Ndị Nlekọta Na-ebute Ụzọ—Onye Nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche
1 Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova bụ ndokwa bụ́ isi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” maka inye anyị nri ime mmụọ “n’oge ya.” (Mat. 24:45) Onye okenye na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche nwere ọrụ dị mkpa dị ka onye ozizi ruru eru nke na-egosi ezi ihe nlereanya n’ibi ndụ ndị Kraịst.—Rom 12:7; Jes. 3:1.
2 Iji zie ihe n’ụzọ dị irè, onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche aghaghị itinye ezigbo mgbalị n’ime nkwadebe kwa izu. Ọ na-eji ekpere na nlezianya eme nke ahụ. Mmasị dị ukwuu o nwere n’ebe ọgbakọ dị na-apụta ìhè n’ezi mgbalị ọ na-eme ime ka ihe a na-amụ bamie anyị n’obi. Ọ na-elekwasị anya n’isi ihe ndị dị n’ihe ọmụmụ ahụ ma na-enyere anyị aka ịhụ otú e si jikọta ha na isiokwu nke ihe ọmụmụ ahụ.
3 Ya ime ezi nkwadebe gụnyere ịgụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ tupu oge eruo iji mara otú ha si kwekọọ. Ọ na-ebute Okwu Chineke ụzọ site n’ịgba ọgbakọ ume iji Bible eme ihe nke ọma n’oge ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe a na-ewepụtaghị otu isi ihe dị mkpa n’azịza ndị ọgbakọ nyere ma ọ bụ mgbe a na-ejighị otu akụkụ akwụkwọ nsọ gbara ọkpụrụkpụ mee ihe, ọ na-ajụ ajụjụ ntụkwasị a kapịrị ọnụ iji wepụta isi ihe ahụ. N’ụzọ dị otú a, ọ na-enyere anyị aka iru ná nkwubi okwu ndị ziri ezi na ịmata ụzọ isi jiri ihe anyị na-amụta mee ihe ná ndụ anyị.
4 Onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-agbalị imeziwanye ikike izi ihe ya n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. Ọ dịghị ekwubiga okwu ókè kama ọ na-agba anyị ume ịza ajụjụ—n’okwu nke aka anyị, n’ụzọ dị mkpirikpi, n’ụzọ gara n’ihe a chọrọ. Ọ pụrụ ichetara anyị mgbe ụfọdụ na onye mbụ ga-aza ajụjụ kwesịrị inye azịza dị mkpirikpi, nke zara ajụjụ ahụ e biri ebi kpọmkwem. Azịza ndị ọzọ sitere n’ọnụ ndị na-ege ntị pụrụ ịdọrọ uche gaa n’otú a pụrụ isi jiri akụkụ akwụkwọ nsọ mee ihe, ihe ndị ọzọ na-akwado ya, ma ọ bụ ụzọ bara uru a pụrụ isi jiri ihe ọmụmụ ahụ mee ihe. Site n’ịdị na-agba ume ka a na-eme nkwadebe n’onwe onye na dị ka ezinụlọ, onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-arụ ọrụ ịkpali mmadụ nile inwe ọchịchọ ikere òkè.
5 Dị ka “ndị mmụta Jehova,” anyị nwere ekele maka “onyinye n’ụdị mmadụ,” (NW) dị ka ndị nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, bụ́ ndị ‘na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ozizi.’—Aịsa. 54:13; Efe. 4:8, 11; 1 Tim. 5:17.