Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/1 p. 4-8
  • Mara Jehova—Chineke Bụ́ Onye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mara Jehova—Chineke Bụ́ Onye
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova na Mosis “Ihu na Ihu”
  • Jehova—Chineke Bụ́ Onye nke Elaịja
  • Nduzi nke Mmụọ Nsọ Nyere Pọl
  • Ekweghị na Chineke Adịghị Egbochi Mmasị Onwe Onye nke Jehova
  • “Onye Iberibe” na Chineke
  • Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Sitere n’Aka Chineke Anyị Bụ́ Onye
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ị̀ Ga-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/1 p. 4-8

Mara Jehova—Chineke Bụ́ Onye

N’IJI echiche ndị Hindu banyere Chineke tụnyere nke usoro okpukpe ndị ọzọ, Dr. S. Radhakrishnan nke India na-ekwu, sị: “Chineke ndị Hibru dị iche. Ọ bụ onye, na-akpakwa ike n’akụkọ ihe mere eme ma nwee mmasị ná mgbanwe na ihe ndapụta nke ụwa a na-emepe emepe. Ọ bụ Onye Dị Adị nke na-eso anyị ekwurịta okwu.”

Aha Hibru maka Chineke nke Bible bụ יהוה, nke a na-asụgharịkarị ịbụ “Jehova.” Ọ karịrị chi nile ọzọ. Gịnị ka anyị maara banyere ya? Olee otú o si mesoo ụmụ mmadụ n’oge Bible?

Jehova na Mosis “Ihu na Ihu”

Mkpachi anya “ihu na ihu” dị n’etiti Jehova na ohu ya bụ́ Mosis, ọ bụ ezie na Mosis apụghị ịhụ Chineke n’ụzọ nkịtị. (Deuterọnọmi 34:10; Ọpụpụ 33:20) N’oge ntorobịa ya, obi Mosis dị n’ebe ụmụ Israel nọ, bụ́ ndị e ji mere ohu n’Ijipt n’oge ahụ. Ọ gbakụtara ndụ ya dị ka onye òtù nke ezinụlọ Fero azụ, “họrọ ka e mejọkọọ ya na ndị nke Chineke.” (Ndị Hibru 11:25) N’ihi ya, Jehova nyere Mosis ọtụtụ ihe ùgwù pụrụ iche.

Dị ka onye òtù nke ezinụlọ Fero, ‘e ziri Mosis ihe n’amamihe nile nke ndị Ijipt.’ (Ọrụ 7:22) Ma iji duo mba Israel, ọ dịkwa ya mkpa ịzụlite àgwà ịdị umeala n’obi, ndidi, na ịdị nwayọọ n’obi. Nke a ka o mere n’ime afọ 40 ya dị ka onye ọzụzụ atụrụ na Midian. (Ọpụpụ 2:15-22; Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Jehova, ọ bụ ezie na ọ nọgidere dị ka onye a na-apụghị ịhụ anya, kpugheere Mosis onwe ya na nzube ya, sitekwa n’aka ndị mmụọ ozi Chineke nyefere ya Iwu Iri ahụ. (Ọpụpụ 3:1-10; 19:3–20:20; Ọrụ 7:53; Ndị Hibru 11:27) Bible na-agwa anyị na “Jehova wee gwa Mosis okwu ihu na ihu, dị ka mmadụ na-agwa enyi ya okwu.” (Ọpụpụ 33:11) N’ezie, Jehova n’onwe ya kwuru, sị: “Ọnụ na ọnụ ka M ga-agwa ya okwu.” Lee ụdị mmekọrịta onwe onye, dị oké ọnụ ahịa nke Mosis sooro Chineke ya a na-apụghị ịhụ anya ma bụrụ onye nwee!—Ọnụ Ọgụgụ 12:8.

Tụkwasị n’akụkọ ihe mere eme oge gboo nke mba Israel, Mosis dekọrọ usoro Iwu ahụ tinyere nkebi ya nile. E nyefekwara ya ihe ùgwù ọzọ dị oké ọnụ ahịa—nke ide akwụkwọ Jenesis. Akụkụ ikpeazụ nke akwụkwọ ahụ bụ akụkọ ihe mere eme a maara nke ọma n’ime ezinụlọ ya, n’ihi ya ọ dịtụkwa mfe idekọ. Ma ebee ka Mosis si nweta ihe ndị dị n’akụkọ ihe mere eme kasị ochie nke mmadụ? O kwere omume na Mosis nwere ihe ochie e dere ede, ndị nna nna ya hà chekwara, iji mee ihe dị ka ebe isi nweta ihe ọmụma. N’aka nke ọzọ, ọ pụrụ inwetaworị ihe site n’ozi ọnụ ma ọ bụ kpọmkwem site ná mkpughe dị nsọ sitere n’aka Jehova. Ndị ikom na-atụ egwu Chineke n’ọgbọ nile amatawo eri mgbe mmekọrịta onwe onye nke Mosis sooro Chineke ya nwee n’akụkụ a.

Jehova—Chineke Bụ́ Onye nke Elaịja

Elaịja onye amụma makwaara Jehova dị ka Chineke bụ́ onye. Elaịja nụụrụ ofufe dị ọcha ọkụ n’obi ma jeere Jehova ozi n’agbanyeghị ịghọ onye e lekwasịrị anya maka oké ịkpọasị na mmegide site n’aka ndị na-efe Beal ofufe, chi bụ isi nke ụlọ arụsị ndị Kenean.—1 Ndị Eze 18:17-40.

Ehab, eze Israel, na nwunye ya, bụ́ Jezebel, chọrọ igbu Elaịja. N’ịtụ egwu maka ndụ ya, Elaịja gbagara Bịa-sheba, ebe ọdịda anyanwụ nke Osimiri Nwụrụ Anwụ. N’ebe ahụ ọ wagharịrị banye n’ime ọzara ma kpee ekpere ka ya nwụọ. (1 Ndị Eze 19:1-4) Jehova ọ̀ gbahapụwo Elaịja? Ò nwekwaghị mmasị n’ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi? Elaịja pụrụ icheworị otú ahụ, ma lee otú o si ghara izi ezi! Mgbe e mesịrị, Jehova jiri nwayọọ gwa ya okwu, na-ajụ, sị: “Gịnị ka ị na-eme n’ebe a, Elaịja?” Mgbe ngosipụta dị ịrịba ama nke ike karịrị nke mmadụ gasịrị, “olu ruru ya ntị [ọzọ], sị, Gịnị ka ị na-eme n’ebe a, Elaịja?” Jehova gosipụtara mmasị onwe onye a n’ebe Elaịja nọ iji gbaa ohu ya a pụrụ ịtụkwasị obi ume. Chineke nwere ọrụ ọ ga-arụkwu, Elaịja jikwa oké mmasị zaa òkù ahụ! Elaịja ji ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ọrụ ya, na-edo aha Jehova nsọ, bụ́ Chineke ya bụ́ onye.—1 Ndị Eze 19:9-18.

Mgbe ọ jụsịrị mba Israel, Jehova agwakwaghị ndị ohu ya nọ n’ụwa okwu n’onwe ya. Nke a apụtaghị na mmasị onwe onye o nwere na ha ebelatawo. Site na mmụọ nsọ ya, ọ ka na-eduzi ma na-ewusi ha ike n’ozi ya. Were, dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi, nke a maara na mbụ dị ka Sọl.

Nduzi nke Mmụọ Nsọ Nyere Pọl

Sọl si Tasọs, otu obodo ukwu a ma ama nke Silisia. Ndị mụrụ ya bụ ndị Hibru, ma a mụrụ ya dị ka nwa amaala Rom. Otú ọ dị, nzụlite Sọl kwekọrọ na nkwenkwe siri ike nke ndị Farisii. Mgbe e mesịrị, na Jerusalem, o nwere ohere ịbụ onye e ziri ihe “n’ụkwụ Gameliel,” onye nkụzi a ma ama nke Iwu ahụ.—Ọrụ 22:3, 26-28.

N’ihi ịnụ ọkụ n’obi hiere ụzọ nke Sọl nwere maka ọdịnala ndị Juu, o keere òkè n’ajọ mwakpo megide ụmụazụ Jisọs Kraịst. Ọbụna ọ kwadoro ogbugbu Stifen, onye Kraịst mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya. (Ọrụ 7:58-60; 8:1, 3) Mgbe e mesịrị o kwetara na ọ bụ ezie na ya bụ onye nkwulu na onye nsogbu na nwoke na-eme ihe ihere na mbụ, ‘e meere ya ebere, n’ihi na o mere ya n’amaghị ama n’ime ekweghị ekwe.’—1 Timoti 1:13.

Ezi agụụ maka ijere Chineke ozi kpaliri Sọl. Mgbe a tọghatasịrị Sọl ka ọ nọ n’ụzọ ije Damaskọs, Jehova jiri ya mee ihe n’ụzọ dị ike. Kraịst ahụ siworo n’ọnwụ bilie tụziiri Ananaịas, onye na-eso ụzọ bụ́ onye Kraịst oge mbụ, ka o nyere ya aka. Ka nke ahụ gasịrị mmụọ nsọ nke Jehova duziri Pọl (aha Rom e ji mara Sọl dị ka onye Kraịst) ijezu ozi dị ogologo, nke mịkwara mkpụrụ n’akụkụ nile nke Europe na Asia Minor.—Ọrụ 13:2-5; 16:9, 10.

À pụrụ ịhụta otu nduzi nke mmụọ nsọ ahụ taa? Ee, a pụrụ.

Ekweghị na Chineke Adịghị Egbochi Mmasị Onwe Onye nke Jehova

Joseph F. Rutherford bụ onye isi oche nke abụọ nke Watch Tower Society. E mere ya baptism na 1906 dị ka Onye Mmụta Bible—aha e ji mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ—a họpụtara ya ịbụ onye ndụmọdụ okwu iwu nke Society n’afọ sochiri ya, ọ ghọkwara onye isi oche ya na January 1917. Ma, n’otu oge, ọkàiwu a na-akatabeghị ahụ bụ onye na-ekweghị na Chineke. Olee otú o si ghọọ onye Kraịst na-ejere Jehova ozi nke nwere mkpali dị otú ahụ?

Na July 1913, Rutherford jere ozi dị ka onye isi oche nke mgbakọ Òtù Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile e mere na Springfield, Massachusetts, U.S.A. Otu onye nta akụkọ si n’otu ụlọ ọrụ akwụkwọ akụkọ dị n’ógbè ahụ, bụ́ The Homestead, gbara Rutherford ajụjụ ọnụ, e bipụtaghachikwara ihe ndekọ ahụ n’akụkọ nchịkọta ihe omume mgbakọ ahụ.

Rutherford kọwara na n’oge o mere atụmatụ ịlụ nwanyị, nkwenkwe okpukpe o nwere bụ ndị nke òtù okpukpe Baptist, ma ndị nke onye gaje ịbụ nwunye ya bụ nke ndị Prezibiterịan. Mgbe pastọ Rutherford kwuru na “nwanyị ahụ ga-aga ọkụ ala mmụọ n’ihi na e mikpubeghị ya na mmiri nakwa na ya [Rutherford] ga-aga eluigwe ozugbo n’ihi na e mikpuwo ya, uche ya nwere ezi izu ekwetaghị, o wee ghọọ onye na-ekweghị na Chineke.”

O were Rutherford ọtụtụ afọ nke ime nnyocha ruru ala iji wulighachi okwukwe ya na Chineke bụ́ onye. Ọ tụgharịrị uche, ka ọ sịrị, n’echiche nke bụ na “ihe uche na-anabataghị na obi ekwesịghị ịnabata ya.” Ndị Kraịst “aghaghị ijide n’aka na Akwụkwọ Nsọ nke ha kwere na ya bụ eziokwu,” ka Rutherford kọwara, na-agbakwụnye: “Ha aghaghị ịmara ntọala ha guzo n’elu ya.”—Lee 2 Timoti 3:16, 17.

Ee, ọ pụrụ ikwe onye na-ekweghị na Chineke ma ọ bụ onye na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị omume ọbụna taa inyocha Akwụkwọ Nsọ, iwulite okwukwe, na ịzụlite mmekọrịta onwe onye siri ike n’ebe Jehova Chineke nọ. Mgbe o jisịrị nlezianya mụọ Bible site n’enyemaka nke mbipụta Watch Tower bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, otu nwa okorobịa kwupụtara, sị: “Ekweghị m na Chineke mgbe m malitere ọmụmụ ihe a, ma ugbu a achọpụtara m na ihe ọmụma nke Bible agbanwewo echiche m dum. Ana m amalite ịmara Jehova na ịtụkwasị ya obi.”

“Onye Iberibe” na Chineke

“Ọ dịghị mgbe ọ batara onye ọ bụla so dee AO [Akwụkwọ Nsọ Hibru] n’obi ịnwale ma ọ bụ ịrụ ịdị adị nke Chineke ụka,” ka Dr. James Hastings na-ekwu n’ime A Dictionary of the Bible. “O kwekọghị ná mmụọ nke ụwa oge gboo n’ozuzu ya ịgọnahụ ịdị adị nke Chineke, ma ọ bụ iji arụmụka nwapụta ya. Nkwenkwe ahụ bụ ihe e tinyere n’uche mmadụ site n’okike ma bụrụ nke mmadụ nile nwere.” Otú ọ dị, nke a apụtaghị na mmadụ nile n’oge ahụ na-atụ egwu Chineke. Ọ dịghị ma ọlị. Abụ Ọma 14:1 na 53:1 kwuchara banyere “onye nzuzu,” ma ọ bụ dị ka King James Version kwuru, “onye iberibe,” nke sịworo n’obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị.”

Ụdị onye dị aṅaa ka onye iberibe a, bụ́ nwoke nke na-agọnarị ịdị adị nke Chineke bụ? Ọ bụghị onye na-enweghị ọgụgụ isi. Kama nke ahụ, okwu Hibru bụ́ na·valʹ na-atụ aka n’enweghị omume ọma. Prọfesọ S. R. Driver, n’okwu nkọwa ya e denyere na The Parallel Psalter, na-asị na mmejọ ahụ “abụghị adịghị ike nke echiche, kama enweghị mmetụta n’ụzọ omume na n’ụzọ okpukpe, oké ụkọ nke echiche, ma ọ bụ nghọta.”

Ọbụ abụ ahụ gara n’ihụ ịkọwa ndakpọ omume ọma nke si n’àgwà dị otú ahụ pụta: “Ha ebibiwo onwe ha, ha emewo ka omume ha bụrụ ihe arụ; ọ dịghị onye na-eme ezi ihe.” (Abụ Ọma 14:1) Dr. Hastings na-achịkọta okwu, sị: “N’ịdabere n’adịghị adị a nke Chineke n’ụwa na n’anataghị ntaramahụhụ, ụmụ mmadụ ghọrọ ndị rụrụ arụ ma na-akpa arụ.” Ha na-anabata ụkpụrụ asọpụrụghị Chineke n’ihu ọha ma na-elelị Chineke bụ́ onye, onye ha na-enweghị ọchịchọ ịza ajụjụ. Ma echiche dị otú ahụ bụ nke iberibe na nke nzuzu taa dị ka ọ bụkwa mgbe ọbụ abụ ahụ dere okwu ya ihe karịrị afọ 3,000 gara aga.

Ịdọ Aka ná Ntị Ndị Sitere n’Aka Chineke Anyị Bụ́ Onye

Ka anyị laghachi ugbu a n’ajụjụ ndị e welitere n’isiokwu mmeghe anyị. Gịnị mere ọtụtụ mmadụ enweghị ike ijikọ Chineke bụ́ onye na ahụhụ ndị juru n’ụwa taa?

Bible nwere ihe ọmụma e dere ede sitere n’aka ndị ikom ndị “sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:21) Nanị ya na-ekpughere anyị Chineke bụ́ onye, bụ́ Jehova. Ọ na-adọkwa anyị aka ná ntị banyere otu onye ọjọọ, mmadụ na-apụghị ịhụ anya, onye dị ike n’iduzi na ịchịkwa echiche mmadụ—Setan bụ́ Ekwensu. N’ụzọ ezi izu dị na ya, ọ bụrụ na anyị ekweghị na Chineke bụ́ onye, olee otú anyị pụrụ isi kwere na e nwekwara Ekwensu, ma ọ bụ Setan bụ́ onye?

N’okpuru ike mmụọ nsọ Jọn onyeozi dere, sị: “Onye a na-akpọ Ekwensu na Setan . . . na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Mgbe e mesịrị Jọn sịrị: “Anyị matara na anyị bụ ndị si na Chineke pụta, ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Okwu ndị a na-egosipụta okwu Jisọs, bụ́ okwu ndị Jọn dekọrọ n’onwe ya n’Oziọma ya: “Onye isi nke ụwa nke a na-abịa: ọ dịghịkwa ihe ọ bụla o nwere n’ime m.”—Jọn 14:30.

Lee otú ozizi Akwụkwọ Nsọ a si dị nnọọ iche n’ihe ndị mmadụ kwere ugbu a! “Ikwu banyere Ekwensu adịghị nnọọ ewu ewu taa. Ọgbọ sayensị anyị, nke na-enyokwa ihe enyo achụlawo Setan,” ka Catholic Herald na-ekwu. Ma, Jisọs kwuru n’ụzọ dị ike gwa ndị ikom ahụ nwere nzube igbu ya, sị: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime.”—Jọn 8:44.

Ezi uche dị ná nkọwa Bible banyere ike Setan. Ọ na-eme ka a ghọta ihe mere na, n’agbanyeghị ọchịchọ nke ihe ka ukwuu n’ụmụ mmadụ ibi n’udo na nkwekọ, ịkpọasị, agha, na ime ihe ike na-abaghị uru na-eti ụwa ihe otiti, dị ka e gosipụtara na Dunblane (nke a kpọrọ aha na peji nke 3 na nke 4). Ọzọkwa, Setan abụghị nanị otu onye iro nke anyị na-aghaghị ịgbaso mgba. Bible na-enyekwu ịdọ aka ná ntị banyere ndị bụ ekwensu, ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ—ndị ajọ mmụọ e kere eke ndị sonyeere Setan eri mgbe dị anya gara aga iji duhie ma metọọ ihe a kpọrọ mmadụ. (Jud 6) Jisọs Kraịst chere ike nke ndị mmụọ a ihu ọtụtụ ugbo, o nwekwara ike imeri ha.—Matiu 12:22-24; Luk 9:37-43.

Ezi Chineke, bụ́ Jehova, ezubewo iwepụ ajọ omume n’ụwa a, n’ikpeazụkwa kpochapụ ọrụ nile nke Setan na nke ndị mmụọ ọjọọ ya. Dabere n’ihe ọmụma anyị nwere banyere Jehova, anyị pụrụ inwe okwukwe na ntụkwasị obi siri ike ná nkwa ya nile. Ọ na-asị: “Ọ dịghị chi ọzọ e buru Mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ. Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Jehova; ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị ma ọ bụghị nanị m.” Jehova bụ n’eziokwu Chineke bụ́ onye nye ndị nile maara, na-efe, ma na-ejere ya ozi. Anyị pụrụ ilegara ya anya, nanị ya kwa, maka nzọpụta anyị.—Aịsaịa 43:10, 11.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ihe osise a kanyere n’ihe na narị afọ nke 18 nke na-egosi Mosis ka ọ na-ede Jenesis 1:1 n’okpuru ike mmụọ nsọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site na The Holy Bible nke J. Baskett, Oxford, dere

[Foto dị na peeji nke 8]

Jisọs Kraịst meriri ndị mmụọ ọjọọ ọtụtụ ugbo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya