Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/99 p. 3-4
  • Ohere Ịsụ Ụzọ Ò Megheworo Gị Ugbu A?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ohere Ịsụ Ụzọ Ò Megheworo Gị Ugbu A?
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ànyị Ga-eme Ya Ọzọ?—Òkù Ọzọ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Ozi Ọsụ Ụzọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—1998
  • A Chọrọ—Ndị Ọsụ Ụzọ Inyeaka 30,000
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 8/99 p. 3-4

Ohere Ịsụ Ụzọ Ò Megheworo Gị Ugbu A?

1 Isiokwu anyị dịịrị afọ maka 1999 na-echetara anyị na anyị ka nọ ‘n’ụbọchị nzọpụta’ Jehova. (2 Kọr. 6:2) Ma ụbọchị nzọpụta ya ga-agwụsị n’oge na-adịghị anya. Mgbe ahụ “ụbọchị ikpe” ya ga-amalite. (2 Pita 2:9) Ka Jehova nọgidere na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ohere maka nzọpụta, lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịhụ ka ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị mmadụ na-anakwere ya!

2 Ndị Jehova emeriwo ihe ịma aka nke ijekwuru ndị na-aṅa ntị tupu oge agabiga. Nye ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze, nke a apụtawo ịbanye ozi ọsụ ụzọ. Ohere ịsụ ụzọ ò megheworo gị ugbu a? Gịnị mere anyị ji na-ajụ?

3 Ekele E Gosipụtara: Dị ka a mara ọkwa ya n’Ozi Alaeze Anyị nke January 1999, e gbubilatawo awa ole a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile na ndị ọsụ ụzọ inyeaka. Iji rụtazuo awa ọhụrụ ahụ a chọrọ n’aka ha, ọ dị ndị ọsụ ụzọ oge nile mkpa itinye awa 70 n’ozi kwa ọnwa iji nweta ngụkọta nke awa 840 maka afọ ije ozi ọ bụla. Ndị ọsụ ụzọ inyeaka ga-etinye awa 50 n’ozi kwa ọnwa. Ndị a bụ ole na ole n’ime ọtụtụ okwu ekele ndị a natara n’ihi mgbanwe ndị a:

“Lee onyinye na-enye obi ụtọ sitere n’aka Nna anyị nke eluigwe ọ bụ!”

“Ọ dịghị okwu pụrụ ịkọwa mmetụta ọṅụ, ịhụnanya, na ekele m nwere maka ndokwa a!”

“Ọ ga-eme ka usoro ihe omume anyị ka nnọọ mfe igbaso!”

“Ekpere anyị bụ ka ọtụtụ ndị ọzọ malite ozi oge nile ugbu a ma nweta ngọzi ndị na-abịa site n’ijere Jehova ozi n’ụzọ dị ukwuu.”

4 Ka anyị na-abịaru njedebe nke ụbọchị nzọpụta nke Chineke nso, o doro anya na Jehova chọrọ ka ndị ya jiri olu dara ụda tie mkpu otuto ikpeazụ. Ịdị ukwuu na ịdị ike nke ozi na-arị elu (1) site ná mmụba na-aga n’ihu nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na (2) site n’onye ọ bụla ịchọ ịmụba ihe o nwere ike ime n’ime nkwusa Alaeze. Jehova, bụ́ onye “na-eme ka ọ na-aba ụba,” emewo ka e nwee ihe ịga nke ọma n’ụzọ abụọ ahụ site n’ịgọzi mmụọ afọ ofufo nke ndị nile nakwereworo nzọpụta.—1 Kọr. 3:6, 7; Abụ Ọma 110:3.

5 Anarala Ya n’Efu: Ọ bụ banyere ụbọchị nzọpụta Jehova ka Pọl dụrụ ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Ma, dị ka ndị anyị na Ya [Jehova] na-arụkọ ọrụ, anyị na-arịọkwa unu ka unu ghara ịnara amara Chineke n’efu.” Anyị agaghị ‘anara ya n’efu’ ma ọ bụrụ na anyị ahụ nke a dị ka “oge a na-anara mmadụ nke ọma” iji ohere ọ bụla dapụtaranụ rụọ ọrụ maka ịzọpụta ndị ọzọ. (2 Kọr. 6:1, 2) Taa, okwu Pọl chọrọ ime ihe ngwa ngwa karị. Ndị Kraịst nwere ịhụnanya n’ebe Jehova nọ na-ewe ya dị ka ihe ùgwù ikere òkè zuru ezu ruo ókè o kwere ha mee n’ozi ahụ o kenyeworo ha. Ì nwere ike ugbu a ikerekwu òkè n’ụzọ zuru ezu n’ozi ahụ dị ka ọsụ ụzọ oge nile?

