Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w19 Nọvemba p. 31
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Amamihe Kwadebe Maka Ọdịnihu
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Ị Bụ Onye A Tụkwasịrị Obi Nke Na-elekọta Ụlọ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jiri Ezi Amamihe Kpadoo Ihe Maka Ọdịnihu
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
w19 Nọvemba p. 31
Ebe onye na-elekọta ụlọ n’Ijipt oge ochie na-elekọta ihe ndị ọrụ na-arụ

Ị̀ Maara?

Gịnị Bụ Ọrụ Onye Na-elekọta Ụlọ n’Oge Ochie?

N’OGE ochie, onye na-elekọta ụlọ na-elekọtara onye ọzọ ezinụlọ ya ma ọ bụ ihe ndị ọzọ onye ahụ nwere. Okwu Hibru na okwu Grik a sụgharịrị “onye na-elekọta ụlọ” nwekwara ike ịpụta onye nlekọta.

Mgbe Josef nwa Jekọb bụ ohu n’Ijipt, ọ ghọrọ onye na-elekọta ụlọ nna ya ukwu. Nna ukwu Josef bụ́ onye Ijipt ‘tinyere ihe niile o nwere n’aka ya.’ (Jen. 39:2-6) Mgbe Josef mechara ghọọ nnukwu onye ọchịchị n’Ijipt, ọ họpụtakwara onye ga na-elekọta ụlọ ya.—Jen. 44:4.

N’oge Jizọs, ndị nwere ala na-ebikarị n’obodo na-abụghị ebe ugbo ha dị. Ọ bụ ya mere ha ji achọta ndị ga na-elekọta ọrụ a na-arụ n’ugbo ha kwa ụbọchị.

Ònye ruru eru ịbụ onye na-elekọta ụlọ? Otu onye Rom aha ya bụ Columella na-ede akwụkwọ n’oge ndịozi Jizọs kwuru na ohu a họpụtara ka ọ bụrụ onye na-elekọta ụlọ kwesịrị ịbụ “onye mụtara ịrụ ọrụ ya nke ọma.” Ọ ga-abụ onye “na-agbalịsi ike ka ndị ọrụ rụọ ihe ha kwesịrị ịrụ. Ma, ọ gaghị abụ onye obi tara mmiri.” Nwoke ahụ kwukwara, sị: “Ma ihe kacha mkpa a chọrọ n’aka onye na-elekọta ụlọ bụ na o kwesịghị iche na ya macha ihe niile. O kwesịrị ịdị njikere ịmụta ihe ọhụrụ.”

Baịbụl ji onye na-elekọta ụlọ na ihe ọ na-arụ kọwaa ihe ụfọdụ a na-eme n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi gwara Ndị Kraịst ka ha jiri nkà Chineke nyere ha ‘na-ejere ibe ha ozi dị ka ezi ndị nlekọta ụlọ n’ihe banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ.’—1 Pita 4:10.

Jizọs jikwa onye na-elekọta ụlọ mee ihe atụ n’ihe e dere na Luk 16:1-8. N’amụma Jizọs buru gbasara ihe ịrịba ama a ga-eji mata mgbe ọ ga-aghọ Eze n’eluigwe, o mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ọ ga-ahọpụta “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ma ọ bụ “onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi.” Ọrụ kachanụ onye ahụ na-elekọta ụlọ ga na-arụ bụ ịna-enye ndị na-eso ụzọ Jizọs nri n’oge kwesịrị ekwesị n’oge ikpeazụ. (Mat. 24:45-47; Luk 12:42) Obi dị anyị ụtọ na anyị so ná ndị na-enweta akwụkwọ na ihe ndị ọzọ na-eme ka okwukwe anyị sie ike onye ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke na-elekọta ụlọ na-ewepụta ma na-ekesa n’ụwa niile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya