Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/98 p. 8
  • “Egbochila” Ha Ịma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Egbochila” Ha Ịma
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • New World Translation Ihe Ọtụtụ Nde Mmadụ Ji Kpọrọ Ihe n’Ụwa Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Otu Ihe Dị Ịrịba Ama Nye Ndị Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Nsụgharị Baịbụl nke Na-akpa Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Olee Otú Ị Ga-esi Mata Baịbụl A Sụgharịrị Nke Ọma?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 12/98 p. 8

“Egbochila” Ha Ịma

1 Anyị na-egosipụta ikpe ziri ezi Chineke mgbe anyị ji ịdị uchu na-ekere òkè n’ọrụ ime nkwusa. “Egbochila ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, mgbe ọ dịịrị ike aka gị ime ya,” ka Jehova na-adụ anyị n’ọdụ. (Ilu 3:27) A ghaghị ịkpọsa ihe ọmụma na-enye ndụ nke Jehova nyeworo anyị n’ụzọ bara nnọọ ụba. Ọzọkwa, n’ọnwa December na January, anyị nwere ihe ùgwù nke inyere ndị ọzọ aka inweta ihe ọmụma na-enye ndụ site n’inyefe ùkwù akwụkwọ n’ụtụ e mere ka ha dị nnọọ ala.

2 Gosi Ekele Maka Akwụkwọ Ndị Ahụ: Akwụkwọ ndị a nwere ihe ọmụma dị mkpa nke dị ndị mmadụ oké mkpa. E gosiri n’ụzọ doro anya ọchịchọ ha nwere inweta ya site ná nzaghachi ndị e nwetara mgbe anyị nyefere akwụkwọ ndị a na mbụ n’afọ a. Malite na June ruo August, e nyefere akwụkwọ dị 169,925 na Nigeria n’oge mkpọsa a pụrụ iche! Ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu bụ́ 73,375 nke akwụkwọ ndị e tinyere n’August bụ ọnụ ọgụgụ kasị elu eri 1982. Obi ekele kwesịrị ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi nyefee akwụkwọ ndị a ọzọ.

3 Ụzọ Iche Ihe n’Ihu A Tụrụ Aro Ya: “Ị̀ kwetara na n’ihi ụkpụrụ omume na-agbanwe n’ike n’ike taa nakwa n’ihi ejighị ọdịnihu anyị n’aka, na nduzi a pụrụ ịdabere na ya dị anyị mkpa ná ndụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ọ bụ ezie na ọ bụ akwụkwọ kasị mee ochie, Bible na-enye ndụmọdụ dị irè maka ịdị ndụ n’oge a nakwa maka inwe obi ụtọ ná ndụ ezinụlọ.” Mgbe ahụ sapeta isiakwụkwọ na paragraf dabara adaba n’akwụkwọ ị na-enyefe, gụpụtakwa otu paragraf ma ọ bụ abụọ. Gụọ 2 Timoti 3:16, 17. Nyefee akwụkwọ ahụ, kọwaa usoro ihe omume nke ọmụmụ Bible ebe obibi anyị na-eduzi n’efu, kwuokwa ka i gosi ya ụzọ e si amụ ya ma ọ bụrụ na oge dị. Ọ bụrụ na i chere na ọ ga-aka mma iji broshuọ Na-achọ malite ọmụmụ ihe ahụ, ị pụrụ ime nke a. Ị ga-ahụ okwu mmalite ndị ọzọ dabara adaba na peji nke 8 nke mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke June na July.

4 Ọ bụ mmadụ ole na ole na-agụ Bible, ma ya fọdụzie ịghọta ụkpụrụ ya maka ibi ndụ kwa ụbọchị. Ọ dị ha mkpa ịmata otú Okwu Chineke pụrụ isi metụta ndụ ha n’ụzọ dị mma nakwa na ịgbaso ndụmọdụ ya n’ihe banyere ịkwụwa aka ọtọ, omume ọma, na ndụ ezinụlọ pụrụ inyere ha aka ịnagide nsogbu nke taa. Ọ bụrụ na anyị egbochighị ezi ihe ná ndị ọ dịịrị, anyị ga-enwe ike inyere ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu ndị a dị mkpa. Ka anyị gosipụta ekele anyị nwere maka ihe ùgwù a magburu onwe ya site n’iji ịnụ n’ọkụ n’obi nyefee akwụkwọ ndị a na December.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya