Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onyeisi Oche Ndị Nlekọta
1 Ije ozi dị ka onye nlekọta n’ime ọgbakọ bụ ibu ọrụ siri ike. (Ọrụ 20:28; 1 Tim. 3:1) Nke a bụ nke mbụ n’ime usoro isiokwu ndị ga-akọwapụta ọrụ dị iche iche nke ndị Kraịst bụ́ okenye ka anyị nile wee nwee ike ịghọta ọrụ dị mkpa ha na-arụ n’ihi anyị.
2 Society na-ahọpụta onyeisi oche ndị nlekọta ije ozi ruo ogologo oge a na-akaghị aka. Mgbe onyeisi oche ndị nlekọta na-ahazi okwu dị iche iche, nke a na-enyere ndị okenye aka ilebara ọrụ ndị e kenyere ha anya nke ọma. (Ozi Anyị, p. 42) Gịnị ka nke a na-agụnye?
3 Onyeisi oche ndị nlekọta na-anata akwụkwọ ozi ọgbakọ ma nyefee ya odeakwụkwọ ozugbo maka ịhụ maka ya. N’ịkwadebe maka nzukọ ndị okenye, onyeisi oche ndị nlekọta na-enweta aro site n’aka ndị okenye banyere okwu ndị ọ dị mkpa ka a tụlee ma chịkọta isiokwu ndị a ga-atụle. Ọ na-ejekwa ozi dị ka onyeisi oche ná nzukọ ndị okenye. Mgbe e mere mkpebi, ọ na-ahụ na e mezuru ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ na-ahụ banyere nkwadebe nke Nzukọ Ije Ozi na ime ndokwa maka okwu ihu ọha. Ọ na-enye nkwado maka ọkwa nile a na-amara ọgbakọ, na-enye ikike ịkwụ ụgwọ mmefu nile a na-eme mgbe nile, ma na-ahụ na a gụzigharịrị ihe ndekọ ego ọgbakọ nke a na-eme kwa ọnwa atọ.
4 Dị ka onyeisi oche, onyeisi oche ndị nlekọta na-achịkọta ọrụ nke Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ. Mgbe onye a na-amụrụ Bible rịọrọ ka a mata ya dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptism ma ọ bụ mgbe onye nkwusa a na-emebeghị baptism chọrọ ka e mee ya baptism, onyeisi oche ndị nlekọta na-eme ndokwa ka ndị okenye soro ya nọkọọ. Onyeisi oche ndị nlekọta na-ebutekwa ụzọ n’ime nkwadebe maka nleta nke onye nlekọta sekit ka ọgbakọ wee nwee ike irite uru zuru ezu site n’izu ọrụ ahụ pụrụ iche.
5 Ọrụ onyeisi oche ndị nlekọta buru ibu ma dịgasịa iche iche. Ka o ji “obi na-anụ ọkụ” na-arụ ọrụ ya n’ịdị umeala n’obi, anyị nile pụrụ imezu òkè nke anyị site n’ikwenyere ndị okenye. (Rom 12:8) Ọ bụrụ na anyị ‘na-ekwenyere’ ma ‘na-edo onwe anyị n’okpuru’ ndị na-edu ndú n’etiti anyị, ha pụrụ iji ezi ọṅụ ka ukwuu na-arụ ọrụ ha.—Hib. 13:17.