Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na June - September: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla nwere peji dị 192 n’ọnụ ego e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦20 ma e wezụga Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, na Nhazi E mere Iji Jezuo Ozi Anyị. E degaara ọgbakọ na òtù ndị okenye ọ bụla akwụkwọ banyere nke a na March.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Maara ọgbakọ ọkwa mgbe e meworo nke a.
◼ N’Ozi Alaeze Anyị nke August 1991 n’isiokwu bụ́ “Agbamakwụkwọ Ndị Kraịst, Akụkụ nke 6b—Okwu Agbamakwụkwọ,” e kwuru okwu na-esonụ na paragraf nke 2: “Nanị di na nwunye ahụ kwesịrị iguzo n’ihu onye ahụ na-eje ozi n’oge ikwe nkwa alụmdi na nwunye. (Ụlọ Nche, October 15, 1984, p. 10)” Isiokwu Ụlọ Nche a bu foto di na nwunye nanị ha na-eguzo n’ihu onye ahụ na-eje ozi, ma ọ dịghị ihe e kwuru n’isiokwu ahụ banyere ma ọ̀ bụ nanị ha pụrụ iguzo ọtọ n’oge ikwe nkwa ahụ. Otú ọ dị, na peji nke 2 nke ndepụta bụ́ “Alụmdi na Nwunye Dị Nsọpụrụ Di Ka Chineke Si Ele Ihe Anya,” n’okpuru “A Pụrụ Ịhapụ Ma Ọ Bụ Kwuo Nke A: Usoro Agbamakwụkwọ Tupu Ikwe Nkwa,” e kwuru na “di, nwunye, na ndị akaebe ga-eguzo n’ihu onye ozi gọọmentị.” Ndị na-abụkarị ndị akaebe iwu kwadoro bụ nwaada nọ n’isi ndị na-enyere nwunye ọhụrụ ahụ aka (ma ọ bụ enyi nwanyị a na-alụ ọhụrụ) na enyi nke onye ahụ na-alụ nwanyị. Ya mere o kwesịrị ekwesị ka mmadụ abụọ a guzorokwuo n’ihu onye na-eje ozi n’oge ikwe nkwa ahụ. Ndị ga-ekwu okwu agbamakwụkwọ kwesịrị icheta ime ka di na nwunye ahụ mara nke a.
◼ Na-amalite n’izu nke May 4, 1998, dịgide ruo izu nke September 28, 1998, a ga-amụ akwụkwọ bụ́ Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.