Nzukọ Ije Ozi Maka January
Izu Na-amalite January 4
Abụ nke 36
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Ọ bụrụ na oge nzukọ unu gbanwere na January 1, chetara mmadụ nile ka ha jiri mpempe akwụkwọ e ji akpọ òkù nke nwere ndokwa ọhụrụ ahụ. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.”
10 min: “Abụla Ndị E Kekọtara n’Ụzọ Na-ahaghị Nhata.” Okwu onye okenye ga-ekwu, na-adabere n’Ụlọ Nche nke November 15, 1995, peji nke 31.
20 min: Kaadị Advance Medical Directive/Release. A gbasasịa nzukọ a, a ga-enye Ndịàmà e mere baptism kaadị ọhụrụ, ndị nwekwara obere ụmụaka a na-emebeghị baptism ga-anata otu Identity Card maka nwatakịrị ọ bụla. A gaghị edejupụta kaadị ndị a n’uhuruchi a. E kwesịrị iji nlezianya dejupụta ha n’ụlọ ma A GAGHỊ abịanye aka na ha. Ịbịanye aka, ịgba akaebe, na ide ụbọchị n’ime kaadị nile ga-abụ ma a gbasasịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ, n’okpuru nduzi nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ. Tupu a na-abịanye aka na ha, jide n’aka na e dejupụtasịrị kaadị ndị ahụ. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị n’ezie ịhụ onye nwe kaadị ahụ mgbe ọ na-abịanye aka na ya. Site n’ime ka okwu sitere na kaadị a daba n’ọnọdụ na ihe ha kwenyere, ndị nkwusa a na-emebeghị baptism pụrụ idejupụta okwu nduzi nke ha bụ́ nke ha na ụmụ ha ga-eji na-eme ihe. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị inwe ihe ndekọ iji jide n’aka na ndị nile nọ n’ìgwè ha nwetara enyemaka dị ha mkpa iji dejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release. Iji nweta nchebe iwu kasị mma, e kwesịrị idejupụta kaadị a. Ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke August 1994, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Nzọụkwụ Mbụ Ndị Dị Oké Mkpa—Ì Wereworị Ha?” paragraf nke 8 na 9 na-ekwu, sị: “Hụ na mmadụ nile na-eji kaadị ndị a MGBE Ọ BỤLA. Lee ma ụmụ gị ha jikwa ha tupu ha ejee akwụkwọ kwa ụbọchị, ee, ọbụna tupu ha ejee ebe a na-egwuri egwu. Anyị nile kwesịrị ijide n’aka na anyị ji kaadị ndị a n’ebe anyị na-arụ ọrụ, mgbe anyị nọ n’ezumike, ma ọ bụ ná mgbakọ ndị Kraịst. Ya adịkwala mgbe ị na-ejighị ha! “Chee echiche ihe pụrụ ime gị ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ dị oké njọ mgbe i rutere n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede nke ụlọ ọgwụ, n’amaghị onwe gị na/ma ọ bụ n’enweghị ike ikwuchitere onwe gị. Ọ bụrụ na i jighị kaadị ahụ, e nweghịkwa onye ikwu ma ọ bụ okenye ruteworo n’ụlọ ọgwụ ikwuchitere gị, e wee kpebiekwa na ‘ọbara dị gị mkpa,’ ma eleghị anya a ga-amịnyere gị ọbara. N’ụzọ dị mwute, nke a emewo ụfọdụ ndị. Ma mgbe anyị nwere akwụkwọ ahụ, ọ na-ekuwuchitere anyị, na-egosipụta uche anyị.” Ọtụtụ ndị dọkịta na-ekwenyere anyị nọ na Nigeria ugbu a na-akwanyere kaadị Medical Directive/Release ùgwù. Ha na-arịọ ka ụmụnna anyị na-eji kaadị ahụ iji mee ka a mara ndị ha bụ ọbụna mgbe e nwere ọnodụ mberede.
Abụ nke 61 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 11
Abụ nke 88
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwapụta ndokwa maka ozi ubi na January.
20 min: Ị̀ Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị? Okwu nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kwa afọ Society na-ewepụta akwụkwọ nta bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ. Ùnu na-eji mbipụta a na-eme ihe n’ụzọ dị mma n’otu n’otu ma ọ bụ dị ka ìgwè ezinụlọ? Kọwaa ihe ndị mere o ji baa uru na anyị kwesịrị ịtụle akụkụ akwụkwọ nsọ nke dịịrị ụbọchị ọ bụla. Tụlee ihe ndị e kwuru n’okwu nkọwa nke Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—1999, peji nke 3-4. Kpọọ ndị nkwusa òkù ịkọ mgbalị pụrụ iche ha na-eme n’otu n’otu na dị ka ezinụlọ iji na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị na nkọwa ya kwa ụbọchị.
15 min: “Na-atachinụ Ogologo Ntachi Obi.” Nkwurịta okwu nke ndị òtù ezinụlọ ga-enwe. Ha atụlee ụzọ ndị ha pụrụ isi tachikwuo obi n’ozi ha. Gụnye okwu ndị dabara adaba sitere n’Ụlọ Nche nke June 15, 1995, peji nke 12.
Abụ nke 135 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 18
Abụ nke 169
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
10 min: Mkpa ọgbakọ.
10 min: “Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Ndị Nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.” Okwu nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ bụ́ ezi ihe nlereanya ga-ekwu, bụ́ onye ga-atụleghachi ọrụ ya. O gosi otú ọrụ dị otú ahụ si atụnye ụtụ n’ọganihu na ọdịmma ime mmụọ nke ọgbakọ. Gụnye okwu ndị bụ́ isi sitere ná Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, peji nke 44-46, 74-76.
15 min: “Ịmalite Ọmụmụ Ihe na Broshuọ Na-achọ.” Ntụle ajụjụ na azịza.
Abụ nke 197 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite January 25
Abụ nke 201
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
20 min: “Site n’Ọnụ Ụmụ Ọhụrụ.” Okwu nke onye okenye ga-ekwu, na-adabere n’Ụlọ Nche nke January 1, 1995, peji nke 24-26.
15 min: “Mgbanwe n’Awa Ole A Chọrọ n’Aka Ndị Ọsụ Ụzọ.” Okwu onye okenye ga-ekwu. Jaa ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ mma, gbaakwa ọtụtụ ndị nkwusa ume ịmalite ozi ọsụ ụzọ inyeaka na nke oge nile, na-eburu n’uche ijekwu ozi n’ọnwa March, April, na May. Gụnye ihe ọmụma sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke February 1997 na July 1998.
Abụ nke 225 na ekpere mmechi.