Nzukọ Ije Ozi Maka July
Izu Na-amalite July 6
Abụ 110
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi March maka mba a na ọgbakọ unu.
15 min: “Lee Ka O Si Dị Mma Ịga Mgbe Nile!” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ndị dị na Teta! nke November 8, 1989, peji nke 13-15, iji gbaa ndị na-eto eto ume ịgachi nzukọ anya.
20 min: “Ọ Dị Ndị Agbata Obi Anyị Mkpa Ịnụ Ozi Ọma Ahụ.” A ga-enyefe ùkwù akwụkwọ ndị nwere akwụkwọ abụọ ma ọ bụ anọ n’ụtụ dị ala. Mee ndokwa ka ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru tụleghachi aro ndị ahụ, na-eji akwụkwọ Young People Ask eme ihe. Mee ka isi ihe ndị pụrụ ịdị irè n’ókèala unu pụta ìhè. Mesie ike ihe mgbaru ọsọ nke ịmalite ọmụmụ Bible na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke mbụ bụ́ nke nletaghachi na ikwu ka e duzie ọmụmụ ihe ga-esochi.
Abụ 73 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 13
Abụ 116
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gbaa mmadụ nile ume ichesi echiche ike banyere idebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’August, mgbe a ga-enwe ngwụsị izu ise zuru ezu.
15 min: “Ònye Ga-anwa Anwa Ripịa Ụlọ Ndị Inyom Di Ha Nwụrụ?” Ajụjụ na azịza. Nke onye okenye ga-eme.
20 min: Mmụọ nke Ụwa Ọ̀ Na-eme Gị Nsí? Okwu onye okenye ga-ekwu dabeere n’Ụlọ Nche nke October 1, 1997, peji nke 25-29.
Abụ 182 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 20
Abụ 18
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
12 min: “Nleta nke Pụrụ Ịbụ Ngọzi.” Mkparịta ụka n’etiti ndị okenye abụọ. Kọwaa ebumnobi nke ọrụ ọzụzụ atụrụ dị ka a tụlere n’Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peji nke 20-23. Gbaa ọgbakọ ume n’ụzọ na-ekpo ọkụ ịtụ anya nleta nke ndị okenye.
25 min: “Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?” (Paragraf nke 1-14) Onye nlekọta ije ozi ekwuo okwu mmeghe dị mkpirikpi, na-agba mmadụ nile ume ichesi echiche ike banyere ịsụ ụzọ oge nile. Mgbe ahụ ọ tụlee ajụjụ nke 1, tinyere ihe ndị e kwuru na “Mmụọ Ịsụ Ụzọ Na-ekpo Ọkụ” (Enthusiastic Pioneer Spirit) dị na 1998 Yearbook, peji nke 104-105. Mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nọ n’ọgbakọ bụ́ ndị nweworo ahụmahụ n’ịsụ ụzọ esonyere ya n’elu ikpo okwu ịtụle ajụjụ nke 2. Ha ekerịta echiche bara uru, nke ga-ekwe omume n’ezie nke otú ọ pụrụ isi kwee omume inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe dị ka ndị ọsụ ụzọ. Mgbe ahụ mmadụ abụọ mụrụ ụmụ esonyere ìgwè ahụ iji tụlee ajụjụ nke 3. Ha ekwuo ezi ihe mere ndị ntorobịa kwesịrị iji chesie echiche ike banyere ọrụ ozi oge nile. Gbaa mmadụ nile ume ịbịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-esonụ, mgbe a ga-atụle ajụjụ ndị fọrọ afọ.
Abụ 80 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 27
Abụ 155
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka July. Maa ọkwa ndokwa e mere maka ije ozi n’izu mbụ n’August, gbaakwa mmadụ nile ume ikere òkè.
30 min: “Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?” (Paragraf nke 15-25) Okwu na mkparịta ụka nke onye okenye ga-eduzi. Mee ndokwa tupu oge eruo ka ndị ọsụ ụzọ na ndị sụrụ ụzọ n’oge gara kwuo ihe ndị si ha n’obi n’ịza ajụjụ nke 4-5. Ha emesie ike mkpa ọ dị inwe ndokwa dị mma na ịgbaso ya, na-enye ihe atụ nke usoro ije ozi kwa izu ndị bara uru, ndị dị irè n’ezie. Onye okenye ahụ ejiri okwu na-akpali akpali nke zara ajụjụ nke 6 mechie. Mmalite nke afọ ije ozi na September 1 bụ oge dị mma ka ndị ọsụ ụzọ ọhụrụ malite ozi oge nile ha. A pụrụ inweta fọm site n’aka onye ọ bụla so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ.
Abụ 51 na ekpere mmechi.