Nzukọ Ije Ozi Maka June
Izu Na-amalite June 1
Abụ 223
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara site n’Ozi Alaeze Anyị. Akụkọ Ọchịchị Chineke.
15 min: “Ndị E Mere Ka Ha Zuo Okè Ịrụ Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla.” Ajụjụ na azịza. Kwuo okwu ndị dị mkpirikpi n’Ụlọ Nche, February 15, 1989, peji nke 22-24.
22 min: “Ịgbara ‘Mmadụ Nile’ Àmà.” Onye okenye akọwaa na ihe mejupụtara akwụkwọ a na-enyefe na June bụ akwụkwọ ndị a họtara nwere peji 192, na ùkwù akwụkwọ ndị nwere akwụkwọ abụọ ma ọ bụ anọ n’ụtụ dị ala. Onye okenye na ìgwè ndị nkwusa nweworo ahụmahụ ekwurịta ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụrụ aro ha. Kọwaa ihe mere anyị ji kwesị ibu ihe n’uche iji malite mkparịta ụka n’ọnọdụ ọ bụla. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ dị mkpirikpi.
Abụ 112 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 8
Abụ 209
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Ilekọta Ihe Onyenwenụ ahụ Nwere.” Okwu nke onye okenye ga-ekwu, na-atụlezu ihe ọmụma dị n’ihe ntinye.
20 min: “A Chọrọ Anyị Nile Iji Rụzuo Ọrụ Ahụ.” Ajụjụ na azịza. Kọwaa ihe mere ndị okenye ji adabere n’ebe ọtụtụ ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo nọ iji rụzuo ihe ndị dị mkpa. Tụlee mkpa e nwere n’ọgbakọ, dị ka ihicha na ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, inyere ndị ọrịa na ndị agadi aka, na ịrụzu ókèala. Kpọọ ndị okenye ka ha kwuo okwu n’otú ha si enwe ekele maka enyemaka si n’ọchịchọ obi nke ọtụtụ ndị na-enye. Mesie ike otú mgbalị onye ọ bụla dịruru ná mkpa.
Abụ 153 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 15
Abụ 7
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
20 min: “Jisienụ Ike.” Okwu dabeere n’Ụlọ Nche, May 15, 1986, peji nke 10-14. Tụlee ịdị mkpa nke ozi ọsụ ụzọ oge nile, na-agba ume idebanye aha ka ọ na-erule September 1.
15 min: “Ịgba Àmà Site n’Àgwà Dị Mma.” Ajụjụ na azịza. Gbaa ndị na-eto eto ụfọdụ bụ ezi ihe nlereanya ajụjụ ọnụ. Ha akọọ otú àgwà ndị Kraịst ha siworo nwee mmetụta dị mma n’ahụ ndị ọzọ. Kọọ otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ site n’Ụlọ Nche, January 1, 1995, peji nke 24-25.
Abụ 170 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 22
Abụ 61
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kwuo mgbe a gụzigharịsịrị ihe ndekọ ego ọgbakọ.
15 min: Ụzọ Isi Malite Ụzọ Magazin. Kọwapụta ihe dị mkpa: detuo akwụkwọ nile e tinyere, gaghachi n’ime izu abụọ, wepụta echiche ndị ọhụrụ site na magazin ndị ọhụrụ iji jigide mmasị e gosiri. Tụọ aro ịgụnye ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe mmadụ, ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa, ndị na-ere petrol, na ndị ọzọ. Nyefee ndị nọgidere na-egosi mmasị ụtụ ọnwa isii. Kpọọ otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ịkọ ahụmahụ dị mma banyere ụzọ magazin.
20 min: Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka. Okwu nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu, na-atụleghachi ndokwa e mere ka ndị ọsụ ụzọ nyere ndị ọzọ aka n’onwe ha. Kọwaa otú e si malite usoro inye aka n’oge gara aga. ( jv-E 100; km-IB 9/79 1, 3) Ihe karịrị otu nde ndị ọhụrụ e mere baptism n’ime afọ atọ gara aga chọrọ ọzụzụ. Usoro ihe omume “Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka” na-eji ahụmahụ na ọzụzụ nke ndị ọsụ ụzọ oge nile na nke ndị pụrụ iche ndị jeworo Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ eme ihe. Ebumnobi ya bụ ka onye ọsụ ụzọ ọ bụla nyere ndị nkwusa abụọ aka kwa afọ ịghọ ndị nwere nkà karị n’ozi na inwe ike ikerekwu òkè. Ndị a na-enyere aka enweghị ihe mere ha ga-eji na-atụ ụjọ; ihe a na-emesi ike bụ inye agbamume ịhụnanya, nke obiọma. Usoro ihe omume ọhụrụ a na-enye ọtụtụ narị puku ikike ịghọ ndị ozi dị irè karị.
Abụ 207 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 29
Abụ 114
10 min: Ịma ọkwa. Chetara mmadụ nile ka ha tinye akụkọ ozi ubi ha maka June. Tụlee akwụkwọ a ga-enyefe na July.
15 min: Mkpa ọgbakọ ma ọ bụ Èbelatawo M Aka? Okwu nke onye okenye ga-ekwu na-adabere n’Ụlọ Nche, December 15, 1987, peji nke 18-19, paragraf 14-16. Gbaa ndị nọworo na-arụsi ọrụ ike ruo ọtụtụ afọ ume ịtụgharị uche n’ọdịdị na otú ozi ha dị nsọ haruru.
20 min: Anyị Nile Pụrụ Ịgba Àmà Mberede. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ dabere n’Ụlọ Nche, October 15, 1987, peji nke 21-26. Gosi otú ndị ọrụ ego, ezinụlọ, ma ọ bụ ibu ọrụ onwe onye na-ewekọrọ oge ha pụrụ isi chọta ọtụtụ ohere kwa ụbọchị isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. Gụnye ahụmahụ ụfọdụ e nwere n’ógbè.
Abụ 76 na ekpere mmechi.