Nzukọ Ije Ozi Maka May
Izu Na-amalite May 4
Abụ 10
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Akụkọ Ọchịchị Chineke.
15 min: “Mmụọ Jehova Nọnyeere Anyị.” Ajụjụ na azịza. Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, webata ihe ndị kwesịrị ekwesị sitere na 1998 Yearbook.
22 min: “Họrọ Isiokwu Dị Iche Iche Iji Nweta Mmasị Pụrụ Iche nke Ndị Mmadụ.” Tụlee isi ihe ndị dị n’isiokwu. Kọwaa na a pụrụ inyefe ọbụna mbipụta ndị ka ochie bụ́ ndị nọ n’ọnọdụ dị mma n’ụzọ dị otú a. Kpọọ ndị nkwusa òkù ịkọ isiokwu ndị ha cheworo n’ihu mmadụ rụpụtara ihe dị mma. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu dị na paragraf nke 7.
Abụ 212 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 11
Abụ 197
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
12 min: “Ịkụziri Ndị Toworo Eto Ịgụ Ihe.” Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu bụ́ nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ.
25 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ụzọ Ndụ nke Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 1998.” (Paragraf nke 1-8) Ntụle ajụjụ na azịza nke onye okenye ga-eme. Gụpụta paragraf nke 5 na 8. Mesie ike mkpa ibu ụzọ mee nkwadebe dị ná ndabere nke Akwụkwọ Nsọ.
Abụ 48 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 18
Abụ 141
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Maa ọkwa ndokwa ndị pụrụ iche maka ije ozi ubi ná ngwụsị izu. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Ì Nwere ‘Ogwu n’Anụ Ahụ’?” Ajụjụ na azịza.
22 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ụzọ Ndụ nke Chineke’ nke Ndịàmà Jehova nke 1998.” (Paragraf nke 9-16) Ntụle ajụjụ na azịza nke odeakwụkwọ ga-eme. Gụpụta paragraf nke 13 na akụkụ akwụkwọ nsọ e zoro aka. Mesie ike ịdị mkpa nke iji nrubeisi kwado ndokwa inye ụlọ ná ndabere nke Akwụkwọ Nsọ.
Abụ 139 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 25
Abụ 137
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: Ihe Mere M Ji Eji Nzukọ Ọgbakọ Akpọrọ Ihe. Onye okenye eduzie nkwurịta okwu nke ya na ìgwè ndị na-abịachi ọmụmụ ihe anya bụ́ ndị na-anọchite anya ụdị ndị dị iche iche n’ọgbakọ, ikekwe na-agụnye otu di na nwunye, otu agadi, na otu onye nọ n’afọ iri na ụma. Ha ekwupụta obi ha banyere ihe mere ha ji abịachi anya: mkpakọrịta ọma, ntụziaka Chineke, na ndụmọdụ ọma, ndị na-enyere ha aka ịnagide nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị na ịhụ na ọnọdụ ime mmụọ ha siri ike. Okwu emesie ike ụzọ anyị nile na-esi enweta ngọzi site n’ịbịachi nzukọ anya.
Abụ 222 na ekpere mmechi.