Jiri Broshọ Bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? Nyere Ndị Mmadụ Aka
Broshọ Anyị Ga-eji Nyere Ndị Anyị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka Ha Mata Nzukọ Jehova
1. Olee ihe atọ mere e ji bipụta broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?
1 Ị̀ malitela iji broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? na-enyere ndị mmadụ aka? Ihe atọ mere e ji bipụta ya bụ ka anyị jiri ya nyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịmata (1) ndị anyị bụ, (2) ọrụ anyị na-arụ, na (3) ọgbakọ anyị. Isiokwu niile dị na broshọ a enweghị nke gafere otu peeji. Ihe ọzọ bụ na ịmụcha otu isiokwu anaghị ewe oge. Unu mụchaa ihe n’ụbọchị ọ bụla, unu nwere ike iji naanị nkeji ise ma ọ bụ karịa tụlee otu isiokwu.
2. Olee otú e si dee broshọ a? Oleekwa ihe ndị dị na ya?
2 Otú E Si Dee Ya: E kere broshọ a ụzọ atọ. Nkebi nke ọ bụla ga-enyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ịmata otu ihe banyere nzukọ Jehova. Broshọ a nwere isiokwu iri abụọ na asatọ. Isiokwu nke ọ bụla bụ ajụjụ. Isiokwu nta ndị dị na ya zakwara ajụjụ ahụ. E jikwa aka akwụkwọ gbara okpotokpo dee ha. Ihe ọzọ bụ na e nwere foto ndị e si n’ihe karịrị obodo iri ise nweta, e dekwara aha obodo nke ọ bụla na ha. Foto ndị ahụ ga-eme ka onye anyị na-amụrụ Baịbụl ghọta na ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ. E nwekwara ọtụtụ ebe e dere “Ihe Ọzọ Ị Ga-eme,” bụ́ ebe e kwuru ihe ndị ọzọ i nwere ike ịgwa onye ị na-amụrụ Baịbụl ka o mee.
3. Olee otú anyị nwere ike isi jiri broshọ a nyere onye anyị na-amụrụ Baịbụl aka?
3 Otú Ị Ga-esi Jiri Ya Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka: Ihe mbụ ị ga-eme bụ igosi ya isiokwu ị chọrọ ka unu leba anya. I gosichaa ya isiokwu ahụ, gụọnụ ya. Ka unu na-agụ ya, gosi ya isiokwu nta ndị ahụ e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo. Unu mechaa, jụọ ya ajụjụ ndị ahụ dị n’ala ala isiokwu ahụ. Unu nwere ike ịgụcha isiokwu ahụ niile tupu unu akọwaa ya. Unu nwekwara ike ịgụ otu paragraf kọwaa ya tupu unu agafee n’ọzọ. E nwere amaokwu Baịbụl ndị e dere n’isiokwu ahụ, ọ bụ gịnwa ga-ama nke unu ga-agụ. Unu ahapụkwala ịkọwa foto na igbe bụ́ “Ihe Ọzọ Ị Ga-eme.” Ọ ga-akacha mma ka unu bido n’isi nke mbụ mụrụ ya na-aga. Ma, e nwee ihe ị chọrọ ka onye ị na-amụrụ Baịbụl mara, unu nwere ike ịtụle isiokwu kwuru gbasara ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na unu chọrọ ịga mgbakọ, unu nwere ike ịhapụgodị isiokwu ndị ọzọ ka unu mụọ isiokwu nke iri na otu.
4. Olee ihe mere obi ji dị gị ụtọ maka broshọ ọhụrụ a?
4 Mgbe ọ bụla anyị na-amụrụ mmadụ Baịbụl, anyị na-enyere ya aka ka ọ mara Nna anyị nke eluigwe. Ma, anyị kwesịkwara ịkụziri ya gbasara nzukọ Jehova. (Ilu 6:20) Obi dị anyị ụtọ na broshọ a ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ime otú ahụ.