Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/13 p. 2
  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Nyere Ndị Mmadụ Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ngwá Ọrụ Ọhụrụ Iji Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịmụta Ihe Chineke Na-achọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Otú Anyị Ga-esi Eji Broshọ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Na-akụzi Ihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 9/13 p. 2

Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?

1. Olee mgbe anyị ga-amalite ịmụ broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Oleekwa uru ịmụ ya ga-abara anyị?

1 Anyị ga-amalite ịmụ broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ n’izu na-amalite n’Ọktoba 28. E wepụtara broshọ a ná mgbakọ distrikti afọ gara aga. Ihe mere e ji wepụta ya bụ ka anyị jiri ya na-enyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịmata ọgbakọ Jehova. Ịmụ akwụkwọ a ga-eme ka anyị hụkwuo ọgbakọ Jehova n’anya. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịma otú anyị ga-esi jiri ya na-akụziri ndị mmadụ ihe.—Ọma 48:13.

2. Olee otú a ga-esi mụọ broshọ a n’ọgbakọ?

2 Otú A Ga-esi Amụ Ya: Onye na-eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ kwesịrị ịhazi oge a ga-eji mụọ isiokwu ndị ahụ nke ọma ka e nwee ike iwepụtacha ihe ndị dị mkpa n’isiokwu nke ọ bụla. Mgbe ọ bụla ọ na-amalite isiokwu ọhụrụ, ọ ga-agụpụta isiokwu ya. Ọ gụpụtachaa ya, ya agwa onye na-agụ ihe ka ọ gụọ paragraf nke mbụ. A gụchaa ya, ya ajụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ga-esi na paragraf ahụ. Ha zachaa, a gụpụta paragraf na-eso ya, kọwaa ya nke ọma, kwuokwa otú o si zaa ajụjụ ahụ bụ́ isiokwu a na-amụ. A ga-agụ paragraf nke ọ bụla iche, kọwaakwa ya tupu a gụọ nke na-eso ya. E kwesịkwara ikwu otú foto ndị dị n’isiokwu ahụ si gbasa ihe a na-ekwu. Gụọ amaokwu Baịbụl ndị dị ezigbo mkpa. Tupu a gafee n’isiokwu ọzọ, onye na-eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ kwesịrị ịjụ ajụjụ ndị dị n’ala. Ha ga-enyere mmadụ niile aka icheta ihe a tụlere n’isiokwu ahụ. Ọ bụrụ na ebe e dere “Ihe Ọzọ Ị Ga-eme” dị n’isiokwu ahụ, a ga-agụpụta ya. A gụchaa ya, nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe ga-ajụ ndị na-ege ntị otú ihe ahụ ga-esi baara onye a na-amụrụ Baịbụl uru. Ọ bụrụ na oge ka dị, nwanna na-eduzi ọmụmụ ihe nwere ike ịgụpụta isiokwu a na-amụ. Ya gụpụta ya, ya echere ka ndị na-ege ntị zaa ya n’ihi na ọ bụ ya ka ọ ga-eji mere ajụjụ a ga-eji tụleghachi ihe a mụrụ. Ọ bụghị iwu na ọ bụ otú a ka anyị na onye anyị na-amụrụ ihe ga-esi na-amụ broshọ a.

3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike irite ezigbo uru mgbe a na-amụ broshọ a?

3 Ịmụ akwụkwọ a n’ụlọ tupu anyị abịa ọmụmụ ihe ga-eme ka anyị rite uru mgbe a na-amụ ya n’ọgbakọ. Gbaa mbọ na-etinye ọnụ ma a na-amụ ya. A na-amụ akwụkwọ a, chọpụta otú ihe a na-amụ ga-esi baara ndị ị na-amụrụ ihe uru. Ekpere anyị bụ ka ịmụ broshọ a nyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi jiri ya nyere ndị ọzọ aka ime uche Chineke. Nke a ga-eme ka ha nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi.—1 Jọn 2:17.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya