Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/00 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 8/00 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’August na September: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. October: Ụlọ Nche na Teta! A pụrụ inyefe ụtụ ebe a chọtara mmasị ná nletaghachi. Na-amalite ná ngwụsị ọnwa ahụ, a ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 36, bụ́ “Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?” November: Nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị jezuru ókèala ha site n’iji otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze nke 36 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ebe obibi ọ bụla pụrụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetala ha, a pụrụ iji akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi mee ihe.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe nke ahụ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla ókè fọm zuru ezu maka iji mee ihe n’afọ ije ozi 2001. Biko jirinụ ezi uche were fọm ndị a mee ihe. E kwesịrị iji ha mee ihe nanị maka nzube e ji mepụta ha.

◼ E kwesịrị ime ngụkọ a na-eme kwa afọ nke akwụkwọ na magazin nile e nwere n’August 31, 2000, ma ọ bụ n’oge dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ịgụ akwụkwọ ọnụ kpọmkwem nke onye nlekọta akwụkwọ na-eme kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ngụkọta ha na fọm Literature Inventory (S-18). A pụrụ ị jụta magazin ole e nwere site n’aka ndị na-elekọta magazin n’ọgbakọ ọ bụla so n’ìgwè nwekọrọ akwụkwọ ọnụ. Ọgbakọ ọ bụla nhazi dị n’aka ga-enweta fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Biko ziterenụ Society ibe nke mbụ tupu September 6 agafee. Debenụ ibe nke abụọ ya na faịlụ unu. A pụrụ iji ibe nke atọ mee ihe dị ka ibe akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ. Odeakwụkwọ na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ nhazi dị n’aka ga-abịanye aka na fọm ahụ.

◼ Malite n’August 20, 2000, ruo September 2, 2000, Society ga na-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ihi ngụkọ a, ọ dịghị ọda akwụkwọ ọgbakọ tinyere nke a ga-akwadebe maka ibupụ ma ọ bụ ka a bịa buru n’ụbọchị ndị ahụ.

◼ Obi dị anyị ụtọ ịgwa unu na ọha na eze pụziri ịbịa ugbu a n’ebe nnabata ndị ọbịa nke ebe obibi akwụkwọ dị n’Igieduma. Nke a pụtara na mgbe ọ bụla unu bịara nleta n’alaka ụlọ ọrụ, ọ ga-ekwe mee inwetatụ magazin na akwụkwọ. Biko rịba ama na ọ dịghị ihe ndị a na-atụrụ ọda pụrụ iche ị ga-enweta. Otú ọ dị, anyị na-agba gị ume ka ị gbalịsie ike ruo n’ókè o kwere mee inweta akwụkwọ site n’ọgbakọ gị, ebe nke ahụ bụ ụzọ Society na-esikarị enye ọgbakọ dị iche iche ihe ndị dị ha mkpa.

◼ E mewo mgbanwe ndị na-esonụ ‘n’Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti nke 2000,’ nke pụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 2000. Biko, onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ ọ bụla a gbanweworo ebe ma ọ bụ ụbọchị ha ga-enwe mgbakọ distrikti, kwesịrị ime ndokwa ka a maa ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ mgbe e nwetasịrị mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke a.

October 27-29, 2000

SULEJA 1 (Yoruba) Y-13B

ULI 1 (Igbo) IB-6: Akoh, Iyiukwu, Mmakwum, Okpuno Okwu, Omabala, na Ububa; IB-7, 33

November 3-5, 2000

SULEJA 2 (Bekee) NE-1B: P ruo Z; NE-7

November 10-12, 2000

AGBOR 2 (Bekee) ME-10: Oloa; ME-11; ME-13: A ruo I

JOS 3 (Bekee) NE-3: Ọgbakọ ndị a na-ekenyeghị na Jos 2; NE-4

ZARIA (Bekee) NE-1A, NE-2

November 17-19, 2000

SULEJA 3 (Bekee, Ụdị Asụsụ Ogbi nke America) NE-1B: A ruo O; NE-5

November 24-26, 2000

ULI 5 (Bekee) EE-9: A ruo J; EE-10; EE-24: Agba, Central (Onitsha), Enugu Agidi, Express, Ezinato, GRA, Nimo, Trans-Nkisi, Umudike, Umunachi, na Umuokwara

December 1-3, 2000

ULI 6 (Igbo) IB-29; IB-22: A ruo O; IB-25

December 8-10, 2000

AGBOR 6 (Bekee) ME-10: Enede; ME-15: A ruo N; ME-17; ME-18: Emu Uno

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya