Isi 87
Jiri Ezi Amamihe Kpadoo Ihe Maka Ọdịnihu
JISỌS ka kọsịịrị ìgwè mmadụ ahụ nke gụnyere ndị na-eso ụzọ ya, ndị ọna ụtụ na-adịghị eme ihe n’eziokwu na ndị mmehie ọzọ a ma ama, gụnyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii akụkọ banyere nwa mmefu ahụ. Ugbu a, n’iche ndị na-eso ụzọ ya ihu, ọ kọrọ ihe atụ nke metụtara otu onye ọgaranya nke natara akụkọ na-adịghị mma banyere onye na-elekọta ma ọ bụ onye na-achị ụlọ ya.
Dị ka Jisọs si kọọ, ọgaranya ahụ kpọrọ onye ahụ na-achị ụlọ ya wee gwa ya na ya gaje ịchụ ya n’ọrụ. Onye ahụ na-achị ezinụlọ tụgharịrị uche na-ekwu sị, “Gịnị ka m ga-eme, n’ihi na onye nwe m na-anapụ m ọchịchị ezinụlọ a? Enweghị m ike igwu ala; ihere ịrịọ arịrịọ na-eme m. Amaara m ihe m ga-eme, ka, mgbe ọ bụla a ga-ewepụ m n’ọchịchị ezinụlọ a, ka ha wee kpọbata m n’ụlọ nke aka ha.”
Gịnị bụ atụmatụ onye ahụ na-achị ezinụlọ? O jere kpọkọta ndị nile ji nna ya ukwu ụgwọ. Ọ jụrụ sị, “Ụgwọ ole ka i ji onyenwe m?”
Onye nke mbụ zara sị, ‘580 galọn mmanụ olive.’
Ọ gwara ya sị, ‘Were akwụkwọ nkwekọrịta gị, nọdụ ọsọ ọsọ, dee 290.’
O wee jụọ onye ọzọ sị, ‘Ugbu a gị, ụgwọ ole ka i ji?’
Ọ sịrị, ‘630 mgbé ọka wheat.’
‘Wereghachi akwụkwọ gị dee 504.’
Onye ahụ na-achị ezinụlọ nwere ikike iwedata ụgwọ ndị a ji onyenwe ya ebe ọ ka bụ onye na-elekọta okwu ego nke nna ya ukwu. Site n’iwedata ụgwọ ndị ahụ ji, ọ na-ewulite ọbụbụenyi n’etiti ya na ndị pụrụ imeghachiri ya ihe ọma mgbe a chụpụrụ ya n’ọrụ.
Mgbe onyenwe ya nụrụ ihe meworonụ, nke ahụ masịrị ya. N’ezie, o “wee too onye ahụ na-achị ezinụlọ nke na-eme ajọ omume, n’ihi na o mere dị ka onye nwere uche [“ezi amamihe,” NW].” N’ezie, Jisọs kwukwara, sị: “N’ihi na ụmụ nke oge a nwere uche n’ebe ọgbọ nke aka ha nọ karịa ụmụ nke ìhè.”
Ugbu a, n’ime ka ndị na-eso ụzọ ya mụta ihe site na nke a, Jisọs gbara ume, sị: “Meenụ ndị enyi nye onwe unu site n’akụ nke ajọ omume; ka, mgbe ọ bụla ọ ga-agwụ, ka ha wee kpọbata unu n’ụlọ ikwuu ebighị ebi.”
Jisọs adịghị aja onye ahụ na-achị ezinụlọ mma maka ajọ omume ya kama ọ bụ maka nlepụanya ya, ezi amamihe nke o ji mee ihe. Ọtụtụ mgbe, “ụmụ nke oge a” na-eji amamihe were ego ha ma ọ bụ ọnọdụ ha mete enyi nke ha na ndị pụrụ imeghachiri ha ihe ọma. Otú ahụ, ndị ohu Chineke, bụ́ “ụmụ nke ìhè,” kwesịkwara iji ihe onwunwe ha, bụ́ “akụ nke ajọ omume” mee ihe n’ụzọ amamihe iji baara onwe ha uru.
Ma dị ka Jisọs kwuru, ha kwesịrị iji akụ ndị a mete enyi nke ha na ndị pụrụ ịkpọbata ha “n’ụlọ ikwuu ebighị ebi.” Nye ndị so n’ìgwè atụrụ nta ahụ, ebe ndị a bụ n’eluigwe; nye “atụrụ ọzọ,” ha bụ n’ime paradaịs elu ala. Ebe ọ bụ nanị Jehova Chineke na Ọkpara ya pụrụ ịnabata mmadụ n’ebe ndị a, anyị kwesịrị itinye uchu n’ịzụlite ọbụbụenyi nke anyị na ha site n’iji “akụ nke ajọ omume” ọ bụla anyị pụrụ inwe mee ihe n’ịkwado ọdịmma Alaeze. Mgbe ahụ, mgbe ihe onwunwe ndị a dara ma ọ bụ laa n’iyi, dị ka ha na-aghaghị ime, anyị ga-ejide ọdịnihu ebighị ebi anyị n’aka.
Jisọs gara n’ihu ikwu na mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ọbụna ihe onwunwe ndị a, ma ọ bụ ihe ndị dịkarịsịrị nta, ga-ekwesịkwa ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ndị ka mkpa. Ọ gara n’ihu ikwu sị, “Ya mere, ọ bụrụ na unu abụghị ndị kwesịrị ka a tụkwasị unu obi n’akụ ajọ omume, ònye ga-enye ezi akụ [ya bụ, ọdịmma ime mmụọ, ma ọ bụ nke Alaeze] n’aka unu ná ntụkwasị obi idebe? Ọ bụrụkwa na unu abụghị ndị kwesịrị ka a tụkwasị unu obi n’ihe onye ọzọ nwere [ọdịmma Alaeze ndị Chineke ji ntụkwasị obi nye ndị ohu ya n’aka idebe], ònye ga-enye unu ihe nke aka unu [ụgwọ ọrụ nke bụ ndụ ebighị ebi n’ebe obibi ndị na-adịru mgbe ebighị ebi]?”
Isi ihe dị na ya bụ na anyị apụghị ịbụ ezi ndị ohu Chineke, bụrụkwa ohu nye akụ nke ajọ omume, bụ́ ihe onwunwe ndị anya na-ahụ n’otu mgbe ahụ, dị ka Jisọs kwubiri, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-eje ozi nke pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ.” Luk 15:1, 2; 16:1-13; Jọn 10:16.
▪ Olee otú onye ahụ na-achị ezinụlọ dị n’ilu Jisọs si wulite ọbụbụenyi n’etiti ndị pụrụ inyere ya aka mgbe e mesịrị?
▪ Gịnị bụ “akụ nke ajọ omume,” oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi jiri ha mete ndị enyi?
▪ Olee ndị pụrụ ịnabata anyị “n’ụlọ ikwuu ebighị ebi,” oleekwa ebe ndị a bụ?