Ekwensu Ọ̀ Na-eme Ka Anyị Daa Ọrịa?
ỌRỊA EKWESỊGHỊ ỊDỊ MA ỌLỊ. Chineke kere anyị ịdị ndụ ebighị ebi n’ahụ ike zuru ezu. Ọ bụ otu mmụọ e kere eke, bụ́ Setan, mere ka ọrịa, ihe mgbu, na ọnwụ na-eti ezinụlọ mmadụ ihe otiti mgbe o dubara nne na nna mbụ anyị, bụ́ Adam na Iv, ná mmehie.—JENESIS 3:1-5, 17-19; NDỊ ROM 5:12.
NKE a ọ̀ pụtara na ọrịa nile bụ nsogbu na-esite n’ógbè ndị bụ́ mmụọ kpọmkwem? Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, ọtụtụ mmadụ taa na-eche otú ahụ. Nne nne obere Owmadji chere otú ahụ. Ma ọ̀ bụ ndị mmụọ a na-adịghị ahụ anya kpatara afọ ọsịsa Owmadji n’ezie—ọrịa nke na-egbu ụmụaka mgbe ụfọdụ n’akụkụ ụwa ndị na-ekpo oké ọkụ?
Òkè Setan Na-ekere
Bible na-aza ajụjụ a n’ụzọ doro nnọọ anya. Nke mbụ, ọ na-egosi na mmụọ nke ndị nna nna anyị apụghị ime ndị nọ ndụ ihe. Mgbe ndị mmadụ nwụrụ, “[ha] adịghị ama ihe ọ bụla.” Ha adịghị enwe mmụọ nke na-alanarị ọnwụ. Ha nọ n’ụra n’ime ili, bụ́ ebe “ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, [na-adịghị].” (Eklisiastis 9:5, 10) Ọ dịghị ụzọ ọ bụla ndị nwụrụ anwụ pụrụ isi mee ka ndị nọ ndụ daa ọrịa!
Otú ọ dị, Bible na-ekpughe na ndị ajọ mmụọ dị adị. Onye nnupụisi mbụ e nwere n’eluigwe na ala nile bụ mmụọ ahụ e kere eke nke a ma ugbu a dị ka Setan. Ndị ọzọ sonyeere ya ma bịa bụrụ ndị a na-akpọ ndị mmụọ ọjọọ. Setan na ndị mmụọ ọjọọ hà pụrụ ịkpata ọrịa? O mewo na mbụ. Ụfọdụ n’ime ọrụ ebube ndị metụtara ịgwọ ọrịa ndị Jisọs rụrụ gụnyere ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (Luk 9:37-43; 13:10-16) Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ọrịa ndị Jisọs gwọrọ bụ ọrịa ndị ọ na-abụghị ndị mmụọ ọjọọ kpatara ha kpọmkwem. (Matiu 12:15; 14:14; 19:2) N’otú aka ahụ taa, n’ụzọ bụ́ isi, ọrịa na-apụtara onwe ya, ọ bụghị ike karịrị nke mmadụ na-akpata ya.
Gịnị banyere ịta amoosu? Ilu 18:10 na-emesi anyị obi ike, sị: “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu.” Jemes 4:7 na-asị: “Guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.” Ee, Chineke pụrụ ichebe ndị ya kwesịrị ntụkwasị obi pụọ n’amoosu na ike ọzọ karịrị nke mmadụ. Nke ahụ bụ otu ihe okwu Jisọs na-egosi: “Eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.
‘Gịnị banyere Job?’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ. ‘Ọ́ bụghị ajọ mmụọ mere ka ọ daa ọrịa?’ Ee, Bible kwuru na ọ bụ Setan kpatara ọrịa Job. Ma ọnọdụ Job dị iche. Chineke echebeworị Job pụọ ná mwakpo ndị mmụọ ọjọọ ruo ogologo oge. Mgbe ahụ, Setan mara Jehova aka ka o tie Job ihe otiti, ebe ọ bụkwa na nke a metụtara ihe iseokwu ndị dị ukwuu, Jehova kwụsịtụrụ nchebe ya n’ebe onye na-efe ya nọ nanị na nke a.
Otú ọ dị, Chineke kpaara ya ókè. Mgbe o kwere ka Setan tie Job ihe otiti, Setan pụrụ ime ka Job daa ọrịa ruo oge ụfọdụ, ma ọ pụghị igbu ya egbu. (Job 2:5, 6) N’ikpeazụ, nhụjuanya Job kwụsịrị, Jehova kwụghachikwara ya ụgwọ ọrụ n’ụba maka iguzosi ike n’ezi ihe ya. (Job 42:10-17) E dekọwo ụkpụrụ ndị iguzosi ike n’ezi ihe Job gosipụtara n’ime Bible eri oge, ha pụtakwara ìhè nye mmadụ nile. Ule ọzọ dị otú ahụ adịghịzi mkpa.
Olee Otú Setan Si Arụ Ọrụ?
N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile, nanị njikọ Setan na nrịanrịa mmadụ nwere bụ eziokwu ahụ bụ́ na Setan nwara di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ ọnwụnwa, ha wee daba ná mmehie. Ọ bụghị ya na ndị mmụọ ọjọọ ya na-akpata ọrịa nile kpọmkwem. Otú ọ dị, Setan ka nwere ike ime ka anyị mee mkpebi ndị amamihe na-adịghị na ha wee mebie okwukwe anyị, bụ́ nke pụrụ imebi ahụ ike anyị. Ọ taghị Adam na Iv amoosu, o gbughị ha, ma ọ bụ wetara ha nrịanrịa. Ọ rụgidere Iv inupụrụ Chineke isi, Adam gbasokwara ụzọ nnupụisi Iv. Ọrịa na ọnwụ so n’ihe ndị si na ya pụta.—Ndị Rom 5:19.
N’otu oge, eze Moab goro otu onye amụma na-ekwesịghị ntụkwasị obi aha ya bụ Belam ọrụ ịkọcha mba Israel, bụ́ ndị mara ụlọikwuu n’ókèala Moab n’ụzọ na-eyi egwu. Belam nwara ịkọcha Israel, ma o nweghị ike ya n’ihi na mba ahụ nọ n’okpuru nchebe Jehova. Ndị Moab gbalịwaziri ịrabanye Israel n’ikpere arụsị na inwe mmekọahụ rụrụ arụ. Ụzọ aghụghọ a gara nke ọma, nchebe Jehova funahụkwara Israel.—Ọnụ Ọgụgụ 22:5, 6, 12, 35; 24:10; 25:1-9; Mkpughe 2:14.
Anyị pụrụ ịmụta otu ihe dị mkpa site n’ihe ahụ mere n’oge ochie. Enyemaka Chineke na-echebe ndị ji ikwesị ntụkwasị obi efe ya pụọ ná mwakpọ sitere n’aka ndị ajọ mmụọ kpọmkwem. Otú ọ dị, Setan pụrụ ịnwa ime ka ndị mmadụ mebie okwukwe ha. Ọ pụrụ ịnwa ịrabanye ha n’omume rụrụ arụ. Ma ọ bụ, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ pụrụ ịnwa ime ka ha jiri ụjọ mee ihe n’ụzọ ga-anapụ ha nchebe Chineke. (1 Pita 5:8) Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji kpọọ Setan “onye nwere ike nke ọnwụ.”—Ndị Hibru 2:14.
Nne nne Owmadji nwara ime ka Hawa kweta iji ọgwụ nchebe na ọtụmọkpọ mee ihe dị ka ihe nchebe pụọ n’ọrịa. Gịnị pụrụ imewo ma a sị na Hawa mesịrị kwenye? Ọ gaara egosipụtawo enweghị ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova Chineke nọ, ọ garaghịzi enwe ike inwe obi ike zuru ezu n’ebe nchebe Chineke dị.—Ọpụpụ 20:5; Matiu 4:10; 1 Ndị Kọrint 10:21.
Setan jikwa nrụgide mee ihe n’ebe Job nọ. Ịnapụ ya ezinụlọ ya, akụ̀ na ụba ya, na ahụ ike ya ezughịrị ya. Nwunye Job nyekwara ya ndụmọdụ ọjọọ mgbe ọ sịrị: “Gbakụta Chineke azụ, nwụọ.” (Job 2:9) Mgbe e mesịrị, “ndị enyi” ya atọ bụ́ ndị jikọrọ aka nwaa ime ka o kweta na ụta dịịrị ya maka ọrịa ya, letara ya. (Job 19:1-3) N’ụzọ dị otú a, Setan ji ọnọdụ adịghị ike Job nwaa ịkụda ya aka na ime ka obi ike o nwere n’ezi omume Jehova gharakwa isi ike. Ma, Job nọgidere na-adabere na Jehova dị ka nanị olileanya o nwere.—Tụlee Abụ Ọma 55:22.
Mgbe anyị dara ọrịa, anyị pụkwara inwe nkụda mmụọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, Setan na-adị ngwa n’ịnwa ime ka anyị mee omume n’ụzọ ụfọdụ ga-emebi okwukwe anyị. N’ihi ya, mgbe nrịanrịa bịara, ọ dị mkpa iburu n’uche na ihe bụ́ isi na-akpata nhụjuanya anyị yikarịrị ka ọ bụ ezughị okè anyị ketara eketa, kama ịbụ mmetụta ụfọdụ nke ike karịrị nke mmadụ. Cheta, Aịsak kwesịrị ntụkwasị obi kpuru ìsì ruo ọtụtụ afọ tupu ọ nwụọ. (Jenesis 27:1) Ọ bụghị ndị ajọ mmụọ kpatara ya kama ọ bụ nká. Rechel nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa, ọ bụghị Setan, kama ọ bụ adịghị ike mmadụ kpatara ya. (Jenesis 35:17-19) Ndị nile kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie mesịrị nwụọ—ọ bụghị n’ihi na a kọrọ ha ọgwụ ma ọ bụ bụọ ha ọnụ kama ọ bụ n’ihi ezughị okè ha ketara eketa.
Iche na aka ndị mmụọ a na-adịghị ahụ anya dị kpọmkwem n’ọrịa ọ bụla dakwasịrị anyị bụ ọnyà. Ọ pụrụ ịkpata egwu na-enweghị isi nke ndị mmụọ. Anyị dazie ọrịa, anyị pụrụ ịbụ ndị a nwara ịgbalị ime ka obi ndị mmụọ ọjọọ dajụọ kama ịgbara ha ọsọ. Ọ bụrụ na Setan pụrụ iji ụjọ mee ka anyị chọọ enyemaka site n’omume mgbaasị, nke ahụ ga-abụ ịgbahapụ ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova. (2 Ndị Kọrint 6:15) Ọ bụ ịtụ egwu Chineke n’ụzọ ùgwù dị na ya kwesịrị ịdị na-eduzi anyị, ọ bụghị ịtụ Onye Iro ya egwu site na nkwenkwe na-enweghị isi.—Mkpughe 14:7.
Obere Owmadji enweelarị nchebe kasị mma a pụrụ inwe megide ndị ajọ mmụọ. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, Chineke na-ele ya anya dị ka onye “dị nsọ” n’ihi na o nwere nne kwere ekwe, nne ya pụkwara ikpeku Chineke ekpere ka ọ nọnyere nwa ya nwanyị site ná mmụọ nsọ. (1 Ndị Kọrint 7:14) N’ịbụ onye e ji ezi ihe ọmụma dị otú ahụ gọzie, Hawa chọrọ ọgwụgwọ dị irè maka Owmadji kama ịdabere n’ọtụmọkpọ.
Ihe Dị Iche Iche Na-akpata Ọrịa
Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ ekweghị ná ndị mmụọ. Mgbe ha dara ọrịa, ha na-agakwuru dọkịta—ma ọ bụrụ na aka ha ruru ya. N’ezie, onye ọrịa pụrụ ịgakwuru dọkịta ma ka bụrụ onye a na-agwọtaghị. Ndị dọkịta apụghị ịrụ ọrụ ebube. Ma ọtụtụ ndị nwere nkwenkwe na-enweghị isi bụ́ ndị a pụrụ ịgwọta na-ejekwuru dọkịta nanị mgbe oge gafeworo nnọọ. Ha pụrụ ibu ụzọ nwalee usoro ọgwụgwọ ndị dabeere ná mgbaasị, ma mgbe usoro ndị a na-enweghị ike ịgwọta ha, ha na-agakwuru dọkịta mgbe ha na-amaghịzi ihe ọzọ ha ga-eme. Ọtụtụ ndị na-anwụ n’ụzọ na-enweghị isi.
Ndị ọzọ na-eche nnwụchu ọnwụ ihu n’ihi amaghị nke a na-akọ. Ha adịghị aghọta mgbaàmà ndị ha nwere, ha adịghịkwa ama ihe ndị kwesịrị ekwesị ha ga-eme iji gbochie ọrịa. Ihe ọmụma na-enye aka igbochi nhụjuanya na-enweghị isi. Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ọrịa adịghị egbu ụmụ nke ndị nne maara akwụkwọ ruo n’ókè ọ na-egbu ụmụ nke ndị na-amaghị akwụkwọ. Ee, amaghị nke a na-akọ pụrụ igbu mmadụ.
Ihe ọzọ na-akpata nrịanrịa bụ ileghara ihe anya. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-ada ọrịa n’ihi na ha na-ekwe ka ụmụ ahụhụ rịkwasị n’elu nri ha tupu ha erie ya ma ọ bụ n’ihi na ndị na-akwadebe nri ahụ adịghị ebu ụzọ akwọ aka ha. Ihi ụra n’ógbè ndị ọrịa ịba juru eju n’ejighị ákwà e ji egbochi anwụnta dịkwa ize ndụ.a N’ihe banyere ahụ ike, ọ na-abụkarị eziokwu na “mgbochi ọrịa karịrị ọgwụgwọ ya.”
Ụzọ ndụ amamihe na-adịghị na ya emewo ka ọtụtụ nde mmadụ daa ọrịa ma nwụchuo ọnwụ. Aṅụrụma, mmekọahụ rụrụ arụ, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na iji ụtaba eme ihe ebibiwo ahụ ike nke ọtụtụ ndị. Ọ bụrụ na mmadụ emikpuo onwe ya n’omume ọjọọ ndị a wee dazie ọrịa, ọ̀ bụ n’ihi na mmadụ kọrọ ya ọgwụ ma ọ bụ n’ihi na mmụọ ọjọọ wakporo ya? Ee e. Ụta dịịrị ya maka ọrịa ya. Ịta ndị mmụọ ụta ga-abụ ịjụ ịnabata ụta n’ihi ụzọ ndụ amamihe na-adịghị na ya.
N’ezie, anyị apụghị ịchịkwa ihe ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ikpughepụ anyị nye ụmụ nje ma ọ bụ mmetọ ndị na-akpata ọrịa. Nke a bụ ihe mere Owmadji. Nne ya amaghị ihe nọ na-akpata ọrịa afọ ọsịsa ahụ. Ụmụ ya adịghị arịakarị ọrịa dị ka ụmụaka ndị ọzọ n’ihi na ọ na-edote ụlọ na mbara èzí ya ọcha, ọ na-akwọkwa aka ya mgbe nile tupu ọ kwadebe nri. Ma ụmụaka nile na-ada ọrịa mgbe ụfọdụ. Ihe dị ka ụmụ nje 25 dị iche iche pụrụ ịkpata ọrịa afọ ọsịsa. Ma eleghị anya, ọ dịghị onye pụrụ ịma ma ọlị nke ọ bụ ya kpatara nsogbu Owmadji.
Ihe Ngwọta Na-adịte Anya
Ụta adịghịrị Chineke maka ọrịa. “Chineke bụ Onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa Ya, Ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” (Jemes 1:13) Ọ bụrụ na otu n’ime ndị na-efe ya adaa ọrịa, Jehova na-akwagide ya n’ụzọ ime mmụọ. “Jehova ga-akwagide ya n’elu ihe o ji dinaa mgbe ahụ na-adịghị ya ike: ihe ndina ya nile ka Ị gbanweworo n’ọrịa ya.” (Abụ Ọma 41:3) Ee, Chineke nwere ọmịiko. Ọ na-achọ inyere anyị aka, ọ bụghị imerụ anyị ahụ.
N’ezie, Jehova nwere ihe ngwọta na-adịte anya maka ọrịa—ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs. Site n’àjà mgbapụta Jisọs, a na-anapụta ndị obi ha ziri ezi n’ọnọdụ mmehie ha, ha ga-enwetakwa ndụ zuru okè na ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs n’ikpeazụ. (Matiu 5:5; Jọn 3:16) Ọrụ ebube ndị Jisọs rụrụ bụ ihe na-egosipụta ezi ọgwụgwọ nke Alaeze Chineke ga-eweta. Chineke ga-ewepụkwa Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Ndị Rom 16:20) N’ezie, Jehova nwere ihe ndị dị ebube o dokwara maka ndị na-egosipụta okwukwe n’ebe Ọ nọ. Nanị ihe dị anyị mkpa ime bụ inwe ndidi na ịtachi obi.
Ka ọ dịgodị, Chineke na-enye ezi amamihe na nduzi ime mmụọ site na Bible na òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ofufe. Ọ na-egosi anyị otú anyị ga-esi zere omume ọjọọ ndị na-akpata nsogbu ahụ ike. Ọ na-enyekwa anyị ezi ndị enyi bụ́ ndị ga-enye aka mgbe nsogbu bilitere.
Chee echiche ọzọ banyere Job. Ijekwuru dibịa afa gaara abụ ihe kasị njọ Job pụrụ imewo! Ọ gaara anapụwo ya nchebe Chineke, ngọzi nile nọ na-echere ya mgbe ọnwụnwa ya gasịrị gaara efunahụkwa ya. Chineke echefughị Job, ọ gaghị echefukwa anyị. “Unu nụrụ ihe banyere ntachi obi nke Job, hụkwa ihe Onyenwe anyị zubere,” ka onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes na-ekwu. (Jemes 5:11) Ọ bụrụ na anyị adaghị mbà ma ọlị, anyị onwe anyị kwa ga-enweta ngọzi ndị dị ebube n’oge Chineke kara aka.
Gịnị mere obere Owmadji? Nne ya chetara otu isiokwu banyere usoro ọgwụgwọ e ji etinyeghachi mmiri n’ahụ site n’ọnụ bụ́ nke dị na magazin nke ya na Ụlọ Nche na-agakọ, bụ́ Teta!b Ọ gbasoro ntụziaka ya ma gbooro Owmadji ọgwụ ahụ ka ọ ṅụọ. Ugbu a ahụ dị nwata nwanyị ahụ mma, dịkwa ya ike.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ijeri mmadụ na-arịa ịba. Ọrịa ahụ na-egbu ihe dị ka nde mmadụ abụọ kwa afọ, karịsịa n’Africa.
b Lee Teta! (Bekee) nke September 22, 1985, peji nke 24-25, “Ihe Ọṅụṅụ Na-atọ Nnu Nnu nke Na-azọpụta Ndụ!”
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Jehova emewo ndokwa maka ihe ngwọta na-adịgide adịgide maka nsogbu nke ọrịa