Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na June na July: Nnyefe pụrụ iche nke ùkwù akwụkwọ ndị e mere ọda ha site n’aka Society dị ka a kọwapụtara n’akwụkwọ ozi anyị nke March 1, 1999. Ùkwù ndị nwere akwụkwọ anọ maka ₦70 (ma ọ bụ ₦60 ma ọ bụrụ na Akwukwọm nke Akukọ Bible esoghị n’ùkwù ahụ). August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. September: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.