Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 23
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 23
Abụ nke 109 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 14 ¶14-19 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Kọrịnt 8-13 (Nkeji 10)
Nke 1: 2 Ndị Kọrịnt 10:1-18 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Mmadụ Ò Kwesịrị Ime Ihe Ọ Bụla Iji Zọpụta Ndụ Ya?—td 38B (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ka Ihe E Kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 10:13 Pụtara? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: “Agaghị M Ewe Akwụkwọ Unu ma Ọ Bụrụ na I Weghị nke Anyị.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha gwara onye gwara ha ụdị ihe a.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Ije Ozi Gara Aga? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Kwuo otú ọgbakọ unu si jee ozi n’afọ ije ozi gara aga. Kwuo ebe unu kacha mee nke ọma, jaakwa ha mma. Kwuo otu ebe ma ọ bụ ebe abụọ unu ga-arụkwu ọrụ n’afọ ije ozi a, kwuokwa ihe ga-enyere unu aka imekwu nke ọma n’ebe ndị ahụ.
Nkeji 15: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 16:19-40. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Abụ nke 44 na Ekpere