Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/99 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 8/99 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. September: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. October: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta! November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.

◼ N’ógbè ọ bụla, a na-enwe ememe ndị ụwa n’oge dị iche iche n’ime afọ bụ́ mgbe a na-agwa ụmụaka ka ha ghara ịga akwụkwọ, na-enyekwa ndị ọrụ ezumike. Ndị a bụ ohere magburu onwe ha maka ọgbakọ ikere òkè ka ukwuu n’ozi ubi. Ndị okenye kwesịrị ime atụmatụ tupu oge eruo maka oge ndị a ma gwa ọgbakọ n’ezi oge banyere ndokwa ndị a na-eme maka ịgba àmà n’ìgwè n’oge ezumike.

◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla òkè fọm zuru ezu maka iji mee ihe n’afọ ije ozi 2000. Biko jiri ezi uche were fọm ndị a mee ihe. E kwesịrị iji ha mee ihe nanị maka nzube e ji mepụta ha.

◼ Ọgbakọ ọ bụla ga-anata fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Odeakwụkwọ ọgbakọ na ohu na-ahụ maka akwụkwọ kwesịrị izukọ ná mmalite August ma yie ụbọchị ha ga-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere n’ọgbakọ ná ngwụsị ọnwa. A ghaghị ịgụ akwụkwọ nile e nwere ọnụ, a ga-edebakwa ngụkọta ha na fọm Literature Inventory. A pụrụ inweta ngụkọta magazin ndị e nwere site n’aka ohu na-ahụ maka magazin. Biko zitere Society ibe nke mbụ tupu September 6 agafee. Debe ibe nke abụọ ya na faịlụ unu. A pụrụ iji ibe nke atọ mee ihe dị ka ibe akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ, onyeisi oche ndị nlekọta kwesịkwara inyocha fọm ahụ e dejupụtara. Odeakwụkwọ na onyeisi oche ndị nlekọta ga-abịanye aka na fọm ahụ.

◼ Malite n’August 18, 1999, ruo n’August 31, 1999, Society ga na-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ihi ngụkọ a, ọ dịghị ọda akwụkwọ ọgbakọ tinyere nke a ga-akwadebe maka mbupụ n’ụbọchị ndị ahụ. A ga-emechikwa ebe nnabata ndị ọbịa nke ebe obibi akwụkwọ malite n’August 18 ruo n’August 20, 1999, a gaghịkwa abịa buru akwụkwọ n’oge ahụ.

◼ Kasetị Vidio Ọhụrụ E Nwere:

Noah—He Walked With God —Bekee

Ndị nkwusa: ₦800; ndị ọsụ ụzọ: ₦640.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya