Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 4 ruo August 24, 1998. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Dị ka ihe ndekọ Bible si dị, Pọl degaara ndị Kọrint akwụkwọ ozi nke ugboro abụọ mgbe o letasịrị ha na 56 O.A. [5, w90 9/15 p. 26]
2. Ịghasasị ntụ nke ozu e suru ọkụ ekwekọghị n’Akwụkwọ Nsọ. [2, w96 9/15 p. 30 para. 6–p. 31 para. 1]
3. Ịnụ ọkụ n’obi gafere ókè iji mee ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu agaghị eme ka enweghị akọ, mmetụta ọmịiko, na ịdị nro mgbe e so ndị ọzọ na-emekọ ihe zie ezie. (1 Kọr. 13:2, 3) [3, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 10/15 p. 31 para. 4.]
4. A na-akpọ mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe “mbilite n’ọnwụ mbụ,” ebe ọ bụ nke mbụ n’oge na n’ọkwá. (Mkpu. 20:6) [6, w96 10/15 p. 6 para. 5]
5. Ihe odide dị ná Ndị Galetia 5:26 gụpụrụ egwuregwu asọmpi nile maka ezi ndị Kraịst. [9, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee g95-E 12/8 p. 15 para. 8.]
6. Akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrint bara uru iji nyere anyị aka igosi nkwanye ùgwù, ime ihe n’usoro, na ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto. [4, w90 9/15 p. 25 para. 5, 6]
7. Pọl dere akwụkwọ ozi ahụ o degaara ndị Filipaị nanị ọnwa ole na ole mgbe o guzobesịrị ọgbakọ ahụ na Filipaị, ihe kpalitekwara ya bụ oké nsogbu dapụtaworo n’etiti ha. [12, w90 11/15 p. 25]
8. “A gụrụ [Jisọs] n’onye ezi omume n’ime mmụọ,” dị ka a kpọtụrụ uche na 1 Timoti 3:16, site n’iji ịdị ndụ dị ka mmụọ kwụọ ya ụgwọ ná mbilite n’ọnwụ ya; nke a pụtara na Chineke weere ya na Jisọs bụ nnọọ onye ezi omume n’akụkụ nile, ruokwa eruo inweta ọrụ ndị ọzọ dị elu karị. [16, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 1/15 p. 13 para. 12.]
9. N’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Tesalọnaịka, Pọl kpọtụrụ uche n’ọnụnọ nke Jisọs Kraịst ugboro anọ, e leghị anya n’ihi mmasị ọgbakọ ahụ nwere n’ozizi a. [14, Ọgụgụ Bible kwa izu]
10. Anyị pụrụ ịrụta ndụ n’ọrụ site n’ijere Jehova Chineke ozi. [7, kl p. 182 para. 4]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. N’ụzọ dị aṅaa ka ụfọdụ ndị nọ na Kọrint si na-ekere òkè n’ihe nnochianya ndị ahụ “mgbe ọ na-ekwesịghị” mgbe ha nọkọrọ ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst? (1 Kọr. 11:27) [2, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 2/15 p. 19 para. 17.]
12. Olee otú Jehova ga-esi kwụghachi ụgwọ ihe ọ bụla anyị pụrụ ịchụ n’àjà n’ihi ofufe ya? [1, kl p. 169 para. 20]
13. N’ihi gịnị ka onye Kraịst kwesịrị iji dị njikere ịrịọ mgbaghara ọ bụ ezie na ọ pụrụ iche na ọ dịghị ihe ọjọọ ya mere? [1, w96 9/15 p. 22 para 4, 7]
14. Akụkụ dị aṅaa dị mkpa nke “ihe omimi ahụ dị nsọ,” (NW) ka e mere ka o doo anya n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Efesọs? (Efe. 3:4-6) [11, w90 11/15 p. 24 para. 4]
15. Dị ka onye na-eje ozi nke bụkwa onyeozi, olee otú Pọl si gosi ihe nlereanya magburu onwe ya maka ndị ozi bụ́ ndị Kraịst taa? [7, w90 9/15 p. 27 para. 2)]
16. Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe ọ sịrị na “a tụkwasịrị [Iwu ahụ] n’ihi njehie”? (Gal. 3:19) [8, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee uw p. 146-147 para. 3-4.]
17. Ná Ndị Filipaị 1:3-7, n’ihi ihe ndị dị aṅaa ka Pọl ji jaa ụmụnna ahụ mma, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya ha? [12, w90 11/15 p. 25 para. 1-3]
18. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst nile na-eje ozi kwesịrị iji ṅaa ntị na ndụmọdụ ahụ e dekọrọ ná Ndị Kọlọsi 4:6? [13, Ọgụgụ Bible kwa izu]
19. Gịnị ka Pọl onyeozi bu n’uche mgbe o kwuru na o zubere ka ndị inyom “were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma”? (1 Tim. 2:9) [16, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee g90-E 6/22 p. 19 para. 2.]
20. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji ṅaa ntị na ndụmọdụ Pọl dị na 1 Timoti 6:6 n’ihe banyere “nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa”? [17, w91 1/15 p. 30 para. 8]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. E si na _________________________ deta Ndị Kọrint nke abụọ, ma e leghị anya ọ bụ _________________________ wetara ya. [5, w90 9/15 p. 26]
22. Mgbe Pọl kwuru ná 2 Ndị Kọrint 10:4 na “ihe agha nke ibu agha anyị abụghị nke anụ ahụ,” ọ na-emesi ike na ndị Kraịst ekwesịghị ichigharịkwuru _________________________, dị ka _________________________, _________________________, ma ọ bụ _________________________, iji chebe ọgbakọ ahụ pụọ n’ozizi ụgha. [7, w90 9/15 p. 27 (igbe)]
23. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Galetia, Pọl na-anwapụta na ịgụ mmadụ n’onye ezi omume bụ site n’inwe _________________________ na Kraịst Jisọs, ọ bụghị site n’ọrụ nke _________________________, n’ihi ya kwa na _________________________ adịghị ndị Kraịst mkpa. [8, w90 11/15 p. 23]
24. “Ịla” a kpọtụrụ uche ná Ndị Filipaị 1:23 dị ka ihe àmà gosiri bụ atụmanya Pọl ịnọ n’ebe Kraịst nọ mgbe _________________________. [12, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95-IB 3/1 p. 30 para. 4.]
25. _________________________ dere akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Tesalọnaịka mgbe ọ nọ na Kọrint n’afọ _________________________. [15, w91 1/15 p. 23]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Ọ bụrụ na i nwere obi abụọ siri ike banyere mmadụ n’oge mbedo, ihe amamihe dị na ya ime bụ (ikwere ka mmetụta ịhụnanya kpuchie obi abụọ gị; ịkwụsị mmekọrịta ahụ; imechi anya nye ntụpọ ndị siri oké ike na-enwe olileanya na ihe ga-aka mma mgbe unu lụsịrị di na nwunye). [16, fy p. 23 para. 19]
27. Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Galetia na-enye nkọwa Aịsaịa 54:1-6, na-eme ka a mata nwanyị Jehova dị ka (Jerusalem elu ala; Jerusalem dị n’elu; Jerusalem Ọhụrụ). (Gal. 4:21-26) [9, Ọgụgụ Bible kwa izu]
28. Ná Ndị Efesọs 1:10, “nhazi,” [NW] ahụ na-ezo aka n’ebe (Alaeze Mesaịa; Òtù Na-achị Isi; Ụzọ Chineke si na-achịkwa ihe omume ezinụlọ ya) dị. [10, w90 11/15 p. 24 para. 3]
29. A pụrụ ịkọwa (ndị okpukpe ndị Juu; òtù ndị ụkọchukwu Krisendọm; Babilọn Ukwu ahụ) dị ka “onye ahụ na-emebi iwu” nke a kpọtụrụ uche ná 2 Ndị Tesalọnaịka 2:3. [15, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 1/15 p. 18 para. 11.]
30. Ná 1 Ndị Kọrint 12:31, “ụzọ nke kachasị mma” na-ezo aka n’ụzọ (nke eziokwu; nke ịhụnanya; nke ndụ jupụtara n’onyinye ime mmụọ). [2, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 7/15 p. 27 para. 3.]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
1 Kọr. 10:11, 12; 2 Kọr. 4:7; 2 Kọr. 8:14; Fil. 4:6, 7; 2 Tesa. 1:8, 9, 12
31. Mgbe mmadụ butere ozi ndị Kraịst ụzọ ná ndụ ya, ọ na-enweta ike Chineke na-enye. [5, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w90 3/1 p. 29 para. 6.]
32. Anyị kwesịrị ịṅa ntị n’ihe atụ ịdọ aka ná ntị nke ụmụ Israel n’okpuru Mosis ma zere ịdabere n’onwe anyị. [4, w90 9/15 p. 25]
33. Onyinye mmesapụ aka sitere n’aka ndị Kraịst bara ọgaranya pụrụ inye aka gboo mkpa ndị bi n’ebe ihe na-adịchaghị mma, ebe ịnụ ọkụ n’obi na ntachi obi nke ndị ihe na-esiri ike pụrụ iwetara ndị ahụ nyere onyinye ọṅụ na agbamume. [6, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w93 12/15 p. 21 para. 20.]
34. Ike agaghị agwụ anyị n’ikwusa ozi ọma ahụ, n’ihi na dị ka Bible si kwuo, ndị nile dị ndụ taa bụ́ ndị dịgidere ndụ ruo ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a, bụrụkwa ndị a gụrụ ná ndị iro nke ezi ofufe ga-enweta mbibi ebighị ebi. [15, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 5/1 p. 19 para. 4.]
35. Jehova na-enye ịnọ jụụ na ịnọ nwayọọ n’ọnọdụ ọnwụnwa ndị kasị ukwuu. [12, Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88 11/1 p. 30 para. 19-20.]