Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 4/1 p. 24-25
  • Ò Nwere Mgbe Owu Na-ama Gị na Mgbe Egwu Na-atụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ò Nwere Mgbe Owu Na-ama Gị na Mgbe Egwu Na-atụ Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Nwere Mgbe Ụjọ Na-atụ Gị, Ya Adị Gị Ka E Nweghị Onye Ga-enyere Gị Aka?
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • Chineke Ya Kasiri Ya Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ị̀ Ga-ekwesị Ntụkwasị Obi Dị Ka Elaịja?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 4/1 p. 24-25

Kụziere Ụmụ Gị Ihe

Ò Nwere Mgbe Owu Na-ama Gị na Mgbe Egwu Na-atụ Gị?

OWU na-ama ọtụtụ ndị n’oge a; ha na-eche na ọ dịghị onye na-eche banyere ha n’ezie. Ndị agadi na-echekarị otú ahụ. Ma, owu na-ama ọtụtụ ụmụaka taa, na-amakwa ọbụna ọtụtụ ndị na-efe Chineke, ụjọ na-atụkwa ha. Ị̀ maara ihe kpatara ya?—a

E nwere ike inwe ọtụtụ ihe kpatara ya. Ka anyị tụlee ihe atụ nke otu nwoke dịrị ndụ ogologo oge gara aga, ya bụ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu puku afọ tupu a mụọ Jizọs. Aha ya bụ Ịlaịja. Ọ dịrị ndụ mgbe ndị Izrel hapụrụ ife ezi Chineke, bụ́ Jehova. Ihe ka ọtụtụ amalitela ife chi ụgha bụ́ Bel. Ịlaịja kwuru, sị: “Ọ fọdụrụ naanị m.” Ma, ì chere na Ịlaịja bụ naanị onye na-efe Jehova fọdụrụnụ?—

Ndị ọzọ nọ n’Izrel ka na-efe ezi Chineke, ọ bụ eziokwu na Ịlaịja amaghị. Ma ha zoro ezo. Ha na-atụ ụjọ. Ị̀ maara ihe kpatara ya?—

Ehab, bụ́ eze Izrel, anaghị efe Jehova; ọ na-efe Bel, bụ́ chi ụgha nke nwunye ọjọọ ya Ehab, bụ́ Jezibel. N’ihi ya, ya na Ehab nọ na-agba mbọ ịchọta ndị na-efe Jehova, nke ka nke Ịlaịja, ka ha gbuo ha. Nke ahụ mere ka Ịlaịja gbaa ọsọ. Ọ gara ije ihe fọrọ nke nta ka o ruo narị kilomita anọ na iri asatọ na atọ ruo n’ọzara Horeb, bụ́ ebe a na-akpọkwa Saịnaị na Baịbụl. Ọ bụ n’ebe ahụ ka Jehova nyere ndị ya Iwu Iri na iwu ndị ọzọ ọtụtụ narị afọ tupu oge Ịlaịja. Ịlaịja zoro naanị ya n’ọgba dị na Horeb. Ì chere na Ịlaịja kwesịrị ịtụ ụjọ?—

Baịbụl gosiri na tupu oge ahụ, Jehova ji Ịlaịja rụọ nnukwu ọrụ ebube dị iche iche. E nwere mgbe Jehova zara ekpere Ịlaịja kpere ka o si n’eluigwe zite ọkụ ga-erepịa àjà Ịlaịja chụụrụ ya. Jehova si otú ahụ gosi na ọ bụ Ya bụ ezi Chineke, ọ bụghị Bel. Ugbu a, ka Ịlaịja nọ n’ọgba ahụ, Jehova gwara ya okwu.

Jehova jụrụ ya, sị: “Gịnị ka ị na-eme n’ebe a?” Ọ bụ mgbe ahụ ka Ịlaịja kwuru, sị, ‘Ọ bụ naanị m fọrọ n’ime ndị na-efe gị.’ Jehova ji obiọma gbazie Ịlaịja, gwa ya, sị, ‘M ka nwere puku mmadụ asaa na-efe m.’ Jehova gwara Ịlaịja ka ọ laghachi, kọwaara ya na Ya ka nwere ọrụ ọ ga-arụrụ Ya.

Olee ihe i chere anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya Ịlaịja?— Ndị na-efe Jehova nwedịrị ike ịtụ ụjọ. N’ihi ya, anyị niile, ma ụmụaka ma ndị toro eto, kwesịrị icheta ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Baịbụl kwere nkwa, sị: “Jehova nọ ndị niile na-akpọku ya nso.”

E nwere ihe ọzọ anyị ga-amụta na ya: Anyị nwere ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị n’ebe niile, bụ́ ndị hụrụ Jehova n’anya, hụkwa anyị n’anya. Baịbụl kwuru, sị: “Òtù ụmụnna [anyị] niile ndị nọ n’ụwa na-ata ụdị ahụhụ a [anyị] na-ata.” Obi ọ́ dịghị gị ụtọ ịmara na o nweghị mgbe anyị nọ naanị anyị?—

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

1 Ndị Eze 19:3-18

Diuterọnọmi 5:1-22

Abụ Ọma 145:18

1 Pita 5:9

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya