Mgbanwe n’Awa Ole A Chọrọ n’Aka Ndị Ọsụ Ụzọ
1 Anyị nile nwere ekele inwe ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke inyeaka na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ. Ọbụna n’ebe e nwere ntakịrị ókèala, a na-arụzukwa ya nke ọma mgbe nile, ndị ọsụ ụzọ esetịpụwo ezi ihe nlereanya site n’ozi Alaeze ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eje. Ha agbawo ndị nkwusa nile ume ịnọgide na-arụ ọrụ n’ịchọ ndị “obi ha ziri ezi.”—Ọrụ 13:48, NW.
2 Society ahụwo ihe isi ike na-arị elu ndị ọsụ ụzọ na-eche ihu, karịsịa n’ihe banyere inweta ọrụ ego nwa oge nke ga-enye ha ohere igbo mkpa ha nke ọma iji nọgide n’ozi oge nile. Ọnọdụ akụ̀ na ụba e nwere ugbu a n’ọtụtụ ala emewokwa ka o siere ndị ọzọ ike karị ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ, n’agbanyeghị na nke ahụ bụ ọchịchọ obi ha. N’ọnwa ndị na-adịbeghị anya, e jiriwo nlezianya tụlee ihe ndị a na ihe ndị ọzọ.
3 N’ihi ya, n’ihi ihe ahụ e kwuru n’elu, Society egbubilatawo awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke inyeaka. Malite n’afọ 1999, ihe a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile ga-abụ awa 70 kwa ọnwa, ma ọ bụ ngụkọta nke awa 840 maka otu afọ. Ihe a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ inyeaka kwa ọnwa ga-abụ awa 50. Awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị ozi ala ọzọ ka dịkwa otú ọ dị, ebe Society na-enyere ha aka igbo mkpa anụ ahụ ha ndị bụ́ isi. N’ụzọ dị otú a, ha pụrụ ilekwasị anya n’ụzọ zuru ezu karị n’ọrụ ha nke ime nkwusa na ndị na-eso ụzọ.
4 A na-enwe olileanya na mgbanwe a e nwere n’awa ole a chọrọ ga-enyere ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ aka ijigide ihe ùgwù ije ozi a dị oké ọnụ ahịa. O kwesịrị imeghere ọtụtụ ndị nkwusa ohere iwere ọrụ ọsụ ụzọ oge nile na nke inyeaka. Lee ngọzi nke a kwesịrị ịbụrụ onye ọ bụla n’ime ọgbakọ!