Ntụleghachi Odide Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi odide e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke May 1 ruo August 21, 2000. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike ịza n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide a, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe gị. Nọmba peeji na paragraf nwere ike ghara ịpụta n’aka nile e zoro n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Otú Gideọn si zaghachi nkatọ ndị ikom Efraim katọrọ ya gosiri ịdị nwayọọ na ịdị umeala n’obi, o si otú a leghara nkatọ ha anya ma mee ka udo dịrị. (Ikpe 8:1-3) [Ọgụgụ Bible kwa izu]
2. Ọ bụ ezie na Manoa sịrị, “ọ bụ Chineke ka anyị hụworo,” n’ezie, ya na nwunye ya hụrụ ọnụ na-ekwuru Chineke, bụ́ onye nwoghara onwe ya, ọ bụghị Jehova n’onwe ya. (Ikpe 13:22) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w88-E 5/15 p. 23 para. 3.]
3. Akwụkwọ Ndị Ikpe na-eme ka nkweta anyị kwetara na Jehova bụ Onye Mgbapụta dị ukwuu nke ndị na-efe ya ofufe siwanye ike. [w84 10/15 p. 30 para. 6]
4. Dị ka Naomi, ndị agadi pụrụ inwe mkpa nke onye ga-elekọta ha, ma ha achọghị ịbụ ibu arọ. [w93 8/15 p. 28 para. 1]
5. Ndị Ikpe 21:25 na-ezo aka n’oge mgbe Jehova kwụsịrị iduzi mba Israel n’ụzọ ọ bụla. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 6/15 p. 22 para. 16.]
6. Ihe oyiyi ndị cherub nọ n’elu igbe ọgbụgba ndụ ahụ gosiri ọnụnọ Jehova dị ka eze, bụ́ onye a sịrị na o “bi n’etiti cherubim.” (1 Sam. 4:4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w81 5/1 p. 29 para. 2.]
7. Mgbe ndị agha Sọl riri ọbara n’ihi ọnọdụ siri ike ha nọ na ya ma ghara ịnara ahụhụ n’ihi ya, nke a gosiri na a pụrụ inwe ezi ihe ndị ga-eme ka e legharatụ iwu Chineke anya iji chebe ndụ mmadụ. (1 Sam. 14:24-35) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w94 4/15 p. 31 para. 7-9.]
8. Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-ejikọ okwu ahụ bụ́ ‘ime ka e kwenye’ na nrụgide na aghụghọ, a pụrụ iji ya mee ihe n’ụzọ ziri ezi iji nye echiche nke ime ka e kweta na ịkpata mgbanwe obi site ná ntụgharị uche dị mma na nke ezi uche dị na ya. (2 Tim. 3:14, 15) [w98 5/15 p. 21 para. 4]
9. “Ngwugwu nke ndị dị ndụ” na-ezo aka ná ndokwa Chineke mere maka nchebe, bụ́ nke ga-abara Devid uru ma ọ bụrụ na o zere ịbụ onye ikpe ọbara mara n’anya Chineke. (1 Sam. 25:29) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w91 6/15 p. 14 para. 3.]
10. Ọgbụgba ndụ Alaeze Devid, nke e zoro aka na ya na 2 Samuel 7:16, nyekwuru aka mee ka usoro ọmụmụ nke Mkpụrụ ahụ ga-abụ Mesaịa ga-esi na ya pụta doo anya, ọ bụkwa ihe ndabere nke iwu kwadoro na onye si n’eriri Devid ga-abịa ịchị “ruo mgbe ebighị ebi.” [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 2/1 p. 14 para. 21-p. 15 para. 22.]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Obi ike dị aṅaa ka Abụ Ọma 34:18 na-enye? [w98 4/1 p. 31 para. 2]
12. Gịnị ka eziokwu ahụ bụ́ na e nyere Josef utu aha bụ́ Banabas gosiri? (Ọrụ 4:36) [w98 4/15 p. 20 para. 3, nkọwa ala ala peeji NW.]
13. N’ihi gịnị ka ihe ndekọ Bible ji kwuo na Ilaị na-asọpụrụ ụmụ ya karịa ka ọ sọpụụrụ Jehova? (1 Sam. 2:12, 22-24, 29) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 9/15 p. 13 para. 14.]
14. Gịnị mere ndụ ji dị Naomi na-eme agadi ilu? [w93 8/15 p. 27 para. 5]
15. Dị ka 1 Samuel 1:1-7 si gosi, ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka ezinụlọ Samuel setịpụrụ? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w98 3/1 p. 16 para. 12.]
16. N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na ‘aghụghọ nke akụ̀, na-eduhie eduhie’? (Mat. 13:22) [w98 5/15 p. 5 para. 1]
17. Olee otú Jonatan bụ́ okenye si gosi na ya nabatara onye Jehova tere mmanụ, bụ́ Devid, gịnịkwa ka nke a na-ese onyinyo ya taa? (1 Sam. 18:1, 3, 4) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w89 1/1 p. 24, 26 para. 4, 13.]
18. Ọ bụ ezie na ọ bụ “[onye a na-apụghị ịta ụta, NW], ziekwa ezie,” olee otú akwụkwọ Job si gosi na nke a apụtaghị na Job bụ onye zuru okè? (Job 1:8) [w98 5/1 p. 30 para. 7]
19. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “jisienụ ike” pụtara? (Luk 13:24) [w98 6/15 p. 31 para. 1, 4]
20. Mgbe anyị na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ, ihe mmụta dị aṅaa bara uru ka anyị pụrụ iburu n’uche, dị ka e dekọrọ ya na 2 Samuel 12:26-28? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w93 12/1 p. 19 para. 19.]
Denye okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
21. Ihe ndekọ dị ná Ndị Ikpe 16:1-21 na-akụziri anyị na anyị aghaghị ịnọgide na nche mgbe nile megide __________________________ nke __________________________ ahụ. [w84 10/15 p. 30 para. 3, 4]
22. Akwụkwọ abụọ nke Samuel na-akọwa ọgwụgwụ nke oge __________________________ na mmalite nke ọchịchị site n’aka __________________________ Israel. [w85 1/15 p. 22 para. 3]
23. Aha Chineke, bụ́ Jehova, pụtara “ __________________________” na-enye echiche na Jehova pụrụ ịrụzu ọrụ ọ bụla dị mkpa iji mezuo __________________________ ya. [w98 5/1 p. 5 para. 3]
24. A mụrụ __________________________ ahụ, bụ́ “Nwa Devid,” na __________________________. [w85 1/15 p. 24 para. 3]
25. Ilu Jisọs tụrụ banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi na-egosi na onye ụzọ ya ziri ezi n’ezie abụghị nanị onye na-erube isi __________________________ Chineke kamakwa ọ bụ onye na-eṅomi __________________________ ya. (Luk 10:29-37) [w98 7/1 p. 31 para. 2]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. (Rut; Naomi; Ọpa), agbahapụghị nne di ya. Ọ hụrụ ya na Jehova, bụ́ Chineke nke nne di ya na-efe ofufe, n’anya. [w93 8/15 p. 28 para. 2]
27. Oge ọchịchị nke ndị ikpe n’Israel ruru ná njedebe mgbe e tere (Samuel; Devid; Sọl) mmanụ dị ka eze, ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, o meriri (ndị Amọn; ndị Moab; ndị Filistia) site ná nkwado Jehova. (1 Sam. 11:6, 11) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w95 12/15 p. 9 para. 2 p. 10 para. 1.]
28. Ọ bụ (Pọl onyeozi; nna ya; nne ya na nne ya ochie) butere ụzọ n’ịzụlite Timoti ‘n’ihe dị nsọ nile’ ruo n’ókè nke ịhụ ya ka ọ ghọrọ onye ozi ala ọzọ na onye nlekọta bụ ọkpọka. (2 Tim. 3:14, 15; Phil. 2:19-22) [w98 5/15 p. 8 para. 3-p. 9 para. 5]
29. Ịdị umeala n’obi, ndidi, na ndabere (Devid; Samuel; Jonatan) dabeere na Jehova dị ndị ohu Jehova nọ n’afọ ndụ nile mkpa. [w85 1/15 p. 23 para. 2]
30. A na-akpọ ebe ahụ nke Jerusalem dị n’eluigwe dị (“Ugwu Zaịọn;” “Jerusalem nke dị n’elu;” “Jerusalem Ọhụrụ”). [w85 1/15 p. 25 para. 2]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-esonụ na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ikpe 11:30, 31; 1 Sam. 15:22; 30:24, 25; 2 Eze 6:15-17; Jes. 5:11
31. Jehova na-emesi ndị ya obi ike na ya ga-eji usuu ndị agha nke eluigwe echebe ha dị ka uche ya si dị. [w98 4/15 p. 29 para. 5]
32. Ndị nlekọta ọgbakọ nwere ibu ọrụ nke imezu ihe ha kwekọrịtara n’agbanyeghị na ọ pụrụ ịbụ ihe mwute na ihe siri ike mgbe ụfọdụ. [w99 9/15 p. 10 para. 3-4]
33. Ịnọgide ná nguzosi ike n’ezi ihe mgbe e nwere ule na-eme ka e nweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu site n’aka Jehova Chineke. [w98 5/1 p. 31 para. 3]
34. Inwe ezi ịhụnanya maka Chineke chọrọ irubere ntụzi ya isi ọ bụghị nanị ịchụrụ ya àjà. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w96 6/15 p. 5 para. 1.]
35. Jehova na-egosi mmasị miri emi maka ndị na-arụ ọrụ nkwado ná nzukọ ya taa. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w87 4/1 p. 28 para. 4.]