Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yc ihe ọmụmụ 7 p. 16-17
  • È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?
  • Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ò Nwere Mgbe Owu Na-ama Gị na Mgbe Egwu Na-atụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ị̀ Ga-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
yc ihe ọmụmụ 7 p. 16-17
Ebe otu nwatakịrị nọ naanị ya, ụjọ ana-atụ ya

ISI NKE 7

È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?

Ị̀ hụrụ nwatakịrị nwoke a e sere ebe a? Ụjọ ji ya. Ọ dịkwa ya ka e nweghị onye ga-enyere ya aka. È nwetụla mgbe ụjọ tụrụ gị, ya adị gị ka e nweghị onye ga-enyere gị aka?— O nweghị onye ụjọ na-anaghị atụ. Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ụjọ tụrụ ụfọdụ ndị enyi Jehova, ya adị ha ka e nweghị onye ga-enyere ha aka. Otu onye n’ime ha bụ Ịlaịja. Ngwa, ka anyị gụọ banyere ya.

Eze Nwaanyị Jezibel ji iwe na-aba mba

Jezibel chọrọ igbu Ịlaịja

Tupu a mụọ Jizọs, Ịlaịja biri n’Izrel. Eze na-achị Izrel n’oge ahụ bụ Ehab. Aha nwunye ya bụ Jezibel. Ha abụọ anaghị efe Jehova, kama ha na-efe arụsị a na-akpọ Bel. Nke a mere ka ọtụtụ ndị Izrel na-efe Bel. Jezibel bụ ajọ mmadụ. Obi adịghịkwa ya mma na ụfọdụ ndị Izrel na-efe Jehova. Ọ bụ ya mere o ji chọwa otú ọ ga-esi gbuo Ịlaịja na ndị ọzọ na-efe Jehova. Ị̀ ma ihe Ịlaịja mere mgbe ọ nụrụ na a chọrọ igbu ya?—

Ịlaịja gbapụrụ n’obodo ahụ gaa zoo n’ọgba dị n’ọzara. Gịnị ka i chere mere o ji gbaa ọsọ?— Ọ bụ maka na ụjọ nọ na-atụ ya. Ma, o kwesịghị ịtụ ụjọ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ọ ma na Jehova ga-enyeliri ya aka. E nwere mgbe ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọkụ sị n’eluigwe rechapụ ihe o ji chụọrọ ya àjà. Jehova mekwara ya. Ọ bụ ya mere na Ịlaịja ekwesịghị ịtụ ụjọ.

Jehova si n’eluigwe zite ọkụ iji zaa ekpere Ịlaịja. Ebe Ịlaịja nọ n’ọgba. Ebe obi na-atọ Ịlaịja ụtọ mgbe Jehova gbara ya ume

Olee otú Jehova si nyere Ịlaịja aka?

Mgbe Ịlaịja nọ n’ọgba ahụ, Jehova jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka ị na-eme ebe a?’ Ya asị: ‘Ọ bụ naanị m na-efe gị. Ụjọ na-atụkwa m na a ga-egbu m.’ Ịlaịja chere na e gbuchaala ndị niile na-efe Jehova. Ma, Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị eziokwu. A ka nwere puku mmadụ asaa ndị na-efe m. Atụla egwu. E nwere ihe ndị ị ka ga-arụrụ m.’ Ì chere na obi dị Ịlaịja ụtọ mgbe ọ nụrụ ihe a Chineke kwuru?—

Olee ihe ị mụtara n’aka Ịlaịja?— I kwesịghị ịna-atụ ụjọ ma ọ bụ na-eche na o nweghị onye ga-enyeliri gị aka. Ndị enyi gị ga-enyere gị aka. Ha hụrụ Jehova n’anya, hụkwa gịnwa n’anya. Chetakwa na e nweghị onye ka Jehova ike. Ọ ga-enyekwara gị aka. Obi ọ̀ dị gị ụtọ na Jehova ga na-enyere gị aka mgbe niile?—

GỤỌ EBE NDỊ A NA BAỊBỤL GỊ

  • 1 Ndị Eze 19:3-18

  • Abụ Ọma 145:18

  • 1 Pita 5:9

AJỤJỤ:

  • Mgbe Ịlaịja nọ ndụ, ọ̀ bụ ndị Izrel niile na-efe Jehova? Gịnị ka ha na-efe?

  • Olee ihe mere Ịlaịja ji gbapụ gaa zoo n’ọgba?

  • Gịnị ka Jehova gwara Ịlaịja?

  • Olee ihe anyị mụtara n’aka Ịlaịja?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya