Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/15 p. 5-7
  • Ezi Obi Ụtọ Gịnị Bụ Isi Ihe Na-eweta Ya?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezi Obi Ụtọ Gịnị Bụ Isi Ihe Na-eweta Ya?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ Ime Mmụọ Na-eduga n’Obi Ụtọ
  • Ikike Anyị Nwere Ime Nhọrọ
  • Amamihe Chineke na Nrubeisi —Isi Ihe Na-eweta Ya
  • Otú E Si Enweta Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ezi Obi Ụtọ n’Ijere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Olee Ebe A Pụrụ Inweta Ezi Obi Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/15 p. 5-7

Ezi Obi Ụtọ Gịnị Bụ Isi Ihe Na-eweta Ya?

E MERE mmadụ inwe obi ụtọ. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide nke ahụ n’aka? Ọ dị mma, tụlee mmalite mmadụ.

Jehova Chineke kere di na nwunye mbụ ahụ inwe ike inweta obi ụtọ. E tinyere Adam na Iv n’ime paradaịs, bụ́ ogige nke ihe ụtọ a kpọrọ Iden. Onye Okike ahụ nyere ha ihe nile dị mkpa a na-ahụ anya nke ndụ. Ogige ahụ nwere “osisi nile ọ bụla . . . bụ́ nke a na-achọsi ike n’ile anya, nke dịkwa mma ihe oriri.” (Jenesis 2:9) Adam na Iv ji ahụ, sie ike, maakwa mma—ha zuru okè nweekwa obi ụtọ n’ezie.

Otú ọ dị, gịnị bụ isi ihe wetaara ha obi ụtọ? Ọ̀ bụ ebe obibi ha bụ́ paradaịs ka ọ̀ bụ ikekwe izu okè nke ahụ ha? Onyinye ndị a sitere n’aka Chineke so nyere ha aka ịnụ ụtọ ndụ. Ma obi ụtọ ha adabereghị n’ihe ndị dị otú ahụ a pụrụ ịhụ anya. Ogige Iden ahụ abụghị nanị ogige mara mma. Ọ bụ ebe nchebe, ebe a ga-efe Chineke ofufe. Isi ihe ga-ewetara ha obi ụtọ ebighị ebi bụ ikike ha nwere iguzobe na ịnọgide na-enwe mmekọrịta ịhụnanya nke ha na Onye Okike. Iji nwee obi ụtọ, ha aghaghị ibu ụzọ bụrụ ndị mmụọ nsọ na-achị.—Tụlee Matiu 5:3.

Ọnọdụ Ime Mmụọ Na-eduga n’Obi Ụtọ

Na mbụ, Adam sooro Chineke nwee mmekọrịta ime mmụọ. Ọ bụ mmekọrịta ịhụnanya, nke dị nro dị ka nke nwa na nna. (Luk 3:38) N’ogige Iden, Adam na Iv nwere ọnọdụ ndị dị mma ndị nyere ha ohere imeju ọchịchọ ha ife ofufe. Site ná nrubeisi ha ji ọchịchọ obi, ịhụnanya nye Jehova, ha ga-ewetara Chineke nsọpụrụ na otuto karịrị nnọọ nke anụmanụ e kere eke pụrụ iweta. Ha pụrụ iji ọgụgụ isi too Chineke maka àgwà ya dị ebube, nweekwa ike ịkwado ọbụbụeze ya. Ha pụkwara ịnọgide na-anata nlekọta ịhụnanya na nke dị nro nke Jehova.

Mmekọrịta nke a chiri anya nke ha na Onye Okike na irubere iwu ya isi wetaara nne na nna anyị mbụ ezi obi ụtọ. (Luk 11:28) A tụghị anya ka Adam na Iv nwee ahụmahụ ọtụtụ afọ nke ime nnwale tupu ịchọpụta isi ihe na-eweta obi ụtọ. Ha nwere obi ụtọ malite n’oge ahụ e kere ha. Iso Chineke nọrọ n’udo na ido onwe ha n’okpuru ịbụisi ya nyere ha obi ụtọ.

Otú ọ dị, obi ụtọ ahụ gwụrụ ozugbo ha nupụụrụ Chineke isi. Site n’inupụ isi, Adam na Iv gbubiri mmekọrịta ime mmụọ nke ha na Jehova. Ha abụkwaghị ndị enyi Chineke. (Jenesis 3:17-19) O yiri ka malite n’ụbọchị ahụ a chụpụrụ ha site n’ogige ahụ, Jehova kwụsịrị isoro ha nwee nkwurịta okwu. Ha tụfuru izu okè ha, olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi, na ebe obibi ha bụ́ ubi. (Jenesis 3:23) Ma nke ka mkpa, ebe ha tụfuru mmekọrịta ha na Chineke, ha tụfuru isi ihe ahụ nke na-eweta obi ụtọ.

Ikike Anyị Nwere Ime Nhọrọ

Tupu ịnwụ, Adam na Iv bufeere ụmụ ha njimara ha nke mmadụ, akọ na uche ha bu pụta ụwa, na ikike ha maka ọnọdụ ime mmụọ. E wetughị ezinụlọ mmadụ ala ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụmụ anụmanụ. A pụrụ ime ka anyị na Onye Okike dị n’otu. (2 Ndị Kọrint 5:18) Dị ka ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi, ụmụ mmadụ nọgidere na-enwe ike ịhọrọ irubere Chineke isi ma ọ bụ ịghara irube. E gosiri nke a ọtụtụ narị afọ n’ihu mgbe Jehova nyere mba Israel e guzobere ọhụrụ nhọrọ nke ndụ ma ọ bụ ọnwụ. Site n’ọnụ na-ekwuru ya bụ́ Mosis, Chineke sịrị: “Etinyewo m n’ihu gị taa ndụ na ezi ihe, na ọnwụ na ihe ọjọọ.”—Deuterọnọmi 30:15-18.

Ọbụna ugbu a, ọtụtụ puku afọ mgbe Paradaịs mbụ ahụ fusịrị, anyị bụ́ ụmụ mmadụ ka nwekwara ikike ime nhọrọ ziri ezi. Anyị nwere akọ na uche na-arụ ọrụ na ikike bụ isi maka irubere iwu Chineke isi. Bible na-ekwu banyere “mmadụ ime anyị” na mmadụ “ime.” (2 Ndị Kọrint 4:16; Ndị Rom 7:22) Okwu ndị a metụtara ikike anyị nile ketara site n’ọmụmụ iji gosipụta ụdị onye Chineke bụ, iche echiche otú o si eche, ịbụ onye mmụọ nsọ na-achị.

Banyere ọdịdị omume na akọ na uche anyị, Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe ọ bụla ndị mba ọzọ ndị na-enweghị iwu na-eme ihe nile dị n’iwu site ka e si mụọ ha, ndị ahụ, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu, ma ha onwe ha bụ iwu e nyere onwe ha; n’ihi na ha na-egosi ọrụ iwu na e dewo ya n’obi ha, akọ na uche ha na-esokwa ya na-agba àmà, ihe ha na-atụle n’obi ha n’etiti onwe ha na-ebokwa ha ebubo ma ọ bụ ma eleghị anya na-agọpụ ha.”—Ndị Rom 2:14, 15.

Amamihe Chineke na Nrubeisi —Isi Ihe Na-eweta Ya

Otú ọ dị, mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ bụrụ na anyị nile nwere ọchịchọ ebumpụta ụwa ife Chineke na, n’ihi ya, iji nwee ezi obi ụtọ, n’ihi gịnị ka enweghị obi ụtọ ji zuo ebe nile?’ Ọ bụ n’ihi na iji nwee obi ụtọ, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ito eto n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụ ezie na e kere ya n’onyinyo Chineke na mbụ, mmadụ aghọwo onye ala ọzọ site n’ebe Onye Okike ya nọ. (Ndị Efesọs 4:17, 18) N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị iwere nzọụkwụ doro anya iji guzobe ma nọgide na-enwe mmekọrịta ime mmụọ nke ya na Chineke. Ụdị mmekọrịta dị otú ahụ adịghị abịa n’onwe ya.

Jisọs depụtara ụkpụrụ abụọ dị mkpa n’ịzụlite ọnọdụ ime mmụọ. Otu bụ inweta ezi ihe ọmụma banyere Chineke, nke ọzọ bụkwa iji nrubeisi mee uche ya. (Jọn 17:3) N’ihota Okwu Chineke, Jisọs sịrị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ọ bụghị nanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ Chineke pụta.” (Matiu 4:4) N’oge ọzọ, Jisọs sịrị: “Ihe oriri m bụ ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ, ka M rụzuokwa ọrụ Ya.” (Jọn 4:34) Ọ dịghị mkpa ka anyị tinye ọtụtụ iri afọ ime nnwale maka obi ụtọ. Ahụmahụ abụghị isi ihe na-eweta obi ụtọ. Kama, nanị amamihe Chineke na irubere Onye Okike anyị isi pụrụ iduga n’ezi ọṅụ ná ndụ.—Abụ Ọma 19:7, 8; Eklisiastis 12:13.

N’ụzọ doro anya, obi ụtọ nke na-abịa site n’itinye amamihe Chineke n’ọrụ na inwe nguzo dị mma n’ebe Chineke nọ abụghị ihe na-agaghị eruli anyị aka. (Ọrụ 17:26, 27) Ihe ọmụma banyere Jehova na nzube ya dị adị nye onye ọ bụla. Ebe e nwere ọtụtụ ijeri n’ọtụtụ asụsụ, Bible nọgidere na-abụ akwụkwọ a kasị ekesa n’ụwa. Bible pụrụ inyere gị aka ịghọ enyi Chineke na inwe ezi obi ụtọ, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na “ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”—Abụ Ọma 144:15.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Nzọụkwụ Ndị Na-eduga n’Obi Ụtọ

1. Nwee ekele ma zụlite ọnọdụ ime mmụọ. Jisọs kwuru, sị: “[Obi ụtọ, NW] na-adịrị ndị nụrụ okwu Chineke, debekwa ya.”—Luk 11:28.

2. Mata na nnwapụta Chineke ka akụ̀ na ụba ma ọ bụ ndụ okomoko mkpa. Pọl dere, sị: “Ma nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe nile dị mkpa, bụ ụzọ irite uru nke ukwuu; . . . ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ, afọ ga-eju anyị n’ihe ndị a.”—1 Timoti 6:6-8.

3. Gbalịa ịzụlite na ịgbaso akọ na uche e ji Bible zụọ.—Ndị Rom 2:14, 15.

4. Kpebie irubere Jehova Chineke isi, si otú ahụ ruo eru ịbụ otu n’ime ndị ya. Devid oge ochie dere, sị: “Ndị [obi ụtọ, NW] ka ndị ahụ bụ, nke Jehova bụ Chineke ha.”—Abụ Ọma 144:15.

[Foto dị na peeji nke 7]

“Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”—Matiu 5:3, NW

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya