Ùnu Abịala ná Mgbakọ Distrikt “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya”!
NNWERE ONWE! Lee nnọọ ụda dị ụtọ okwu ahụ nwere! Ọ dịghị onye ọ na-amasị ịnọ n’agbụ ma ọ bụ ịbụ onye e ji eji. N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, e nwewo mgbalị dị ukwuu e mere maka nnwere onwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị a tụrụ anya ya karịa ka e meworo n’afọ ọ bụla ọzọ ruo ókè a pụrụ icheta.
Otú ọ dị, ọ bụ ezie na nnwere onwe nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ihe a na-achọsi ike, e nwere nnwere onwe nke dị mkpa, bụrụkwa ihe a na-achọsi ike karị nke ukwuu. Ọ bụ nnwere onwe ahụ nke Jisọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke, kwuru okwu banyere ya mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:31, 32) Nke a bụ nnwere onwe pụọ na nkwenkwe okpukpe ụgha, nnwere onwe pụọ n’egwu nke mmadụ, nnwere onwe pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie ndị riworo mmadụ ahụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Ọ bụ nnwere onwe nke a bụ isiokwu nke Mgbakọ Distrikti “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya” nke Ndịàmà Jehova ga-enwe gburugburu ụwa malite n’oge okpomọkụ nke 1991. Kemgbe 1919, bụ́ mgbe e wepụsịrị mmachibido ọchịchị machibidoro ndị ahụ na-edu ndú n’etiti ha, ndị Chineke anọgidewo na-enwe nnwere onwe na-amụbawanyenụ n’ihe banyere ofufe ha dị ọcha.
Ọ bụ nnọọ ihe kwesịrị ekwesị na a nọgidewo na-eme ka isiokwu banyere nnwere onwe pụta ìhè n’afọ ndị gaworo aga ná mgbakọ ọchịchị Chineke dị iche iche, site n’isiokwu ndị dị ka “Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke ‘Mba Nweere Onwe Ya’” na “Mgbakọ Distrikt nke ‘Ụmụ Chineke Ndị Nweere Onwe Ha.’” E nyekwara nkọwa sara mbara banyere nnwere onwe n’akwụkwọ ndị dị ka “The Truth Shall Make You Free” na Ndu Ebighi-Ebi nime Inwe-onwe Nke Umu Chineke.
Nnwere onwe ahụ Chineke nyere nke ndị ohu Jehova nwere abụghị nanị maka ọdịmma na inwe ọṅụ nke onwe ha. Dị ka anyị na-agụ ná Ndị Galetia 5:13: “N’ihi na unu onwe unu, ụmụnna m, ka a kpọrọ ka unu nwee onwe unu; nanị unu ewerela inwe onwe unu ahụ nye ka ọ bụrụ ihe anụ ahụ unu ga-eji mee ihe, kama werenụ ịhụnanya bụrịta ohu ibe unu.” Mgbakọ Distrikti “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya” ga-enyere anyị aka ịghọta nzube nke nnwere onwe anyị, mee ka anyị nwee ike ijigide inwe onwe anyị dị oké ọnụ ahịa, gosikwa anyị ụzọ anyị pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ụzọ kasị mma.
Mgbakọ ahụ ga-eji ihe omume nke olu ụtọ malite n’elekere 10:20 nke ụtụtụ Friday, bụ́ nke ga-etinye anyị n’ọnọdụ echiche ziri ezi maka nri ime mmụọ nke ga-esochi. Isiokwu nke ụbọchị mbụ bụ “Ịmara Eziokwu ahụ nke Na-eme Ka Anyị Pụọ n’Ohu,” bụ́ nke dabeere na Jọn 8:32. Tupu o ruo etiti ehihie, a ga-enwe okwu nnabata nke onye isi oche na okwu bụ isi, nke isiokwu ya bụ “Nzube na Iji Nnwere Onwe Chineke Nyere Anyị Na-eme Ihe.” Okwu nke a ga-eme ka ọ pụta ìhè, bụ́ ọdịiche dị n’etiti nnwere onwe Jehova nke a na-akparaghị ókè ọ bụla na nnwere onwe a kpaara ókè nke Chineke na-enye anyị. Ọ ga-agbakwa anyị ume iji nnwere onwe ahụ anyị nwere mee ihe n’ụzọ kasị mma. Usoro ihe omume nke ehihie ga-eleba anya n’akụkụ dị iche iche nke nnwere onwe anyị na ije ozi anyị, jirikwa otu ihe nkiri mechie, nke isiokwu ya bụ, Ndị E Mere Ka Ha Nwere Onwe Ha Ịkwalite Ezi Ofufe.
Isiokwu ụbọchị nke abụọ bụ “Iguzosi Ike ná Nnwere Onwe nke Chineke Nyeworo Anyị,” nke dabeere ná ndị Galetia 5:1. Usoro ihe omume nke ụtụtụ ga-enwe otu usoro isiokwu nke na-egosi ụzọ ndị nọ n’ezinụlọ n’otu n’otu pụrụ isi nwee ọṅụ site ná nnwere onwe Chineke nyeworo n’ime ezinụlọ. Ndị ahụ dị njikere ime baptism ga-erite uru karịsịa site n’okwu ndị ahụ metụtara ụzọ a na-esi enweta nnwere onwe site ná nraranye na ime baptism. Otu okwu na-akpali akpali so n’usoro ihe omume nke ehihie, nke ga-atụle ma alụmdi na nwunye ọ̀ bụ n’ezie isi ihe dị n’inwe obi ụtọ ma ọ bụ na ọ bụghị. A ga-enwekwa usoro isiokwu n’akụkụ dị iche iche nke nnwere onwe, e mesịa kwuo okwu mmechi nke lekwasịrị anya n’Onye Isi ahụ Chineke doworo maka inye nnwere onwe na ndụ ebighị ebi.
Sunday nwere isiokwu bụ “Iji Nnwere Onwe Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kwekọrọ ná Mmụọ Chineke” nke dabeere ná 2 Ndị Kọrint 3:17. Usoro ihe omume ahụ ga-enwe otu usoro isiokwu na-akpali mmasị n’ihe banyere ilu Jisọs ndị e dekọrọ na Matiu 13:47-50, nke na-ekpughe ụzọ Ndịàmà Jehova si na-eje ozi dị ka ndị ọkụ na-akụta mmadụ. Okwu ihu ọha a ga-ekwu n’ehihie bụ “Ịnabata Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Nnwere Onwe!” Ọ ga-abụ nke otu ihe omume ọhụrụ a ga na-eme ná mgbakọ distrikti ga-esochi: nchịkọta nke ihe mmụta Ụlọ Nche maka izu ahụ. Usoro ihe omume ahụ ga-emechi site n’agbamume Akwụkwọ nsọ ka anyị nile nọgide na-aga n’ihu n’iji nnwere onwe ahụ Chineke nyere anyị na-eme ihe nke ọma n’akparamagwa na n’ịgba àmà anyị.
Nye ndị nile hụrụ inwe onwe n’anya, anyị na-agwa ha, n’okwu onye ọbụ abụ ahụ bụ Devid, sị: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma.” (Abụ Ọma 34:8) Mee ihe nile ị pụrụ ime ná mgbalị gị ịbịa mgbakọ nke a. Mee ka ọ bụrụ ihe dị gị mkpa ịnọ n’ebe ahụ site ná mmalite nnọkọ nke ụtụtụ Friday ruo n’okwu mmechi n’ehihie Sunday. Ọ bụrụ na i jiri ezi agụụ ime mmụọ wee bịa, na-amara mkpa ime mmụọ gị nke ọma, ị ga-enwe obi ụtọ n’ezie! (Matiu 5:3) Ka anyị gharakwa ichefu ụkpụrụ ahụ bụ, “Onye weere aka ntagide na-agha mkpụrụ ga-ewerekwa aka ntagide na-ewe ihe ubi.” Nke a metụtakwara ụzọ anyị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi kwadebe tupu oge eruo iji wee bịa, ụzọ anyị ga-esi dị uchu n’ige ntị n’usoro ihe omume ahụ dị ka e si chee ya n’ihu anyị, nakwa ụzọ anyị si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụzu ihe ùgwù ọ bụla nke ozi afọ ofufo anyị nwere n’ihe banyere Mgbakọ Distrikt anyị nke “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya.”—2 Ndị Kọrint 9:6.