Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 12 p. 142-152
  • Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ndị Na-ebibi Ezinụlọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ndị Na-ebibi Ezinụlọ
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MBIBI NKE AṄỤRỤMA NA-AKPATA
  • GỊNỊ KA EZINỤLỌ PỤRỤ IME?
  • MBIBI NKE IME IHE IKE N’EBE OBIBI NA-AKPATA
  • ỤZỌ ISI ZERE IME IHE IKE N’EBE OBIBI
  • IKEWA KA Ọ̀ BỤ ỊNỌGIDE NA-EBIKỌ
  • ỌGWỤGWỤ NYE NSOGBU NDỊ NA-EBIBI IHE
  • Inwe Ihe Ịga Nke Ọma N’ịlụ Ọgụ Megide Aṅụrụma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 12 p. 142-152

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Ị Pụrụ Imeri Nsogbu Ndị Na-ebibi Ezinụlọ

1. Olee nsogbu ndị zoro ezo dị n’ezinụlọ ụfọdụ?

AKA sapụrụ ụgbọ ala ochie ahụ ma tee ya mmanụ. Nye ndị na-agafenụ ọ na-egbuke egbuke, dị nnọọ ka nke ọhụrụ. Ma e wepụ ihe a na-ahụ anya, ahụ ụgbọ ala ahụ na-erichapụsị n’ịta nchara. Otú ahụ ka ọ dị n’ezinụlọ ụfọdụ. Ọ bụ ezie na n’ile anya n’elu ahụ ihe nile dị ka ọ dị mma, ihu ọchị na-ezochi egwu na ihe mgbu. N’ime ụlọ ihe ndị na-akpata ịta nchara na-erichapụ udo ezinụlọ. Nsogbu abụọ pụrụ inwe mmetụta a bụ aṅụrụma na ime ihe ike.

MBIBI NKE AṄỤRỤMA NA-AKPATA

2. (a) Gịnị bụ echiche Bible banyere ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya? (b) Gịnị bụ aṅụrụma?

2 Bible adịghị amachibido ịṅụru ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ókè, ma ọ na-amachibido ịṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:20, 21; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 1 Timoti 5:23; Taịtọs 2:2, 3) Ma, aṅụrụma karịrị ịṅụbiga mmanya ókè; ọ bụ itinyebiga uche ókè n’ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya mgbe nile na enweghị nchịkwa n’ịṅụ ha. Ndị aṅụrụma pụrụ ịbụ ndị toworo eto. N’ụzọ dị mwute, ha pụkwara ịbụ ndị ntorobịa.

3, 4. Kọwaa mmetụta dị iche iche nke aṅụrụma n’ahụ di ma ọ bụ nwunye na n’ahụ ụmụ.

3 Ogologo oge gara aga Bible mere ka a mata na iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma pụrụ ịkpaghasị udo ezinụlọ. (Deuterọnọmi 21:18-21) Ezinụlọ dum na-enweta mmetụta nrichapụ nke aṅụrụma. Di ma ọ bụ nwunye pụrụ imikpu ná mgbalị ịkwụsị ọṅụṅụ mmanya nke onye aṅụrụma ahụ ma ọ bụ n’ịnagide àgwà ya a na-apụghị ịka aka. Ọ na-agbalị izochi mmanya ahụ, na-atụfu ya, na-ezo ego ya, na-arịọkwa maka ịhụnanya ya maka ezinụlọ, maka ndụ, ọbụna maka Chineke—ma onye aṅụrụma ahụ anọgide na-aṅụ. Ka mgbalị ya ịchịkwa ọṅụṅụ mmanya ya na-ada ugboro ugboro, ọ na-enwe nkụda mmụọ na mmetụta nke erughị eru. Ọ pụrụ ịmalite ịtụ egwu, iwe iwe, inwe obi amamikpe, ahụ erughị ala, nchekasị, na enweghị ùgwù onwe onye.

4 Ụmụaka adịghị agbanarị mmetụta nke aṅụrụma nne ma ọ bụ nna. A na-awakpo ụfọdụ n’ụzọ anụ ahụ. A na-emerụ ndị ọzọ n’ụzọ mmekọahụ. Ha pụrụ ọbụna ịta onwe ha ụta maka aṅụrụma nne ma ọ bụ nna ahụ. Ọtụtụ mgbe àgwà a na-ejighị n’aka nke onye aṅụrụma ahụ na-akpaghasị ikike ha ịtụkwasị ndị ọzọ obi. N’ihi na ha apụghị ịtụsara ahụ kwuo banyere ihe na-eme n’ụlọ, ụmụaka ahụ pụrụ ịmụta ịbịada mmetụta ha, bụ́ nke na-enwe ajọ mmetụta n’ahụ ọtụtụ mgbe. (Ilu 17:22) Ụmụaka dị otú ahụ pụrụ iburu ụkọ a nke obi ike onwe onye ma ọ bụ ùgwù onwe onye banye n’oge ịbụ okenye.

GỊNỊ KA EZINỤLỌ PỤRỤ IME?

5. Olee otú a pụrụ isi chịkwaa aṅụrụma, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji sie ike?

5 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ọkachamara na-asị na a pụghị ịgwọta aṅụrụma, ọtụtụ kwetara na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nnwetaghachi onwe kwere omume site n’usoro ihe omume nke akpaghị aka ma ọlị. (Tụlee Matiu 5:29.) Otú ọ dị, ime ka onye aṅụrụma nara enyemaka dị mfe okwukwu karịa ime ya eme, ebe ọ na-adịghị ekwekarị na ya nwere nsogbu. Ka o sina dị, mgbe ndị òtù ezinụlọ weere nzọụkwụ ụfọdụ iji hụ maka ụzọ aṅụrụma ahụ siworo metụta ha, onye aṅụrụma ahụ pụrụ ịmalite ịmata na ya nwere nsogbu. Otu dibịa nweworo ahụmahụ n’inyere ndị aṅụrụma na ezinụlọ ha aka sịrị: “Echere m na ihe kasị mkpa bụ ka ezinụlọ gaa n’ihu n’ibi ndụ ha n’ụzọ kasị mma ha pụrụ. Ịdị ukwuu nke ọdịiche dị n’etiti ya na ndị ọzọ n’ezinụlọ ahụ ga na-echekwu onye aṅụrụma ahụ ihu.”

6. Gịnị bụ isi iyi kasị mma nke ndụmọdụ maka ezinụlọ ndị nwere onye aṅụrụma?

6 Ọ bụrụ na e nwere onye aṅụrụma n’ezinụlọ gị, ndụmọdụ Bible sitere n’ike mmụọ nsọ pụrụ inyere gị aka ibi ndụ n’ụzọ kasị mma a pụrụ inwe. (Aịsaịa 48:17; 2 Timoti 3:16, 17) Tụlee ụkpụrụ ụfọdụ nyewooro ezinụlọ dị iche iche aka iche aṅụrụma ihu nke ọma.

7. Ọ bụrụ na onye òtù ezinụlọ bụ onye aṅụrụma, ònye ga-aza ajụjụ ya?

7 Kwụsị ịnara ụta nile. Bible na-asị: “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha,” na, “onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.” (Ndị Galetia 6:5; Ndị Rom 14:12) Onye aṅụrụma ahụ pụrụ ịnwa inye echiche nke na ndị òtù ezinụlọ kpatara ya. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịsị: “Unu mesoo m nke ọma karị, m gaghị aṅụ mmanya.” Ọ bụrụ na ndị ọzọ eyie ka ha kwenyeere ya, ha na-agba ya ume ịnọgide na-aṅụ mmanya. Ma ọbụna ma ọ bụrụ na ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụ ndị mmadụ ọzọ emetụta anyị, anyị nile—gụnyere ndị aṅụrụma—ga-aza ajụjụ maka ihe ọ bụla anyị mere.—Tụlee Ndị Filipaị 2:12.

8. Olee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi nyere onye aṅụrụma aka iche ihe ndị na-esi na nsogbu ya apụta ihu?

8 Echela na ị ghaghị ikpuchi onye aṅụrụma ahụ mgbe nile pụọ n’ihe ndị na-esite n’ọṅụṅụ mmanya ya. Otu ilu Bible banyere onye nọ n’ọnụma pụkwara imetụta onye aṅụrụma ahụ: “Ọ bụrụ na ị napụta ya, ị ga-emekwa ya ọzọ.” (Ilu 19:19) Hapụ onye aṅụrụma ahụ ka ọ taa ahụhụ ihe ndị si n’ọṅụṅụ mmanya ya apụta. Hapụ ya ka o hichasịa ihe o metọrọ ma ọ bụ kpọtụrụ onye were ya n’ọrụ n’ụtụtụ na-eso ụbọchị ọ ṅụrụ mmanya.

Foto dị na peeji nke 146

Ndị okenye ndị Kraịst pụrụ ịbụ isi iyi ukwu nke enyemaka n’idozi nsogbu ezinụlọ

9, 10. N’ihi gịnị ka ezinụlọ ndị aṅụrụma kwesịrị iji nara enyemaka, enyemaka ònye karịsịakwa ka ha kwesịrị ịchọ?

9 Nakwere enyemaka site n’aka ndị ọzọ. Ilu 17:17 na-asị: “Na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” Mgbe e nwere onye aṅụrụma n’ezinụlọ gị, e nwere ahụhụ. Enyemaka dị gị mkpa. Egbula oge n’ịdabere n’ahụ ‘ezi ndị enyi’ maka nkwado. (Ilu 18:24) Iso ndị ọzọ ghọtara nsogbu ahụ ma ọ bụ ndị cheworo ọnọdụ dị otú ahụ ihu kwurịta okwu pụrụ inye gị aro ụfọdụ dị irè banyere ihe ị ga-eme na ihe ị na-agaghị eme. Ma nwee nguzozi. Kwunyere ndị ị tụkwasịrị obi, ndị ga-edebe “izu nzuzo” gị, okwu.—Ilu 11:13.

10 Mụta ịtụkwasị ndị okenye ndị Kraịst obi. Ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst pụrụ ịbụ isi iyi dị ukwuu nke enyemaka. Ndị ikom a tozuru okè bụ ndị e ji Okwu Chineke nye ọzụzụ ma nwee ahụmahụ n’itinye ụkpụrụ ya dị iche iche n’ọrụ. Ha pụrụ ịdị “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:2) Ọ bụghị nanị na ndị okenye ndị Kraịst na-echebe ọgbakọ n’ozuzu ya pụọ ná mmetụta ọjọọ kama ha na-akasikwa ndị nwere nsogbu obi, na-enye ha ume ọhụrụ, na-enwekwa mmasị onwe onye n’ebe ndị ahụ nọ. Nweta abamuru zuru ezu nke enyemaka ha.

11, 12. Ònye na-enye enyemaka kachasịnụ maka ezinụlọ ndị aṅụrụma, oleekwa ụzọ e si na-enye nkwado ahụ?

11 Karịsịa ihe nile, nweta ume site n’aka Jehova. Bible na-emesi anyị obi ike n’ụzọ na-ekpo ọkụ, sị: “Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha.” (Abụ Ọma 34:18) Ọ bụrụ na ọ dị gị ka obi gị tiwara etiwa ma ọ bụ mmụọ gị abụrụ nke e gwepịara egwepịa n’ihi nrụgide nke ibinyere onye òtù ezinụlọ nke bụ onye aṅụrụma, mara na “Jehova nọ nso.” Ọ na-aghọta otú ọnọdụ ezinụlọ gị siruru n’ike.—1 Pita 5:6, 7.

12 Ikwere ihe Jehova na-ekwu n’Okwu ya pụrụ inyere gị aka ịnagide nchekasị. (Abụ Ọma 130:3, 4; Matiu 6:25-34; 1 Jọn 3:19, 20) Ịmụ Okwu Chineke na ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya nile na-etinye gị n’ahịrị ịnata enyemaka nke mmụọ nsọ Chineke, nke pụrụ iji “ọkịka nke ike” kee gị ekike ịnagide ọnọdụ kwa ụbọchị.—2 Ndị Kọrint 4:7.a

13. Gịnị bụ nsogbu nke abụọ na-ebibi ọtụtụ ezinụlọ?

13 Iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụrụ iduba ná nsogbu ọzọ na-ebibi ọtụtụ ezinụlọ—ime ihe ike n’ebe obibi.

MBIBI NKE IME IHE IKE N’EBE OBIBI NA-AKPATA

14. Olee mgbe ime ihe ike n’ebe obibi malitere, gịnị bụkwa ọnọdụ dị taa?

14 Ime ihe ike mbụ weere ọnọdụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ bụ ime ihe ike n’ebe obibi nke metụtara ụmụnne ndị ikom abụọ, bụ́ Ken na Ebel. (Jenesis 4:8) Eri mgbe ahụ, ụdị nile nke ime ihe ike n’ebe obibi etiwo ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. E nwere ndị di na-eti nwunye ha ihe, ndị nwunye na-awakpo di ha, ndị nne na nna ji obi ọjọọ eti ụmụntakịrị ha ihe, na ụmụ toro eto na-akụ nne na nna ha meworo agadi ihe.

15. Olee otú ime ihe ike n’ebe obibi si emetụta ndị òtù ezinụlọ n’ụzọ mmetụta uche?

15 Mbibi nke ime ihe ike n’ebe obibi na-akpata na-agabiga ọnyá elu ahụ. Otu nwunye a na-eti ihe sịrị: “E nwere obi amamikpe na ihere dị ukwuu ị na-aghaghị iche ihu. N’ọtụtụ ụtụtụ, ị na-achọ nnọọ ịnọrọ n’elu àkwà, ọ na-adị gị ka ya bụrụ nanị nrọ ọjọọ.” Ụmụaka na-ekiri, ma ọ bụ na-enwe ahụmahụ, nke ime ihe ike n’ebe obibi pụrụ n’onwe ha ime ihe ike mgbe ha toro ma nwee ezinụlọ ndị nke ha.

16, 17. Gịnị bụ iti ihe nke mmetụta uche, oleekwa ụzọ o si emetụta ndị òtù ezinụlọ?

16 Ime ihe ike n’ebe obibi abụghị nanị nke iti ihe nkịtị. Ọtụtụ mgbe mwakpo ahụ bụ nke okwu ọnụ. Ilu 12:18 na-asị: “O nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị eche dị ka ndụpu nke mma agha.” “Ndụpu” ndị a e ji amata ime ihe ike n’ebe obibi gụnyere ịkpọ iyi na iti mkpu, nakwa ịnọgide na-akatọ akatọ, mkparị ndị na-eweda n’ala, na iyi egwu nke ime ihe ike nkịtị. A dịghị ahụ ọnyá ndị nke ime ihe ike nke mmetụta uche anya, ndị ọzọ adịkebeghịkwa ahụta ya.

17 Ihe dị mwute karịsịa bụ iti nwata ihe n’ụzọ mmetụta uche—ịnọgide na-akatọ akatọ na iwetu ikike, ọgụgụ isi, ma ọ bụ abamuru nwata ahụ nwegasịrị dị ka mmadụ ala. Otiti ihe dị otú ahụ n’okwu ọnụ pụrụ ibibi mmụọ nke nwata. N’eziokwu, ịdọ aka ná ntị dị ụmụaka nile mkpa. Ma Bible na-agwa ndị nna, sị: “Akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

ỤZỌ ISI ZERE IME IHE IKE N’EBE OBIBI

Foto dị na peeji nke 151

Di na nwunye bụ́ ndị Kraịst hụrụ onwe ha n’anya ma na-akwanyere onwe ha ùgwù ga-eme ihe ngwa ngwa idozi ihe isi ike

18. Olee ebe ime ihe ike n’ebe obibi na-amalite, gịnịkwa ka Bible na-egosi na ọ bụ ụzọ isi kwụsị ya?

18 Ime ihe ike n’ebe obibi na-amalite n’obi na uche; ụzọ anyị si akpa àgwà na-amalite n’ụzọ anyị si eche echiche. (Jemes 1:14, 15) Iji kwụsị ime ihe ike ahụ, ọ dị onye mmetọ ahụ mkpa ịgbanwe ụzọ o si eche echiche. (Ndị Rom 12:2) Nke ahụ ọ̀ pụrụ ikwe omume? Ee. Okwu Chineke nwere ike ịgbanwe mmadụ. Ọ pụrụ ọbụna ifopụ echiche na-ebibi ebibi bụ́ ndị “e wusiri ike.” (2 Ndị Kọrint 10:4; Ndị Hibru 4:12) Ezi ihe ọmụma nke Bible pụrụ inye aka iweta mgbanwe zuru ezu n’ebe ndị mmadụ nọ nke na a na-asị na ha yikwasịrị mmadụ ọhụrụ.—Ndị Efesọs 4:22-24; Ndị Kọlọsi 3:8-10.

19. Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi lee di ma ọ bụ nwunye ya anya, mesookwa ya ihe?

19 Ụzọ isi lee di ma ọ bụ nwunye anya. Okwu Chineke na-asị: “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya.” (Ndị Efesọs 5:28) Bible na-ekwukwa na di kwesịrị ikenye nwunye “nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị.” (1 Pita 3:7) A gwara ndị nwunye okwu ịdọ aka ná ntị ka ha “na-ahụ di ha n’anya” nakwa ịdị “na-atụ egwu” ha. (Taịtọs 2:4; Ndị Efesọs 5:33) N’ezie ọ dịghị di na-atụ egwu Chineke nke pụrụ ịrụ ụka n’eziokwu na ya na-asọpụrụ nwunye ya n’ezie ma ọ bụrụ na ọ na-awakpo ya n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’okwu ọnụ. Ọ dịghịkwa nwunye nke na-etikwasị di ya mkpu, na-agwa ya okwu n’ụzọ mkparị, ma ọ bụ na-abara ya mba mgbe nile nke pụrụ ikwu na ya hụrụ ya n’anya n’ezie ma na-atụ egwu ya.

20. N’ihu ònye ka ndị nne na nna nwere ibu ọrụ n’ebe ụmụ ha nọ, n’ihi gịnịkwa ka ndị nne na nna kwesịrị iji ghara ịtụ anya ihe ezi uche na-adịghị na ha n’aka ụmụ ha?

20 Ụzọ kwesịrị ekwesị isi lee ụmụ anya. O ruuru ụmụaka, ee, ọ dị ha mkpa, inweta ịhụnanya na nlekọta site n’aka ndị mụrụ ha. Okwu Chineke na-akpọ ụmụaka “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa” na “ụgwọ ọrụ.” (Abụ Ọma 127:3) Ọ bụ ibu ọrụ nne na nna n’anya Jehova ilekọta ihe nketa ahụ. Bible na-ekwu banyere “omume nwa ọhụrụ” na “uche gbagọrọ agbagọ” nke nwata. (1 Ndị Kọrint 13:11; Ilu 22:15) Nne na nna ekwesịghị inwe ijuanya ma ha zute uche gbagọrọ agbagọ n’ụmụ ha. Ndị na-eto eto abụghị ndị okenye. Nne na nna ekwesịghị ịchọ ihe karịrị afọ ndụ, ọnọdụ ezinụlọ, na ikike nwatakịrị n’aka ya.—Lee Jenesis 33:12-14.

21. Gịnị bụ ụzọ nke Chineke isi lee nne na nna meworo agadi anya na imeso ha ihe?

21 Ụzọ isi lee nne na nna meworo agadi anya. Levitikọs 19:32 na-asị: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye.” Iwu Chineke si otú a na-emesi ike ịkwanyere ndị agadi ùgwù na iji ha kpọrọ oké ihe. Nke a pụrụ ịbụ ihe ịma aka mgbe nne ma ọ bụ nna meworo agadi yiri ka ọ̀ na-achọ ihe gabiga ókè ma ọ bụ na-arịa ọrịa na ma eleghị anya ghara ịdị na-emegharị ahụ ma ọ bụ na-eche echiche ngwa ngwa. Ka o sina dị, a na-echetara ụmụaka “inyeghachi ndị mụrụ ha ihe.” (1 Timoti 5:4) Nke a ga-apụta imeso ha n’ụzọ dị ùgwù na ná nkwanye ùgwù, eleghị anya ọbụna na-elekọta ha n’ụzọ ego. Imejọ ndị nne na nna meworo agadi n’ụzọ anụ ahụ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ na-emegide kpọmkwem ụzọ Bible na-agwa anyị isi kpaa àgwà.

22. Gịnị bụ otu àgwà gbara ọkpụrụkpụ n’imeri ime ihe ike n’ebe obibi, oleekwa ụzọ a pụrụ isi gosipụta ya?

22 Zụlite njide onwe onye. Ilu 29:11 na-asị: “Mmụọ nile nke onwe ya ka onye nzuzu na-eme ka ọ pụta ìhè: ma onye maara ihe na-egbochi mmụọ ya, na-emekwa ka ọ dajụọ.” Olee otú ị pụrụ isi chịkwaa mmụọ gị? Kama ikwere ka nkụda mmụọ wulite n’ime, mee ihe ngwa ngwa iji dozie esemokwu biliterenụ. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Si n’ebe ahụ pụọ ma ọ dị gị ka mmụọ gị ọ̀ na-arị elu. Kpee ekpere maka mmụọ nsọ Chineke iji zụlite njide onwe onye n’ime gị. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ime mkpagharị ma ọ bụ ime ụdị mmega ahụ ndị ọzọ pụrụ inyere gị aka ịchịkwa mmetụta uche gị. (Ilu 17:14, 27) Gbalịa ịbụ “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ.”—Ilu 14:29.

IKEWA KA Ọ̀ BỤ ỊNỌGIDE NA-EBIKỌ

23. Gịnị pụrụ ime ma ọ bụrụ na onye òtù ọgbakọ ndị Kraịst adaba n’ọnụma ime ihe ike ugboro ugboro ma ghara ichegharị, ma eleghị anya na-agụnye iti ezinụlọ ya ihe nkịtị?

23 Bible na-etinye “ibu iro, esemokwu, . . . ọnụma” n’ọrụ ndị Chineke machibidoro iwu ma na-ekwu na “ndị na-eme ihe dị otú a agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galetia 5:19-21) Ya mere, a pụrụ ịchụpụ onye ọ bụla na-azọrọ ịbụ onye Kraịst nke na-adaba ugboro ugboro n’ọnụma ime ihe ike, ma eleghị anya na-agụnye ịkụ nwunye ma ọ bụ di ma ọ bụ ụmụaka ihe nkịtị ma ghara ichegharị, n’ọgbakọ ndị Kraịst. (Tụlee 2 Jọn 9, 10.) N’ụzọ dị otú a a na-edebe ọgbakọ ọcha megide ndị mmetọ.—1 Ndị Kọrint 5:6, 7; Ndị Galetia 5:9.

24. (a) Olee ụzọ ndị di ma ọ bụ nwunye a na-eti ihe pụrụ ịhọrọ isi mee ihe? (b) Olee otú ndị enyi na ndị okenye na-enwe nchegbu pụrụ isi kwado di ma ọ bụ nwunye a na-eti ihe, ma gịnị ka ha na-ekwesịghị ime?

24 Olee banyere ndị Kraịst ndị di ma ọ bụ nwunye arụrụala na-adịghị egosi ihe àmà ọ bụla nke mgbanwe na-eti ihe ugbu a? Ụfọdụ ahọrọwo iso di ma ọ bụ nwunye arụrụala ahụ biri n’ihi otu ihe ma ọ bụ ọzọ. Ndị ọzọ ahọrọwo ịpụ, na-eche na ahụ ike anụ ahụ, nke uche, na nke ime mmụọ ha—eleghị anya ọbụna ndụ ha—dị n’ihe ize ndụ. Ihe onye a na-emeso ihe ike n’ebe obibi họọrọ ime n’ọnọdụ ndị a bụ mkpebi onwe onye n’ihu Jehova. (1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Ndị enyi, ndị ikwu, ma ọ bụ ndị okenye ndị Kraịst bu ezi ihe n’obi pụrụ ịchọ inye aka na ndụmọdụ, ma ha ekwesịghị ịrụgide mmadụ ịgbaso ụzọ nke ọ bụla kpọmkwem. Nke ahụ bụ mkpebi nke ya ime.—Ndị Rom 14:4; Ndị Galetia 6:5.

ỌGWỤGWỤ NYE NSOGBU NDỊ NA-EBIBI IHE

25. Gịnị bụ nzube Jehova maka ezinụlọ?

25 Mgbe Jehova jikọtara Adam na Iv ọnụ n’alụmdi na nwunye, ọ dịghị mgbe o zubere na nsogbu ndị na-ebibi ihe dị ka aṅụrụma ma ọ bụ ime ihe ike ga-erichapụ ezinụlọ. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Ezinụlọ gaje ịbụ ebe ịhụnanya na udo ga-eto na ebe a ga-elekọta mkpa nke uche, mmetụta uche, na nke ime mmụọ nke onye òtù nke ọ bụla. Ma, site ná mbata nke mmehie, ndụ ezinụlọ ji ọsọ retọọ.—Tụlee Eklisiastis 8:9.

26. Olee ọdịnihu na-echere ndị na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe nile Jehova chọrọ?

26 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova agbahapụbeghị nzube ya maka ezinụlọ. Ọ na-ekwe nkwa iwebata ụwa ọhụrụ nke udo ebe ndị mmadụ “ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.” (Ezikiel 34:28) N’oge ahụ, aṅụrụma, ime ihe ike n’ebe obibi, na nsogbu ndị ọzọ nile na-ebibi ezinụlọ taa ga-abụ ihe ndị oge ha gafeworo. Ndị mmadụ ga-amụmụ ọnụ ọchị, ọ bụghị iji zochie egwu na ihe mgbu, kama n’ihi na ‘ịba ụba nke udo na-atọ ha ụtọ.’—Abụ Ọma 37:11.

a N’ala ụfọdụ, e nwere ebe ọgwụgwọ, ụlọ ọgwụ, na usoro ihe omume nnwetaghachi onwe bụ́ ndị na-ahụ kpọmkwem maka inyere ndị aṅụrụma na ezinụlọ ha aka. Ma à ga-achọ ịnara enyemaka dị otú ahụ ma ọ bụ na a gaghị achọ bụ mkpebi onwe onye. Watch Tower Society adịghị akwado ụdị ọgwụgwọ ọ bụla kpọmkwem. Otú ọ dị, a ghaghị ilezi anya ka, n’ịchọ enyemaka, mmadụ ghara itinye aka n’ihe omume ndị na-emebi ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI NYERE . . . EZINỤLỌ AKA IJI ZERE NSOGBU NDỊ PỤRỤ ỊKPATA OKÉ MBIBI?

Jehova na-amachibido iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iwu.—Ilu 23:20, 21.

Onye ọ bụla ga-aza ajụjụ maka ihe ndị o mere.—Ndị Rom 14:12.

Ma e nweghị njide onwe onye anyị apụghị ijere Chineke ozi n’ụzọ ọ na-anakwere.—Ilu 29:11.

Ezigbo ndị Kraịst na-asọpụrụ nne na nna ha meworo agadi.—Levitikọs 19:32.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya