Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/98 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka September

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka September
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 7
  • Izu Na-amalite September 14
  • Izu Na-amalite September 21
  • Izu Na-amalite September 28
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 9/98 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka September

Izu Na-amalite September 7

Abụ 28

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee igbe bụ́ “Aro.”

15 min: “Anyị Pụrụ Ịrụ Ọrụ Ka Ukwuu.” Ajụjụ na azịza. Gbaa mmadụ nile ume isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha maka afọ ije ozi ọhụrụ na ịrụsi ọrụ ike iji ruo ha.—Lee Ozi Anyị, peji nke 116-118.

20 min: “Ndị Ọsụ Ụzọ Na-enyere Ndị Ọzọ Aka.” Onye okenye akọwaa na tinyere ọzụzụ a na-enye n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, e mewo ndokwa ka ndị ọsụ ụzọ nyere ndị ọzọ aka n’otu n’otu n’ozi. Ọ jụọ ajụjụ dabeere n’isiokwu ma kpọọ ndị na-ege ntị òkù ịza ha, karịsịa ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa so n’ihe omume ahụ. Tụlee ụzọ a pụrụ isi nweta ihe ndị kasị mma site na ya. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ ịkọ otú ha siworo nwee ọṅụ ma rite uru site n’ikere òkè n’inyere ndị ọzọ aka. Ndị nkwusa e nyewooro aka pụrụ ikwu otú ha si nwee ekele maka ndokwa ịhụnanya a ma kwuo isi ihe ndị nyeere ha aka inwe ihe ịga nke ọma na ọṅụ ka ukwuu n’ozi.

Abụ 172 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 14

Abụ 160

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ Ọchịchị Chineke.

15 min: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Okwu. Anyị ga-amalite ịmụ broshuọ a n’izu ọzọ n’ọmụmụ akwụkwọ. Gbaa mmadụ nile ume ịkwadebe tupu oge eruo ma bịazuo n’ụbọchị nile iji mata broshuọ ahụ nke ọma ma mụta ụzọ isi soro ndị ọzọ mụọ ya. Gụpụta paragraf dị n’okpuru “Ụzọ Isi Jiri Broshuọ a Mee Ihe.” Were ihe ọmụma dị n’Ụlọ Nche, January 15, 1997, peji nke 16-17 mee ihe, iji mesie ike mkpa nke iji ajụjụ, akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche, na ihe osise ndị dị na broshuọ ahụ akụzi ihe. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị isetịpụ ezi ihe nlereanya nye ndị na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi, site n’ekwubigaghị okwu ókè nakwa n’ewebataghị ihe ndị na-adịghị n’ihe a na-amụ.—Lee Ozi Alaeze Anyị, June 1996, peji nke 3, paragraf nke 5.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ụzọ Ndụ nke Chineke’ nke 1998.” (Paragraf nke 1-16) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 10 na 11. Kwusie okwu ike ná mkpa ọ dị n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ iji nlezianya nọgide na-eji ejiji ma na-enwe àgwà ndị Kraịst anyị kwesịrị ekwesị na ilekọta ụmụaka anyị nke ọma.

Abụ 48 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 21

Abụ 122

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

20 min: “Mgbakọ Distrikti ‘Ụzọ Ndụ nke Chineke’ nke 1998.” (Paragraf nke 17-22) Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 17 na akụkụ akwụkwọ nsọ e zoro aka na ya. Kwusie okwu ike ná mkpa ọ dị ime ihe n’usoro na ichebara ndị ọzọ echiche, karịsịa n’ihe banyere ịnọdụ ala. Jiri okwu dị mkpirikpi na-atụleghachi “Ihe Ncheta Maka Mgbakọ” mechie.

15 min: “Mara Ụmụnna Gị.” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu dị n’Ụlọ Nche, October 1, 1988, peji nke 10-11. Gbaa mmadụ nile ume ibu ụzọ mee ihe iji mara ibe anyị karị.

Abụ 34 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 28

Abụ 17

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa inye akụkọ ozi maka September. Gbaa mmadụ nile ume ime atụmatụ ịrụ ọrụ ụlọ ruo n’ụlọ karị n’October iji mụbaa nkesa magazin. Zoo aka n’Ozi Alaeze Anyị nke October 1996, peji nke 8, maka aro ụzọ isi kwadebe ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. Mee ihe ngosi nke otú a pụrụ isi nyefee magazin ndị ọhụrụ. Nweta magazin maka ọrụ ngwụsị izu.

20 min: “Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onye Nlekọta Ije Ozi.” Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Mgbe ọ tụlesịrị ọrụ ya, ọ kọwaa kpọmkwem ụzọ ndị ọgbakọ pụrụ isi nye nkwado iji mụbaa ókè na ịdị irè nke ozi ahụ n’ógbè unu.

13 min: Gịnị Na-eme Mmadụ Ezi Onye Nkwusa Ọgbakọ? Okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ dịghị mkpa inwekarịsị ikike ma ọ bụ nkà; kama nke ahụ, a chọkarịsịrị ka anyị nile nwee àgwà ịdị njikere ime ihe nke na-egosipụta ịhụnanya, ịdị umeala n’obi, ịnụ ọkụ n’obi, na ekele. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ikwu ihe kpatara ihe ndị na-esonụ ji bụrụ ihe ndị a na-achọsi ike: (1) mmụọ obi ụtọ, (2) ịgachi nzukọ anya na ikere òkè na ha, (3) ịdị njikere ịnara na ịrụzu ọrụ e kenyere, (4) ịkwado ndị okenye na ndokwa ndị e mere maka ọgbakọ, (5) inwe ezi mmasị n’inyere ndị ọzọ aka, na (6) ikerechi òkè anya n’ozi ubi na inye akụkọ ozi n’egbughị oge kwa ọnwa.

Abụ 25 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya