Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 6/15 p. 9-12
  • Ndidi—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Ụkọ nke Ukwuu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndidi—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Ụkọ nke Ukwuu?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Enweghị Ndidi
  • Ihe Ndị Na-akpata Enweghị Ndidi
  • Ndidi—Ihe Mere O Ji Baa Oké Uru
  • Ihe Atụ Ndị Na-agba Ume
  • Ụgwọ Ọrụ Dị Iche Iche nke Ndidi
  • Na-enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Ị̀ Pụrụ Inwe Ndidi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ṅomie Ndidi Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Mụta Ihe N’otú Jehova na Jizọs Si Enwe Ndidi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 6/15 p. 9-12

Ndidi—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Ụkọ nke Ukwuu?

EMILIO nọ n’afọ ndị 60 ya.a Ọ bịara njem dị mwute n’Oahu—ili nwa ya nwoke toruworo ogo mmadụ. Ka o ji ụkwụ na-aga n’okporo ámá dị n’akụkụ ugwu dị jụụ, sorokwa ụfọdụ ndị enyi na-akparịta ụka, otu ụgbọ ala ji azụ si n’otu ebe obibi na-agbapụta n’okporo ámá ahụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ dị ukwuu mere ka Emilio kụja. Ọ fọrọ nke nta ka ụgbọ ahụ kụtuo ya, n’ihi iwe na enweghị ndidi kwa, Emilio tikuru ọkwọ ụgbọ ahụ mkpu ma tie ụgbọ ahụ aka. Arụmụka malitere. O yiri ka ọkwọ ụgbọ ahụ nuru Emilio aka, bụ́ onye dara ma kụọ isi n’ala ahụ siri ike. N’ụbọchị ole na ole n’ihu, Emilio nwụrụ n’ihi ahụ o merụrụ n’isi. Lee ihe mwute nke ahụ rụpụtara!

Anyị bi n’ụwa ebe ndidi bụ àgwà dị ụkọ. Ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọ ala na-agba oké ọsọ. Ndị ọzọ na-eso n’ike n’ike—na-esochi anya—n’azụ ụgbọ ndị na-adịghị agafe ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ iwu kwadoro. Ndị ọzọkwa na-agba site n’otu akụkụ ụzọ gaa na nke ọzọ n’ihi na ha enweghị ike iso ụgbọ ọzọ n’azụ. N’ụlọ, ndị òtù ezinụlọ pụrụ igosipụta ọnụma ma mee ihe ike. Ọbụna ụfọdụ ndị Kraịst pụrụ iwebiga iwe ókè n’ihi erughị eru ma ọ bụ mmejọ nke ụmụnna ime mmụọ ha.

N’ihi gịnị ka ndidi ji dị nnọọ ụkọ? Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dịworo mgbe nile? N’ihi gịnị ka o ji sie oké ike inwe ndidi n’oge anyị?

Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Enweghị Ndidi

Bible kọrọ banyere otu nwanyị na-echereghị iso di ya kwurịta okwu tupu ọ na-eme otu mkpebi dị oké mkpa. Aha ya bụ Iv. N’ịgba Adam n’ihu, ma eleghị anya n’otu akụkụ n’ihi enweghị ndidi, o riri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu. (Jenesis 3:1-6) Gịnị banyere di ya? Ya onwe ya kwa nwere ike igosipụtaworị enweghị ndidi site n’isoro Iv banye ná mmehie n’ebughị ụzọ gakwuru Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, maka enyemaka ma ọ bụ nduzi. Anyaukwu ha, ma eleghị anya n’ịbụ nke e jikọrọ ya na enweghị ndidi nke dubara ná mmehie, kpataara anyị nile ọdachi. Site n’aka ha anyị anatawokwa dị ka ihe nketa ọchịchọ nke ime mmehie, gụnyere ndị nke mpako na enweghị ndidi.—Ndị Rom 5:12.

N’ihe dị ka 2,500 afọ mgbe mmehie nke nne na nna anyị mbụ gasịrị, ndị Chineke họọrọ, bụ́ ndị Israel, gosipụtara ajọ ụkọ nke okwukwe, nke dịgidere adịgide, nakwa ụkọ nke ndidi. Ọ bụ ezie na Jehova ka gbapụtasịrị ha n’ụzọ ọrụ ebube site n’ịbụ ohu n’Ijipt, ha “chezọrọ ọrụ Ya nile” ngwa ngwa, ha ‘echereghịkwa ndụmọdụ ya.’ (Abụ Ọma 106:7-14) Ugboro ugboro ha dabara n’ajọ mmehie n’ihi na ha agaghị enwe ndidi. Ha kpụrụ chi nwa ehi ọlaedo ma fee ya ofufe; ha tamuru ntamu banyere nri anụ ahụ ahụ bụ́ manna nke Jehova nyere ha; ọbụna na ọtụtụ n’ime ha nupụkwara isi megide onye nnọchiteanya Jehova o si n’eluigwe họpụta, bụ́ Mosis. N’eziokwu, enweghị ndidi ha dubara ha n’iru újú na ọdachi.

Eze mbụ bụ mmadụ nke Israel, bụ́ Sọl, tụfuru ohere nke ụmụ ya isochi ya n’ọkwá eze. N’ihi gịnị? N’ihi na o chereghị Samuel onye amụma, onye ọ bụ ya kwesịrị ịchụrụ Jehova àjà. Egwu mmadụ mere ka Sọl gbaa Samuel n’ihu n’ịchụ àjà ahụ. Cheedị otú ọ na-aghaghị ịdị ya mgbe Samuel rutere kpọmkwem ka Sọl mesịrị ememe ahụ! A sị nnọọ na o cherekwuuru minit ole na ole!—1 Samuel 13:6-14.

A sị nnọọ na Iv cheere Adam kama iji ọkụ ọkụ matịa aka ghọrọ mkpụrụ ahụ! A sị nnọọ na ndị Israel chetara ichere ndụmọdụ Jehova! Ee, ndidi pụrụ inyewo aka ịzọpụta ha na anyị pụọ n’iru újú na ihe mgbu dị ukwuu.

Ihe Ndị Na-akpata Enweghị Ndidi

Bible na-enyere anyị aka ịghọta otu isi ihe na-akpata enweghị ndidi taa. Timoti nke Abụọ isi 3 na-akọwa ọgbọ anyị dị ka nke na-ebi n’ime “oge dị oké egwu.” Ọ na-ekwu na ndị mmadụ “ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (Amaokwu nke 2, 3) Àgwà dị otú a nke anyaukwu na ichebara nanị onwe onye echiche juru n’obi na n’uche ọtụtụ ndị, na-eme ka o siere mmadụ nile ike, ọbụna ezi ndị Kraịst, inwe ndidi. Mgbe anyị hụrụ ka ndị ụwa na-akwọ ụgbọ ala oké ọsọ ọsọ ma ọ bụ na-agbachi ndị bu ha ụzọ ihu ma ọ bụ na-akpọrị anyị, a pụrụ ile ndidi anyị ule n’ụzọ dị ukwuu. A pụrụ ịnwa anyị iṅomi ha ma ọ bụ imegwara ha, si otú ahụ na-ewetu onwe anyị ala gaa n’ọnọdụ ha nke nganga ọchịchọ onwe onye nanị.

Mgbe ụfọdụ ọ bụ nkwubi okwu ndị nke anyị na-ezighị ezi na-eme ka anyị ghara inwekwa ndidi. Rịba ama ụzọ Eze Solomọn maara ihe si gosipụta njikọ dị n’etiti echiche ọkụ ọkụ, nke na-ezighị ezi na omume enweghị ndidi, nke mkpasu iwe: “Ọ dị mma, bụ́ onye mmụọ ya nwere ogologo ntachi obi, karịa onye mmụọ ya dị elu. Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị: n’ihi na mkpasu iwe nwere ọnọdụ ya n’obi ndị nzuzu.” (Eklisiastis 7:8, 9) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge inweta ihe ọmụma zuru ezu, nke ziri ezi nke otu ọnọdụ tupu ime ihe banyere ya, o yiri ka anyị ga-egosi nghọta karị, ọmịiko karị, ndidi karị n’ebe ndị ọzọ nọ. N’aka nke ọzọ, mmụọ dị elu, nke ichebara nanị onwe onye echiche pụrụ ime ka anyị ghara ịdị na-anabata ndị ọzọ, ghara inwe ndidi, nweekwa obi ilu, dị ka ndị Israel ahụ na-atamu ntamu, ndị kwesiri olu ike bụ́ ndị mekpara Mosis ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 20:2-5, 10.

Ihe ọzọ na-akpata ụkọ nke ndidi nke ụwa a nke na-arị elu bụ ọnọdụ enweghị olileanya ya, nke na-esite n’ịbụ nke e wezụgara n’ebe Jehova nọ. Devid kwupụtara mkpa mmadụ nwere maka ile anya Jehova, sị: “Na-edebere nanị Chineke duu, mkpụrụ obi m; n’ihi na ọ bụ Ya ka olileanya m si pụta.” (Abụ Ọma 62:5) Ọtụtụ ndị na-amaghị Jehova nwere ntakịrị ọdịnihu a kpaara ókè, nke gbachiri agbachi, ya mere ha na-anwa ịdọbiri ihe ụtọ na uru ọ bụla ha nwere ike inweta tupu oge ha agwụsịa. Dị ka nna ime mmụọ ha, bụ́ Setan Ekwensu, ha adịghị echekarị banyere otú omume ha pụrụ isi merụọ ndị ọzọ ahụ.—Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19.

Ọ bụghị ihe ijuanya na ndidi dị ụkọ nke ukwuu taa. Ajọ usoro ihe nke a, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, chi ya bụ́ Setan, na ọchịchọ ime mmehie nke anụ ahụ anyị dara ada na-eme ka o siere onye ọ bụla ike, ọbụna ndị nwere obi eziokwu, inwe ndidi. Ma, Bible na-agba anyị ume ịdị ‘na-atachi obi,’ karịsịa n’ihe banyere mmezu nke nzube dị iche iche nke Chineke. (Jemes 5:8) N’ihi gịnị ka ndidi ji baa oké uru? Ụgwọ ọrụ ndị dị aṅaa ka ọ pụrụ iwetara anyị?

Ndidi—Ihe Mere O Ji Baa Oké Uru

“Ndị na-eguzo nanị ma chere na-ejekwa ozi.” Onye England na-ede abụ uri bụ́ John Milton kwuru okwu ndị ahụ n’ihe karịrị narị afọ atọ gara aga n’abụ ya bụ́ “Banyere Ikpu Ìsì Ya.” N’akụkụ bu ụzọ n’abụ uri ahụ, o kwupụtara obi nkoropụ na nchekasị ya n’ihi ya iche na ya apụghị ijere Chineke ozi n’ụzọ zuru ezu n’ihi na o kpuwo ìsì n’afọ ndụ ndị nke 40 ya. Ma dị ka e gosiri n’ahịrị ikpeazụ e hotara n’elu nke abụ uri ahụ, ọ bịara ghọta na mmadụ pụrụ ife Chineke site n’iji ndidi nagide mkpagbu ma jiri ịdị jụụ na-achọ ohere ije ozi ndị e nwere. Milton hụrụ uru nke iji ndidi dabere na Chineke.

Ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ime anyị pụrụ ịdị na-ahụ ụzọ nke ọma, ma anyị nile nwere erughị eru dị iche iche pụrụ ime ka anyị wee iwe ma ọ bụ nwee nchekasị. Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ma na-enwe ndidi?

Ihe Atụ Ndị Na-agba Ume

Bible na-enye anyị ọtụtụ ihe atụ ndị mara mma nke ndidi. Ndidi Jehova mere ka ndụ ebighị ebi kwe nde kwụrụ nde mmadụ nnweta. (2 Pita 3:9, 15) N’ọkpụkpọ òkù obi ọma ya ka anyị nyara yoke nke ya ma ‘chọta izu ike nye mkpụrụ obi anyị,’ Jisọs na-egosipụta n’ụzọ zuru okè ndidi dị ebube nke Nna ya. (Matiu 11:28-30) Ịtụgharị uche n’ihe atụ ndị nke Jehova na Jisọs pụrụ inyere anyị aka inwekwu ndidi.

Otu onye nke dị ka o nwere ihe dị ukwuu mere ọ ga-eji wee iwe, nwee obi ilu, ma ọ bụ megwara ihe bụ nwa Jekọb bụ́ Josef. Ụmụnne ya ndị ikom emesowo ya n’ụzọ jọrọ oké njọ, kpaa nkata ọnwụ ya ma mesịa renye ya n’ohu. N’Ijipt, n’agbanyeghị ozi o ji obi ya jeere Pọtịfa n’ịnọgidesi ike n’ihe, e boro Josef ebubo n’ụzọ na-adịghị mma ma tụọ ya nga. O ji ndidi nagide mkpagbu ya nile, ma eleghị anya na-aghọta na ule ndị dị otú ahụ pụrụ imezu nzube dị iche iche nke Jehova. (Jenesis 45:5) N’ihi na ọ zụlitere okwukwe na olileanya n’ebe Jehova nọ tinyere obi umeala na nghọta, Josef pụrụ inwe ndidi ọbụna n’okpuru ọnọdụ ndị siri oké ike.

Ihe enyemaka ọzọ dị mkpa bụ mmụọ nsọ Jehova. Ọ bụrụ na, dị ka ihe atụ, anyị na-ewe iwe ọsọ ọsọ ma nwee ire na-agba agba, anyị pụrụ ikpe ekpere maka enyemaka nke mmụọ nsọ ka anyị wee zụlite mkpụrụ ya. Ịtụgharị uche na nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ndị a, dị ka ogologo ntachi obi na njide onwe onye, ga-enyere anyị aka ịhụ ụzọ e si jikọọ ha na ndidi nke ukwuu.—Ndị Galetia 5:22, 23.

Ụgwọ Ọrụ Dị Iche Iche nke Ndidi

Inwe ndidi pụrụ iweta ọtụtụ uru. Ọ na-eme ka ọdịdị mmadụ anyị ka mma ma na-echebe anyị pụọ n’ime ihe ọkụ ọkụ, n’ụzọ nzuzu. Olee onye n’ime anyị nke na-ehietụbeghị ụzọ nke na-emerụ ahụ n’ihi anyị imeghachi omume ngwa ngwa karị banyere ọnọdụ siri ike ma ọ bụ na-eweta nrụgide? Anyị pụrụ ikwuwo okwu na-egosighị obi ọma ma ọ bụ kpaa àgwà ọjọọ. Anyị pụrụ ikwerewo ka ihe na-enweghị isi toruo n’ịghọ ọgụ na-enweghị nkwụsị nke anyị na onye a hụrụ n’anya nke ukwuu. Mgbe iwe, obi nkoropụ, na ihe mgbu dị ukwuu gasịrị, anyị pụrụ ijiwo ịkwa ụta chee sị, ‘A sị na m cheretụkwuuru.’ Inwe ndidi pụrụ ichebe anyị pụọ n’iru újú nile. Eziokwu ahụ nanị na-enye ndụ anyị udo, nkwụrụsi ike, na afọ ojuju ka nnọọ ukwuu.—Ndị Filipaị 4:5-7.

Inwe ndidi pụkwara inyere anyị aka inwe obi dị jụụ, nke na-atụkwasị obi. Nke a pụrụ iduga n’anyị inwe ahụ ike ka mma n’anụ ahụ, mmetụta uche, na n’ime mmụọ. (Ilu 14:30) Iwe a na-achịkwaghị achịkwa, nke na-ere ọkụ pụrụ ịkpata ajọ ọrịa mmetụta uche na nke anụ ahụ na ọnwụ. N’aka nke ọzọ, site n’inwe ndidi anyị pụrụ inwe àgwà ka mma n’ebe ndị ọzọ nọ, karịsịa n’ebe ụmụnna anyị n’ime mmụọ na ndị òtù ezinụlọ anyị nọ. Mgbe ahụ anyị ga-enwekwu ọchịchọ ịdị na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-enye aka kama ịdị na-enwe ahụ mgbakasị ma na-eme nkatọ. N’akụkụ nke ha, ọ ga-akara ndị ọzọ mfe, ọ tọọkwa ha ụtọ karị ịnọnyere anyị.

Ọ dị ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst mkpa karịsịa inwe ndidi. Mgbe ụfọdụ, ndị Kraịst ibe ha na-eji nsogbu ndị siri ike abịakwute ha. Ndị a nwere obi eziokwu pụrụ inwe mgbagwoju anya, obi erughị ala, ma ọ bụ ịda mbà n’obi, ebe ndị okenye n’onwe ha pụrụ inwe ike ọgwụgwụ ma ọ bụ bụrụ ndị nsogbu ndị nke ha ma ọ bụ nke ezinụlọ ha dọpụrụ uche ha. Ma, lee ka o si dị mkpa na ndị okenye na-enwe ndidi n’ọnọdụ ndị siri ike dị otú ahụ! N’ụzọ dị otú a ha pụrụ izi ihe “n’ịdị nwayọọ,” ‘na-emekwara ìgwè atụrụ ahụ ebere.’ (2 Timoti 2:24, 25; Ọrụ 20:28, 29) Ndụ ndị dị oké ọnụ ahịa nọ n’ihe ize ndụ. Lee aha ngọzi ndị okenye nwere obi ọma, na-ahụ n’anya, nweekwa ndidi na-abụrụ ọgbakọ!

Ndị isi ezinụlọ kwesịrị inwere ezinụlọ ha ndidi, nghọta, na obi ọma. Ha kwesịkwara ịtụ anya ma na-agba ndị ezinụlọ ha nile ume inwe otu àgwà ndị a. (Matiu 7:12) Nke a ga-etinye ihe dị ukwuu n’ịhụnanya na udo dị n’ụlọ.

Inwe ndidi ka a na-ekere òkè n’ozi ubi ga-enyere ndị Kraịst na-eje ozi aka ịnụ ụtọ nke ozi a n’ụzọ zuru ezu karị. Ha ga-enwe ike karị ịnagide enweghị mmasị na mmegide ọ bụla e zutere. Kama iso ndị nwe ụlọ iwe ji na-arụ ụka, ndị ozi na-enwe ndidi ga-enwe ike inye azịza dị nro ma ọ bụ jiri nwayọọ pụọ, si otú ahụ nọgide na-enwe udo na ọṅụ. (Matiu 10:12, 13) Ọzọkwa, mgbe ndị Kraịst jiri ndidi na obi ọma mesoo onye ọ bụla, a ga-adọta ndị yiri atụrụ n’ozi Alaeze ahụ. Jehova agọziwo mgbalị ndị e ji ndidi tinye gburugburu ụwa, ka ọtụtụ narị puku ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị na-achọ eziokwu ahụ na-enuga n’ọgbakọ Jehova na-ahụ n’anya kwa afọ.

N’eziokwu, inwe ndidi ga-ewetara anyị ụgwọ ọrụ ọma dị iche iche. Anyị ga-ezere ọtụtụ ihe ọghọm na nsogbu ịgba ara ara ma ọ bụ ikwu okwu ngwa ngwa na-akpata. Anyị ga-enwe obi ụtọ karị, dị jụụ karị, ma eleghị anya nweekwa ahụ ike karị. Anyị ga-enwe ọṅụ na udo ka ukwuu n’ozi anyị, n’ọgbakọ, na n’ụlọ. Ma nke kasịnụ, anyị ga-eso Chineke nwee mmekọrịta ka chie anya. Ya mere na-echere Jehova. Na-enwe ndidi!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ya.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ruo ókè hà aṅaa ka ị na-enweru ndidi ná ndụ ị na-adị kwa ụbọchị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya