ISI NKE IRI
Mgbe Onye Òtù Ezinụlọ Na-arịa Ọrịa
1, 2. Olee otú Setan si jiri ọdachi na ọrịa nwaa imebi nguzosi ike n’ezi ihe nke Job?
AGHAGHỊ nnọọ ịgụnye nwoke ahụ bụ Job ná ndị nwere ndụ ezinụlọ obi ụtọ. Bible kpọrọ ya onye “dị ukwuu karịa ụmụ Ihu anyanwụ nile.” O nwere ụmụ ndị ikom asaa na ndị inyom atọ, ụmụ iri ná ngụkọta. O nwekwara ihe iji gboo mkpa ezinụlọ ya nke ọma. Nke kasịnụ, o butere ụzọ n’ihe omume ime mmụọ dị iche iche, o nwekwara nchegbu banyere nguzo ụmụ ya n’ihu Jehova. Ihe a dum kpatara nkekọ chiri anya na nke obi ụtọ ezinụlọ.—Job 1:1-5.
2 Ọnọdụ Job agafeghị anya Setan, onye isi ndị iro Jehova Chineke. Setan, onye na-anọgide na-achọ ụzọ isi mebie nguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ohu Chineke, wakporo Job site n’ibibi ezinụlọ obi ụtọ ya. Mgbe ahụ, o “[weere] ihe ofifi ọjọọ tie Job, site n’ọbụ ụkwụ ya ruo opu n’isi ya.” Otú a Setan tụrụ anya iji ọdachi na ọrịa mebie nguzosi ike n’ezi ihe Job.—Job 2:6, 7.
3. Olee ihe mgbaàmà dị iche iche nke nrịanrịa Job?
3 Bible enyeghị nkọwa nkà ọgwụ na ahụ ike nke ihe otiti Job. Ma, ọ gwara anyị ihe mgbaàmà ya gasị. Ikpuru juru ya ahụ, akpụkpọ ahụ ya kpọsịkwara nkụ ma rekasịa. Ume Job na-eku na-asọ oyi, anụ ahụ ya na-esikwa ísì ọjọọ. Ahụ nile na-egbu ya mgbu. (Job 7:5; 19:17; 30:17, 30) N’oké ahụ ụfụ Job nọdụrụ n’ikpo ntụ ma jiri ejùjù akọ onwe ya ọkọ. (Job 2:8) Ọ bụ n’ezie ihe na-agba anya mmiri!
4. Olee ahụmahụ ezinụlọ ọ bụla na-enwe site n’oge ruo n’oge?
4 Olee otú ị ga-esi meghachi omume ma ọ bụrụ na ajọ ọrịa dị otú ahụ dakwasịrị gị? Taa, Setan adịghị eti ndị ohu Chineke ọrịa dị ka o mere Job. Ma, n’ihi ezughị okè mmadụ, nrụgide nile nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị, na ọnọdụ gburugburu ebe obibi na-eretọ eretọ nke anyị bi n’ime ya, a gaje ịtụ nnọọ anya na site n’oge ruo n’oge, ndị òtù ezinụlọ ga-ada ọrịa. N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị anyị pụrụ ime, anyị nile na-ada ọrịa, ọ bụ ezie na ole na ole ga-ataru ahụhụ n’ókè Job tara. Mgbe ọrịa wabatara n’ezinụlọ anyị, ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka n’ezie. Ya mere ka anyị tụlee ụzọ Bible si enyere anyị aka ịnagide onye iro a na-adị mgbe nile nke ihe a kpọrọ mmadụ.—Eklisiastis 9:11; 2 Timoti 3:16.
OLEE MMETỤTA GỊ BANYERE YA?
5. Olee otú ndị òtù ezinụlọ na-esikarị emeghachi omume n’ọnọdụ ọrịa na-adịru nwa oge?
5 Mkpaghasị nke usoro e ji ebi ndụ, n’agbanyeghị ihe kpatara ya, na-esi ike mgbe nile, nke a bụkwa eziokwu karịsịa ma ọ bụrụ na ọrịa na-adịte anya kpatara mkpaghasị ahụ. Ọbụna ọrịa nwa oge na-achọ mgbanwe dị iche iche, nnabata ihe dị iche iche, na ịchụ àjà dị iche iche. Ọ pụrụ ịdị ndị òtù ezinụlọ nwere ahụ ike mkpa ịnọ jụụ ka onye nke na-arịa ọrịa wee zuo ike. Ọ pụrụ ịdị mkpa ka ihe omume ụfọdụ kwaa ha. Otú ọ bụla o si dị, n’ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ezinụlọ nile, ọbụna ụmụntakịrị na-enwe ọmịiko maka nwanne ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna nke na-arịa ọrịa, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịdị mkpa mgbe mgbe ka e chetara ha ichebara ya echiche. (Ndị Kọlọsi 3:12) N’ọnọdụ nke ọrịa nwa oge, ezinụlọ na-adịkarị njikere ime ihe dị mkpa. E wezụga nke ahụ, onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ na-atụ anya otu ụdị nchebara echiche ahụ ma ọ bụrụ na ọ daa ọrịa.—Matiu 7:12.
6. Olee mmeghachi omume ndị a na-ahụ mgbe ụfọdụ ma onye òtù ezinụlọ daa ajọ ọrịa, nke na-adịte anya?
6 Ma, gịnị ma ọ bụrụ na ọrịa ahụ dị oké njọ, mkpaghasị ahụ abụrụkwa nke dị ukwuu na nke na-adịte anya? Dị ka ihe atụ, gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ n’ezinụlọ enwee ahụ mkpọnwụ, nwee nkwarụ n’ihi ọrịa Alzheimer, ma ọ bụ bụrụ onye ọrịa ọzọ napụrụ ike? Ma ọ bụ gịnị ma ọ bụrụ na otu onye òtù ezinụlọ nwere isi mgbaka, dị ka schizophrenia? Mmeghachi omume mbụ a na-ahụkarị bụ ime ebere—mwute nke na onye a hụrụ n’anya na-ata ahụhụ dị ukwuu. Otú ọ dị, mmeghachi omume ndị ọzọ pụrụ isochi ime ebere. Ka ndị òtù ezinụlọ na-ahụ na ọrịa nke otu onye na-emetụta ha nke ukwuu, a na-akpakwara nnwere onwe ha ókè, iwe pụrụ ịmalite iwe ha. Ha pụrụ ịjụ, sị: “Gịnị mere nke a ga-eji dabara m?”
7. Olee otú nwunye Job si meghachi omume n’ihe banyere ọrịa ya, gịnịkwa ka ihe àmà na-egosi na o chezọrọ?
7 Ihe yiri nke ahụ yiri ka ọ batara n’uche nwunye Job. Cheta na o nweworị ahụmahụ nke ọnwụ ụmụ ya. Ka ọdachi ndị ahụ na-ewere ọnọdụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na obi ụfụ ya nọgidere na-arị elu. N’ikpeazụ, ka ọ hụrụ di ya gbasiburu ike ma jupụta n’ume ka ọrịa na-egbu mgbu, na-asọ oyi dakwasịrị ya, o yiri ka o chezọrọ ihe gbara ọkpụrụkpụ nke kpuchiri ọdachi ya nile—mmekọrịta ya na di ya nwere n’ebe Chineke nọ. Bible na-asị: “Nwunye [Job] wee sị ya, Ị̀ nọ na-ejide izu okè gị? gbakụta Chineke azụ, nwụọ.”—Job 2:9.
Ndị Kraịst na-egosipụta ịdị omimi nke ịhụnanya ha mgbe ndị ibe ha dara ọrịa
8. Mgbe onye òtù ezinụlọ dara oké ọrịa, olee akụkụ akwụkwọ nsọ ga-enyere ndị ọzọ n’ezinụlọ aka inwe echiche ziri ezi?
8 Ọtụtụ na-enwe obi nkoropụ, ọbụna iwe, mgbe ọrịa onye ọzọ gbanwere ndụ ha nke ukwuu. Otú ọ bụla o si dị, onye Kraịst tụgharịrị uche banyere ọnọdụ ahụ kwesịrị ịmata n’ikpeazụ na nke a na-enye ya ohere igosipụta ịhụnanya ya ịbụ nke ezigbo. Ezi ịhụnanya “nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obi ọma . . . ọ dịghị[kwa] achọ ihe nke aka ya . . . Ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:4-7) Kama ikwere ka mmetụta na-adịghị mma ju anyị n’uche, ọ dị mkpa na anyị mere ihe kasị mma anyị pụrụ ime iji chịkwaa ha.—Ilu 3:21.
9. Mmesi obi ike dịgasị aṅaa pụrụ inyere ezinụlọ aka n’ụzọ ime mmụọ na ná mmetụta uche mgbe onye òtù ya dara ajọ ọrịa?
9 Gịnị ka a pụrụ ime iji chebe ọdịmma ime mmụọ na mmetụta uche nke ezinụlọ mgbe otu n’ime ndị òtù ya na-arịasi ọrịa ike? N’ezie, ọrịa nke ọ bụla na-achọ nlekọta na ọgwụgwọ nke ya, ọ gaghịkwa ekwesị ekwesị n’ime akwụkwọ a ịtụ aro usoro nkà ọgwụ ma ọ bụ nke nlekọta ahụ ike ọ bụla n’ebe obibi. Ka o sina dị, n’ụzọ ime mmụọ, Jehova “na-ekulikwa ndị nile na-eruda n’ala.” (Abụ Ọma 145:14) Eze Devid dere, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka ọ bụ, bụ́ onye nwere uche n’imeso onye na-enweghị ike: n’ụbọchị ihe ọjọọ Jehova ga-eme ka o wepụga onwe ya. Jehova ga-edebe ya, mee ka ọ dị ndụ. . . . Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ na-adịghị ya ike.” (Abụ Ọma 41:1-3) Jehova na-echebe ndị ohu ya ndụ n’ụzọ ime mmụọ, ọbụna mgbe a na-anwa ha ná mmetụta uche gabiga ike ha. (2 Ndị Kọrint 4:7) Ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ na-eche ọrịa siri ike ihu n’ebe obibi ha ekwughachiwo okwu ndị a nke ọbụ abụ ahụ: “E wedawo m n’ala nke ukwuu: mee ka m dị ndụ, Jehova, dị ka okwu Gị si dị.”—Abụ Ọma 119:107.
MMỤỌ NKE ỌGWỤGWỌ
10, 11. (a) Gịnị dị mkpa ma ọ bụrụ na ezinụlọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọrịa? (b) Olee otú otu nwanyị si nagide ọrịa di ya?
10 “Mmụọ mmadụ ga-anagide ọrịa ya,” ka otu ilu Bible na-ekwu, “ma mmụọ mmadụ nke e tigburu etigbu, ònye ga-eburu ya?” (Ilu 18:14) Mkpasasị uche pụrụ iti mmụọ nke ezinụlọ nakwa “mmụọ mmadụ” ihe otiti. Ma, “ndụ nke anụ ahụ ka obi a gwọrọ ọrịa ya bụ.” (Ilu 14:30) Ma ezinụlọ ọ̀ na-anagide ajọ ọrịa nke ọma ma ọ bụ na ọ dịghị anagide ya dabeere n’ụzọ dị ukwuu n’àgwà, ma ọ bụ mmụọ, nke ndị òtù ya.—Tụlee Ilu 17:22.
11 Ọ dịrị mkpa ka otu nwanyị bụ́ onye Kraịst die ịhụ di ya ka ahụ mkpọnwụ kụnwụrụ ya ahụ nanị afọ isii ka ha gbasịrị akwụkwọ. “O metụtara ọnụ okwu di m nke ọjọọ ya, ọ fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ihe na-ekweghị omume iso ya kparịta nkata,” ka o chetara. “Ndọlị uche iji gbalịa ịghọta ihe ọ na-agbasi mgba ike ikwu dị nnọọ ukwuu.” Cheekwa banyere obi mgbu na obi nkoropụ nke di ahụ na-aghaghị inweworị. Gịnị ka di na nwunye ahụ mere? Ọ bụ ezie na ha bi ebe dị anya site n’ọgbakọ ndị Kraịst, nwanna nwanyị ahụ mere ihe nile ọ pụrụ ime iji kwụsie ike n’ime mmụọ site n’inweta ihe ọmụma ọhụrụ nile nke nzukọ nakwa nri ime mmụọ na-adịghị agwụ agwụ na magazin Ụlọ Nche na Teta! Nke a nyere ya ume ime mmụọ iji lekọta ezi di ya ruo ọnwụ ya n’afọ anọ n’ihu.
12. Dị ka a hụrụ n’ọnọdụ nke Job, olee ụtụ onye ọrịa na-atụnye mgbe ụfọdụ?
12 N’ọnọdụ nke Job ọ bụ ya, onye nke nọ n’ahụhụ, kwụsiri ike. “Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ?” ka ọ jụrụ nwunye ya. (Job 2:10) Ka a sịkwa ihe mere Jemes onye na-eso ụzọ ji mesịa hota Job dị ka ihe atụ pụtara ìhè nke ndidi na ntachi obi! Na Jemes 5:11 anyị na-agụ: “Unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere, na Onyenwe anyị bụ onye nwere ọmịiko hie nne, nweekwa obi ebere.” N’otu aka ahụ taa, n’ọtụtụ ọnọdụ àgwà obi ike nke onye òtù ezinụlọ nọ n’ọrịa enyeworo ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ aka ịnọgide na-enwe echiche olileanya.
13. Olee ntụnyere ezinụlọ na-enwe ahụmahụ ajọ ọrịa na-ekwesịghị ime?
13 Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị ọ dịworo mkpa ịnagide ọrịa n’ezinụlọ na-ekwenye na ná mmalite ọ na-esikarịrị ndị òtù ezinụlọ ike ịnakwere ihe ndị bụ ezie. Ha na-ekwukwa na ụzọ mmadụ mesịrị si na-ele ọnọdụ ahụ anya dị oké mkpa. Mgbanwe na nhazigharị n’usoro ihe omume ezinụlọ pụrụ isi ike ná mbido. Ma ọ bụrụ na mmadụ etinye mgbalị n’ezie, ọ pụrụ ikwekọ n’ọnọdụ ọhụrụ. N’ime otú ahụ, ọ dị mkpa na anyị ejighị ọnọdụ ndị nke anyị tụnyere ndị nke ndị ọzọ na-enweghị ọrịa n’ezinụlọ ha, na-eche na ndụ ha ka mfe nakwa na ‘ezi ikpe adịghị ya nnọọ!’ N’ezie, ọ dịghị onye maara ibu arọ ndị ọzọ na-aghaghị ibu. Ndị Kraịst nile na-enweta nkasi obi n’okwu Jisọs bụ́: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.”—Matiu 11:28.
ỊHAZI IHE N’USORO ỊDỊ MKPA
14. Olee otú a pụrụ isi hazie ihe n’usoro ịdị mkpa nke kwesịrị ekwesị?
14 Mgbe e nwere ajọ ọrịa, ezinụlọ ga-eme nke ọma icheta okwu ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ: “N’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka ha na-eguzosi ike.” (Ilu 15:22) Ndị òtù ezinụlọ hà pụrụ ịbịakọta ọnụ ma tụlee ọnọdụ ahụ ọrịa kpatara? Ọ ga-ekwesị ekwesị n’ezie iji ekpere mee nke ahụ ma chigharịkwuru Okwu Chineke maka nduzi. (Abụ Ọma 25:4) Gịnị ka e kwesịrị ịtụle ná nkwurịta okwu dị otú ahụ? Ọ dị mma, e nwere mkpebi ndị metụtara nkà ọgwụ, ego, na ezinụlọ ndị a ga-eme. Ònye ga-enye nlekọta bụ́ isi? Olee otú ezinụlọ pụrụ isi mekọọ ihe ọnụ iji kwado nlekọta ahụ? Olee otú ndokwa ndị e mere ga-esi metụta onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ ahụ? Olee otú a ga-esi lekọta mkpa ime mmụọ na ndị ọzọ nke onye ahụ na-enye nlekọta bụ́ isi?
15. Nkwado dị aṅaa ka Jehova na-enye ezinụlọ ndị na-enwe ajọ ọrịa?
15 Ikpe ekpere site n’obi maka nduzi Jehova, ịtụgharị uche n’Okwu ya, na iji obi ike na-agbaso ụzọ Bible gosiri na-arụpụtakarị ngọzi ndị anyị na-atụghị anya ha. Ọrịa nke onye òtù ezinụlọ ahụ na-adịghị nwere ike ọ gaghị ebelata mgbe nile. Ma ịdabere na Jehova na-arụpụta ihe kasị mma mgbe nile n’ọnọdụ ọ bụla. (Abụ Ọma 55:22) Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ebere Gị na-akwagide m, Jehova. Mgbe nchegbu m na-aba ụba n’ime m, nkasi obi Gị nile na-agụgụ mkpụrụ obi m.”—Abụ Ọma 94:18, 19; leekwa Abụ Ọma 63:6-8.
INYERE ỤMỤAKA AKA
Mgbe ezinụlọ na-arụkọ ọrụ ọnụ, a pụrụ idozi nsogbu nile
16, 17. Olee isi ihe ndị a pụrụ ikwu mgbe e so ụmụaka na-ekwurịta banyere ọrịa nwanne ha?
16 Ajọ ọrịa pụrụ ịkpatara ụmụaka n’ezinụlọ ahụ nsogbu. Ọ dị mkpa na ndị nne na nna nyeere ụmụaka aka ịghọta mkpa ndị biliteworo na ihe ha pụrụ ime iji nye aka. Ọ bụrụ na onye nke daworo ọrịa bụ nwatakịrị, a ghaghị inyere ụmụnne ya aka ịghọta na nlekọta kanụ a na-elekọta onye ọrịa ahụ apụtaghị na e nwere ịhụnanya ka nta maka ụmụaka ndị nke ọzọ. Kama ikwe ka iwe ma ọ bụ esemokwu bilite, ndị nne na nna pụrụ inyere ụmụaka ndị nke ọzọ aka guzobe nkekọ ka chie anya n’ebe ibe ha nọ ma nwee ezigbote mmetụta ka ha na-emekọ ihe ọnụ n’ịhụ maka ọnọdụ ọrịa ahụ kpatara.
17 Ụmụntakịrị ga-azaghachikarị ngwa ngwa karị ma ọ bụrụ na nne na nna ekwuo ihe ndị na-eru ná mmetụta ha karịa ná nkọwa ndị dị ogologo ma dị mgbagwoju anya banyere ọnọdụ ọgwụ na ahụ ike. Ya mere a pụrụ inye ha nghọta ụfọdụ nke ahụmahụ onye òtù ezinụlọ ahụ nọ n’ọrịa na-enwe. Ọ bụrụ na ụmụaka ndị nke nwere ahụ ike ahụ ụzọ nrịanrịa ahụ si egbochi onye nke na-arịa ọrịa ime ọtụtụ ihe ha onwe ha ji akpọrọ ihe nkịtị, o yikarịrị ka ha ga-enwe ‘ịhụnanya ụmụnna’ karị, nweekwa “obi ọmịiko.”—1 Pita 3:8.
18. Olee otú a pụrụ isi nyere ụmụ ndị ka okenye aka ịghọta nsogbu ndị ọrịa kpatara, oleekwa ụzọ nke a pụrụ isi baara ha uru?
18 E kwesịrị inyere ụmụ ndị ka okenye aka ịghọta na ọnọdụ siri ike dị nakwa na ọ na-achọ ịchụ àjà n’akụkụ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ. Ebe e nwere ụgwọ ndị dọkịta na ọgwụ ịkwụ, o nwere ike ọ gaghị ekwe nne na nna omume imere ụmụaka ndị nke ọzọ ihe dị ka ha ga-achọ. Ụmụaka hà ga-ewe iwe n’ihi nke a ma chee na a na-awọ ha ihe? Ka hà ga-aghọta ọnọdụ ahụ ma dị njikere ịchụ àjà ndị dị mkpa? Ihe dị ukwuu dabeere n’ụzọ e si tụlee okwu ahụ na mmụọ a kpalitere n’ezinụlọ. N’ezie, n’ọtụtụ ezinụlọ ọrịa nke onye òtù ezinụlọ enyewo aka n’ịzụlite ụmụaka ịgbaso ndụmọdụ Pọl bụ́: “Unu emela ihe ọ bụla n’ụzọ ịkpa iche iche ma ọ bụ n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala na-agụrịtanụ ibe unu ná ndị ka unu onwe unu mma; unu nile n’otu n’otu elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n’otu n’otu leekwa ihe nke mmadụ ibe unu anya.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.
ỤZỌ ISI LEE IJI ỌGWỤ AGWỌ ỌRỊA ANYA
19, 20. Olee ibu ọrụ ndị isi ezinụlọ na-ebu mgbe onye òtù ezinụlọ nọ n’ọrịa? (b) Ọ bụ ezie na ọ bụghị akwụkwọ nkà ọgwụ, n’ụzọ dị aṅaa ka Bible si enye nduzi n’iche ọrịa ihu?
19 Ndị Kraịst nwere echiche ziri ezi adịghị ajụ iji ọgwụ agwọ ọrịa ọ bụrụhaala na o megideghị iwu Chineke. Mgbe onye òtù ezinụlọ ha dara ọrịa, ha na-anụ ọkụ n’obi ịchọ enyemaka iji belata ahụhụ nke onye ahụ a na-emekpa ahụ. Ma, a pụrụ inwe echiche ndị na-emegide onwe ha site n’ọnụ ndị ọkachamara bụ́ ndị a na-aghaghị ịtụle. Tụkwasịkwa, n’afọ ndị a ọrịa na adịghị ike ndị ọhụrụ anọwo na-ebilite, maka ọtụtụ n’ime ndị a kwa, e nweghị usoro ọgwụgwọ mmadụ nile nabatara. Ọbụna ezigbo nkọwa na-esi ike mgbe ụfọdụ inweta. Mgbe ahụ, gịnị ka onye Kraịst kwesịrị ime?
20 Ọ bụ ezie na otu onye so dee Bible bụ dibịa, Pọl onyeozi nyekwa enyi ya bụ́ Timoti ndụmọdụ na-enye aka banyere ahụ ike, Akwụkwọ Nsọ bụ ihe nduzi omume na nke ime mmụọ, ọ bụghị akwụkwọ nkà ọgwụ. (Ndị Kọlọsi 4:14; 1 Timoti 5:23) Ya mere, n’okwu iji ọgwụ agwọ ọrịa, ndị isi ezinụlọ ndị Kraịst aghaghị ime mkpebi ndị nke ha guzoziri eguzozi. Ikekwe ha pụrụ iche na ọ dị ha mkpa inweta echiche ihe karịrị otu ọkachamara. (Tụlee Ilu 18:17.) Ha ga-achọ n’ezie enyemaka kasị mma a pụrụ inweta maka onye òtù ezinụlọ ha nọ n’ọrịa, ọtụtụ na-achọkwa nke a n’etiti ndị dọkịta a ma ama ji ọgwụ agwọ ọrịa. Ụfọdụ na-enwe mmasị karị n’usoro ọgwụgwọ ndị ọzọ. Nke a kwa bụ mkpebi onwe onye. Otú ọ bụla o si dị, mgbe a na-ahụ maka nsogbu ahụ ike, ndị Kraịst adịghị akwụsị ikwe ka ‘okwu Chineke bụrụ oriọna dịịrị ụkwụ ha, na ìhè dịịrị okporo ụzọ ha.’ (Abụ Ọma 119:105) Ha na-anọgide na-agbaso ụkpụrụ nduzi ndị e setịpụrụ n’ime Bible. (Aịsaịa 55:8, 9) N’ihi ya, ha na-ajụ nkà nkọwa ndị yiri mgbaasị, ha na-ezerekwa usoro ọgwụgwọ ndị na-emebi ụkpụrụ Bible.—Abụ Ọma 36:9; Ọrụ 15:28, 29; Mkpughe 21:8.
21, 22. Olee otú otu nwanyị onye Esia si tụgharịa uche n’otu ụkpụrụ Bible, oleekwa ụzọ mkpebi o mere si ghọọ nke ziri ezi n’ọnọdụ ya?
21 Tụlee ọnọdụ nke nwa agbọghọ bụ́ onye Esia. Ntakịrị oge ka ọ malitesịrị ịmụ banyere Bible dị ka ihe sitere n’ọmụmụ ihe ya na otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ mụkworo nwa nwanyị nke ịdị aro ya bụ nanị 1,470 gram. Obi tiwara nwanyị ahụ mgbe otu dọkịta gwara ya na nwa ahụ ga-enwe ajọ nkwarụ nakwa na ọ dịghị ihe ga-eme ka o nwee ike ịga ije. Ọ tụụrụ ya aro inyefe nwa ahụ n’ebe a na-elekọta ndị ọrụsị. Di ya enweghị obi ike n’okwu ahụ. Ònye ka ọ pụrụ ichigharịkwuru?
22 Ọ na-asị: “M na-echeta ịmụta site na Bible na ‘ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.’” (Abụ Ọma 127:3) O kpebiri ikula “ihe nketa” nke a ụlọ ma lekọta ya. Ihe tara akpụ na mbụ, ma site n’enyemaka ndị enyi bụ́ ndị Kraịst n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ahụ, nwanyị ahụ nwere ike ịnagide ọnọdụ ahụ na inye nwa ahụ nkwado pụrụ iche dị mkpa. Afọ 12 n’ihu, nwa ahụ na-aga nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-enwe ọṅụ ná mkpakọrịta nke ndị na-eto eto nọ n’ebe ahụ. Nne ahụ na-ekwu, sị: “Enwere m ekele dị ukwuu na ụkpụrụ Bible kwaliri m ime ihe ziri ezi. Bible nyeere m aka ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha n’ihu Jehova Chineke, ghara inwe ihe ịkwa ụta gaara eso m ogologo ndụ m nile.”
23. Olee nkasi obi Bible na-enye maka ndị ọrịa na maka ndị na-elekọta ha?
23 Anyị na ọrịa agaghị anọgide ruo ebighị ebi. Aịsaịa onye amụma tụrụ aka n’ihu n’oge mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) A ga-emezu nkwa ahụ n’ụwa ọhụrụ nke ji ọsọ na-erute. Otú ọ dị, tupu mgbe ahụ, anyị na ọrịa na ọnwụ gaje ịnọgide. Dị ka ihe obi ụtọ, Okwu Chineke na-enye anyị nduzi na enyemaka. Ụkpụrụ omume ndị bụ isi ndị Bible na-enye na-adịgide adịgide, ha karịkwara echiche ndị na-agbanwe mgbe nile nke ụmụ mmadụ na-ezughị okè. N’ihi ya, onye maara ihe na-ekwenyere ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Iwu Jehova zuru okè, na-eweghachi mkpụrụ obi: ihe àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. . . . Ikpe nile nke Jehova bụ eziokwu, ha nile ziri ezi n’otu. . . . N’idebe ha ka ọkpụkpụ ọrụ hiri nne na-apụta.”—Abụ Ọma 19:7, 9, 11.