Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/99 p. 2-3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 1/99 p. 2-3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na January: Nnyefe pụrụ iche nke ùkwù akwụkwọ nwere akwụkwọ abụọ maka ₦40 na nke nwere akwụkwọ anọ maka ₦80 bụ́ ndị a ga-eme ọda ha site n’alaka dị ka a kọwapụtara n’akwụkwọ ozi anyị nke March 23, 1998. February: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla meworo ochie karị e nwere nke nwere peji dị 192. March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Akwụkwọ ọzọ a pụrụ inyefe: Akwụkwọ ọ bụla ọzọ nwere peji dị 192 n’ụtụ a na-enyefe ya. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! Nweenụ broshuọ Na-achọ ka ndị nwere mmasị nwee ike inweta ya, gbalịakwa ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.

◼ A ga-enye ndị nkwusa nile e mere baptism nọ ná Nzukọ Ije Ozi n’izu January 4 kaadị Advance Medical Directive/ Release na Identity Card maka ụmụ ha.

◼ Na-amalite na February, n’agafeghịkwa March 1, okwu ihu ọha ọhụrụ maka ndị nlekọta sekit ga-abụ “Ruo Ókè Ha Aṅaa Ka Chineke Dị Adị n’Ezie Nye Gị?”

◼ Ọgbakọ nile kwesịrị ime ndokwa maka ime Ememe Ncheta nke afọ a na Thursday, April 1, mgbe anyanwụ dasịrị. Ọ bụ ezie na okwu pụrụ ịmalite n’oge karị, mbugharị nke ihe nnọchianya Ememe Ncheta ekwesịghị ịmalite ruo mgbe anyanwụ dasịrị. Mee nchọpụta n’ógbè unu iji mara mgbe anyanwụ ji ada n’ógbè unu. Ọ bụ ezie na ọ ga-adị mma ka ọgbakọ ọ bụla mee Ememe Ncheta nke ya, ọ pụrụ ịbụ na nke a agaghị ekwe omume mgbe nile. N’ebe ọtụtụ ọgbakọ na-eji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ma eleghị anya otu ọgbakọ ma ọ bụ karị pụrụ inweta ihe owuwu ọzọ iji mee ihe n’uhuruchi ahụ. N’ebe o kwere omume, anyị ga-atụ aro ka e nwee minit 40 ma ọ dịkarịa ala mgbe e mesịrị ihe omume tupu a malite ihe omume ọzọ iji nwee ohere maka ikele ndị ọbịa, ịgba ndị ọhụrụ nwere mmasị ume, na iji rite uru zuru ezu site n’ememe ahụ. E kwesịkwara ichebara nsogbu nke ngafe na ndọba ụgbọala echiche, gụnyere ibula na iburu ndị mmadụ. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa ndị ga-akasị mma n’ógbè ha.

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 1999 na Sunday, April 18. Isiokwu ya ga-abụ “Isoro Chineke na Ndị Agbata Obi Nwee Ezi Ọbụbụenyi.” A ga-enye ihe ndepụta. Ọgbakọ ndị onye nlekọta sekit na-eleta, ndị nwere mgbakọ sekit, ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-enwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị inwe okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu April 18, 1999.

◼ Na-amalite na February 1, 1999, a ga-atụle broshuọ ahụ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya