Ì Nwezuru Ihe Dị Mkpa Iji Mụta Ka E Si Agụ na Ka E Si Ede?
1 Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-eme ka mkpa ọ dị ịbụ ndị e ‘mere ka ha zuo òkè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla’ doo ndị Kraịst anya site n’ihe ọmụma ọ na-enye. (2 Tim. 3:17) N’ihi ya a na-eme ka ndị ohu Jehova nile nwezuo ihe dị mkpa site ná nzukọ dị iche iche. Ndị toruworo ogo mmadụ bụ́ ndị na-apụghị ịgụ ma ọ bụ ide ihe anọwo mgbe nile na-enweta nchebara echiche nke nzukọ Jehova. N’ihi ya e kwuru n’otu oge na magazin bụ́ U.S. Catholic na “[Ụ]lọ [N]zukọ [A]laeze ọ bụla na-enye mmụta ka ukwu [maka ndị okenye] n’otu ọnwa karịa ihe ọtụtụ ụlọ chọọchị ndị Katọlik na-enye n’otu afọ.”
2 Ụdị agụmakwụkwọ dị otú ahụ maka ndị okenye na-agụnye ịmụ ka e si agụ na ka e si ede ihe maka ndị toruworo ogo mmadụ na-amaghị agụ ihe ma ọ bụ ede ihe, tinyere ozizi Bible sara mbara nke e zubere iji kụbanye ụkpụrụ ndị dị mkpa maka ibi ndụ ndị Kraịst, gụnyere ilekọta ụmụaka n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ma gịnị ka inwezu ihe dị mkpa pụtara? Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-akọwa inwezu ihe dị mkpa dị ka ‘inye mmadụ ihe dị mkpa, iji mezuo otu nzube ma ọ bụ rụzuo otu ọrụ.’
3 Mgbe o kwusịrị na n’agbata 1962 na 1976, na a kụziere mmadụ 15,156 otú e si agụ na otú e si ede ihe, nanị na Nigeria, Teta! nke February 22, 1978, (Bekee), kwukwasịrị: “Ihe ka ukwuu n’ime ha bụ ndị si n’ime ime obodo—ndị ọrụ ugbo, ndị dinta, ndị ọkụ azụ̀, ndị odozi akụ̀. Mkpebisi ike ha inweta ihe ọmụma sitere na Bible na inwe ike ịkụziri ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ tụteghachiri ọchịchọ ha ịmụ ihe.” Lee nzube magburu onwe ya ọ bụ maka ịmụ ịgụ na ide ihe! Ọ̀ bụ na mkpebisi ike dị otú ahụ agaghị atọ Jehova ụtọ? Oleezi ngwá ọrụ dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ịkụziri ndị okenye ihe site n’usoro ihe omume anyị nke ịmụ ka e si agụ na ka e si ede ihe?
4 Ngwá Ọrụ Ndị Dị Mkpa: Jehova gwara Aịsaịa onye amụma, sị: “Were n’onwe gị otu oké mbadamba ihe, jikwa ihe mmadụ ji ede ihe odide dekwasị ya.” (Aịsaịa 8:1, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’enweghị obi abụọ ọ bụla, e mere ka onye amụma ahụ zuo òkè ịrụ ọrụ chere ya ihu. Ya mere, mgbe mmadụ kpebisiri ike ma wepụta oge, ọ ghaghị inweta ihe ndị ọ ga-eji mụọ ihe n’onwe ya: akwụkwọ ọgụgụ (How to Read and Write), akwụkwọ e ji ede ihe, nchicha, na pensịl ma ọ bụ pen maka iji ede ihe na klas. Ọ kasị mma itinye ihe ndị a n’ime akpa e debere iche maka ịmụ ihe.
5 Dị nnọọ ka nkwado nke ndị nne na nna bụ isi ihe dị mkpa iji nweta agụmakwụkwọ dị mma n’ihe banyere ụmụaka, otú ahụ ka nkwado ezinụlọ dị n’ihe banyere ndị okenye. Nkwado dị otú ahụ ga-agụnye ịkwanyere ihe onye okenye ahụ ji aga akwụkwọ ùgwù, inwe mmasị n’ọrụ ụlọ akwụkwọ ya, na ịkwado ya iji mee ka onye okenye ahụ nwee ike ịrụzu ọrụ o ji n’aka.
6 Cheedị ihe onye ọrụ ugbo ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ ịmalite otu ubi ji. Ọ ga-ebu ụzọ sụchaa ma kọọ otu ibe ala. Nke a ga-apụta inweta ọgụ na mma ogè. Mgbe ahụ ọ ga-enweta awa ji ndị dị mma. Ruo ókè ha aṅaa ka onye ọrụ ugbo ahụ ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na o nweghị ngwá ọrụ ndị dị otú ahụ dị mkpa? Ọ pụrụ inwe ihe isi ike mgbe ụfọdụ, ma ọ ga-adịrị onye ọrụ ugbo nwezuru ihe dị mkpa mfe karị ịtachi obi n’ụdị ihe ndị ahụ ruo n’oge owuwe ihe ubi. Dị ka ọ dị n’ihe banyere onye ọrụ ugbo, otú ahụ ka ọ dị onye na-amụ ka e si agụ na ka e si ede ihe—ọ ghaghị inweta ngwá ọrụ ndị dị mkpa. Lee ụdị afọ ojuju onye ọrụ ubi ga-enwe mgbe o nwetara ihe ubi dị mma, ma ọ tasịa ahụhụ! Ọ bụrụ na i denyere aha gị na klas ịmụ ka e si agụ na ka e si ede ihe, ì nwezuru ihe dị mkpa iji mụta ka e si agụ na ka e si ede?