A Chọrọ Anyị Nile Iji Rụzuo Ọrụ Ahụ
1 Onye ọ bụla na-eso ụzọ Jisọs Kraịst kwesịrị ịghọta na mgbalị ọ na-eme iji kwadoo ma kere òkè n’ọrụ ime nkwusa Alaeze dị oké mkpa. Jisọs matara na ndị na-eso ụzọ ya ga-amịpụta mkpụrụ Alaeze n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche. (Mat. 13:23) Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-arụsi ọrụ ike na-arụzu akụkụ dị ukwuu nke ọrụ ime nkwusa ahụ, e kwesịrị ịja ndị nile ji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-enye Chineke otuto site n’ịmịpụta mkpụrụ dị ka o kwere mee mma.—Jọn 15:8.
2 Mgbalị E Mekọrọ Ọnụ Na-arụzu Ihe Dị Ukwuu: Jisọs buru amụma na mgbalị ndị nile na-eso ụzọ ya ga-emekọ ọnụ ga-arụpụta ọrụ karịrị nke ya. (Jọn 14:12) Ma ọnọdụ anyị ò mere ka ihe anyị pụrụ ime dị nta ma ò kwere ka anyị tinye oge dị ukwuu n’ime nkwusa Alaeze, a chọrọ anyị dum iji rụzuo ọrụ ahụ. Ọ bụ nnọọ dị ka Pọl kwuru: “Ahụ nile, ebe a na-ewere nkwonkwo nile ọ bụla nke nnyezu kwụkọọ ya nke ọma jikọọkwa ya, dị ka ịrụsi ọrụ ike nke akụkụ nile ọ bụla n’otu n’otu n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha si dị, ahụ nile ahụ na-esite na Ya na-eme ka ahụ baa ụba.”—Efe 4:16.
3 Ụfọdụ pụrụ iche na mgbalị ha erughị ihe ọ bụla. Otú ọ dị, n’anya Jehova ihe dị mkpa bụ ka ije ozi anyị bụrụ nke sitere n’obi dum. Ihe ọ bụla anyị na-emere ya bara uru, bụrụkwa nke o nwere ekele maka ya.—Tụlee Luk 21:1-4.
4 Nọgide Na-akwado Ọrụ Ahụ: Anyị nile nwere ihe ùgwù nke inye ihe onwunwe maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ụfọdụ pụkwara inye aka n’ike ọkpụkpụ aka ọ gụnyere n’ịkwado ọrụ Alaeze. Onye ọ bụla pụrụ ịgbalị ịza ajụjụ a kwadoro nke ọma ná nzukọ ma kere òkè n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Site n’iji ohere ndị e nwere mee ihe iji gbaa ndị ọzọ ume, anyị na-atụnye ụtụ bara uru n’ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ, nke a na-emekwa ka o nwekwuo ike ịrụzu ọrụ e nyere ya.
5 Ee, a chọrọ anyị nile iji rụzuo ọrụ ahụ. Ọ dịghị onye kwesịrị iche na ya adịghị mkpa. Mgbalị anyị mekọrọ ọnụ, ma nke dị nta ma nke dị ukwuu, n’ijere Jehova ozi na-edo anyị iche dị ka ezi ndị na-efe Chineke ofufe. (Mal. 3:18) Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikere òkè dị mkpa n’ịsọpụrụ Jehova na inyere ndị ọzọ aka ịmata na ijere ya ozi.