Isoro Ndị Hụrụ Nnwere Onwe nke Chineke Nyeworo n’Anya Zukọta
NDỊÀMÀ JEHOVA pụrụ iche n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche. Nanị ha na-asụ ‘asụsụ dị ọcha.’ (Zefanaịa 3:9) Nanị ha dị n’otu, na-enwe akara ịhụnanya nke na-esetipụ ha iche bụ́ nke Jisọs Kraịst kọwapụtara. (Jọn 13:35) Nanị ha na-enwekwa nnwere onwe nke Jisọs Kraịst kwuru na eziokwu ga-eweta, dị ka e mere ihe ndekọ ya na Jọn 8:32: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”
Okwu ndị ahụ nke Jisọs Kraịst, Ọkpara nke Chineke, gwara ndị na-eso ụzọ ya abụrụwo eziokwu. Ndịàmà nile nke Jehova bụ ndị gara Mgbakọ Distrikti “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya” na-egosi obi ekele maka nke a ugbu a karịa ka ọ dịworo mgbe ọ bụla. Ihe omume mgbakọ ahụ emewo ka o doo ha anya bụ́ akụkụ dị iche iche nke nnwere onwe ha, ụzọ ha ga-esi eji ya eme ihe, ịza ajụjụ nke na-eso nnwere onwe ha, na ụdị ndị a gọziri agọzi ha bụ ịbụ ndị nweere onwe ha.
Mgbakọ ndị a ndị bịara n’ezi oge na ndị bara uru malitere n’Ebe Ugwu Ụwa na June 7, 1991, na Los Angeles, California U.S.A. Usoro ihe omume ahụ ji olu ụtọ malite na 10:20 nke ụtụtụ, abụ na ekpere sochiri ya. Okwu mmeghe bụ ihe omume na-akpali mmụọ dabeere na Jemes 1:25. Dị ka The Jerusalem Bible si dee ya, amaokwu a na-agụ otú a, sị: “Nwoke ahụ nke legidere anya kpam kpam n’iwu ahụ zuru okè nke nnwere onwe ma mee ka nke ahụ bụrụ omume ya—ọ bụghị ige ntị ma mesịa chefuo, kama itinyesi ya ike n’omume—ga-enwe obi ụtọ n’ihe nile ọ na-eme.” Dị ka anyị na-ele anya n’enyo iji hụ ebe anyị ga-emeziwanye ụdịdị elu ahụ anyị, otú a ka ọ dị anyị mkpa anyị ịnọgide na-eleba anya nime iwu zuru okè nke Chineke nke dịịrị nnwere onwe iji mụta ebe ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe n’ụdị mmadụ anyị bụ. Anyị kwesịkwara ịnọgide na-eleba anya n’ime enyo ahụ.
Okwu ọzọ sochiri ya bụ okwu onye isi oche, “Ùnu Abịala, Unu Nile Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya.” Ndịàmà Jehova hụrụ nnwere onwe n’anya, ha chọkwara ịnọgide n’inwe onwe. Onye ọkà okwu ahụ hotara ndị ọchịchị bụ́ ndị gosiri na a pụghị inwe nnwere onwe ma ọ bụrụ na iwu adịghị. Ee, ndị Kraịst enwereghị onwe ha ime otú masịrị ha kama ha nweere onwe ha ime ihe Chineke na-achọ. Ha chọrọ iji nnwere onwe ha mee ihe n’ụzọ zuru ezu, ma ọ bụghị iji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Karịsịa kemgbe 1919, Ndịàmà Jehova anọwo na-eri uru nnwere onwe na-arị elu. Onye ọkà okwu ahụ kọrọ otú e siworo mesie okwu ike banyere nnwere onwe n’isiokwu mgbakọ dị iche iche na n’akwụkwọ dị iche iche nke ndị Kraịst na-ebipụta. Ndị nile bịara mgbakọ ga-amụtakwu banyere nnwere onwe nke Chineke na-enye nakwa ụzọ e si eji ya eme ihe.
Ịgba ndị hụrụ nnwere onwe n’anya, bụ́ ndị nwere ọṅụ ịnọ ná mgbakọ ahụ, ajụjụ ọnụ bụ nke sochiri okwu ndị ahụ bịara n’ezi oge. Ụdị mgbakọ ndị ahụ bụ oge nke ịṅụrị ọṅụ ọbụna dị ka ememe atọ a na-eme kwa afọ n’Israel oge ochie bụ nke oké ọṅụ na-ejupụta na ha. Ụfọdụ ịgba ajụjụ ọnụ gosiri na mgbakọ dị iche iche bụ oge ọṅụ nke na-ewuli elu n’ime mmụọ.
Ihe ọzọ e nwere bụ okwu bụ isi, “Nzube na Iji Nnwere Onwe Chineke Nyere Anyị Na-eme Ihe.” Site n’okwu a ndị bịara mgbakọ mụtara na ọ bụ nanị Jehova nwere nnwere onwe kasị elu n’ihi na ọ bụ Ike Kasị Elu na onye pụrụ ime ihe nile. Otú ọ dị, n’ihi aha ya na n’ihi ọdịmma nke ihe ndị o kere eke, mgbe ụfọdụ ọ na-akpara nnwere onwe ya ókè site n’adịghị ngwa n’iwe iwe na inwe njide onwe onye. Ndị o kere eke nile nwere ọgụgụ isi nwere nnwere onwe a kpaara ókè, n’ihi na ha nọ n’okpuru Jehova ma bụrụ ndị a kpara ókè site n’iwu ya nke okike na nke omume. Jehova enyewo ha nnwere onwe maka inweta ọṅụ ha ma karịsịa ka ha wee nwee ike iwetara ya nsọpụrụ na ọṅụ site n’ife ya ofufe. N’ihi iji nnwere onwe ya eme ihe n’ụzọ ziri ezi, Ndịàmà enwetawo aha ọma n’elu uwa dum maka ezi àgwà na ịnụ ọkụ n’obi n’ije ozi ha.
Ehihie Friday
“Iji Ọrụ n’Aka—N’ọrụ Nile Nwụrụ Anwụ ka ọ̀ bụ n’Ozi Jehova?” bụ isiokwu na-akpali echiche nke okwu meghere nnọkọ nke ehihie Friday. Ọrụ nile nwụrụ anwụ agụnyeghị nanị ndị nke anụ ahụ, kama ọ gụnyekwara ndị ọzọ nwụrụ anwụ n’ụzọ ime mmụọ, ihe efu, na ihe na-adịghị amị mkpụrụ—dị ka ụzọ dị iche iche e ji enwe ego. N’akụkụ nke a, inyocha onwe anyị n’ụzọ eziokwu dị mkpa iji mata ma anyị na-etinye Alaeze ahụ n’ọkwá mbụ ná ndụ anyị.
Okwu ọzọ nwere ụdị nzube ahụ bụ, “Ịrụzu Ọrụ Anyị dị ka Ndị Ozi Chineke.” Onye ọkà okwu ahụ gosiri na ndị Kraịst ekwesịghị ịbụ ndị nwere afọ ojuju n’ije ozi iji mezuo iwu ma ọ bụ nanị ịrụzu hour ole a chọrọ mmadụ n’aka. Ha kwesịrị ịchọ ịdị irè n’akụkụ nile nke ije ozi ndị Kraịst ha. A kụnyere isi ihe ndị a n’uche ndị bịara mgbakọ site n’ihe ngosi na ịgba ajụjụ ọnụ. A gbara mmadụ nile ume ijezu ozi ha n’ụzọ kasị zuo ezu dị ka o kwere mee.
N’okwu ahụ bụ́ “Ndị Nweere Onwe Ha ma Bụrụ Ndị Ga-aza Ajụjụ,” onye ọkà okwu mesiri ya ike na ọ bụ ezie na ndị Jehova hụrụ nnwere onwe eziokwu wetawooro ha n’anya, ha kwesịrị icheta na nke a gụnyere ịza ajụjụ. Ha kwesịrị iji nnwere onwe ha na-eme ihe, ọ bụghị dị ka ihe ngọpụ maka àgwà ọjọọ, kama ka ọ bụrụ ihe ga-enye Jehova otuto. Dị ka ndị Kraịst, ha ga-aza ajụjụ nye “ndị na-achị isi” ma na-akwado ndị okenye ọgbakọ. (Ndị Rom 13:1) Ọzọkwa, ha ga-aza ajụjụ maka uwe ha, ejiji, na omume. Ha ekwesịghị ichezọ na “onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.”—Ndị Rom 14:12; 1 Pita 2:16.
Ihe ọzọ sochirinụ bụ nkwurịta okwu banyere mkpa ọ dị maka ndị Kraịst nile ịbụ “Ndị Na-adịghị Atụ Egwu Ka Ọgwụgwụ Ụwa nke a Na-abịaru Nso.” Ka ihe a kpọrọ mmadụ na-atụ egwu banyere ihe ọdịnihu ga-eweta, ndị Kraịst kwesịrị ịbụ ndị na-adịghị atụ egwu n’ije ozi ha. Atụghị egwu bụ ihe ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ na-eweta, n’ihi na ka onye Kraịst na-atụkari ime ihe na-adịghị atọ Chineke ụtọ egwu, otú ahụ ka ya ịtụ ihe e kere eke egwu na-adịwanye ala. Ibu akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akasị obi n’isi pụrụ ime ka mmadụ sie ike ịbụ onye na-adịghị atụ egwu. Iji bụrụ onye siri ike n’ụzọ ime mmụọ na onye na-adịghị atụ egwu, ọ dịkwa mkpa ndị na-ejere Chineke ozi iji ohere ha nwere eme ihe nke ọma iji soro ndị kwere ekwe ibe ha na-enwe mmekọrịta. Onye ọ bụla kwesịkwara icheta ọrụ ekpere na-arụ n’ịbụ onye na-adịghị atụ egwu. Site n’ịnọgide na-abụ onye na-adịghị atụ egwu, ndị Kraịst ga-anọgide na-enwe ezi mmekọrịta dị mma n’ebe Jehova Chineke nọ.
Usoro ihe omume ụbọchị mbụ ji ihe nkiri na-akụzi ihe bụ Ndị E Mere Ka Ha Nwere Onwe Ha Ịkwalite Ezi Ofufe mechie. O gosịrị ụzọ otu ezinụlọ nke oge a si mụta ihe n’aka Ezra na ndị òtù ya dị 7,000, bụ́ ndị jiri ihe ụfọdụ chụọ àjà iji laghachị na Jerusalem. O nyeere onye ọ bụla bịara mgbakọ aka inyocha ihe ndị ka ya mkpa ma lee ụzọ ọ pụrụ isi mụba ihe ùgwù ije ozi ya. Ihe nkiri a metụtara ndị okenye na ndị na-eto eto.
Ụtụtụ Saturday
Mgbe ihe omume olu ụtọ, abụ, ekpere, na ntụle nke ihe mmụta Bible dịịrị ụbọchị gasịrị, usoro ihe omume ụtụtụ Saturday nwere ihe omume nke usoro isiokwu nke isiokwu ya bụ “Nnwere Onwe nke Nwere Ibu Ọrụ n’Ime Ezinụlọ.” N’akụkụ nke mbụ, “Otú Ndị Bụ Nna Pụrụ Isi Ṅomie Jehova,” e nyere ndị bụ nna ndụmọdụ n’ụzọ dị iche iche ha pụrụ isi ṅomie Nna anyị nke eluigwe. Timoti nke Mbụ 5:8 chọrọ ka ha na-elekọta ọ bụghị nanị n’ụzọ anụ ahụ kama n’ụzọ ime mmụọ kwa. Ha na-eṅomi Jehova site n’ịbụ ndị nkụzi dị mma nke ezinụlọ ha na site n’inye ịdọ aka ná ntị n’ụzọ ịhụnanya dị ka mkpa ya si dị. E ji ọtụtụ ịgba ajụjụ ọnụ mee ka isi ihe ndị a doo anya.
“Ọrụ Inyeaka nke Onye Bụ Nwunye” bụ akụkụ ọzọ nke usoro isiokwu a. Ọ malitere site n’imesi ike na onye bụ nwụnye nwere ọnọdụ ùgwù dị na ya n’ezinụlọ ndị Kraịst, nke ịbụ onye inyeaka. Gịnị ka nke a chọrọ n’aka ya? Ka ọ nọrọ n’okpuru dị ka o kwesịrị ekwesị, ghara ịdị na-arụgide di ya ime nani ihe ọ chọrọ. Ọ dị ya mkpa ilezi ibu ọrụ ya anya nke ọma n’ebe di ya na ụmụ ya nọ, ọ pụkwara inweta ezi afọ ojuju site n’idebe ebe obibi ya ọcha. Dịkwa ka onye Kraịst na-eje ozi, ọ pụrụ inwe ọtụtụ ohere iji sonye n’ije ozi ubi. Ajụjụ a jụrụ otu ezinụlọ gosipụtara amamihe nke ụdị ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ nke Akwụkwọ nsọ.
E lebaara ndị na-eto eto anya n’akụkụ ahụ bụ “Ụmụ Ndị Na-ege Ntị ma Na-amụta Ihe.” Site n’ịzụ ụmụ ha ige ntị na ịmụta ihe, ndị mụrụ ụmụ na-ewetara Jehova nsọpụrụ ma na-egosi ịhụnanya n’ebe ụmụnna ha nke ime mmụọ nọ nakwa nye ụmụ ha. Mmekọrịta chiri anya ga-adị n’etiti ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ma ọ bụru na ha ejiri oge dị mma nọkọọ ọnụ. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịdị njikere ịza ajụjụ ụmụ ha na-ajụ ma kpalie agụ ha inwe ihe ọmụma. Ọzọkwa, ịgba ajụjụ ọnụ gosiri ụzọ a pụrụ isi mee nke a.
Ihe ọzọ e nwere bụ ezi ndụmọdụ ahụ bụ́ “Mee Ka I Nwere Onwe Gị Ijere Jehova Ozi.” È si aṅaa eme nke a? Site n’inwere onwe pụọ n’ịchụso ọrụ ụwa, ọrụ ntụrụndụ ndị na-egbu oge, na ihe mgbaru ọsọ dị iche iche nke ihe onwunwe. Jisọs na Pọl onyeozi setipụụrụ anyị ezi ihe nlereanya site n’iji onwe ha chụọ àjà. Ọ dị ndị Jehova mkpa ịdị na-ele anya n’otu ebe, na-elegide anya n’ọdịmma Alaeze. Mgbe a bịara n’ịkpata ihe onwunwe, ọ bụ ihe amamihe dị n’ime ya karị ichekwa ego ugbu a ma zụọ ihe ma e mesịa karịa ịzụ ihe ugbu a ma kwụọ ụgwọ ma e mesịa. Ndị ntorobịa aghaghị ịnọ na nche megide ịnọ na-atụgharị n’uche ha ihe banyere ihe ụtọ nke mmekọahụ na ọrụ ụwa. Ajụjụ ọnụ a gbara onye ọsụ ụzọ na-alụbeghị di gosiri ngọzi nile nke na-abịa mgbe mmadụ nweere onwe ya ijere Jehova ozi.
Usoro ihe omume nke ụtụtụ Saturday jiri okwu bụ “Banye n’Ime Nnwere Onwe Site ná Nraranye na Ime Baptism” mechie. E chetaghachiiri ndị gaje ime baptism na ebe a tụbaworo ihe e kere eke n’ime ohu site na nnupụisi Adam, Onye Mgbapụta bụ dike, Jisọs Kraịst, meghere ụzọ nke nnwere onwe site n’ichụ àjà ya. Onye ọkà okwu ahụ gosiri ihe ịtọhapụ onwe onye iji mee uche Chineke gụnyere ma mee ka ibu ọrụ na ngọzi ga-abụ nke ndị ahụ a na-eme baptism pụta ìhè.
Ehihie Saturday
Usoro ihe omume ehihie Saturday malitere n’ajụjụ ahụ na-enyocha obi nke bụ “Abamuru Ònye Ka Ị Na-achọ?” Ụwa na-egosipụta mmụọ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke Ekwensu. Otú ọ dị, ndị Kraịst ga-eṅomi mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke Jisọs. Lee ụdị ihe nlereanya o setipụrụ! Ọ hapụrụ ebube nke eluigwe wee chụọ mmadụ ya n’àjà maka ọdịmma anyị. Ihe ịma aka banyere onye anyị na-achọ ọdịmma ya na-apụta ìhè mgbe e nwere nghọtahie n’etiti ndị Kraịst n’azụmahia ma ọ bụ n’okwu ego, mgbe e nwere esemokwu n’ihi ndịrịta iche n’àgwà na ihe ndị ọzọ. Ụdị ihe ndị ahụ na-etinye ihụnanya ndị Kraịst n’ule. Ma site n’ichọ ọdịmma nke ndị ọzọ, mmadụ n’ezie ga-achọpụta ngọzi ka ukwuu nke inye ihe, ọ ga-enwetakwa nnwapụta nke Jehova.
Ihe ọzọ sochirinụ bụ isiokwu ahụ ya na ya nwere njikọ chiri anya, bụ́ “Ịmata na Imeri Adịghị Ike nke Ime Mmụọ.” Okwu a mesiri ike ịdị mkpa ọ dị ịmata ihe mgbaàmà nke adịghị ike ime mmụọ ma lụsie ọgụ ike iji merie Ekwensu na ọnyà ya nile. Ndị na-ejere Jehova ozi aghaghị ịzụlite ịhụnanya dị omimi n’ebe ọ nọ na ịkpọ ihe ọjọọ asị. Nke a chọrọ ka ha mara Jehova site n’ọmụmụ ihe Bible onwe onye na nke ezinụlọ nwere nzube, nke a na-eme kwa mgbe. Ha aghaghị izere ụdị nile nke ntụrụndụ nke na-eto ime ihe ike na omume mmekọahụ rụrụ arụ. (Ndị Efesọs 5:3-5) Ikpe ekpere mgbe nile na ịgachị nzukọ anya bụkwa ihe ndị bụ isi e ji enwe ihe ịga nke ọma n’imeri adịghị ike dị iche iche ime mmụọ.
Eleghị anya okwu kpatara mkparịta ụka karịa okwu ọ bụla ọzọ e kwuru ná mgbakọ ahụ bụ nke isiokwu ya bụ “Alụmdi na Nwunye Ọ̀ Bụ Ụzọ Bụ Isi E Si Enweta Obi Ụtọ?” Ọtụtụ ndị na-eto eto chere na ọ dị otú a! Ma onye ọkà okwu mere ya ka ọ pụta ìhè na e nwere ọtụtụ ndị mmụọ e kere eke kwesịrị ntụkwasị obi a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị nwere obi ụtọ ọ bụ ezie na ha alụghị nwunye, ọbụna dị ka ọtụtụ ndị Kraịst raraworo onwe ha nye bụ ndị nwere obi ụtọ ọ bụ ezie na ha abanyebeghị n’alụmdi na nwunye. Tinyere nke a, ọtụtụ ndị lụworo di na nwunye adịghị enwe obi ụtọ, dị ka ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm na-arị elu na-egosi. Ọ dị nnọọ mkpa ka mmadụ tụgharịa uche n’ọtụtụ ngọzi nke ndị Kraịst nile rarawooro onwe ha nye na-enweta iji mata na alụmdi na nwunye, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ ihe ngọzi, ọ bụghị ụzọ bụ isi e si enweta obi ụtọ.
Ihe sochiri nke a bụ usoro isiokwu bụ “Nnwere Onwe Ndị Kraịst n’Oge Anyị.” Onye ọkà okwu mbụ kwuru banyere “Akụkụ Dị Iche Iche nke Nnwere Onwe Ndị Kraịst.” Ihe ndị a gụnyere nnwere onwe pụọ n’ụdị ozizi okpukpe ụgha dị iche iche dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, ịta ahụhụ ebighị ebi. E nwekwara nnwere onwe pụọ n’agbụ ịbụ ohu nke mmehie. Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ezughị okè, ha nweere onwe ha pụọ n’ụdị àgwà ọjọọ ndị dị ka ise siga, ịgba chaa chaa, ịṅụbiga mmanya ókè, na mmekọahụ na-ezighị ezi. E nwekwara nnwere onwe pụọ n’enweghị olileanya, n’ihi na ha nwere olileanya nke Paradaịs nke na-akpali ha ịgwa ndị ọzọ banyere ya.
Onye ọkà okwu sochiri nke a jụrụ ajụjụ bụ “Ị̀ Na-ewere Nnwere Onwe Dị Otú ahụ dị ka Ihe Dị Oké Ọnụ Ahịa?” Iwere ihe dị ka ihe dị oké ọnụ ọhia pụtara ịhụ ihe n’anya, iji nlezianya na-azụlite ihe. Iji mee nke ahụ, onye na-ejere Chineke ozi kwesịrị ịnọ na nche megide ọnwụnwa nke ịgafe ịkpa ókè nke nnwere onwe ndị Kraịst. Nnwere onwe nke ụwa bụ okwu ụgha na-eduhie eduhie, n’ihi na ọ na-arụpụta ịbụ ohu nke mmehie na omume ọjọọ.
Onye ọkà okwu ikpeazụ n’usoro isiokwu nke a kwuru okwu n’isiokwu bụ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya Na-eguzosi Ike.” Iji mee nke ahụ, ndị Kraịst aghaghị ịrapagidesi ike n’ebe nne na nna ha nke eluigwe, Jehova na ọgbakọ ya yiri nwunye nọ. Ndị Jehova apụghị ikwe ka okwu ụgha nke ndị dapụrụ n’ezi ofufe mee ka ha pụọ n’ụzọ ziri ezi; ha aghaghị ịjụ ndị ahụ ji ịtụ arọ omume rụrụ arụ bịakwute ha. Iji nọgidesie ike ná nnwere onwe Chineke na-enye, ndị Kraịst aghaghị ịbụ ndị dị ndụ “site na mmụọ nsọ.”—Ndị Galetia 5:25.
Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ ezi ihe na-eme obi ụtọ. Isiokwu ya bụ “Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.” Jisọs Kraịst bụ nwoke kasị ukwuu, n’ihi na o metụtawo ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ siri ike karịa ndị agha nile, ndị agha mmiri nile, ndị ome iwu, na ndị eze nile ma a chịkọta ha ọnụ. Ọ bụ Ọkpara Chineke, bụ onye nọworo n’eluigwe tupu ọ bịa n’elu ala. Jisọs ṅomiri Nna ya nke eluigwe nke ọma n’ihe ndị o kwuru na ihe ndị o ziri na ụzọ o si bie ndụ nke na ọ pụrụ ikwu, sị: “Onye hụworo m anya ahụwo Nna m anya.” (Jọn 14:9) Lee ka Jịsọs si gosipụta nke ọma na “Chineke bụ ịhụnanya”! (1 Jọn 4:8) Mgbe o kwusịrị okwu dị ogologo banyere àgwà dị iche iche nke Jisọs, onye ọkà okwu ahụ kwuru na usoro ihe odide isiokwu ya bụ “Ndụ na Ije Ozi Jisọs” abụrụwo nke e bipụtara n’ime Ụlọ Nche kemgbe April 1985. Ná nzaghachi nye ọtụtụ arịrịọ, Society na-ewepụta ugbu a akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. O nwere 133 isiakwụkwọ, e bikwara ya n’ụzọ tụrụ àgwà dị iche iche. A chịkọtawokwa ihe nile dị n’ime usoro isiokwu ahụ nile, e jikọtakwara ha nile n’ime 448 peji nke akwụkwọ ahụ. N’ezie, ụbọchị mgbakọ a mechiri n’ọṅụ dị ukwuu!
Ụtụtụ Sunday
Na mmalite nke ihe omume ụtụtụ Sunday e nwere usoro isiokwu bụ “Ije Ozi dị ka Ndị Ọ́kụ̀ Na-akụta Mmadụ.” Okwu bụ “Ịkụta Azụ—N’ụzọ Nkịtị na n’Ụzọ Ihe Atụ” tọrọ ntọala maka okwu ndị ọzọ sochirinụ. Onye ọkà okwu ahụ gosiri na mgbe Jisọs kụtasịrị azụ n’ụzọ ọrụ ebube, ọ kpọrọ ndị na-akụ azụ sonyere na nke a òkù ịbịa bụrụ ndị ọ́kụ̀ na-akụta mmadụ. Ruo oge ụfọdụ, Jisọs zụrụ ndị na-eso ụzọ ya ịghọ ndị ọkụ na-akụta mmadụ, malitekwa na Pentikọst 33 O.A., ha nwere ihe ịga nke ọma n’inyere ọtụtụ ìgwè ndị ikom na ndị inyom aka ịghọ ndị na-eso ụzọ.
Onye ọkà okwu ọzọ kwuru okwu banyere ilu ụgbụ nke e mere ihe ndekọ ya na Matiu 13:47-50. O kwupụtara na ụgbụ ihe atụ ahụ gụnyere ma ndị Kraịst e tere mmanụ ma Krisendọm, Krisendọm n’ihi ọrụ ha nụrụ n’ịsụgharị, ibipụta, na ikesa Bible, ọ bụ ezie na mgbalị ndị a kpokọtara ọtụtụ ìgwè azụ na-ekwesịghị ekwesị. Karịsịa kemgbe 1919 e nwewo ọrụ nkewapụ, na-atụfu azụ ndị ahụ na-ekwesịghị ekwesị, ebe a na-achịkọta ndị nke ahụ kwesịrị ekwesị n’ime ọgbakọ dị iche iche yiri igbe nke nyeworo aka ichebe na ichekwa ezi ndị Kraịst maka ije ozi Chineke.
Okwu nke atọ, “Ịkụ Ọ́kụ̀ Mmadụ ná Mmiri nke Ụwa,” mesiri ike ibu ọrụ nke ndị Kraịst nile rarawooro onwe ha nye nwere ikere òkè n’ịkụ azụ zuru ụwa nile ọnụ. Ugbu a ihe karịrị 4,000,000 na-ekere òkè n’ọrụ a n’ime ihe karịrị 200 ala, n’afọ ndị nso nso a kwa e mewo ihe karịrị 230,000 baptism kwa afọ. A gbara ndị Jehova nile ume ka ha meziwanye nkà ịkụ azụ ha, a gbakwara “ndị na-akụ azụ” nweworo ihe ịga nke ọma ajụjụ ọnụ.
N’okwu na-esonụ, nke isiokwu ya bụ “Ịmụrụ Anya na ‘Mgbe Ọgwụgwụ’” onye ọkà okwu kpọpụtara ihe inyeaka asaa ga-enyere ndị Chineke aka ịnọgide na-amụrụ anya: ịlụso ihe ndọpụ uche dị iche iche ọgụ, ikpe ekpere, ịdọ aka ná ntị banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a, ịrapara ná nzukọ Jehova, ime nnyocha onwe onye, ịtụgharị uche dị omimi n’amụma ndị mezuworonụ, na iburu n’uche na nzọpụta ha dị nso karịa mgbe ha ghọrọ ndị kwere ekwe.
Usoro ihe omume ụtụtụ bịara ná mmechi site n’okwu bụ “Ònye Ga-agbanarị ‘Mgbe Ahụhụ’?” Onye ọkà okwu ahụ gosiri ụzọ amụma nke Joel si nwee mmezu ụfọdụ n’oge ndị ozi, na-agakwa n’ihu na-enwe mmezu ugbu a, ma bụrụkwa nke ga-enwe mmezu zuru ezu n’oge na-adịghị anya n’ọdịnihu.
Ehihie Sunday
Usoro ihe omume ehihie malitere site n’okwu ihu ọha, bụ́ “Ịnabata Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Nnwere Onwe!” Okwu a jiri isiokwu mgbakọ nke nnwere onwe gaa n’ihu. E mere ka ọ pụta ìhè na Okwu Chineke buru amụma banyere ụwa ọhụrụ ebe a ga-enwe nnwere onwe pụọ ná mmegide nke sitere n’aka okpukpe ụgha, nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nsogbu akụ na ụba, na nsogbu agbụrụ. A ga-enwekwa nnwere onwe pụọ ná mmehie na ọnwụ. A ga-eweghachị ahụ ike zuru okè nke ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ibi ndụ ebighị ebi n’obi ụtọ na paradaịs elu ala. Otú a, ndị hụrụ ezi omume n’anya nwere ihe nile mere ha ga-eji too Onye Mere ụwa ọhụrụ ahụ site n’iti mkpu, sị: “Ekele dịrị gị, Jehova, maka iweta ezi nnwere onwe n’ikpeazụ!”
Okwu ihu ọha ahụ bụ nke ihe dị ọhụrụ na mgbakọ distrikti sochiri—ntụle nke ihe mmụta dịịrị izu ahụ n’ime Ụlọ Nche. N’ikpeazụ mgbakọ ahụ bịara ná mmechi site n’okwu na-akpali akpali na nke ịdọ aka ná ntị bụ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya Nọ Na-aga n’Ihu.” Onye ọkà okwu ahụ ná mkpirikpi kwuru banyere ọkpụrụkpụ okwu nke isiokwu nnwere onwe nke mgbakọ. O mesiri ike ụzọ ndị Jehova si bụrụ ndị obi ụtọ n’ihi nnwere onwe ha, kwupụtasịa ụzọ dị iche iche ndị Kraịst siworo nwe ihe ịga nke ọma ma gbaakwa ha ume ka ha nọgide na-aga n’ihu n’ịdị n’otu iji nwetakwuo ngọzi. O ji okwu ndị a mechie: “Ka anyị na-eme nke a, ka Jehova nọgide na-agọzi anyị nile ka anyị wee nwee ike nọgide na-aga n’ihu dị ka ndị hụrụ nnwere onwe n’anya.”
“E doro ihe ahụ e kere eke n’okpuru ihe efu, ọ bụghị na ọ chọrọ ya, kama n’ihi onye ahụ nke doro ya n’okpuru ya n’olileanya; n’ihi na a ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:20, 21.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Onye na-eto eto bịara mgbakọ ná mgbakọ e mere na Prague, Czechoslovakia
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
1. Ndị gaje ime baptism na-aga ebe a na-eme baptism na Prague, Czechoslovakịa
2. Ime baptism dị ka otu onye n’ime Ndịàmà Jehova na Tallinn, Estonia
3. Akwụkwọ ọhụrụ wetaara ndị bịara mgbakọ na Usolye-Sibirskoye, Siberia, ọṅụ
4. Iwepụta “New World Translation of the Holy Scriptures” n’asụsụ Czech na Slovak ná mgbakọ e mere na Prague