6 Ọ Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ezi Uche Dị na Ya: Na Nigeria, ọ bụ ihe mgbaru ọsọ anyị ịhụ na mmadụ 25,000 denyere aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile ka ọ na-erule September 1. Anyị kwere na nke a bụ ihe mgbaru ọsọ ezi uche dị na ya ma bụrụ nke aka ga-eru. N’ihi gịnị ka obi ji sie anyị ike otú a? Na March 1997 anyị hụrụ ka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị dị 19,218 rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka, n’April 1998 kwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 17,000 mere otú ahụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nyere awa 60—bụ́ nke ji nanị awa 10 dị ala n’awa ọhụrụ a chọrọ n’aka ndị ọsụ ụzọ oge nile! Ọ bụrụgodị na nanị mmadụ 4,000 n’ime ndị ahụ rụworo ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka edenye aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile tupu ọgwụgwụ nke afọ ije ozi a, anyị pụrụ iji ndị ọsụ ụzọ oge nile dị 25,000 ma ọ bụ karịa malite na September!

7 Ọ Dị Mkpa Inwe Usoro Ihe Omume: Ịrụtazu awa 70 n’ozi ubi kwa ọnwa ọ̀ ka dịtụ gị ka ihe ị na-agaghị emeli? Ikekwe iche echiche ịrụtazu awa 17 kwa izu ga-enye aka. N’iji usoro ihe omume ihe atụ dị na peji na-esonụ eme ihe, gbalịa idepụta usoro ihe omume ọsụ ụzọ oge nile ga-ekwekọ n’ọnọdụ gị. N’ịhazi ya, soro ndị ọsụ ụzọ nwere ahụmahụ kwurịta okwu iji nụ echiche ha n’ụzọ ha si ahazi ozi ọsụ ụzọ ha ikwekọ n’ibu ọrụ onwe onye na nke ezinụlọ ha. Jụọ onye nlekọta sekit unu otú ndị ọsụ ụzọ nọ na sekit unu si edokwa ozi ha kwa izu. Mgbe ahụ lekwasị Jehova anya ịgọzi atụmatụ ị na-eme ịsụ ụzọ.—Ilu 16:3.

8 Mee Ya Atụmatụ Ezinụlọ: Ị̀ tụlewo ime ịsụ ụzọ atụmatụ ezinụlọ? Unu pụrụ ịnọdụ ala dị ka ezinụlọ ma kwurịta otú—site n’iji nlezianya eme atụmatụ na site n’imekọrịta ihe ọnụ nke ọma—otu n’ime ndị òtù ezinụlọ unu ma ọ bụ abụọ pụrụ isi nwee ike ịsụ ụzọ. N’ụzọ kwere nghọta, ụfọdụ ga-achọpụta na ọnọdụ ha nke e ji obi eziokwu tụlee enyeghị ha ohere maka ịsụ ụzọ oge nile ugbu a. Ọ bụrụ otú ahụ, setịpụ ịsụ ụzọ dị ka ihe mgbaru ọsọ maka ọdịnihu. Ma malite ime atụmatụ iji wepụta otu oge kpọmkwem ị ga-amalite ịsụ ụzọ. Ikekwe ị pụrụ ịsụ ụzọ inyeaka ọtụtụ mgbe n’afọ iji jiri nwayọọ nwayọọ ruo ihe mgbaru ọsọ nke ozi ọsụ ụzọ oge nile.

9 Ihe karịrị ndị ọsụ ụzọ 22,000 aha ha dị n’akwụkwọ na Nigeria nwere ọnọdụ dịgasị iche. Ọ bụghị ha nile nwere ezi ahụ ike, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwekwara ezinụlọ na ibu ọrụ ha bu n’ụzọ ego. Ụfọdụ akatawo ahụ, ebe ndị ọzọ ka bụ ndị ntorobịa ma bụrụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Ọtụtụ bụ ụmụnna nwoke bu ibu ọrụ ọgbakọ na nke ezinụlọ. Ndị a nile ‘na-azụchapụta oge’ maka ịsụ ụzọ, nke pụtara ọtụtụ mgbe ibi ndụ dị mfe ma ka nwee afọ ojuju.—Kọl. 4:5.

10 Ọ̀ Dị Gị Mkpa Ime Ka Ihe Dị Mfe? Ime ka ndụ gị dị mfe pụrụ ịbụ ihe ga-emeghere gị ohere nke ịsụ ụzọ. Ndụ gị ọ̀ dị ka ụlọ buru ibu nke nwere ọnụ ụlọ na ngwongwo ndị na-adịghị mkpa, bụ́ ndị chọrọ nnukwu oge, ego na ọrụ iji lekọta ha? Ọ bụrụ otú ahụ, ịgbanwe gaa n’ọnọdụ katụ mfe pụrụ inye ohere maka ịsụ ụzọ. Ị̀ pụrụ igbubilata oge ị na-eji arụ ọrụ ego? Ị̀ pụrụ ịzụchapụta oge site n’ọrụ na-adịghị mkpa ma ọ bụ nwee nguzozi ka ukwuu n’oge ị na-eji atụrụ ndụ?

11 Bible na-adụ anyị ọdụ na 1 Timoti 6:8, sị: “Ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.” Ịbụ ndị afọ juru n’ihe dị nta bụ ihe dị mkpa n’ime ike anyị nile n’ozi anyị na-ejere Jehova, ọ na-emekwa ka ọ dị mfe karị ibute ọdịmma ime mmụọ ụzọ. (Mat. 6:22, 33) Na peji nke 104 nke 1998 Yearbook n’akụkọ banyere Japan, a tụrụ ọtụtụ aro n’ihe mere e ji nwee nnọọ ezi mmụọ ịsụ ụzọ n’ala ahụ. Tụlee otu: “Ọ bụ eziokwu n’ozuzu ya na ndị Japan adịghị akwakọju ihe n’ụlọ ha, n’ụzọ dị otú a ọ na-ewe ntakịrị oge iji lekọta ha, n’ụzọ kakwa ukwuu, ha na-emekarị ka ndụ ha dị mfe.” Ọ̀ bụ na nke ahụ abụghị ihe 1 Timoti 6:8 pụtara?

12 Gburugburu ụwa, ndị ohu Chineke na-ekwusasi ozi ọma ahụ ike karị tupu ụbọchị nzọpụta Jehova agwụsịa. Ọ bụ ihe ịja mma na n’afọ gara aga ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nkezi mmadụ 700,000 keere òkè n’otu ụdị nke ozi ịsụ ụzọ kwa ọnwa. Ị̀ pụrụ ime mgbanwe ná ndụ gị iji sonyere ha? Anyị na-agba gị ume iji nlezianya na ekpere tụlee ọnọdụ gị ka ị na-aza ajụjụ bụ́: “Ohere ịsụ ụzọ ò megheworo gị ugbu a?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 3]

IHE MGBARU ỌSỌ: NDỊ ỌSỤ ỤZỌ OGE NILE 25,000!

Igbe ndị dị na peeji nke 4]

Usoro Ihe Omume Ihe Atụ Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Oge Nile

Ihe a chọrọ: awa 17 kwa izu

Otu Ụbọchị n’Ime Izu na Ngwụsị Izu

Ụbọchị Awa

Friday 8

Saturday 6

Sunday 3

Ngụkọta Awa: 17

Ụbọchị Abụọ n’Ime Izu na Saturday

Ụbọchị Awa

Tuesday 7

Thursday 7

Saturday 3

Ngụkọta Awa: 17

Ụbọchị Atọ n’Ime Izu na Sunday

Ụbọchị Awa

Monday 5

Wednesday 5

Friday 5

Sunday 2

Ngụkọta Awa: 17

Uhuruchi Abụọ na Ngwụsị Izu

Ụbọchị Awa

Monday 3

Wednesday 3

Saturday 8

Sunday 3

Ngụkọta Awa: 17

Depụta Usoro Ihe Omume nke Gị Maka Ndị Ọsụ Ụzọ Oge Nile

Ụbọchị Awa

Monday

Tuesday

Wednesday

Thursday

Friday

Saturday

Sunday

Ngụkọta Awa: 17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya