Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 3 ruo August 23, 1999. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ọ dịghị mkpa na ndị mụrụ ụmụ ga-emebi ụkpụrụ Bible iji wee mesoo ụmụ ha ihe n’ụzọ ezi uche dị na ya. [fy p. 108 para. 14]
2. Akwụkwọ Bible bụ́ Jenesis na-akpali inwe okwukwe na Jehova na olileanya n’ebe “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa nke ga-eweta ngọzi nọ. (Jen. 3:15) [w83 7/15 p. 27 para. 11]
3. Ọpụpụ abachaghị uru na narị afọ nke 20. [w83 11/15 p. 24 para. 3]
4. Ndị ogbenye ọnụ ntụ apụghị inye ego iji kwalite ọdịmma Alaeze. [w97 9/15 p. 5 para. 8]
5. Inyeghachi ndị nne na nna na ndị nne na nna ochie ihe bụ akụkụ nke ofufe anyị na-efe Jehova. (1 Tim. 5:4) [w97 9/1 p. 4 para. 1-2]
6. Ná mmalite, idebe Ụbọchị Izu Ike bụ ihe ịrịba ama dị n’etiti Jehova na mba nile. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee rs-E p. 345 para. 3.]
7. Mgbe nwatakịrị toruru ịmalite imere onwe ya mkpebi, ọ na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ibu ọrụ ka ukwuu maka ihe ndị ọ na-eme, karịsịa n’ihe banyere iwu Chineke. (Rom 14:12) [fy p. 135 para. 17]
8. Mosis dere akwụkwọ Levitikọs n’afọ 1513 T.O.A. [w84 2/15 p. 27 para. 2]
9. Okwu Jisọs ndị e dekọrọ na Luk 21:20, 21 mezuru na 66 O.A. mgbe ndị agha Rom si na Jerusalem pụọ n’okpuru idu ndú Ọchịagha Titus. [w97 4/1 p. 5 para. 3-4]
10. Ozizi Epicurus dị ize ndụ nye ndị Kraịst n’ihi na ọ dabeere n’echiche ya nke enweghị okwukwe, nke a kọwara ná 1 Ndị Kọrint 15:32. [w97 11/1 p. 24 para. 4]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Gịnị ka anyị na-amụta site ná mmachibido a machibidoro iri abụba bụ́ nke e kwuru na Levitikọs 3:17? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84 2/15 p. 29 para. 3.]
12. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo kwere ka Setan bụ́ Ekwensu dịrị ndụ? (Ọpụ. 9:15, 16) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 3/15 p. 10 para. 14.]
13. Mgbe onye òtù ezinụlọ na-arịa ajọ ọrịa, ihe ndị dị aṅaa ka o kwesịrị ka ezinụlọ ahụ buru ụzọ mee iji hazie ihe n’usoro? (Ilu 15:22) [fy p. 122 para. 14]
14. N’echiche dị aṅaa ka mba Israel bụ “alaeze ndị nchụàjà”? (Ọpụ. 19:6) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 7/1 p. 16 para. 8.]
15. Gịnị bụ ọdịiche dị n’etiti anya ‘na-ele otu ebe’ na nke “jọrọ njọ”? (Mat. 6:22, 23) [w97 10/1 p. 26 para. 5]
16. Olee otú a pụrụ isi kwuo banyere Devid dị ka onye jegharịrị “n’izu okè nke obi, na n’izi ezi” ebe o hiere ụzọ? (1 Eze 9:4) [w97 5/1 p. 5 para. 2]
17. Ihe ùgwù ndị dị aṅaa n’oge a ka omume ụmụ Israel mere “otú a” n’ihe banyere ụlọikwuu ahụ sere onyinyo ha? (Ọpụ. 39:32) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 12/15 p. 13 para. 9.]
18. Gịnị ka eziokwu bụ́ na Jehova kpughere onwe ya dị ka “Abụ m ihe m bụ” na-egosi? (Ọpụ. 3:14) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95-IB 3/1 p. 10 para. 6.]
19. Olee ihe mmụta dị n’ihe ahụ mere Nedab na Abaịhu bụ́ nke e dekọrọ na Levitikọs 10:1, 2? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84 2/15 p. 29 para. 4.]
20. N’okpuru Iwu Mosis, n’ihi gịnị ka ịmụ nwa ji eme ka nwanyị bụrụ onye ‘rụrụ arụ’? (Lev. 12:2, 5) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w84 2/15 p. 29 para. 6.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi okwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Ọ bụ ezie na e nweghị ọgwụgwọ ọrụ ebube maka owu ọmụma, nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ nwa pụrụ iji ume sitere n’aka _________________________ nagide ya, bụ́ nke a na-enweta site n’ịrịọ _________________________ mgbe nile. (1 Tim. 5:5) [fy p. 112 para. 21]
22. Ọdachi mere ná ndụ mmadụ pụrụ ịbụ n’ihi _________________________ ma ọ bụ n’ihi _________________________ nke anyị. [w97 5/15 p. 22 para. 7]
23. Akwụkwọ Ọpụpụ na-eme ka a mata Jehova dị ka _________________________ na _________________________ na _________________________ ukwu. [w83 11/15 p. 27 para. 9-11]
24. Ọ bụ n’ụzọ bụ́ isi ihe anyị bụ mgbe anyị nọ _________________________, ọ bụghị _________________________, na-ekpughe ihe anyị bụ n’ime n’ezie. [w97 10/15 p. 29 para. 4]
25. Ọ bụrụ na ememe owuwe ihe ubi na-enye echiche _________________________ ma ọ bụ _________________________, ezi ndị Kraịst pụrụ izere ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova site n’ịjụ _________________________ n’ụdị ofufe ahụ e merụrụ emerụ. [w97 9/15 p. 9 para. 6]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. ‘Narị afọ anọ’ nke mweda n’ala nke mkpụrụ Abraham malitere mgbe Ishmael chịrị Aịsak ọchị n’afọ (1943; 1919; 1913) T.O.A. ma gwụsịa mgbe a napụtara ha n’Ijipt n’afọ (1543; 1519; 1513) T.O.A. (Jen. 15:13) [w83 7/15 p. 26 para. 13-14]
27. Ma ezinụlọ ọ̀ na-anagide ajọ ọrịa nke ọma ma ọ bụ na ọ dịghị anagide ya dabeere n’ụzọ dị ukwuu (n’ego; n’àgwà; n’akwụkwọ inshọransị) nke ndị nọ na ya. (Ilu 17:22) [fy p. 120 para. 10]
28. A na-akpọ onye na-asị n’obi ya “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị,” “onye nzuzu” n’ihi na onye ahụ (enweghị omume ọma; agụghị akwụkwọ; enweghị ike iche echiche). (Abụ Ọma 14:1) [w97 10/1 p. 6 para. 8]
29. Mgbe Adam na Iv nupụrụ isi, ihe kasị mkpa ha tụfuru bụ (izu okè ha; mmekọrịta ha na Chineke; ebe obibi ha bụ́ ubi), nke bụ́ isi ihe na-ewetara ha obi ụtọ. [w97 10/15 p. 6 para. 2]
30. Akwụkwọ (Jenesis; Ọpụpụ; Levitikọs) kwuru ugboro ugboro banyere ihe ndị a chọrọ maka ịdị nsọ. [w84 2/15 p. 27 para. 1]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ọpụ. 5:2; Ọpụ. 21:29; Ilu 1:8; Gal. 5:20; Jes. 1:14, 15
31. A pụrụ ịchụpụ onye ọ bụla na-azọrọ ịbụ onye Kraịst nke na-adaba ugboro ugboro n’ọnụma ime ihe ike, gụnyere iti ndị ezinụlọ ya ihe n’enweghị nchegharị, n’ọgbakọ. [fy p. 150 para. 23]
32. Ụzọ anyị si akpa àgwà na-amalite n’ụzọ anyị si eche echiche. [fy p. 148 para. 18]
33. Jehova Chineke na-ewetu ndị nile jụwapụrụ isi ịsọpụrụ ịbụ Chineke ya ala. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w92 12/15 p. 13 para. 18.]
34. Ọ bụ ezie na Bible na-ekenye nna ibu ọrụ bụ́ isi nke izi ụmụaka ihe, nne nwekwara òkè dị mkpa ikere. [fy p. 133 para. 12]
35. Iwu ahụ enyeghị ohere maka iji akpachapụghị anya mere ihe nzọrọ maka ebere mgbe e gburu mmadụ. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 11/15 p. 11 para. 5.]