Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 9/1 p. 3
  • Ihe Dị Mgbagwoju Anya Banyere Nrịanrịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Dị Mgbagwoju Anya Banyere Nrịanrịa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkpata Ihe Mgbagwoju Anya Ahụ
  • Ekwensu Ọ̀ Na-eme Ka Anyị Daa Ọrịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Chebe Onwe Gị Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ghara Inweta Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Chineke Ọ̀ Na-akwado Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ụzọ Okwukwe Pụrụ Isi Nyere Ndị Ọrịa Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 9/1 p. 3

Ihe Dị Mgbagwoju Anya Banyere Nrịanrịa

AFỌ NA-ASA OBERE OWMADJI. Nne ya, bụ́ Hawa, na-echegbu onwe ya na mmiri pụrụ ịgwụsị ya n’ahụ; ọ nụrụ na nwatakịrị nke nwa nwanne ya nọ n’ime obodo esiwo otú ahụ nwụnahụ ya n’oge na-adịbeghị anya. Nne nne Owmadji, bụ́ nne di Hawa, chọrọ ịkpọga Owmadji na nke dibịa afa obodo ha. “Ọ bụ ajọ mmụọ na-eme ka nwata a na-arịa ọrịa,” ka ọ sịrị. “Ị jụrụ inye ya ọgwụ nchebe ka o yiri maka nchebe, ugbu a nsogbu amalitewalanụ!”

A NA-AHỤKARỊ ọnọdụ a n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ọtụtụ narị nde mmadụ kwere na ọ bụ ndị ajọ mmụọ bụ ndị a na-adịghị ahụ anya na-akpata nrịanrịa. Nke a ọ̀ bụ eziokwu?

Ịkpata Ihe Mgbagwoju Anya Ahụ

O nwere ike bụrụ na gị onwe gị ekweghị na ọ bụ ndị mmụọ a na-adịghị ahụ anya na-akpata ọrịa. N’ezie, ọ pụrụ iju gị anya ihe ga-eme ka mmadụ ọ bụla chee otú ahụ, n’ihi na ndị ọkà mmụta sayensị egosipụtawo na ọ bụ nje dị iche iche na-akpata ihe ka n’ọtụtụ ọrịa. Ma cheta na ihe a kpọrọ mmadụ amabughị banyere irighiri ihe ndị a na-akpata ọrịa. Ọ bụ nanị mgbe Antonie van Leeuwenhoek mepụtara enyo e ji ahụ ihe ndị pere oké mpe na narị afọ nke 17 ka anya mmadụ bidoro hụwa ihe ndị ahụ pere oké mpe. Ọbụna mgbe ahụ, ọ bụ nanị site ná nchọpụta ndị Louis Pasteur mere na narị afọ nke 19 ka sayensị malitere ịghọta njikọ e nwere n’etiti nje na ọrịa.

Ebe ọ bụ na n’ihe ka ukwuu n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, a mabughị ihe na-akpata ọrịa, ọtụtụ nkwenkwe na-enweghị isi bilitere, gụnyere nchepụta echiche bụ́ na ọ bụ ndị ajọ mmụọ na-akpata ọrịa nile. The New Encyclopædia Britannica na-atụ aro otu ụzọ nke a pụrụ isiwo malite. O kwuru na ndị mbụ gwọrọ ọrịa gbalịrị iji ụdị mkpọrọgwụ, ahịhịa, na ihe ọ bụla ọzọ dị iche iche aka ha pụrụ iru, gwọọ ndị ọrịa. Ihe ndị ahụ na-adị irè mgbe ụfọdụ. Mgbe ahụ ọgwọ ọrịa ahụ na-eji ọtụtụ ememe na nkwenkwe na-enweghị isi gbakwụnyere usoro ọgwụgwọ ahụ, bụ́ nke a na-eme iji zochie ihe gwọrọ ọrịa ahụ n’ezie. Ọgwọ ọrịa ahụ na-esi otú a hụ na ndị mmadụ ga-anọgide na-abịa ka ọ gwọọ ha. N’ụzọ dị otú a, e ji ihe dị mgbagwoju anya gbaa ịgwọ ọrịa gburugburu, a gbakwara ndị mmadụ ume ilegara ike karịrị nke mmadụ anya maka enyemaka.

A ka na-eji usoro ọgwụgwọ ọdịnala a eme ihe n’ọtụtụ ala. Ọtụtụ ndị na-asị na ọ bụ mmụọ nke ndị nna nna nwụrụ anwụ na-akpata ọrịa. Ndị ọzọ na-asị na ọ bụ Chineke na-eme ka anyị daa ọrịa nakwa na nrịanrịa bụ ntaramahụhụ maka mmehie anyị. Ọbụna mgbe ndị maara nke a na-akọ ghọtara ihe na-akpata ọrịa, ha ka pụrụ ịdị na-atụ egwu mmetụta ndị sitere n’ike karịrị nke mmadụ.

Ndị dibịa afa na ndị dibịa ọdịnala na-eji egwu a erigbu ndị mmadụ. Gịnịzi ka anyị kwesịrị ikwere? Ọ̀ dị uru ọ bara ilegara ndị mmụọ anya maka nlekọta ahụ ike? Gịnị ka Bible na-ekwu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya