Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Ndị Nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ
1 Ọ bụ ihe ùgwù pụrụ iche, onye okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi ruru eru ije ozi dị ka onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ilekọta mkpa ime mmụọ nke ndị nọ n’ìgwè ya bụ ọrụ a na-agaghị eji gwurie egwu. Ọrụ ya dị ụzọ atọ.
2 Izi Ihe Dị Irè: Ka onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ wee mee ka ìgwè ahụ na-enweta ihe ọmụma kwa izu, ọ na-achọ ime ezi nkwadebe. Ọ na-achọ ime ka e nwekwuo mmasị n’ihe a na-amụ. Kama ya onwe ya ịdị na-ekwubiga okwu ókè n’oge ọmụmụ ihe ahụ, ọ ga-echepụta ajụjụ ndị ọzọ dị mkpa iji wepụta isi ihe dị n’ihe ọmụmụ ahụ mgbe ọ dị mkpa. Ihe ịma aka o nwere bụ ime ka ọmụmụ ihe ahụ na-adọrọ adọrọ ma nwee ihe mmụta na ime ka onye ọ bụla sonye ná nkwurịta okwu ahụ. Ebumnobi ya bụ iwuli elu n’ụzọ ime mmụọ, ime ka abamuru nke ọmụmụ ihe ahụ pụta ìhè, na ime ka ihe ahụ a na-amụ ruo ma n’obi ma n’uche.—1 Tesa. 2:13.
3 Ọzụzụ Atụrụ Na-enye Aka: Onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ‘dị ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo.’ (Aịsa. 32:2) Ọ na-eche banyere ndị nile nọ n’ìgwè ya n’ezie ma na-ahụ na mgbe otu n’ime ndị ọ na-elekọta nwere nkụda mmụọ na e nyeere ya aka n’ụzọ ime mmụọ.—Ezik. 34:15, 16; 1 Tesa. 2:7, 8.
4 Iji Ịnụ n’Ọkụ n’Obi Na-ezisa Ozi Ọma: Onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-adị uchu n’ime ndokwa dị irè ka ndị nile nọ n’ìgwè ya nwee ike ikere òkè zuru ezu n’ozi ubi. Ọ na-ebute ụzọ n’ọrụ izisa ozi ọma, na-amata na ịgachi anya, ịdị uchu, na ịnụ ọkụ n’obi ọ na-egosi maka ozi ga-apụta ìhè n’ahụ ìgwè ahụ dum. (Kọl. 4:17; 2 Tesa. 3:9) Ka oge na-aga, ọ na-agbalị iso onye ọ bụla nọ n’ìgwè ya jee ozi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeziwanye nkà ime nkwusa na izi ihe anyị n’ozi, onye nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ pụrụ inyere anyị aka imezu nzube anyị.—1 Tim. 4:16; 2 Tim. 4:5.
5 Anyị bụ ndị a gọziri agọzi n’ezie n’ihi onyinye ndị a dị n’ụdị mmadụ bụ́ ndị dị njikere inyere anyị aka n’ụzọ ime mmụọ na ịkwado anyị n’ịhụnanya. (1 Tesa. 5:14) Ka anyị gosi ekele anyị nwere maka ndokwa a magburu onwe ya sitere n’aka Jehova site n’anyị ịdị na-ekerechi òkè anya n’ọmụmụ akwụkwọ na nkwado anyị ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ọrụ izisa ozi ọma ahụ.—Hib. 10:25.