Ekwela Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Funarị Gị
“Ebe mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.”—2 NDỊ KỌRINT 3:17.
1. Gịnị mere Aịsaịa 65:13, 14 ji mezuo n’ebe Ndịàmà Jehova nọ?
JEHOVA bụ Chineke nke nnwere onwe. Lee nnọọ aha ngọzi nke nnwere onwe Chineke nyere bụ! N’ihi na ndị na-ejere ya ozi nwere ụdị nnwere onwe ahụ, okwu nke a nke Eze Onyenwe anyị Jehova na-emetụta ha: “Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu: Lee, ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga-akpọ unu onwe unu nkụ: lee, ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga-eme unu onwe unu: Lee, ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma, ma unu onwe unu ga-eti mkpu site n’ihe mgbu nke obi, unu ga-esitekwa ná ntiwa nke mmụọ unu kwasie ákwà ike.”—Aịsaịa 65:13, 14.
2. Gịnị mere ndị Jehova ji na-aba ụba n’ụzọ ime mmụọ?
2 Ndị nke Chineke na-eri uru ọnọdụ ịba ụba ime mmụọ nke a n’ihi na ha bụ ndị mmụọ, ma ọ bụ ike ọrụ ya na-edu. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ Mmụọ ahụ: ma ebe mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrịnt 3:17) Gịnị bụ nzube nke nnwere onwe nke Chineke nyere? Gịnịkwa ka a chọrọ anyị n’aka iji jiri ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu?
Nnwere Onwe nke Chineke Nwere
3. Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka Chineke nwere, n’ihi gịnịkwa?
3 Nanị Jehova nwere nnwere onwe a na-akparaghị ókè. Ọ dịghị otu n’ime ihe ndị o kere eke pụrụ ịkpara nnwere onwe ya ókè n’ihi na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile na Ọkaaka Elu na Ala. Dị ka nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job kwuru: “Ònye ga-eme ka ọ laghachi azụ? Ònye ga-asị ya, Gịnị ka ị na-eme?” (Job 9:12) N’otu aka ahụ, Eze Babilọn bụ Nebukadneza, bụ onye arụgidere ikweta, sị: “Ọ dịghịkwa onye ga-eti aka ya ihe, sị ya, Gịnị ka i meworo?”—Daniel 4:35.
4. Olee otú o si bụrụ na Jehova adịghị ekwe ka nnwere onwe ya gafee ókè?
4 Otú ọ dị, ụkpụrụ ezi omume nke Jehova n’onwe ya na-akpara nnwere onwe ya ahụ na-enweghị nsọtụ ókè. E mere ihe atụ nke a mgbe Abraham kwupụtara nchegbu banyere ndị bi na Sọdọm ma jụọ, sị: “Onye ikpe ụwa nile, Ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?” Nzaghachi Chineke gosiri na ọ ghọtara ibu ọrụ nke ime ezi ihe. Ọ garaghị ebibi Sọdọm ma ọ bụrụ na onye na-eme ezi omume fọdụrụ n’ime ya. (Jenesis 18:22-33) Chineke na-akpakwara nnwere onwe ya ókè n’ihi na ịhụnanya na amamihe ya na-eme ya ka ọ ghara iwe iwe ọsọsọ, ọ na-enwekwa njide onwe onye.—Aịsaịa 42:14.
Ịkpa Ókè Dị Iche Iche nke Nnwere Onwe Mmadụ
5. Olee ụfọdụ ihe ndị na-akpara nnwere onwe nke mmadụ ókè?
5 Ọ bụ ezie na Jehova nwere nnwere onwe na-enweghị nsọtụ, ndị ọzọ nile na-eme ihe n’agabigaghị ikpa ókè nile nke otú e si kee ha, ikike, gburugburu ebe obibi, nakwa ụdị ihe ndị dị ka afọ ndụ dị ugbu a nke a kpara ókè nke ndị mmadụ na-eme mmehie. Chineke ji nnwere onwe zuru ókè kee mmadụ iji mee ihe na-agafereghị ókè Jehova setipụụrụ ya. Enwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere nnwere onwe nke ụmụ mmadụ ji bụrụ nke a kpara ókè, ọ bụghị nke na-enweghị nsọtụ.
6. Mmetụta dị aṅaa ka ịza ajụjụ nye Chineke nwere n’ebe nnwere onwe anyị dị?
6 Mbụ, a kpaara nnwere onwe nke mmadụ ókè n’ihi na Chineke kere mmadụ imezu nzube Ya. Jehova “kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.” (Mkpughe 4:11) Ya mere mmadụ ga-aza ajụjụ n’ihu Onye Mere ya, bụ́ onye meworo ọtụtụ iwu n’ụzọ ziri ezi nke ga na-achị ụmụ mmadụ. N’Israel oge ochie n’okpuru Iwu Mosis, Chineke na-achọ ka e gbuo ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ha ekwutọọ aha ya ma ọ bụ mebie iwu Ụbọchị Izu Ike. (Ọpụpụ 20:7; 31:14, 15; Levitikọs 24:13-16; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36) Ọ bụ ezie na dị ka ndị Kraịst anyị anọghị n’okpuru Iwu ahụ, a kpaara nnwere onwe anyị ókè n’ihi na anyị ga-aza ajụjụ nye Jehova, bụ́ Onye Ikpe anyị, Onye Na-enye anyị Iwu, na Eze anyị.—Aịsaịa 33:22; Ndị Rom 14:12.
7, 8. (a) Olee otú iwu okike si akpara nnwere onwe mmadụ ókè? (b) Olee iwu Chineke ndị ọzọ na-akpara nnwere onwe anyị ókè dị ka mmadụ?
7 Nke abụọ, nnwere onwe mmadụ bụ ihe a kpaara ókè n’ihi iwu okike nke Chineke. Iji maa atụ, n’ihi iwu nke ike ndọda, mmadụ apụghị isi n’elu ụlọ elu dị oké elu wụpụ n’egbughị ma ọ bụ n’emerụghị onwe ya ahụ. N’ụzọ doro anya, iwu okike nke Chineke na-akpara nnwere onwe mmadụ ókè ime ụfọdụ ihe.
8 Nke atọ, nnwere onwe nke mmadụ bụ nke a kpara ókè n’ihi iwu omume ọma nke Chineke. Ị ghaghị ịchọpụtaworị mmezu nke ihe Pọl dere na Ndị Galetia 6:7, 8: “Unu ekwela ka eduhie unu; Chineke abụghị onye a na-elelị: n’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi. N’ihi na onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi; ma onye na-agha mkpụrụ nye mmụọ nsọ ga-esite na mmụọ nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.” Dị ka ihe a na-agaghị arụ ụka banyere ya, iwu omume ọma nile nke Jehova Chineke na-akpakwara nnwere onwe anyị ókè, ma ọ chọrọ irubere ha isi iji nwee ndụ.
9. Olee otú anyị ịbụ akụkụ nke ọha mmadụ na-esi akpara nnwere onwe anyị ókè?
9 Nke anọ, nnwere onwe nke mmadụ bụ ihe a kpara ókè n’ihi na ọ bụ akụkụ nke ọha mmadụ. Ya mere, o kwesịrị inwere onwe ya nanị ruo n’ókè nke nnwere onwe ya na-adịghị emegide nke ndị ọzọ n’ụzọ na-adịghị mma. Ndị Kraịst kwesịrị ido onwe ha n’okpuru “ndị na-achị isi” nke gọọmenti, na-erubere ha isi ọ bụrụhaala na ha achọghị ka anyị mebie iwu Chineke. (Ndị Rom 13:1; Ọrụ 5:29) Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị irube isi n’iwu nile banyere ịtụ ụtụ isi, ókè anyị ga-agbadebe n’ọsọ mgbe anyị na-akwọ ụgbọ ala, na ihe ndị ọzọ. Eziokwu ahụ bụ́ na anyị aghaghị irubere iwu ndị dị otú ahụ nke “Siza” isi gara n’ihu igosi na nnwere onwe nke Chineke nyere anyị abụghị nke na-enweghị nsọtụ.—Mak 12:17; Ndị Rom 13:7.
N’ihi Gịnị Ka O Ji Bụrụ Nnwere Onwe a kpaara Ókè?
10, 11. N’ihi gịnị ka Jehova ji nye ndị mmadụ nnwere onwe a kpara ókè?
10 N’ihi gịnị ka Chineke ji nye ụmụ mmadụ nnwere onwe a kpaara ókè? Otu ihe kpatara nke a bụ́ ka Onye Okike nwee ike inwe ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi n’elu ala bụ ndị ga-ewetara ya otuto na nsọpụrụ site n’okwu na omume ọma ha. Ụmụ mmadụ pụrụ ime nke a, ebe ụmụ anụmanụ na-apụghị ime ya. Ụmụ anụmanụ bụ́ ndị amamihe ebumpụta ụwa na-achikwa, amaghị ihe ọ bụla banyere omume ọma. Ị pụrụ inye nkita ọzụzụ ka ọ ghara iwe ihe, ma ị pụghị ikụziri ya ihe mere izu ohi ji dị njọ. Anụmanụ n’ịbụ nke omume ya bụ nke e kenyere n’ime ya, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, apụghị ime mkpebi na-ewetara Chineke otuto na nsọpụrụ, ebe mmadụ pụrụ inwere onwe ya ịhọrọ ife Onye kere ya n’ihi ịhụnanya na igosi obi ekele.
11 Chineke nyekwara ụmụ mmadụ nnwere onwe nke a maka abamuru na obi ụtọ ha. Ha pụrụ iji nnwere onwe ha a kpara ókè mee ihe site n’ịrụpụta na ichepụta ihe, ime ihe ọma na isoro ndị ọzọ na-emekọ ihe ọnụ. Ụmụ mmadụ nwekwara nnwere onwe nke ime nhọrọ n’ụdị ihe ndị dị ka aka ọrụ na ebe obibi. Taa, ihe banyere akụ na ụba na okwu ọchịchị na-ewetakarị ịkpa ókè ahụ nke ime nhọrọ, ma nke a pụkwara ịbụ n’ihi anyaukwu mmadụ, ọ bụghị n’ihi ụzọ Chineke si kee ihe a kpọrọ mmadụ na mbụ.
12. Gịnị mere ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ji nọrọ n’agbụ?
12 Ọ bụ ezie na Jehova nyere mmadụ nnwere onwe dị ukwuu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ taa nọ n’ịbụ ohu nke na-eweta ndakpọ olileanya. Gịnị mere? Mmadụ abụọ mbụ, Adam na Iv, bụ ndị nzube nke nnwere onwe Chineke nyere funarịrị. Ha gafere ókè nile Chineke kpaara nnwere onwe ha ma maa iru eru nke ịchịisi Chineke n’ebe ha nọ dị ka Eze Onyenwenụ, bụ́ Jehova aka. (Jenesis 3:1-7; Jeremaịa 10:10; 50:31) N’ihi enweghị afọ ojuju iji nnwere onwe ha mee ihe iwetara Chineke nsọpụrụ, ha jiri ya mee ihe n’ụzọ ọchịchọ onwe onye nanị, ikpebiri onwe ha ihe dị mma na ihe dị njọ, si otú a wee sonyere Setan ná nnupụisi ya megide Jehova. Otú ọ dị, kama inwetawanye nnwere onwe, ndị mmehie ahụ bụ́ Adam na Iv, bụ ndị e mere ka ha nọrọ n’okpuru iwu ndị na-etinye ihe mgbochi na ịbụ ohu, mbelata nke nnwere onwe ha, na n’ikpeazụ ọnwụ. Ụmụ ha ketara ntụfu nke a nke nnwere onwe ahụ. “N’ihi na mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.”—Ndị Rom 3:23; 5:12; 6:23.
13. Gịnị mere Setan ji nwee ike ijide ndị mmadụ n’ohu?
13 N’ihi nnupụisi ahụ n’Iden, Adam na ụmụ ya banyekwara n’agbụ nke Setan bụ́ Ekwensu. Ee, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ”! (1 Jọn 5:19) Ọ bụ n’ihi ike na ikike ka ukwuu o nwere mere Setan ji nwee ike ịghọgbu na ime ka mmadụ nile ndị wepụrụ onwe ha n’ebe Chineke nọ ghọọ ohu ya. Ọzọkwa, ụmụ mmadụ ndị nwere ọchịchọ nke onwe ha nanị achịwo mmadụ ibe ha ruo n’ókè nke imegbu ha. (Eklisiastis 8:9) Ya mere, ụmụ mmadụ n’ọha nọ ugbu a n’agbụ nke mmehie na ọnwụ, nke Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, nakwa nye usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ na ụba, na okpukpe nke ụwa.
E Mere Ka Ezi Nnwere Onwe Bụrụ Ihe Kwere Mee
14. Olileanya ihe a kpọrọ mmadụ maka ezi nnwere onwe bụ nke e jikọrọ ya na gịnị?
14 Inweta nnwere onwe pụọ ná mmehie, ọnwụ, na Ekwensu na ụwa ya bụ nke e jikọtara ya na mkpebi siri ike nke Chineke mere idozi ihe ise okwu banyere izi ezi nke ịbụ ọkaaka ya nke eluigwe na ụwa. N’ihi na Setan welitere isi okwu a, Jehova ekwerewo ka ọ nọrọ ndụ, ọbụna dị ka O kwere ka Fero nọrọ ndụ ruo nwa mgbe. Nke a bụ iji mee ka Jehova gosipụta ike ya n’ụzọ zuru ezu, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile. (Ọpụpụ 9:15, 16) N’oge n’adịghị anya Chineke ga-eme ihe iji wepụ aha ya n’ụta dị ka Ọkaaka nke Eluigwe na ụwa ma mee ka aha nsọ ya bụrụ ihe e doro nsọ site n’iwepụ nkọcha nke nnupụisi nke Setan, Adam, na Iv wetaara ya. Ya mere, a ga-atọhapụ ndị ahụ na-atụ egwu Jehova site n’agbụ nke mmehie na ọnwụ ma bụrụ ndị a ga-eduba n’ime ụwa ọhụrụ nke nnwere onwe Chineke nyere.—Ndị Rom 8:19-23.
15. Òkè dị aṅaa ka Jisọs keere ná mweghachị nke nnwere onwe nye ihe a kpọrọ mmadụ?
15 Iji weghachiri ihe a kpọrọ mmadụ nnwere onwe, Chineke zitere Ọkpara ya n’elu ala dị ka mmadụ. Site n’inye ndụ mmadụ ya zuru ókè n’afọ ofufo, Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs Kraịst, wetara àjà mgbapụta ahụ, ihe mgbakwasị ụkwụ nke ime ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ha. (Matiu 20:28) Ọ kpọsakwara ozi nke nnwere onwe. Ná mmalite nke ije ozi ya, ọ kọwara na okwu ndị a mezuru n’ebe ọ nọ: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; o zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ịkpọsa mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ.”—Aịsaịa 61:1; Luk 4:16-21.
16. Olee ihe ndị Juu narị afọ mbụ mere iji nweta ezi nnwere onwe?
16 Olee otú ndị mmadụ pụrụ isi nweta nnwere onwe ahụ? Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” Ya mere, ndị na-eso ụzọ Jisọs anọrọwo na-eri uru nnwere onwe ime mmụọ. (Jọn 8:31, 32, 36) Jisọs gakwara n’ihu ịgwa onye ọchịchị Rom bụ Pọntịọs Paịlet, sị: “A mụwo mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka m wee gbaara eziokwu àmà. Onye ọ bụla sitere n’eziokwu ahụ na-anụ olu m.” (Jọn 18:37) Ndị Juu nakweere eziokwu ahụ dị ka Jisọs si kwusaa ya ma gosi ihe nlereanya ya, chegharịrị site na mmehie ha nile, mezie ụzọ njehie ha, nye Jehova onwe ha, ma bụrụ ndị e mere baptism dị ka e meworo Jisọs. (Matiu 3:13-17; Ọrụ 3:19) N’ụzọ dị otú a ha bụ ndị nwere nnwere onwe a kpaara ókè nke Chineke nyere.
17. Gịnị mere Jehova ji enye ndị ohu ya nnwere onwe?
17 Jehova na-enye ndị na-ejere ya ozi na-eguzosi ike n’ihe nnwere onwe n’ihi iwepụ ọkaaka ya n’ụta ma tinyekwara ntụsara ahụ na abamuru ha. Ọ tọhapụrụ ndị Israel site n’agbụ ndị Ijipt ka ha wee too ya dị ka alaeze nke ndị nchụàjà, ndịàmà ya. (Ọpụpụ 19:5, 6; Aịsaịa 43:10-12) N’otu aka ahụ, Jehova kpọpụtara ndị ya pụọ na ndọrọ n’agha nke ndị Babilọn n’ụzọ bụ isi iji wughachi ụlọ nsọ ya ma weghachi ezi ofufe. (Ezra 1:2-4) Mgbe ndị ahụ a dọrọ n’agha tinyere onwe ha nanị ná nchuso nke ihe onwunwe na-enye ntụsara ahụ, Jehova zigara ndị amụma ya bụ́ Hagaị na Zekaraịa ịkpọtụrụ ha uche n’ibu ọrụ ndị ha nwere n’ebe Chineke nọ. Ile nnwere onwe nke Chineke nyere ha anya n’ụzọ ziri ezi mere ka e wusịa ụlọ nsọ ahụ, maka otuto nke Chineke, nakwa ntụsara ahụ na n’ọdịmma nke ndị ya.
Ime Ka Nzube nke Nnwere Onwe nke Chineke Nyere Ghara Ifunarị Anyị
18. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo na ndị ohu Jehova nke oge a ekweghị ka nzube nnwere onwe nke Chineke nyere ha fụnarị ha?
18 Gịnị banyere ndị na-ejere Chineke ozi n’oge a? Dị ka otu nzukọ, ha ekweghị ka nzube nke nnwere onwe Chineke nyere funarị ha. N’afọ ndị 1870 ha malitere na-enwere onwe ha pụọ na njehie nke Babilọn na inwe nnwere onwe ndị Kraịst nke na-abawanye ụba. Nke a bụ ná nkwekọ nke Ilu 4:18, nke kwuru, sị: “Ma okporo ụzọ ndị ezi omume dị ka ìhè na-enwu enwu, nke na-amụ aga n’ihu n’ihu ruo mgbe chi bọchara.” Ma, dị ka a dọkpụụrụ ndị Chineke nke oge ochie n’agha gaa na Babilọn ruo nwa oge, na 1918 ndị na-ejere Jehova ozi bara n’agbụ nke Babilọn Ukwu ahụ ruo n’ókè ụfọdụ. (Mkpughe 17:1, 2, 5) Ndị òtù nke alaeze okpukpe ụgha ahụ ṅụrịrị ọṅụ mgbe “ndịàmà abụọ” ahụ nke ihe atụ tọgbọọrọ dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ. Ma site n’obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ, na 1919 ndị na-ejere ya ozi e tere mmanụ dịghachikwara ndụ ma nwerekwa onwe ha n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 11:3, 7-11) N’itinye nnwere onwe Chineke nyere n’ọrụ, ha ghọrọ ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi nke Onye Kasị Elu. Ya mere, lee ka o si kwesi ekwesi na ha, na 1931, ji obi ụtọ nabata aha ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova! (Aịsaịa 43:10-12) Karịsịa kemgbe 1935 Ndịàmà ahụ e tere mmanụ abụrụwo ndị “oké ìgwè mmadụ” sonyere, bụ́ ndị nwere olileanya nke inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ha adịghịkwa ekwe ka nzube nke nnwere onwe Chineke nyere ha funarị ha.—Mkpughe 7:9-17.
19, 20. (a) Olee otu ụzọ dị ịrịba ama nke ndị Jehova jiworo nnwere onwe Chineke nyere ha mee ihe n’ụzọ bara uru? (b) N’ụzọ ọzọ dịkwa ịrịba ama dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova si eji nnwere onwe nke Chineke nyeworo ha eme ihe n’ụzọ bara uru?
19 Ndị Jehova na-eji nnwere onwe Chineke nyere ha eme ihe n’ụzọ abụọ bara uru kwesịrị ịrịba ama karịsịa. Na mbụ, ha na-eji ya eme ihe n’ichuso ụzọ kwụ ọtọ. (1 Pita 2:16) Lee nnọọ aha ọma ha nwere! Dị ka ihe atụ, otu nwoke batara n’ime Ụlọ Nzụkọ Alaeze na Zurich, Switzerland, ma kwuo na ya chọrọ ịbụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Mgbe a jụrụ ya n’ihi gịnị, o kwuru na nwanne ya bụbu Onyeàmà, na a chụpụwokwa ya n’ọgbakọ n’ihi omume rụrụ arụ. O kwuru sị, ‘Nke a bụ nzukọ nke m chọrọ isonyere—nke na-adịghị anakwere omume ọjọọ.’ E nwere ezi ihe mere New Catholic Encyclopedia ji kwuo na Ndịàmà Jehova enwewo aha ọma nke ịbụ “otu n’ime òtù ndị kachasị akpa ezi àgwà n’ụwa.”
20 Ndịàmà Jehova na-ejikwa nnwere onwe Chineke nyere ha eme ihe n’ụzọ bara uru site n’irube isi n’iwu e nyere ha ikwusa ozi ọma nke Alaeze, dị ka Jisọs kwusara. (Matiu 4:17) Site n’okwu ọnụ na akwụkwọ ndị e biri ebi, ma mgbe ha na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ná mberede, ha na-akpọsa Alaeze Jehova. Site n’ime otú a, ha na-erite uru n’ụzọ dị ukwuu site n’ime ka okwukwe ha siwanye ike na ime ka olileanya ha na-apụtawanye ìhè. Ọzọkwa, ọrụ a na-eme ihe n’izọpụta ma ha ma ndị na-ege ha ntị. (1 Timoti 4:16) N’ihe banyere ọrụ a, akwụkwọ bụ́ Dynamic Religious Movements na-ekwu, sị: “Ọ ga-esi ike ịhụ ndị òtù ọzọ na-arụsi ọrụ ike n’okpukpe ha dị ka Ndịàmà na-arụ.”
21. Olee ihe àmà e nwere na Jehova na-agọzi ije ozi nke ndị ya?
21 Lee otú Jehova si na-agọzi anyị n’imezu nzube nke nnwere onwe Chineke nyere anyị! A pụrụ ịhụ nke a site n’ihe ndekọ ozi ubi nke afọ gara aga—ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ihe karịrị nde ndị nkwusa Alaeze anọ, na-enwe ihe karịrị nde mmadụ iri ndị bịara Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs. N’otu nnyocha e mere, Ireland enwewo ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa kasị elu dị 29 n’esepụghị aka kwa ọnwa; Mexico enwewo ọnụ ọgụgụ kasị elu dị 78 n’ime 80 ọnwa; Japan enwewokwa ọnụ ọgụgụ kasị elu dị 153 n’esepụghị aka kwa ọnwa!
Jiri Nnwere Onwe Chineke Nyere Gi Mee Ihe N’ụzọ Bara Uru
22. Olee isi ihe dị n’ụfọdụ ajụjụ ndị na-akpali iche echiche nke anyị pụrụ ịjụ onwe anyị?
22 Ọ bụrụ na ị bụ otu onye n’ime Ndịàmà Jehova raraworo onwe ya nye, ị na-eji nnwere onwe ahụ nke Chineke nyeworo gị eme ihe n’ụzọ bara uru? Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ onwe ya sị: ‘Àna m elezi anya na-eji nnwere onwe nke Chineke nyere m na-eme ihe iji zere ime ka onye ọ bụla maa n’ọnya site n’omume ọjọọ? Àna m erube isi n’iwu Siza n’ezi akọ na uche m, ọ bụ ezie na m na-etinye iwu Chineke n’ọkwá mbụ? Àna m ekwenyere ndị okenye nke ọgbakọ n’ụzọ zuru ezu? M na-eji nnwere onwe nke Chineke nyere m eme ihe n’ụzọ zuru ezu n’ikwusa ozi ọma? Àna m “arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè” mgbe nile? Àna m achụso ihe mmụta nkịtị n’ụzọ siri ike mgbe m pụrụ iji nnwere onwe nke Chineke nyere m na-eme ihe n’ụzọ ka mma site n’ịmụba ije ozi m, na-eru eru maka ịnara ibu ọrụ buwanyere ibu n’ime ọgbakọ ma ọ bụ maka ije ozi oge nile?’—1 Ndị Kọrint 15:58.
23. Olee ihe anyị kwesịrị ime ka nzube nke nnwere onwe Chineke nyere anyị ghara ifunarị anyị?
23 Ka anyị nile ‘detụ ire, hụ na Jehova dị mma.’ (Abụ Ọma 34:8) Ka anyị tụkwasị ya obi, na-eje ije dị ka iwu ya si dị, ma too aha nsọ ya site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa Alaeze ya. Cheta na ndị “na-agha mkpụrụ n’ụba ga-ewetakwa ihe ubi n’ụba.” (2 Ndị Kọrint 9:6, NW) Ya mere, ka anyị nile were obi anyị dum jeere Jehova ozi ma gosipụta na anyị ekweghị ka nzube nke nnwere onwe nke Chineke nyere anyị funarị anyị.
Ị Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Ụdị nnwere onwe dị aṅaa ka Chineke nwere?
◻ Nnwere onwe mmadụ nwere ịkpa ókè ndị dị aṅaa?
◻ Olee otú e si mee ka ezi nnwere onwe kwe omume?
◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji zere ikwe ka nzube nke nnwere onwe Chineke nyere funarị anyị?
[Foto dị na peeji nke 9]
Nnwere onwe mmadụ bụ nke a kpaara ókè site n’ihe ndị dị ka iwu nke ike ndọda