị irè ị ga-esi jiri ya mee ihe maka abamuru nke ndị ga-ege ntị. Họrọ isi ihe abụọ ma ọ bụ atọ ma eleghị anya site n’akwụkwọ ahụ bụ́ ndị ị ga-eji mere isi ihe n’okwu gị. N’otu aka ahụ, si n’ebe ahụ ihe omume e kenyere gị sitere họrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị na-eme atụmatụ ịgụ na ịtụle.

Ihe ọmụma ha aṅaa ka i kwesịrị ịtụle? Ọ bụ nanị ókè i nwere ike ịtụle nke ọma. Elegharala izi ihe n’ụzọ dị mma anya nanị iji webata ọtụtụ ihe ọmụma. Ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ihe ọmụma ahụ adabaghị n’ebumnobi nke okwu gị, lekwasị anya n’akụkụ ndị ga-enyere gị aka imezu nzube gị. Si n’ebe ihe omume e kenyere gị sitere were ihe ga-akasị baara ndị ga-ege gị ntị uru, nke ha ga-akasịkwa mụta ihe na ya. Ebumnobi gị n’isi ihe a a ga-enye ndụmọdụ na ya abụghị ịhụ ókè ihe ị ga-ekwuzu ga-aha kama iji ihe e kenyere gị kwadebe okwu gị.

E zubeghị ka okwu gị bụrụ nanị nchịkọta nke ihe ndị dị n’ebe ihe omume gị sitere. I kwesịrị ime atụmatụ ịkọwa isi ihe ụfọdụ, mekwuo ka ha saa mbara, mee ihe atụ iji kọwaa ha, na ikekwe nye ihe atụ otú a pụrụ isi jiri ha mee ihe. E kwesịrị iji echiche ndị ọzọ kọwapụta isi ihe ndị dị mkpa dị n’ebe ihe omume e kenyere gị sitere kama iji ihe ọzọ dochie ihe ọmụma ahụ.

Mgbe oge na-aga a pụrụ ịkpọ ụmụnna nwoke ndị nwere iru eru a chọrọ dị ka ndị ozizi ka ha zie ihe ná Nzukọ Ije Ozi. Ha na-aghọta mkpa ọ dị iji ebe ihe omume e kenyere ha sitere mee ihe nke ọma kama iji ihe ọzọ dochie ya. N’otu aka ahụ, a na-enye ụmụnna na-ekwu okwu ihu ọha ihe ndepụta ha ga-agbaso. Ihe ndepụta ndị a na-enyetụ ohere ime mgbanwe ụfọdụ, ma ha na-enwe n’ụzọ doro anya isi ihe ndị a ga-akọwapụta, arụmụka ndị na-akwado ha ndị a ga-eji mee ihe, na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị okwu ahụ dabeere na ha. Ịmụta iji ebe ihe omume e kenyere sitere na-ezi ihe bụ akụkụ dị mkpa nke ịkwadebe maka ihe ùgwù ndị ọzọ nke ikwu okwu.

Ọzụzụ a pụkwara inyere gị aka iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi na-aga n’ihu. Ị ga-amụta ilekwasị anya n’ihe a na-amụ kama ịhapụ isiokwu a na-atụle ma gafee n’ọzọ site n’imesi ihe ndị ọzọ ike, bụ́ ndị pụrụ ịdị na-adọrọ mmasị ma ha adịghị mkpa n’ịghọta isiokwu ahụ. Ma, ọ bụrụ na ị ghọtara isi ihe dị n’ihe ọmụmụ a, ị gaghị araparasi ike na ya nke na ị gaghị enyekwu nkọwa nke pụrụ ịdị onye a na-amụrụ ihe mkpa.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Jiri nanị ihe ọmụma metụtara isiokwu e kenyere gị kpọmkwem mee ihe.

  • Ọ bụrụ na ihe omume gị na-agụnye iji ihe ụfọdụ e biri ebi mere ebe okwu gị ga-adabere, si n’ebe ahụ họrọ isi ihe na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ isi ị ga-eji mee ihe kama isi n’ebe ndị ọzọ were ha.

IHE OMUME: N’ụbọchị atọ dịgasị iche iche mgbe ị na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị, kanye akara gburugburu okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu nke na-akọwa isiokwu a na-atụle. Kanye akara n’okpuru otu okwu dị nkenke ma ọ bụ abụọ nke metụtara isiokwu ahụ kpọmkwem. Mgbe ahụ, n’okwu nke aka gị, kwuo okwu n’isiokwu ahụ na-eji akụkụ Akwụkwọ Nsọ na isi ihe ndị ị kanyere akara na ha eme ihe.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya