Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/98 p. 1
  • Anyị Pụrụ Ịrụ Ọrụ Ka Ukwuu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Pụrụ Ịrụ Ọrụ Ka Ukwuu
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”
    ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • “Gaanụ Mee Ndị Mba Niile Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ M”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Iji Ọrụ n’Aka, Ọ̀ Bụ n’Ọrụ Ndị Nwụrụ Anwụ Ka Ọ̀ Bụ n’Ozi Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ịnọgidesi Ike n’Isoro Jehova Na-arụkọ Ọrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 9/98 p. 1

Anyị Pụrụ Ịrụ Ọrụ Ka Ukwuu

1 E ji ọrụ ndị dị ịrịba ama mara ozi Jisọs Kraịst. O nyere ọtụtụ puku mmadụ ihe oriri, gwọọ ọtụtụ ndị ọrịa, ma kpọlite ụfọdụ n’ọnwụ n’ụzọ ọrụ ebube. (Mat. 8:1-17; 14:14-21; Jọn 11:38-44) Ọrụ ya dọtara mmasị nke mba dum. Ma, n’uhuruchi ikpeazụ ahụ tupu ọ nwụọ, ọ gwara ụmụazụ ya na-ekwesị ntụkwasị obi, sị: “Onye na-ekwere na Mụ, ọrụ Mụ onwe m na-arụ ka onye ahụ ga-arụkwa; ọrụ ka ndị a ukwuu ka ọ ga-arụkwa.” (Jọn 14:12) Olee otú anyị pụrụ isi rụọ ọrụ ‘ka ukwuu’?

2 Site n’Ịrụzu Ókèala Ka Ukwuu: Jisọs rụrụ ọrụ nanị na Palestine, ma a gwara ndị na-eso ụzọ ya nke oge gboo ka ha gbaa àmà ‘ruo ebe ụwa sọtụrụ,’ karịa nnọọ ebe Jisọs n’onwe ya mere nkwusa. (Ọrụ 1:8) Ọrụ nkwusa ọ malitere agazuola ụwa nile ugbu a, na-eru ala 232. (Mat. 24:14) Ị̀ na-ekere òkè zuru ezu n’ịrụ ókèala e kenyere ọgbakọ unu?

3 Site n’Ijekwuru Ọtụtụ Ndị Karị: Jisọs hapụrụ mmadụ ole na ole bụ́ ndị na-eso ụzọ ịga n’ihu n’ọrụ ime nkwusa ahụ. Otú ọ dị, n’ihi àmà ha ji ịnụ n’ọkụ n’obi gbaa na Pentikọst 33 O.A., ihe dị ka puku mmadụ atọ natara eziokwu ahụ, e meekwa ha baptism. (Ọrụ 2:1-11, 37-41) Nchịkọta nke “ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi” agawo n’ihu ruo n’oge anyị, mgbe anyị na-eme nkezi nke ihe karịrị mmadụ 1,000 baptism n’otu ụbọchị. (Ọrụ 13:48) Ị̀ na-eme ihe nile i nwere ike ime iji jekwuru ndị nwere obi eziokwu n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ha na isochi mmasị a chọtara ozugbo o kwere mee?

4 Site n’ime Nkwusa Ruo Ogologo Oge Ka Ukwuu: Ozi elu ala Jisọs dịruru nanị afọ atọ na ọkara. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị anọwo na-eme nkwusa ruo ogologo oge karịrị nke ahụ. N’agbanyeghị ogologo oge a ga-ekwe ka anyị gaa n’ihu n’ọrụ a, anyị nwere ekele inyere onye ọhụrụ ọ bụla na-eso ụzọ aka ịbanye n’ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ. (Mat. 7:14) Ị̀ na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè kwa ọnwa?—1 Kọr. 15:58.

5 Anyị pụrụ ịnọgide na-enwe obi ike na site ná nkwado Jisọs, anyị ka ga-arụ ọrụ ka ukwuu dị ka ezi ndị na-eso ụzọ ya.—Mat. 28:19, 20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya