Ndị Nweere Onwe Ha Ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ
“Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—JỌN 8:32.
1, 2. (a) Olee ụzọ nnwere onwe siworo kere òkè n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ? (b) Ọ̀ bụ nanị onye nweere onwe ya n’ezie? Kọwaa.
NNWERE ONWE. Lee okwu dị ike nke ahụ bụ! Ihe a kpọrọ mmadụ atachiwo obi n’ọtụtụ agha na nkwatu ọchịchị ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ nakwa ọgba aghara ọha na eze ndị na-enweghị atụ n’ihi ọchịchọ mmadụ inwere onwe ya. N’ezie, akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana kwuru, sị: ‘Ná mmalite nke mmepeanya, ọ dịghị echiche ọ bụla kerewooro òkè dị mkpa karịa ntọhapụ.’
2 Otú o sina dị, mmadụ òle n’ezie nweere onwe ha? Òle maara ọbụna ihe nnwere onwe bụ? Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “Ka ndị mmadụ wee nwee nnwere onwe zuru ezu, a gaghị enwe ihe mgbochi ọ bụla n’ụzọ ha si eche echiche, ekwu okwu, ma ọ bụ eme omume. Ha aghaghị ịmara banyere ihe nhọrọ ha nile bụ, ha aghaghịkwa inwe ike ime mkpebi n’etiti nhọrọ ndị ahụ.” N’iburu nke a n’uche, ị̀ maara onye ọ bụla nweere onwe ya n’ezie? Olee ndị pụrụ ikwu na ha enweghị “ihe mgbochi ọ bụla n’ụzọ ha si eche echiche, ekwu okwu, ma ọ bụ eme omume”? N’ikwu eziokwu, ọ bụ nanị otu onye n’eluigwe na ala dum kwekọrọ ná nkọwa nke ahụ—Jehova Chineke. Ọ bụ nanị ya nwere nnwere onwe zuru ezu. Ọ bụ nanị ya pụrụ ime nhọrọ nke dị ya mma ma mezuokwa ya n’agbanyeghị mmegide nile. Ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.”—Mkpughe 1:8; Aịsaịa 55:11.
3. N’ọnọdụ dị aṅaa ka ndị mmadụ na-enwetakarị nnwere onwe?
3 Nye ụmụ mmadụ dị ala, inwe onwe pụrụ ịbụ nanị ihe a kpaara ókè. Ọ na-abụkarị ndị na-achị isi na-enye ya ma ọ bụ na-eme ka e nwee ya, ọ na-emetụtakwa anyị ido onwe anyị n’okpuru ịchịisi ahụ. N’ezie, n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ọnọdụ nile, mmadụ pụrụ inwere onwe ya nanị ma ọ bụrụ na ọ ghọta ịchịisi nke onye ahụ mere ka o nwere onwe ya. Dị ka ihe atụ, ndị bi ‘n’ụwa nke nweere onwe ya’ na-erite ọtụtụ uru, dị ka nnwere onwe ime ngagharị, nnwere onwe ikwu okwu, na nnwere onwe ịnọ n’okpukpe ọ bụla. Gịnị na-eme ka e nwee nnwere onwe ndị a? Iwu nke ala. Mmadụ pụrụ nanị inweta ha ma ọ bụrụhaala na ọ na-erube isi n’iwu. Ọ bụrụ na ọ na-eji nnwere onwe ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma na-emebi iwu, ọ ga-aza ajụjụ n’ihu ndị na-achị isi, a pụkwara ibelata nnwere onwe ya n’ụzọ dị ukwuu site n’ịtụ ya mkpọrọ.—Ndị Rom 13:1-4.
Nnwere Onwe Chineke —Na-eweta Ịza Ajụjụ
4, 5. Nnwere onwe dị aṅaa ka ndị na-efe Jehova na-enwe, n’ihi ime gịnịkwa ka ha ga-eji zaa ajụjụ n’ihu ya?
4 Na narị afọ mbụ, Jisọs kwuru okwu banyere nnwere onwe. Ọ gwara ndị Juu, sị: “Ọ bụrụ na unu onwe unu anọgide n’okwu m, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’ezie; unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.” (Jọn 8:31, 32) Ọ dịghị ekwu okwu banyere nnwere onwe nke ikwu okwu ma ọ bụ nnwere onwe nke ịnọ n’okpukpe ọ bụla. N’ezie ọ dịghị ekwu okwu banyere ntọhapụ site ná mmegbu nke Rom, bụ́ nke ọtụtụ ndị Juu na-achọsi ike. Ee e, nke a bụ ihe dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu karị, nnwere onwe nke na-esiteghị n’iwu mmadụ ma ọ bụ ná mkpali nke onye ọchịchị bụ mmadụ, kama nke sitere n’aka Ọkaaka kasị elu nke eluigwe na ala, bụ́ Jehova. Ọ bụ nnwere onwe pụọ n’ịtụ ụjọ na-enweghị isi, nnwere onwe pụọ n’amaghị ihe nke okpukpe, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Nnwere onwe nke Jehova na-enye bụ ezi nnwere onwe, ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe nile ebighị ebi.
5 Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ Mmụọ ahụ: ma ebe mmụọ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ruo ọtụtụ narị afọ, Jehova anọwo na-emeso ihe a kpọrọ mmadụ ihe ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi wee mesịa nweta ụdị nnwere onwe mmadụ nke kasị mma na nke kasị ukwuu, ‘inwe onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’ (Ndị Rom 8:21) Ka ọ dị ugbu a, Jehova na-enye anyị ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwere onwe site n’eziokwu Bible, anyị ga-azakwa ajụjụ n’ihu ya ma ọ bụrụ na anyị ejiri nnwere onwe ahụ mee n’ụzọ na-ezighị ezi. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.”—Ndị Hibru 4:13.
6-8. (a) Nnwere onwe ndị dị aṅaa ka Adam na Iv nwere, n’ọnọdụ dịkwa aṅaa ka ha pụrụ ịnọgide na-enwe nnwere onwe ndị ahụ? (b) Gịnị ka Adam na Iv tụfuuru onwe ha na ụmụ ha?
6 Ịza ajụjụ n’ihu Jehova pụtara ìhè mgbe nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, dị ndụ. Jehova kere ha, na-enye ha onyinye ahụ dị oké ọnụ ahịa nke inwe onwe ime nhọrọ. N’oge nile ha jiri inwe onwe ime nhọrọ ahụ mee ihe n’ụzọ ziri ezi, ha nwetara ngọzi ndị ọzọ, dị ka nnwere onwe pụọ n’ụjọ, nnwere onwe pụọ n’ọrịa, nnwere onwe pụọ n’ọnwụ, na nnwere onwe ịbịakwute Nna ha nke eluigwe site n’akọ na uche dị ọcha. Ma mgbe ha jiri inwe onwe ime nhọrọ ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ihe ahụ nile gbanwere.
7 Jehova tinyere Adam na Iv n’ogige Iden, banyekwara ihe ha ga-eri, o nyere ha mkpụrụ sitere n’osisi nile nke ogige ahụ—e wezụga otu. Nke ahụ ka ọ hapụụrụ onwe ya; ọ bụ ‘osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.’ (Jenesis 2:16, 17) Site n’ịghara iri mkpụrụ nke osisi ahụ, Adam na Iv ga-egosi na ha ghọtara na ọ bụ nanị Jehova nweere onwe ya isetịpụ ụkpụrụ nke ezi ihe na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha emee ka ndị maara ihe ma ghara iri site ná mkpụrụ ahụ e nyere ha iwu ka ha ghara iri, Jehova ga-anọgide na-enye ha nnwere onwe ndị ọzọ.
8 Ọ bụ ihe mwute na Iv ṅara ntị n’aro aghụghọ nke Agwọ ahụ tụrụ nke bụ na ya onwe ya kwesịrị ‘ịma ezi ihe na ihe ọjọọ.’ (Jenesis 3:1-5) Na mbụ ya onwe ya, nakwa mgbe e mesịrị Adam, riri mkpụrụ ahụ e nyere ha iwu ka ha ghara iri. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, mgbe Jehova Chineke bịara ịgwa ha okwu n’ogige Iden, ihere mere ha, ha wee zoo onwe ha. (Jenesis 3:8, 9) Ugbu a ha bụ ndị mmehie na-enwekwaghị echiche nnwere onwe nke e ji abịakwute Chineke nke na-esite n’akọ na uche dị ọcha. N’ihi nke a, ha tụfukwara nnwere onwe pụọ n’ọrịa na ọnwụ, nye ma onwe ha ma ụmụ ha. Pọl sịrị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”—Ndị Rom 5:12; Jenesis 3:16, 19.
9. Olee ndị a maara dị ka ndị jiworo ọ̀tụ̀tụ̀ nnwere onwe ha nwere mee ihe n’ụzọ dị mma?
9 Otú o sina dị, ihe a kpọrọ mmadụ ka nwere inwe onwe ime nhọrọ, mgbe oge na-agakwa, ndị mmadụ ụfọdụ na-ezughị okè ji nke a mee ihe n’ụzọ ziri ezi iji jeere Jehova ozi. E chebewo aha ụfọdụ n’ime ha site n’oge ochie. Ndị ikom dị ka Ebel, Inọk, Noa, Abraham, Aịsak, na Jekọb (onye a na-akpọkwa Israel) bụ ihe atụ nke ndị jiri ọ̀tụ̀tụ̀ nke nnwere onwe ha ka nwere mee ihe iji mee uche Chineke. Ihe gakwaara ha nke ọma n’ihi nke ahụ.—Ndị Hibru 11:4-21.
Nnwere Onwe nke Ndị Chineke Họọrọ
10. Gịnị bụ ihe ndị e kwekọrịtara na ha n’ọgbụgba ndụ ahụ Jehova sooro ndị ya pụrụ iche mee?
10 N’oge Mosis, Jehova tọhapụrụ ụmụ Israel—ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ nde mgbe ahụ—pụọ n’ịbụ ohu n’Ijipt wee soro ha gbaa ndụ, nke mere ka ha ghọọ ndị ya pụrụ iche. N’okpuru ọgbụgba ndụ nke a, ndị Israel nwere usoro ndị nchụàjà na usoro nke ịchụ àjà ụmụ anụmanụ nke kpuchiri mmehie ha n’ụzọ dị nta. Otú a, ha nweere onwe ha ịbịakwute Chineke n’ofufe. Ha nwekwara usoro iwu na ụkpụrụ iji mee ka ha nwere onwe ha pụọ n’omume nke ịtụ ụjọ na-enweghị isi na ofufe ụgha. Mgbe e mesịrị, ha ga-enweta Ala Nkwa ahụ dị ka ihe nketa, na-enwekwa ihe na-emesi ha obi ike na Chineke ga-enyere ha aka megide ndị iro ha. Òkè nke ha n’ọgbụgba ndụ ahụ mere ka ndị Israel nwee ibu ọrụ nke idebe Iwu Jehova. Ndị Israel ji obi ha nakwere ọnọdụ nke a, na-asị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.”—Ọpụpụ 19:3-8; Deuterọnọmi 11:22-25.
11. Gịnị si n’ime ya pụta mgbe Israel na-enweghị ike idebe òkè nke ya nke ọgbụgba ndụ ahụ ya na Jehova gbara?
11 Ruo ihe karịrị 1,500 afọ, ndị Israel nọ ná mmekọrịta ahụ pụrụ iche, ha na Jehova. Ma ọtụtụ mgbe, ha dara n’idebe ọgbụgba ndụ ahụ. Ọtụtụ mgbe, e duhiere ha site n’ofufe ụgha, ha banyekwara n’agbụ nke ikpere arụsị na ịtụ ụjọ na-enweghị isi, ya mere Chineke kwere ka ha bụrụ ndị ohu n’anụ ahụ nye ndị iro ha. (Ndị Ikpe 2:11-19) Kama inweta ngọzi nile nke ntọhapụ ahụ, bụ́ ndị na-abịa site n’idebe ọgbụgba ndụ ahụ, a tara ha ahụhụ n’ihi imebi ya. (Deuterọnọmi 28:1, 2, 15) Mgbe e mesịrị, n’afọ 607 T.O.A., Jehova kwere ka mba ahụ ghọọ ndị ohu na Babilọn.—2 Ihe Emere 36:15-21.
12. Gịnị mesịri pụta ìhè banyere ọgbụgba ndụ Iwu Mosis?
12 Nke a kụziiri ha ihe n’ụzọ dị ilu. Ha kwesịrị isiworị na ya mụta mkpa ọ dị idebe Iwu ahụ. Otú o sina dị, mgbe 70 afọ gasịrị, ka ndị Israel laghachiri n’ala nke aka ha, ha dakwara n’idebe ọgbụgba ndụ Iwu ahụ n’ụzọ ziri ezi. N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ mgbe ha laghachisịrị, Jehova gwara ndị nchụàjà Israel, sị: “Unu onwe unu ewezụgawo onwe unu n’ụzọ Chineke; unu emewo ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ n’iwu; unu ebibiwo ọgbụgba ndụ Livaị.” (Malakaị 2:8) N’ezie, ọbụna onye kasị nwee obi eziokwu n’etiti ndị Israel apụghị iru ọ̀tụ̀tụ̀ nke Iwu ahụ zuru okè. Kama ịbụ nke na-eweta ngọzi, ọ ghọrọ, dị ka Pọl onyeozi si kwuo, “ọbụbụọnụ.” (Ndị Galetia 3:13) O doro anya na a chọrọ ihe karịrị ọgbụgba ndụ Iwu Mosis iji weta ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-ekwesị ntụkwasị obi ná nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.
Ọdịdị nke Nnwere Onwe Ndị Kraịst
13. N’ihe ndabere dị aṅaa ka mma ka e mesịrị weta nnwere onwe?
13 Ihe ahụ bụ àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst. N’ihe dị ka afọ 50 O.A., Pọl degaara ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ dị na Galetia akwụkwọ ozi. Ọ kọwara ụzọ Jehova siworo mee ka ha si n’ohu nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ pụta, kwuokwa, sị: “Kraịst mere ka anyị pụọ n’ohu ka anyị wee nwere onwe anyị: ya mere na-eguzosinụ ike, unu ekwela ka e were yoke nke bụ ịbụ ohu tụhịa unu ọzọ.” (Ndị Galetia 5:1) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jisọs si mee ka ndị mmadụ nwere onwe ha?
14, 15. N’ụzọ dị aṅaa dị ebube ka Jisọs si mee ka ndị kwere ekwe bụ́ ndị Juu na ndị na-abụghị ndị Juu nwere onwe ha?
14 Mgbe Jisọs nwụsịrị, ndị Juu nakweere ya dị ka Mesaịa ma ghọọ ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ, bụ́ nke nọchiri anya ọgbụgba ndụ Iwu ochie ahụ. (Jeremaịa 31:31-34; Ndị Hibru 8:7-13) N’okpuru ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke a, ha—na ndị kwere ekwe na-abụghị ndị Juu mesịrị sonyere ha—ghọrọ akụkụ nke mba ime mmụọ ọhụrụ nke nọchiri anya Israel anụ ahụ dị ka ndị pụrụ iche nke Chineke. (Ndị Rom 9:25, 26; Ndị Galetia 6:16) N’ihi nke ahụ, ha nwetara nnwere onwe ahụ nke Jisọs kwere nkwa ya mgbe ọ sịrị: “Eziokwu ahụ ga-eme ka unu pụọ n’ohu.” E wezụga ime ka ha nwere onwe ha pụọ n’ọbụbụọnụ nke Iwu Mosis, eziokwu ahụ tọhapụrụ ndị Kraịst bụ́ ndị Juu site n’omenala nile dị arọ nke ndị ndú okpukpe bokwasịrị ha. Ọ tọhapụkwara ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu site n’ikpere arụsị na ịtụ ụjọ na-enweghị isi nke ofufe mbụ ha. (Matiu 15:3, 6; 23:4; Ọrụ 14:11-13; 17:16) E nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ.
15 Jisọs, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere eziokwu nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, kwuru, sị: “N’ezie, n’ezie, asị m unu, onye ọ bụla nke na-emehie bụ ohu nke mmehie.” (Jọn 8:34) Kemgbe Adam na Iv mehiere, onye ọ bụla dịworo ndụ abụwo onye mmehie, wee si otú a bụrụ ohu mmehie. Nanị onye nke ahụ na-agụnyeghị bụ Jisọs n’onwe ya, àjà Jisọs tọhapụkwara ndị kwere ekwe site n’ịbụ ohu. N’eziokwu, ha ka bụkwa ndị na-ezughị okè na ndị na-eme mmehie dị ka e si mụọ ha. Otú ọ dị, ugbu a ha pụrụ ichegharị ná mmehie ha ma rịọ maka mgbaghara ná ndabere nke àjà Jisọs, na-enwe obi ike na a ga-anụ arịrịọ ha. (1 Jọn 2:1, 2) Ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs, Chineke kpọrọ ha ndị ezi omume, ha pụkwara ịbịakwute ya site n’akọ na uche dị ọcha. (Ndị Rom 8:33) Ọzọkwa, ebe ọ bụ na àjà mgbapụta ahụ meghere olileanya nke mbilite n’ọnwụ gaa ná ndụ ebighị ebi, eziokwu ahụ tọhapụrụ ha ọbụna site n’ụjọ nke ọnwụ.—Matiu 10:28; Ndị Hibru 2:15.
16. Olee ụzọ nnwere onwe ndị Kraịst si metụta ọtụtụ ihe karịa nnwere onwe ọ bụla ụwa pụrụ inye?
16 N’ụzọ dị ebube, e mere ohere inwe nnwere onwe ndị Kraịst nye ndị ikom na ndị inyom n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ha, n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya. Ndị ogbenye, ndị mkpọrọ, ọbụna ndị ohu, pụrụ inwere onwe ha. N’aka nke ọzọ, ndị bụ oké mmadụ nke mba nile bụ́ ndị jụrụ ozi banyere Kraịst ka nọ n’ịbụ ohu nye ịtụ ụjọ na-enweghị isi, mmehie, na ụjọ nke ọnwụ. Ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị ịkwụsị ikele Jehova maka nnwere onwe anyị na-enweta. Ọ dịghị ihe ọ bụla ụwa na-enye nke a pụrụ iji tụnyere ya ma ọlị.
Ndị Nweere Onwe Ha ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ
17. (a) Olee ụzọ ndị ụfọdụ na narị afọ mbụ si tụfuo nnwere onwe ndị Kraịst? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịbụ ndị e duhiere site n’ihe yiri ka ọ bụ nnwere onwe n’ụwa Setan?
17 Na narị afọ mbụ, ma eleghị anya ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Kraịst e tere mmanụ nwere ọṅụ n’ihi nnwere onwe ha ma jigide iguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha. Otú ọ dị, ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ detụrụ nnwere onwe ndị Kraịst ire, ya na ngọzi ya nile ma mesịa jụ ya, na-alaghachi n’ịbụ ohu n’ụwa. N’ihi gịnị ka nke ahụ ji mee? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na okwukwe nke ọtụtụ ndị dara mbà, ha wee ‘kpafuo.’ (Ndị Hibru 2:1) Ndị ọzọ ‘wezụgara okwukwe na ezi akọ na uche ha, ụgbọ ha wee kpuo n’ebe okwukwe ha dị.’ (1 Timoti 1:19) Ma eleghị anya ha dabara ná nchụso nke ihe onwunwe ma ọ bụ n’ibi ụdị ndụ rụrụ arụ. Lee ka o si dị mkpa ka anyị na-eche okwukwe anyị nche ma wulite ya, na-eji ọrụ n’aka n’ihe banyere ọmụmụ ihe onwe onye, mkpakọrịta, ekpere, na ọrụ ndị Kraịst! (2 Pita 1:5-8) Ka ọ ghara inwe mgbe anyị ga-akwụsị inwe ekele maka nnwere onwe ndị Kraịst! N’eziokwu, a pụrụ ịnwa ụfọdụ site n’omume ime otú ọ masịrị onye nke ha na-ahụ n’ebe ndị na-anọghị n’ọgbakọ nọ, na-eche na ndị ahụ nọ n’ụwa nweere onwe ha karịa ka anyị nwere. Otú ọ dị, n’ezie ihe yiri nnwere onwe n’ụwa na-abụkarị nnọọ ihe na-ezighị ezi. Ọ bụrụ na anyị abụghị ndị ohu Chineke, anyị bụ ndị ohu nke mmehie, ịbụ ohu ahụ na-ewetakwa ụgwọ ọrụ dị ilu.—Ndị Rom 6:23; Ndị Galetia 6:7, 8.
18-20. (a) Olee ụzọ ụfọdụ si ghọọ “ndị iro nke osisi ịta ahụhụ”? (b) Olee ụzọ ụfọdụ si ‘ewere nnwere onwe ha dị ka ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ’?
18 Ọzọkwa, n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị, Pọl dere, sị: “E nwere ọtụtụ, ndị m na-agwabu unu okwu banyere ha ọtụtụ mgbe, ma ugbu a ana m eji anya mmiri agwa unu banyere ha, bụ́ ndị na-ejegharị dị ka ndị iro nke osisi ịta ahụhụ Kraịst.” (Ndị Filipaị 3:18, NW) Ee, e nwere ndị bụbu ndị Kraịst ghọrọ ndị iro nke okwukwe ahụ, ma eleghị anya na-aghọ ndị si n’ezi ofufe dapụ. Lee ka o si dị mkpa ka anyị ghara ịgbaso nzọụkwụ ha! Tụkwasị na nke ahụ, Pita dere, sị: “Dị ka ndị nweere onwe ha, ma unu enweghị inwe onwe unu ahụ dị ka ihe mkpuchi nke ihe ọjọọ, kama dị ka ndị ohu nke Chineke.” (1 Pita 2:16) Olee ụzọ mmadụ pụrụ isi were nnwere onwe ya dị ka ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ? Site n’ime mmehie ndị dị oké njọ—ma eleghị ná nzuzo—ọ bụ ezie na ọ ka na-esonyere ọgbakọ.
19 Cheta Diọtrefis. Jọn kwuru banyere ya, sị: “Diọtrefis, onye ọ na-atọ ụtọ ịbụ onye isi [n’ọgbakọ] anaraghị anyị nke ọma. . . . Ya onwe ya adịghị anara ụmụnna anyị nke ọma, ọ na-egbochikwa ndị na-ezube ịnara ha, ọ na-achụpụkwa ha ná nzukọ Kraịst.” (3 Jọn 9, 10) Diọtrefis jiri nnwere onwe ya mee ihe dị ka ihe mkpuchi maka ọchịchọ ọdịmma onwe ya nanị.
20 Jud onye na-eso ụzọ dere, sị: “Mmadụ ụfọdụ gbebara, bụ́ ndị e werewooro ha gosi ọha mmadụ mgbe ochie ka e wee maa ha ikpe a, ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko, ndị na-agọnarịkwa onye nanị ya bụ Nna nwe ọha, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (Jud 4) Ọ bụ ezie na ndị a na-esonyere ọgbakọ, mmadụ ndị a nwere mmetụta na-emerụ emerụ. (Jud 8-10, 16) Ná Mkpughe anyị na-agụ na n’ọgbakọ Pagamọm na Taịataịra, e nwere ịrọ òtù, ikpere arụsị, na omume rụrụ arụ. (Mkpughe 2:14, 15, 20-23) Lee ka nke ahụ si bụrụ ejighị nnwere onwe ndị Kraịst mee ihe n’ụzọ ziri ezi!
21. Gịnị na-echere ndị na-eji nnwere onwe ndị Kraịst ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?
21 Gịnị na-echere ndị ahụ na-eji nnwere onwe ndị Kraịst ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi otú a? Cheta ihe mere Israel. Israel bụ mba Chineke họọrọ, ma Jehova mesịrị jụ ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị Israel jiri mmekọrịta ha na Chineke mee ihe dị ka ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ. Ha turu ọnụ na ha bụ ụmụ Abraham ma jụ Jisọs, bụ́ Mkpụrụ Abraham na Mesaịa nke Jehova họpụtara. (Matiu 23:37-39; Jọn 8:39-47; Ọrụ 2:36; Ndị Galetia 3:16) “Israel nke Chineke” n’ozuzu ya agaghị abụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ụzọ dị otú ahụ. (Ndị Galetia 6:16) Ma onye Kraịst ọ bụla nke na-akpata mmetọ ime mmụọ ma ọ bụ nke omume ọma ga-emesịa nweta ịdọ aka ná ntị, ọbụna ikpe ọmụma. Anyị nile ga-aza ajụjụ banyere ụzọ anyị si jiri nnwere onwe ndị Kraịst anyị mee ihe.
22. Ọṅụ dị aṅaa na-abịara ndị na-eji nnwere onwe ndị Kraịst ha abụ ohu nye Chineke?
22 Lee ka o si ka mma ịbụ ohu Chineke ma nwere onwe anyị n’ezie. Nanị Jehova na-enye nnwere onwe nke dị mkpa n’ezie. Ilu na-asị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.” (Ilu 27:11) Ka anyị jiri nnwere onwe ndị Kraịst anyị mee ihe n’ụzọ na-ewepụ Jehova n’ụta. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị ga-enwe nzube ná ndụ, anyị ga-eme ihe na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ, e mesịakwa anyị ga-eso ná ndị ahụ ga-enweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.
Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?
◻ Ọ̀ bụ nanị onye nweere onwe ya n’ezie?
◻ Nnwere onwe ndị dị aṅaa ka Adam na Iv nwere, n’ihi gịnịkwa ka ha ji tụfuo ha?
◻ Nnwere onwe ndị dị aṅaa ka ndị Israel nwere mgbe ha debere ọgbụgba ndụ nke ha na Jehova?
◻ Nnwere onwe ndị dị aṅaa bịara ndị ahụ nakweere Jisọs?
◻ Olee ụzọ ndị ụfọdụ na narị afọ mbụ si tụfuo ma ọ bụ jiri nnwere onwe ndị Kraịst ha mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi?
[Foto dị na peeji nke 13]
Nnwere onwe nke Jisọs nyere dị mma karịa nnwere onwe ọ bụla mmadụ pụrụ inye