Akụkọ Ọchịchị Chineke
◼ Ọtụtụ alaka dị n’àgwàetiti dị gburugburu ụwa nyere akụkọ nke ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu dị ịrịba ama ná ndị nkwusa maka January. Ụfọdụ n’ime ndị a bụ Dominican Republic, Haiti, Martinique, Mauritius, Philippines, Taiwan, na Trinidad.
◼ Mmụba e nwere na Seychelles ji pasent 18 karịa nkezi e nwere n’afọ gara aga, e nwekwara mmụba dị pasent 16 na St. Maarten.
◼ Na Hong Kong ndị nkwusa nyere hour 12.7 ná nkezi.
◼ E wusịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ e wuru ọsọ ọsọ na Taiwan na February.