Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/98 p. 1
  • Mara Ụmụnna Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mara Ụmụnna Gị
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Ndị Bụ Ụmụnne Anyị?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “Na-agbanụ Ibe Unu Ume Kwa Ụbọchị”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Na-ahụkwu Jehova na Ndị Ọzọ n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Na-agbarịtanụ Ibe Unu Ume, Karịchaa Ugbu A
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 9/98 p. 1

Mara Ụmụnna Gị

1 Bible na-akọwa ezi enyi dị ka onye na-arapara n’ahụ karịa nwanne, onye na-adịghị agbanwe n’ịhụnanya na iguzosi ike n’ihe ya, na onye na-agbatara enyi ya ọsọ enyemaka n’oge nsogbu. (Ilu 17:17; 18:24) Ụdị ndị enyi dị otú ahụ agaghị akọ anyị n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na anyị etinye mgbalị ịmara na ịhụ ibe anyị n’anya.—Jọn 13:35.

2 Anyị na-enwe ohere ndị mara mma ịmara ụmụnna anyị tupu na mgbe a gbasasịrị nzukọ. Gịnị ma ị bịa n’oge ma nọtetụkwuo aka mgbe e mesịrị ka i wee nwee ike ịnụ ụtọ mkpakọrịta ịhụnanya na nke na-akpali akpali? Chọpụta ụdị ụmụnna dị iche iche, ị ga-eso nwee mkparịta ụka, gụnyere ndị mere okenye karị bụ́ ndị nwere ahụmahụ na ndị na-eto eto ma ọ bụ ndị na-eme ihere.

3 Malite Mkparịta Ụka: Mee ihe karịrị ikele ụmụnna gị ekele efu. Ị pụrụ ịmalite mkparịta ụka site n’iso ha kerịta otu ahụmahụ i nwere n’ozi ubi, otu isi ihe na-adọrọ mmasị dị na magazin ọhụrụ, ma ọ bụ otu okwu banyere nzukọ a ka mechisịrị. Ị pụrụ ịmata ihe dị ukwuu banyere ụmụnna gị site n’ịbụ onye na-ege ntị nke ọma, na-agba ha ume ikwu okwu banyere ahụmahụ ha na ihe ndị ha na-amụta. Nanị ịjụ otú mmadụ si bịa mara Jehova pụrụ ikpughe ihe dị ukwuu. Ụfọdụ enwewo ahụmahụ ndị na-ewusi okwukwe ike ná ndụ ha, ebe ndị ọzọ na-atachi obi n’ọnọdụ dị iche iche ugbu a bụ́ ndị pụrụ isiri ọtụtụ ndị ike iche n’echiche. Ịmata nke a ga-enyere anyị aka, dị ka ezi ndị enyi, inwe mmetụta na ime ihe maka mkpa nke ndị ọzọ.

4 Meenụ Ibe Unu Enyi: Mgbe nwa ya nwụsịrị, o siiri otu nwanna nwanyị ike ịbụ abụ Alaeze ndị na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ. Ọ na-echeta, sị: “Otu oge, otu nwanna nwanyị nke nọ n’akụkụ nke ọzọ hụrụ ka m na-ebe ákwá. Ọ bịakwutere m, konye m aka, ma soro m bụọ ihe fọdụrụ n’abụ ahụ. Ejupụtara m n’ịhụnanya maka ụmụnna nwoke na nwanyị ahụ ma nwee obi ụtọ nke ukwuu na anyị jere nzukọ ndị ahụ, na-amata na ọ bụ n’ebe ahụ ka enyemaka anyị dị, n’ebe ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” Anyị kwesịrị imeta ụmụnna anyị enyi site n’inye ha nkasi obi mgbe ọ dị mkpa na ịgba ha ume n’oge nile.—Hib. 10:24, 25.

5 Ka ụwa ochie a na-atawanye akpụ, ka anyị kpebisie ike ịmara ụmụnna anyị nke ọma karị. Inyerịta ezi agbamume a ga-abụ ngọzi nye mmadụ nile.—Rom. 1:11, 12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya