Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/00 p. 2
  • Usoro Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite February 14
  • Izu Na-amalite February 21
  • Izu Na-amalite February 28
  • Izụ Na-amalite March 6
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 2/00 p. 2

Usoro Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite February 14

Abụ nke 113

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.”

15 min: “Kwusaa Okwu Ya . . . Ngwa Ngwa.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Gụnye okwu dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 170. Tụọ aro ụfọdụ kwesịrị ekwesị banyere otú a ga-esi mụbaa ime nkwusa n’oge ọkọchị fọrọnụ.

20 min: “Ụzọ Isi Zụlite Nkà Isoro Ndị Ọzọ Na-atụgharị Uche.” Okwu na ihe ngosi. Kọwaa ihe mere inwe nkà nke iso ndị ọzọ atụgharị uche ji dị oké mkpa n’ozi nakwa ụzọ isi nweta ya. Mee ka ndị nkwusa abụọ ruru eru kwurịta ụzọ e si akwadebe maka ozi site n’ịgbaso nzọụkwụ ndị e depụtara na paragraf nke 3 nke isiokwu ahụ, mgbe ahụkwa mee ihe ngosi nke nkwurịta okwu ha.

Abụ nke 182 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 21

Abụ nke 17

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: “Okwu Amụma Nile nke Chineke Ga-emezu!” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Kọwapụta ihe ole na ole dị n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ ndị na-eme ka ịdị mkpa nke oge anyị pụta ìhè.

20 min: “Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Iguzosi Ike n’Okwukwe?” Okwu onye okenye ga-ekwu. Anyị bi n’oge dị oké egwu, enyemaka dịkwa anyị nile mkpa n’ụzọ ụfọdụ. Tụleghachị ihe ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi pụrụ ime iji wusie ndị nwere nsogbu ndị na-akụda ha aka ike. (Lee isiokwu nta bụ́ “Ọzụzụ Atụrụ nke Na-ewuli Elu” nke dị n’Ụlọ Nche nke September 15, 1993, peji nke 21-23.) Kọwaa otú anyị pụrụ isi nyere ibe anyị aka n’ụzọ ndị ga-eme ka anyị guzosie ike n’ụzọ ime mmụọ.—Rom 1:11, 12.

Abụ nke 82 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 28

Abụ nke 46

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka February. Tụleghachi ná nkenke “Nzọụkwụ Anọ Ndị Dị Mfe” maka iji traktị malite mkparịta ụka bụ́ ndị a kọwapụtara na peji nke 4 nke Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa gara aga. Mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi jiri trakti Ụwa Ọhụrụ nke Udo malite ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mgbe ị jụsịrị ajụjụ ndị dị na paragraf malitere traktị ahụ, gụpụta paragraf mbụ dị na peji nke 3, gụnyere Abụ Ọma 37:29. Ọ bụrụ na o gosi mmasị, sapeta peji nke 5 nke akwụkwọ Ihe Ọmụma, gụpụta igbe ahụ, gwakwa ya ka gị na ya nwee ọmụmụ ihe. N’ọnwa a, mmadụ nile kwesịrị ịgba mbọ pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ọhụrụ.

5 min: Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu.

12 min: Inwe Ekele Maka Ọrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè. Okwu onye okenye ga-ekwu, nke dabeere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke November 1995. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè 25 ndị dị ugbu a n’ókèala nke alaka Nigeria na-elekọta enyewo aka n’iwu, iwugharị, na idozi Ụlọ Nzukọ Alaeze 530. A ka nwere ọtụtụ ọrụ a ga-arụ. Tụlee ọrụ kọmitii ógbè, meekwa ka e nwee ịnụ ọkụ n’obi maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kọwaa ndị pụrụ iru eru dị ka ndị ọrụ afọ ofufo, kpaliekwa ndị ọzọ inye onwe ha n’afọ ofufo. (Lee ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke April 1998, paragraf nke 12-14.) Gbaa ụfọdụ ndị kewooro òkè n’ọrụ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ajụjụ ọnụ, meekwa ka ha kwuo ọṅụ ha nwetaworo.—Lee Ụlọ Nche nke June 1, 1999, peji nke18-19, paragraf nke 15-16.

18 min: “Iji Ọtụtụ Nkwezu Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ.” Jiri minit abụọ ma ọ bụ atọ kwuo okwu mmeghe na-eru n’obi nke dabeere n’ihe ọmụma nakwa akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha ma hota na paragraf nke 1 na nke 2. Mgbe ahụ jiri ajụjụ na azịza tụlee paragraf nke 3-12.

Abụ nke 61 na ekpere mmechi.

Izụ Na-amalite March 6

Abụ nke 116

5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

10 min: Mkpa ọgbakọ.

15 min: “Lezienụ Anya Otú Unu Si Anụ.” Onyeisi ezinụlọ na nwunye ya na ụmụ ya ekwurịta ihe ha pụrụ ime iji ritekwuo uru n’ụzọ zuru ezu ná nzukọ ọgbakọ, nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ya ekwuo na ndị ezinụlọ ahụ nile pụrụ ịṅa ntị karị. Ha atụleghachi aro ndị e depụtara ma tụlee otú ha ga-esi tinye nke ọ bụla n’ọrụ, gụnyere mkpa ọ dị inwekwu nkwurịta okwu banyere ihe ndị ha mụtara. Ha atụlee otú ha ga-esi mezuo mkpebi ha mere na ha agaghị ahapụ ịga nzukọ ma ọ bụ nnọkọ mgbakọ ọ bụla ma ọ bụrụ nnọọ na ọ ga-ekwe mee.

15 min: “Iji Ọtụtụ Nkwezu Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ.” Mgbe ị tụleghachisịrị n’ụzọ dị nkenke paragraf 12 mbụ nke ihe ntinye bụ́ ndị a tụlere n’izu gara aga, duzie ajụjụ na azịza nke paragraf nke 13-24. Jiri akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e hotara ma zoo aka na ha, mee ihe nke ọma.

Abụ nke 186 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya