Ilekọta Ihe Onyenwenụ ahụ Nwere
1 N’oge Bible, a na-atụkwasị onye na-achị ezinụlọ obi nke ukwuu. Abraham nyere onye na-achị ezinụlọ ya ọrụ ịchọtara nwa ya nwoke, bụ́ Aịsak, nwunye. (Jen. 24:1-4) Ya bụ na onye ahụ na-achị ezinụlọ nwere ọrụ nke ịhụ na usoro ọmụmụ Abraham dịgidere. Lee oké ibu ọrụ ọ bụ! Ka a sịkwa ihe mere Pọl onyeozi ji kwuo, sị: “Ihe a na-achọkwa n’aka ndị na-achị ezinụlọ bụ, ka a hụ onye ọ bụla na o kwesịrị ntụkwasị obi”!—1 Kọr. 4:2.
Ọrụ Ndị Kraịst nke Ịchị Ezinụlọ
2 N’ime Bible a kọwara akụkụ ụfọdụ nke ozi ndị Kraịst dị ka ịchị ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi gwara ndị Efesọs banyere “ọchịchị ezinụlọ nke amara Chineke ahụ nke e nyere m n’ebe unu nọ.” (Efe. 3:2; Kọl. 1:25) O weere ọrụ ya nke ijiri ozi ọma ahụ gakwuru ndị mba ọzọ dị ka ọchịchị ezinụlọ nke ọ na-aghaghị iji ikwesị ntụkwasị obi chịa. (Ọrụ 9:15; 22:21) Pita onyeozi degaara ụmụnna ya e tere mmanụ akwụkwọ, sị: “Na-elerịta onwe unu ọbịa nke ọma n’atamughị ntamu: dị ka unu nile n’otu n’otu natara onyinye amara, werenụ ihe ahụ [na-ejerịtara] onwe unu ozi, dị ka ndị na-achị ezinụlọ nke ọma n’amara Chineke nke dị n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:9, 10; Hib. 13:16) Ihe ọ bụla ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ nwere n’ụzọ ihe onwunwe sitere n’amara Jehova. Ya mere, ha bụ ndị na-achị ihe ndị ahụ, ọ dịkwa ha mkpa iji ha eme ihe n’ụzọ ndị Kraịst.
3 Taa, Ndịàmà Jehova nwere echiche yiri nke ahụ. Ha ararawo onwe ha nye Jehova Chineke ma were ihe nile ha nwere—ndụ ha, ume ha, ihe onwunwe ha—dị ka ihe ndị sitere “n’amara Chineke nke dị n’ụzọ dị iche iche.” Dị ka ezi ndị na-achị ezinụlọ, ha na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị ga-aza Jehova Chineke ajụjụ maka ụzọ ha si jiri ihe ndị a na-eme ihe. Tụkwasị, e nyewo ha ihe ọmụma nke ozi ọma ahụ. Nke a kwa bụ ihe e nyere ha n’aka idebe nke ha chọrọ iji eme ihe n’ụzọ kasị mma o kwere mee: iji bulie aha Jehova elu na iji nyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu.—Mat. 28:19, 20; 1 Tim. 2:3, 4; 2 Tim. 1:13, 14.
4 Olee otú Ndịàmà Jehova si arụ ọrụ ha dị ka ndị na-achị ezinụlọ? Akụkọ mgbaafọ ha na-egosi na n’afọ gara aga nanị, n’ụwa nile ha ji ihe karịrị otu ijeri hour kwusaa “ozi ọma nke a nke alaeze” ma duziere ndị nwere mmasị ọmụmụ Bible ebe obibi gafere 4,500,000. (Mat. 24:14) E gosikwara ikwesị ntụkwasị obi ha dị ka ndị na-achị ezinụlọ nke Jehova site n’onyinye mmesapụ aka ha maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ na iji kwadoo Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị n’ógbè ha, site n’ọbịa ha lere ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị ọzọ, na site n’obiọma pụrụ iche ha gosiri ndị nọ n’oké mkpa—dị ka ndị agha metụtara. Dị ka otu ìgwè, ezi ndị Kraịst na-elekọta ihe Onyenwenụ ahụ nwere nke ọma.
“Onye ahụ Na-achị Ezinụlọ, Onye Kwesịrị Ka A Tụkwasị Ya Obi, nke Nwekwara Uche”
5 A na-achị ezinụlọ ọ bụghị nanị n’otu n’otu kamakwa dị ka otu nzukọ. Jisọs kpọrọ ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ dị n’elu ala “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Luk 12:42) Ọrụ nke ‘onye a na-achị ezinụlọ, kwesịrị ka a tụkwasị ya obi’ bụ inye “òkè nri” na ibute ụzọ n’ọrụ nkwusa ozi ọma zuru mba nile. (Mkpu. 12:17) N’ịbụ nke e jikọtara na nke a, òtù onye ahụ na-achị ezinụlọ, nke kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya, nwere ọrụ sitere n’aka Chineke nke iji ihe onwunwe na “talent” ime mmụọ ya mee ihe nke ọma. (Mat. 25:15) N’ikwekọ n’ihe nlereanya nke “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi,” alaka ụlọ ọrụ nke ọ bụla na-eme mgbalị nile iji onyinye ego nile e nyere mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị iji mee ka ọdịmma Alaeze ahụ gaa n’ihu. A na-enye onyinye nile dị otú ahụ ná ntụkwasị obi, ọ bụkwa ọrụ nke “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ịhụ na e ji ha mee ihe ndị e zubere, nakwa na e ji ha mee ihe n’ụzọ amamihe, n’ụzọ emefusịghị ihe, na n’ụzọ bara uru.
6 A na-ahụ otu ihe atụ nke ojiji e ji ego ndị a tụnyere eme ihe n’ụzọ amamihe n’uto nke ọrụ ibi akwụkwọ nke Ndịàmà Jehova na narị afọ nke 20. Nkesa Bible nakwa akwụkwọ ndị e ji amụ Bible—magazin, akwụkwọ, broshuọ, akwụkwọ nta, traktị, na Akụkọ Alaeze—ekerewo òkè dị ukwuu n’ịgbasa “ozi ọma” na “mgbe ikpeazụ” a. (Mak 13:10; 2 Tim. 3:1) Magazin Ụlọ Nche abụrụwokwa ụzọ bụ́ isi nke isi enye “ezinụlọ Chineke” na ndị òtù ha, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ “ihe e ji azụ ha n’oge ya.”—Efe. 2:19; Mkpu. 7:9; Jọn 10:16; Mat. 24:45.
7 Ná mmalite, ndị ji ibi akwụkwọ na-achụ nta ego biri akwụkwọ Ndịàmà Jehova nile. Ma n’afọ ndị 1920, e kpebiri na ọ ga-adị irè, baakwa uru n’ụzọ ime mmụọ karị, ma ọ bụrụ na ndị ohu Jehova na-ebi akwụkwọ ha n’onwe ha. N’ịmalite n’ụzọ dị ntakịrị na 1920, ọrụ ibi akwụkwọ ji nwayọọ nwayọọ mụbaa na Brooklyn, New York, ruo mgbe o buru nnukwute ibu. Ka ọ na-erule 1967 ihe owuwu obibi akwụkwọ ndị ahụ weghaara mpaghara ala anọ. A malitewokwa ibi akwụkwọ n’ala ndị ọzọ, ma n’ihe ka ọtụtụ n’ime ha, Agha Ụwa nke Abụọ kwụsịtụrụ ya.
8 N’agbanyeghị otú ọrụ ibi akwụkwọ na United States mụbaruru, o zughị iji gazuo ụwa nile. N’ihi ya, n’afọ ndị sochiri mgbe agha gasịrị, a malitere ọrụ ibi akwụkwọ ma ọ bụ na e biwelarị akwụkwọ n’ọtụtụ mba ndị ọzọ, gụnyere Canada, Denmark, England, Gris, South Africa, Switzerland, na West Germany. Ka ọ na-erule mmalite afọ ndị 1970, a gụnyere Australia, Brazil, Finland, Ghana, Japan, Nigeria, na Philippines n’ọnụ ọgụgụ ahụ. Ụfọdụ n’ime mba ndị a mepụtakwara akwụkwọ ukwu. Ná mmalite afọ ndị 1970 kwa, a zụrụ ndị ozi ala ọzọ jere ụlọ akwụkwọ Gilead na nkà ibi akwụkwọ ma ziga ha n’ụfọdụ n’ime ala ndị a inyere ụmụnna nọ n’ebe ahụ aka n’ọrụ ibi akwụkwọ.
9 N’afọ ndị 1980, ọnụ ọgụgụ mba ebe ndị a na-ebi magazin ruru ọnụ ọgụgụ kasị elu bụ́ 51.a Lee otú ihe a nile si bụrụ iji ihe Onyenwenụ ahụ nwere na-eme ihe nke ọma! Lee ihe àmà dị ike nke mmụba ọrụ Alaeze ọ bụ! Leekwa ihe akaebe dị ike ọ bụ banyere nkwado mmesapụ aka nke ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova n’otu n’otu bụ́ ndị ‘sọpụụrụ Jehova site n’akụ̀ ha’! (Ilu 3:9) Otú a, ha gosipụtara onwe ha ịbụ ndị na-achị ihe Jehova jiworo gọzie ha n’ụzọ dị iche iche nke ọma.
Mgbanwe nke Ebe E Lekwasịrị Anya
10 N’afọ ndị 1970 na ná mmalite afọ ndị 1980, e nwere ọganihu dị ukwuu na nkà na ụzụ nke ibi akwụkwọ, Ndịàmà Jehova malitekwara iji nkà ibi akwụkwọ ndị ka ọhụrụ na-eme ihe. Na mbụ, ha ji usoro ibi akwụkwọ ọkpụtọrọkpụ bụ́ letterpress mee ihe. Nke a ji nwayọọ nwayọọ gbanwee ka ha malitere iji usoro ibi akwụkwọ nke dị ọhụrụ karị bụ́ offset na-eme ihe. N’ihi ya, a na-ebipụta akwụkwọ ndị mara mma, ndị nwere ihe osise n’àgwà zuru ezu kama inwe foto ndị nwere àgwà abụọ (àgwà ojii na àgwà ọzọ) bụ́ nke a pụrụ ime n’ígwè letterpress ndị ochie ahụ. Ọzọkwa, nkà na ụzụ kọmputa gbanwere ọrụ dum a na-arụ tupu e bie akwụkwọ (nkwadebe maka obibi akwụkwọ). Ndịàmà Jehova mepụtara Usoro Ígwè Ọrụ Eletrik Na-ahazi Mkpụrụ Okwu n’Ọtụtụ Asụsụ (MEPS), bụ́ usoro nke e ji kọmputa achịkwa nke na-enye aka ugbu a ibi akwụkwọ n’ihe karịrị asụsụ 370 dị iche iche. Ọ dịghị usoro ihe omume kọmputa e ji achụ nta ego nke ya na MEPS ha n’ikike o nwere iji ya arụ ọrụ n’ọtụtụ asụsụ.
11 N’ihi nkà na ụzụ kọmputa nke MEPS na iji ihe ọhụrụ ndị ọzọ dị ka ozi sitere n’ígwè electronics eme ihe, e nwere oké ọganihu ọzọ n’iwepụta nri n’oge ya. Na mbụ, site n’iji nkà na ụzụ ndị ka ochie na-eme ihe, magazin ndị na-abụghị nke Bekee na-ebu ihe ọmụma dị na nke Bekee mgbe ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọbụna otu afọ gasịrị. Ugbu a, Ụlọ Nche na-apụtakọ ọnụ n’asụsụ 115 dị iche iche, Teta! kwa n’asụsụ 62. Nke a pụtara na n’ụwa nile ihe karịrị pasent 95 nke ndị na-abịa Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche kwa izu nke Ndịàmà Jehova na-atụle otu ihe ọmụmụ ahụ n’otu oge ahụ. Lee ngọzi nke a bụ! Ọ bụ n’ezie iji ihe Onyenwenụ ahụ nwere na-eme ihe nke ọma bụ́ itinye ego na nkà na ụzụ ọhụrụ ahụ nile!
Mkpa Ndị Dị Iche nke Nzukọ
12 Usoro ọhụrụ ndị a gbanwere mkpa ndị nzukọ nwere n’ọrụ ibi akwụkwọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. Ígwè obibi akwụkwọ bụ́ web offset na-ebi nnọọ akwụkwọ ngwa ngwa karịa ígwè letterpress ochie ndị ahụ, ma ha dịkwa oké ọnụ nke ukwuu karị. Usoro kọmputa ndị na-enye aka n’ọrụ ndị metụtara ha, dị ka ide ihe, nsụgharị, ihe osise, na graphics, ọ bụ ezie na ha na-eme ka e nwee ike ime ihe ka ukwuu karịa usoro ndị ochie ahụ, ha dịkwa oké ọnụ karị. N’oge na-adịghị anya o doro anya na ọ dịghịzi ọnụ ala ibi magazin na mba 51 dị iche iche. Ya mere, n’afọ ndị 1990, “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” lerugharịrị ihe anya. Gịnị ka o kpebiri?
13 Nnyocha gosiri na a ga-eji “akụ̀” nke Ndịàmà Jehova na ndị enyi ha tụkọtara mee ihe n’ụzọ ka mma ma ọ bụrụ na e kpokọta ọrụ ibi akwụkwọ ọnụ. Ya mere e ji nwayọọ nwayọọ gbubilata ọnụ ọgụgụ alaka ndị na-ebi akwụkwọ. Germany ewegharawo ọrụ ibiri ọtụtụ ala dị n’Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ Europe magazin na akwụkwọ, gụnyere ụfọdụ ndị na-ebibu akwụkwọ ha n’onwe ha. Itali na-ebugara akụkụ ụfọdụ nke Africa na akụkụ ndịda ebe ọwụwa anyanwụ Europe, gụnyere Gris na Albania magazin na akwụkwọ. N’Africa, e mewo ka ibi magazin bụrụ nanị na Nigeria na South Africa. Mkpokọta ọnụ yiri ndị a weere ọnọdụ n’ụwa nile.
Ihe Ndị A Ga-atụle
14 Ka ọ na-erule July 1998, a ga-akwụsịworị ibi magazin n’ọtụtụ mba Europe, gụnyere Austria, Denmark, France, Gris, Netherlands, na Switzerland. Ọrụ ibi akwụkwọ na Europe bụ nke Britain, Finland, Germany, Itali, Spain, na Sweden ga na-arụ. N’ụzọ dị otú a, a ga-ezere mmefu ndị na-adịghị mkpa, e jirikwa onyinye ndị e nyere mee ihe n’ụzọ ka mma maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. Olee otú e si kpebie mba ndị ga-aga n’ihu dị ka ebe ibi akwụkwọ na ndị ga-akwụsị ibi akwụkwọ? N’ikwekọ n’ọrụ e nyere ya ilekọta ihe Onyenwenụ ahụ nwere n’ụzọ amamihe, “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” ji nlezianya tụlee ikwe omume nke ibi akwụkwọ n’ebe ọ bụla.
15 Ihe bụ́ isi mere e ji kwụsị ibi akwụkwọ ná mba ụfọdụ ma kpokọta ha ọnụ n’ebe ndị ọzọ bụ ịba uru ya. Otu mba ibiri ọtụtụ ala ndị ọzọ akwụkwọ dị mfe karị, bụrụkwa ụzọ ka mma isi jiri ngwá ọrụ dị oké ọnụ na-eme ihe. A na-ebi akwụkwọ ugbu a n’ebe ndị mmefu dị ala karị, a pụrụ inweta ihe ndị a chọrọ, ebe usoro mbupụ ihe dịkwa mma. N’ụzọ dị otú a, a na-eji ihe Onyenwenụ ahụ nwere eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ezie, ịkwụsị ibi akwụkwọ n’otu mba apụtaghị na ọrụ ime nkwusa ga-akwụsị n’ebe ahụ. A ka ga-enwe ụba akwụkwọ e biri ebi, ọtụtụ narị puku Ndịàmà Jehova nọ n’ala ndị ahụ ga-anọgidekwa jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ndị agbata obi ha “ozi ọma nke udo.” (Efe. 2:17) Ọzọkwa, nhazigharị a arụpụtawo uru ndị ọzọ.
16 Iji hota otu uru, e zipụrụ ihe ka ukwuu n’ígwè obibi akwụkwọ ọgbara ọhụrụ si Denmark, Gris, Netherlands, na Switzerland gaa Nigeria na Philippines. Ndị ọrụ nwere nkà si ná mba Europe dị iche iche nakweere ọkpụkpọ òkù iso ígwè obibi akwụkwọ ndị ahụ gawa na ịzụ ndị ọrụ obibi akwụkwọ ná mba ndị ahụ n’otú e si eji ha eme ihe. Ya mere, mba ndị ahụ na-enweta ugbu a magazin ndị nwere otu ọdịdị ahụ dị elu nke ala ndị ọzọ nwere.
17 Tụlee uru ọzọ: Ala ole na ole ebe a ka na-ebi akwụkwọ na-ahụzi maka mmefu nke ibi magazin. N’ihi ya, n’ala ebe ndị a kwụsịworo ibi akwụkwọ, e nweziri ego ugbu a maka ime ihe ndị ọzọ, dị ka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na iji nye aka gboo mkpa ụmụnna anyị ndị nọ n’ala ndị dara ogbenye karị. N’ụzọ dị otú a, iji ihe Onyenwenụ ahụ nwere na-eme ihe nke ọma pụtara na a pụrụ iji okwu Pọl gwara ndị Kọrint mee ihe n’ụzọ dị irè karị n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ: “Ekwughị m nke a, ka o wee [dịrị] ndị ọzọ mfe, ka mkpagbu wee dịkwara unu: kama ana m ekwu n’ụzọ nhata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọdụrụ ha inwe n’oge dị ugbu a . . . ka nhata wee dị.”—2 Kọr. 8:13, 14.
18 N’ihi mkpokọta ọnụ a, a na-ejikọta Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ọnụ n’ụzọ chiri anya karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ dịghị enye Ndịàmà nọ na Denmark nsogbu na a na-ebi magazin ha na Germany, ọ bụ ezie na ha na-ebibu nke ha. Ha nwere ekele maka ije ozi nke ụmụnna ha bụ́ ndị Germany. Eziokwu ahụ bụ́ na a na-eji onyinye ha ebi akwụkwọ ndị e ji amụ Bible maka ndị Denmark—ma ọ bụ Russia, Ukraine, na ala ndị ọzọ ọ̀ na-ewute Ndịàmà Jehova nọ na Germany? Ọ dịghị ma ọlị! Obi dị ha ụtọ ịmata na a pụrụ iji onyinye nke ụmụnna ha nọ n’ala ndị ahụ mee ihe ugbu a maka ihe ndị ọzọ dị mkpa.
Ilekọta Ihe Ndị Ahụ E Nwere
19 N’Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, e nwere igbe onyinye e dekwasịrị “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” A pụrụ iji onyinye a na-arịọghị arịọ e tinyere n’igbe ndị ahụ mee ihe n’ebe ọ bụla e nwere mkpa. Ọ bụ “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” na alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na-ekpebi otú a ga-esi jiri onyinye ndị ahụ mee ihe. N’ihi ya, ebe iwu nyere ohere ya, ego e tinyere n’igbe onyinye dị n’otu mba pụrụ ịkwado ọrụ Ndịàmà Jehova ná mba ọzọ dị ọtụtụ puku kilomita site n’ebe ahụ. E jiriwo onyinye nyere ndị kwere ekwe ibe anyị aka n’ọnọdụ mberede bụ́ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ajọ ikuku hurricane, tornado, ala ọma jijiji, na agha obodo. E jikwa onyinye ndị dị otú ahụ na-akwado ndị ozi ala ọzọ nọ n’ihe karịrị nnọọ ala 200.
20 N’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova, dị ka ọ na-adịkarị, a na-ehota okwu ego nanị otu ugboro n’ọnwa—ọ bụkwa nanị ruo minit ole na ole. A dịghị ebugharị efere ụtụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ná mgbakọ. A dịghị ezijere ndị mmadụ akwụkwọ arịrịọ ego. A dịghị egote ndị na-agba ọnyà ego. Dị ka ọ na-adịkarị, Ụlọ Nche na-ebu nanị otu isiokwu n’otu afọ nke na-akọwa otú ndị chọrọ pụrụ isi nye Watch Tower Bible and Tract Society onyinye iji kwadoo ọrụ zuru ụwa ọnụ. A dịghị ekwukarị okwu ego Society na Teta! Mgbe ahụ, olee otú e siworo rụzuo agadaga ọrụ zuru ụwa ọnụ nke ikwusa ozi ọma ahụ, iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị mkpa, ilekọta ndị nọ n’ozi oge nile pụrụ iche, na inyere ndị Kraịst nọ ná mkpa aka? Jehova ejiriwo mmụọ nke mmesapụ aka gọzie ndị ya n’ụzọ dị ịtụnanya. (2 Kọr. 8:2) Anyị na-eji ohere a na-ekele ndị nile kerewooro òkè ‘n’ịsọpụrụ Jehova site n’akụ̀ ha.’ Ha pụrụ ijide n’aka na “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” ga-anọgide na-elekọta ihe Onyenwenụ ahụ nwere. Anyị na-ekpekwa ekpere ka Jehova nọgide na-agọzi ndokwa nile a na-eme maka mgbasa nke ọrụ zuru ụwa ọnụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’asaa n’ime ala ndị a, ọ bụ ụlọ ọrụ achụmnta ego biere ha akwụkwọ.