Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/00 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite September 11
  • Izu Na-amalite September 18
  • Izu Na-amalite September 25
  • Izu Na-amalite October 2
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 9/00 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

IHE ỊRỊBA AMA: Ozi Alaeze Anyị ga-ahazi Nzukọ Ije Ozi maka izu nke ọ bụla n’oge mgbakọ. Ọgbakọ dị iche iche pụrụ ime mgbanwe ndị dị mkpa iji nye ohere maka ịga Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-eme Okwu Chineke.” N’ebe o kwesịrị ekwesị, ná Nzukọ Ije Ozi ikpeazụ tupu unu agawa mgbakọ, jirinụ minit 15 tụleghachi ndụmọdụ a kapịrị ọnụ bụ́ nke dị n’ihe ntinye nke ọnwa a. Gbaanụ mmadụ nile ume ijiri minit ole na ole leba anya n’usoro ihe omume ahụ e biri ebi tupu nnọkọ nke ụtụtụ na nke ehihie ọ bụla amalite ma na-eche echiche banyere ihe a pụrụ ịtụle. Nke a ga-eme ka ọ dị mfe itinye uche n’usoro ihe omume ahụ ma detuo ihe ndị dị nkenke ma baa uru. Mgbe izu abụọ ruo izu anọ gasịrị ka a lọtasịrị mgbakọ ahụ, e kwesịrị ime ndokwa ijiri minit 30 tụlee isi ihe ndị dị n’usoro ihe omume ahụ ná Nzukọ Ije Ozi. N’oge ahụ, onye ọ bụla ga-adị njikere ikwu okwu dị nkenke mgbe ụmụnna nwoke atọ ruru eru bụ́ ndị e kenyere ime akụkụ a kpọrọ ha ime otú ahụ. Okwu ndị dị otú ahụ pụrụ igosi otú ihe ndị a mụtara ná mgbakọ si metụta ndụ mmadụ na ozi ubi ya. A pụrụ ịkọ otu ma ọ bụ ahụmahụ abụọ dị nkenke a họtara ahọta. Ezi nkwadebe nke mmadụ nile ga-eme bụ isi ihe ga-eme ka akụkụ a nke Nzukọ Ije Ozi bụrụ ihe na-akpali mmasị na nke na-akụzi ihe.

Izu Na-amalite September 11

Abụ nke 125

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

15 min: “Ị̀ Na-eji Ihe Ime Mmụọ Akpọrọ Ihe?” Okwu okenye ga-ekwu. Mesie ike mkpa ọ dị ịgazu ụbọchị atọ nile nke mgbakọ distrikti.

20 min: “Jiri Ihe Ndị Na-eme Ugbu A Kpalie Mmasị.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee na ihe ngosi. Kpọtụ uche n’ihe dị iche iche na-eme ugbu a bụ́ ndị kpaliworo mmasị n’ógbè unu. Olee nchegbu ihe ndị a meworo ka e nwee banyere ọdịnihu? N’iji akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible peeji nke 4 eme ihe, tụọ aro ụfọdụ banyere ụzọ isi kwadebe okwu mmeghe nke ga-eduje ná nkwurịta okwu Bible. Mee ihe ngosi abụọ dị irè, bụ́ ndị a kwadebere nke ọma.

Abụ nke 224 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 18

Abụ nke 2

13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

16 min: “Gee Ntị n’Okwu Nsọ.” Ajụjụ na azịza. Mesie ike ihe ndị mere anyị nile kwesịrị iji nọrọ n’oche anyị mgbe nnọkọ ọ bụla na-amalite.

16 min: “Na-ebinụ Obi nke Ọma Bụ́ nke Na-enye Chineke Otuto.” Otu okenye esoro otu ezinụlọ kwurịta isiokwu a. Ha atụlee ihe ọ dị ha mkpa ime iji nọgide na-eme ihe n’usoro, na-akpa àgwà ọma, na-adị ọcha, na-eji ejiji kwesịrị nṅomi, ma na-akpakwa àgwà kwesịrị nṅomi n’ebe ọha mmadụ na-anọ.

Abụ nke 203 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 25

Abụ nke 93

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa inye akụkọ ozi ubi ha maka September. Tụlee Igbe Ajụjụ.

13 min: “Ngọzi Jehova Na-eme Anyị Ọgaranya.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.—Lee Insight, Mpịakọta nke 2, peeji nke 804, paragraf nke 6-7.

17 min: “Ndụ Nọ n’Ihe Ize Ndụ!” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. Mee ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha n’isokwu a pụta ìhè.

Abụ nke 30 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite October 2

Abụ nke 169

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gwa ọgbakọ banyere nkesa pụrụ iche e mere atụmatụ ya maka Akụkọ Alaeze nke 36, bụ́ nke ga-amalite na Monday, October 16 ma gaa n’ihu ruo Friday, November 17. Gbaa mmadụ nile ume, gụnyere ndị na-eto eto na ndị ọhụrụ, ịgbalịsi ike ikere òkè zuru ezu. Ndị nduzi ọmụmụ ihe kwesịrị ịmalite ugbu a ịgba ndị nile nọ n’ìgwè ha ume na ịhazi ha ijiri ịnụ ọkụ n’obi kere òkè ruo n’ókè o kwere mee. Gụnye ahụmahụ ndị na-ewuli elu sitere ná nkesa ikpeazụ nke Akụkọ Alaeze.

15 min: “Èkwesịrị M Ịkwaga Ebe Ọzọ?” Okwu okenye ga-ekwu. Kọwaa ihe mere o ji dị mkpa iji nghọta eme ihe n’ime mkpebi ịkwaga ebe ọzọ. Tụlee ụzọ isi tinye ndụmọdụ dị n’Ilu 22:3 n’ọrụ. Kwuokwa okwu na ndụmọdụ ndị dị n’Ụlọ Nche nke August 15, 1988, peeji nke 22.

15 min: Olee Otú Anyị Si Mee n’Afọ Gara Aga? Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Tụlee ihe ndị pụtara ìhè sitere n’akụkọ ozi ọgbakọ maka afọ ije ozi 2000. Kwuo okwu ịja mma maka ihe ndị dị mma a rụzuru. Kọwapụta ebe ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka e meziwanye ihe. Lekwasị anya n’otú ọgbakọ si mee n’ịga nzukọ, n’ịmalite na iduzi ọmụmụ Bible, na n’ịgachi ozi ubi anya. Kpọsịsịa ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru eru maka afọ na-abịanụ.

Abụ nke 205 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya