Usoro Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2001
Ntụziaka
N’ime afọ 2001, ndị a bụ usoro a ga-agbaso mgbe a na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
EBE IHE OMUME SI: Bible Nsọ nke Union Version, Ụlọ Nche [w-IB], Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè [yp-IB]; na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu (Mbipụta nke 1998) [td-IB] ga-abụ ebe ndị a ga-esi na-enye ihe omume.
E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata dị nkenke malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE. Ọ dịghị mkpa ikwu ihe ndị a ga-atụ anya ha n’usoro ihe omume ahụ. Ka onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-akpọlite ihe omume nke ọ bụla, ọ ga-ekwu isiokwu a ga-ekwu okwu na ya. Gaa n’ihu n’usoro a:
IHE OMUME NKE 1: minit 15. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, ọ ga-adaberekwa n’Ụlọ Nche. E kwesịrị ime ihe omume a dị ka okwu izi ihe ga-ewe minit 15 n’enweghị ajụjụ ọnụ. Nzube ya ekwesịghị ịbụ nanị ikwuzu ihe dị n’akwụkwọ ahụ kama ilekwasị anya n’abamuru nke ihe ọmụma ahụ a na-atụle, na-eme ka ihe ga-akasị nyere ọgbakọ aka pụta ìhè. E kwesịrị iji isiokwu e nyere mee ihe.
Ụmụnna e kenyere okwu a kwesịrị ilezi anya ka ha ghara ịgabiga oge e nyere. A pụrụ inye ndụmọdụ na-abụghị n’ihu ọha ma ọ dị mkpa ma ọ bụ ọ bụrụ na ọkà okwu ekwuo ka e nye ya.
ISI IHE NDỊ SITERE N’ỌGỤGỤ BIBLE: minit 6. Ọ bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi kwesịrị ime nke a, bụ́ onye ga-atụle isiokwu ahụ n’ụzọ dị irè n’ikwekọ ná mkpa ọgbakọ. Ọ dịghị mkpa ka e nwee isiokwu. Nke a ekwesịghị ịbụ nanị nchịkọta nke ihe ọgụgụ ahụ e kenyere ka a gụọ. A pụrụ ịgụnye ntụleghachi nke isiakwụkwọ Bible nile e kenyere bụ́ nke ga-ewe sekọnd 30 ruo 60. Otú ọ dị, nzube ya bụ́ isi bụ inyere ndị na-ege ntị aka ịghọta ihe mere na ụzọ ihe ọmụma ahụ si baara anyị uru. Mgbe ahụ onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-agwa ndị mmụta ka ha gaa na klas ha dị iche iche.
IHE OMUME NKE 2: minit 5. Nke a bụ ọgụgụ Bible nke ebe e kenyere ka a gụọ, nke nwanna nwoke ga-agụ, ma onye mmụta ahụ ọ̀ nọ n’ụlọ akwụkwọ nke mbụ ma ọ bụ n’ìgwè ndị ọzọkwa. Ọgụgụ ihe ahụ na-adịkarị nkenke iji nye ndị mmụta ahụ ohere ikwu okwu nkọwa dị mkpirikpi ná mmalite na ná mmechi okwu ha. A pụrụ ịgụnye ihe ọmụma akụkọ ihe mere eme, nghọta nke okwu amụma ma ọ bụ ozizi, na ụzọ a pụrụ isi jiri ụkpụrụ dị iche iche mee ihe. E kwesịrị ịgụ amaokwu nile ahụ e kenyere n’akwụsịtụghị akwụsị. Otú ọ dị, mgbe amaokwu ndị a gaje ịgụ na-esochighị onwe ha, onye mmụta ahụ pụrụ ịkpọ amaokwu ebe ọgụgụ ihe ahụ gafere.
IHE OMUME NKE 3: minit 5. A ga-ekenye nwanna nwanyị nke a. Isiokwu nke okwu a ga-adabere n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu. Ọnọdụ okwu ahụ pụrụ ịbụ ịgba àmà mberede, nletaghachi, ma ọ bụ ọmụmụ Bible ebe obibi, ndị na-eme ya pụkwara ịnọdụ ala ma ọ bụ guzo ọtọ. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-enwe mmasị karịsịa n’ụzọ onye mmụta ahụ si kọwaa isiokwu ahụ e kenyere ya ma nyere onye nwe ụlọ aka ịtụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche. Onye mmụta e kenyere ihe omume a kwesịrị ịma otú e si agụ ihe. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekenye otu onye inyeaka, ma a pụrụ ijikwu onye inyeaka ọzọ mee ihe. Ọ bụghị ọnọdụ okwu ahụ kama ụzọ e si jiri Bible mee ihe n’ụzọ dị irè bụ ihe e kwesịrị ichebara echiche karịsịa.
IHE OMUME NKE 4: minit 5. Isiokwu nke ihe omume a ga-adabere n’akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ na Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu. A pụrụ ikenye nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwanyị Ihe Omume nke 4. Mgbe ọ bụla e kenyere ya nwanna nwoke, o kwesịrị ịbụ okwu. Mgbe e kenyere ya nwanna nwanyị, e kwesịrị ime ya dị ka a kọwapụtara maka Ihe Omume nke 3.
USORO ỌGỤGỤ BIBLE: A na-agba onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ume igbaso usoro ọgụgụ Bible kwa izu, bụ́ nke pụtara ịgụ ihe dị ka otu peeji kwa ụbọchị.
RỊBA AMA: Iji nwetakwuo ihe ọmụma na ntụziaka banyere ndụmọdụ, idebe oge, ntụleghachi odide, na ịkwadebe ihe omume, biko lee peeji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị nke October 1996.
USORO IHE OMUME
Jan. 1 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 13-16
Abụ nke 62
Nke 1: Otu Omume Mgbaghara Emeghee Ụzọ Maka Nzọpụta (w99 1/1 p. 30-31)
Nke 2: 2 Ndị Eze 14:1-14
Nke 3: td 27CH N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Jụ Ụdị Nile nke Ime Mgbaasị?
Nke 4: Ihe ‘Ịsọpụrụ Nna Gị na Nne Gị’ Pụtara (yp isi 1)
Jan. 8 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 17-20
Abụ nke 116
Nke 1: Ndụmọdụ nke Ka Mfe Nnara (w99 1/15 p. 21-24)
Nke 2: 2 Ndị Eze 18:1-16
Nke 3: td 5A Ihe Mere na Jehova Apụghị Ịbụ Akụkụ nke Atọ n’Ime Otu
Nke 4: Otú Ndị Ntorobịa na Ndị Mụrụ Ha Pụrụ Isi Na-aghọta Onwe Ha (yp isi 2 p. 18-19, 22-25)
Jan. 15 Ọgụgụ Bible: 2 Ndị Eze 21-25
Abụ nke 61
Nke 1: w85 6/1 p. 30 para. 3-6
Nke 2: 2 Ndị Eze 21:1-16
Nke 3: td 5B Ọkpara ahụ na Nna Ya Ahaghị Nhata
Nke 4: Ihe Mere Ndị Ntorobịa Kwesịrị Iji Na-akọrọ Ndị Mụrụ Ha Izu Nzuzo Ha (yp isi 2 p. 20-21)
Jan. 22 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 1-5
Abụ nke 16
Nke 1: w85 11/1 p. 27 para. 1-3
Nke 2: 1 Ihe E Mere 1:1-27
Nke 3: td 5C Otú Chineke na Kraịst Si Bụrụ Otu
Nke 4: Ihe Mere Ndị Mụrụ Ụmụ Ji Achịkwa Nnwere Onwe nke Ụmụ Ha (yp isi 3 p. 26-33)
Jan. 29 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 6-10
Abụ nke 73
Nke 1: Otú A Pụrụ Isi Gosi Ezi Ịdị Umeala n’Obi (w99 2/1 p. 6-7)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 9:1-21
Nke 3: td 5D Mmụọ Nsọ Abụghị Onye
Nke 4: Mmadụ na Ụmụnne Ya Ịdị ná Mma (yp isi 6)
Feb. 5 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 11-16
Abụ nke 65
Nke 1: Bụrụ Onye Na-enye Agbamume (w99 2/15 p. 26-29)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 11:1-19
Nke 3: td 1A Ọ Bụghị Chineke Kpatara Nsogbu Ụwa
Nke 4: Ihe Mere Ịhapụ Ụlọ Na-ejighị Bụrụ Ihe Ngwọta Ya (yp isi 7)
Feb. 12 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 17-23
Abụ nke 122
Nke 1: Werenụ Obi Dị Umeala Kee Onwe Unu Dị Ka Ákwà (w99 3/1 p. 30-31)
Nke 2: 1 Ihe E Mere 18:1-17
Nke 3: td 1B Ihe Mere Chineke Jiworo Kwere Ka Ajọ Omume Dịrị
Nke 4: Inweta Ezi Ndị Enyi (yp isi 8 p. 65-67, 70-72)
Feb. 19 Ọgụgụ Bible: 1 Ihe E Mere 24-29
Abụ nke 119
Nke 1: w85 11/1 p. 28 para. 1 ruo p. 29 para. 1
Nke 2: 1 Ihe E Mere 29:1-13
Nke 3: td 1CH Chineke Na-egosipụta Ebere Ya Dị Ukwuu
Nke 4: Inyere Enyi Nwere Nsogbu Siri Ike Aka (yp isi 8 p. 68-69)
Feb. 26 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 1-5
Abụ nke 168
Nke 1: w85 11/1 p. 29 para. 2 ruo p. 30 para. 3
Nke 2: 2 Ihe E Mere 1:1-17
Nke 3: td 1D Alaeze Chineke Bụ Nanị Ihe Ngwọta Dịnụ
Nke 4: Ihe Mere Ndị Ntorobịa Ji Ekwenyere Nrụgide Ndị Ọgbọ (yp isi 9 p. 73-76)
Mar. 5 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 6-9
Abụ nke 103
Nke 1: Ekwela Ka Nchegbu Rikpuo Gị (w99 3/15 p. 21-23)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 8:1-16
Nke 3: td 18A Ezi Ndị Kraịst Nile Aghaghị Ịgbara Eziokwu Àmà
Nke 4: Ịnagide Nrụgide Ndị Ọgbọ (yp isi 9 p. 77-80)
Mar. 12 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 10-15
Abụ nke 59
Nke 1: Ònye Na-akpụzi Echiche Gị? (w99 4/1 p. 20-22)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 10:1-16
Nke 3: td 18B Ihe Mere Anyị Ji Nọgide Na-akpọtụrụ Ndị Mmadụ
Nke 4: Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọdịdị Dị Mkpa? (yp isi 10)
Mar. 19 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 16-20
Abụ nke 69
Nke 1: Chebe Obi Gị Pụọ ná Mmụọ nke Ofufe Beal (w99 4/1 p. 28-31)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 16:1-14
Nke 3: td 18CH Ịgba Àmà Na-eme Ka Anyị Pụọ n’Ikpe Ọmụma Ọbara
Nke 4: Ihe Na-eduzi Ụdị Uwe Onye Kraịst Na-ahọrọ (yp isi 11 p. 90 ruo p. 94 para. 1)
Mar. 26 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 21-25
Abụ nke 212
Nke 1: Alala Azụ n’Igosipụta Ekele (w99 4/15 p. 15-17)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 22:1-12
Nke 3: td 15A N’ihi Gịnị Ka Mmadụ Na-agaghị Eji Fee Ndị Nna Ya Ochie Ofufe?
Nke 4: Uru Ndị Dị n’Iyi Uwe Dị ‘Nsọpụrụ Ma Kwesị Ekwesị’ (yp isi 11 p. 94 para. 2 ruo p. 96)
Apr. 2 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 26-29
Abụ nke 49
Nke 1: Chineke Ọ̀ Na-arụ Ọrụ n’Ụzọ Ndị “Gbagọrọ Agbagọ”? (w99 5/1 p. 28-29)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 28:1-15
Nke 3: td 15B Ihe Mere A Pụrụ Iji Sọpụrụ Mmadụ Ma Fee Nanị Chineke
Nke 4: Ụzọ Isi Wulite Ùgwù Onwe Onye (yp isi 12 p. 98 ruo p. 101 para. 2)
Apr. 9 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 30-33
Abụ nke 1
Nke 1: Olee Otú Ụmụ Mmadụ Pụrụ Isi Gọzie Jehova Chineke? (w99 5/15 p. 21-24)
Nke 2: 2 Ihe E Mere 33:1-13
Nke 3: td 4 A Olee Otú A Ga-esi Kwụsị Ajọ Omume?
Nke 4: Kpachara Anya Maka Obi Ike Onwe Onye Hiere Ụzọ (yp isi 12 p. 101 para. 3 ruo p. 103)
Apr. 16 Ọgụgụ Bible: 2 Ihe E Mere 34-36
Abụ nke 144
Nke 1: w85 11/1 p. 30 para. 4 ruo p. 31 para. 1 na igbe ndị dị na p. 28-29
Nke 2: 2 Ihe E Mere 36:1-16
Nke 3: td 4 B N’ihi Gịnị Ka Amagedọn Ga-eji Bụrụ Omume Ịhụnanya nke Chineke?
Nke 4: Gịnị Na-akpata Ịda Mbà n’Obi? (yp isi 13 p. 104 ruo p. 106 para. 2)
Apr. 23 Ọgụgụ Bible: Ezra 1-6
Abụ nke 90
Nke 1: w86 2/15 p. 29-30
Nke 2: Ezra 4:1-16
Nke 3: td 6A Baptism Bụ Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Kraịst
Nke 4: Ịmata na Ibelata Ịda Mbà n’Obi (yp isi 13 p. 106 para. 3 ruo p. 111 para. 2)
Apr. 30 Ntụleghachi Odide. Ọgụgụ Bible: Ezra 7-10
Abụ nke 203
May 7 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 1-5
Abụ nke 56
Nke 1: w86 6/1 p. 21 para. 1-19
Nke 2: Nehemaịa 1:1-11
Nke 3: td 6B Baptism Adịghị Asachapụ Mmehie
Nke 4: Ụzọ Isi Lụsoo Ịda Mbà n’Obi Ọgụ (yp isi 13 p. 111 para. 3 ruo p. 114)
May 14 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 6-9
Abụ nke 155
Nke 1: Ọgbakọ Ndị Kraịst Bụ Ebe E Si Enweta Enyemaka Na-ewusi Ike (w99 5/15 p. 25-28)
Nke 2: Nehemaịa 9:1-15
Nke 3: td 7A Bible Ò Sitere n’Ike Mmụọ Nsọ n’Ezie?
Nke 4: Ụzọ Isi Nọrọ Nanị Gị Ma Ghara Inwe Owu Ọmụma (yp isi 14 p. 115-117)
May 21 Ọgụgụ Bible: Nehemaịa 10-13
Abụ nke 46
Nke 1: w86 6/1 p. 22 para. 1-20
Nke 2: Nehemaịa 12:27-43
Nke 3: td 7B Ihe Mere Bible Ji Bụrụ Ihe Nduzi Bara Uru Maka Ụbọchị Anyị
Nke 4: Ihe Ngwọta Dịịrị Owu Ọmụma (yp isi 14 p. 118-120)
May 28 Ọgụgụ Bible: Esta 1-4
Abụ nke 38
Nke 1: w86 7/1 p. 27 para. 1 ruo p. 28 para. 1
Nke 2: Esta 1:1-15
Nke 3: td 7C Maka Ole Ndị Ka E Ji Dee Bible?
Nke 4: Ịghọta Ihere (yp isi 15 p. 121-122)
June 4 Ọgụgụ Bible: Esta 5-10
Abụ nke 37
Nke 1: w86 7/1 p. 28 para. 2-18
Nke 2: Esta 5:1-14
Nke 3: td 38A Mmịnye Ọbara Na-emebi Ịdị Nsọ nke Ọbara
Nke 4: Ụzọ Isi Merie Ihere (yp isi 15 p. 123-126)
June 11 Ọgụgụ Bible: Job 1-7
Abụ nke 84
Nke 1: w94 11/15 p. 10-14
Nke 2: Job 1:6-22
Nke 3: td 38B È Kwesịrị Ịzọpụta Ndụ Mmadụ n’Agbanyeghị Ihe Ọ Ga-efu?
Nke 4: Idi Iru Újú (yp isi 16)
June 18 Ọgụgụ Bible: Job 8-14
Abụ nke 192
Nke 1: Sọl—Ihe Ọrụ A Họpụtaara Onyenwe Anyị (w99 5/15 p. 29-31)
Nke 2: Job 8:1-22
Nke 3: td 40A Olee Otú Anyị Si Mara na Oge Ndị Jentaịl Gwụrụ na 1914?
Nke 4: Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịga Akwụkwọ Anya (yp isi 17)
June 25 Ọgụgụ Bible: Job 15-21
Abụ nke 81
Nke 1: Chineke Anọghị Ọdụ n’Ime Nkwa Ya (w99 6/1 p. 4-7)
Nke 2: Job 17:1-16
Nke 3: td-IB 8A Gịnị Bụ Ezi Chọọchị ahụ na Ntọala Ya?
Nke 4: Otú Mmadụ Ga-esi Welitekwuo Akara Mmụta Ya (yp isi 18)
July 2 Ọgụgụ Bible: Job 22-29
Abụ nke 173
Nke 1: Ì Kwesịrị Ime Ka Echiche Gị Sakwuo Mbara? (w99 6/15 p. 10-13)
Nke 2: Job 27:1-23
Nke 3: td 8B Pita Ọ̀ Bụ “Oké Nkume” ahụ?
Nke 4: Izere Mmaja n’Ụlọ Akwụkwọ (yp isi 19)
July 9 Ọgụgụ Bible: Job 30-35
Abụ nke 108
Nke 1: Ihe Mere Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Obi n’Amụma Bible (w99 7/15 p. 4-8)
Nke 2: Job 31:1-22
Nke 3: td 35A Ezi Sayensị Ò Kwekọrọ na Bible?
Nke 4: Mmadụ na Onye Nkụzi Ya Ịdị ná Mma (yp isi 20)
July 16 Ọgụgụ Bible: Job 36-42
Abụ nke 160
Nke 1: w94 11/15 p. 15-20
Nke 2: Job 36:1-22
Nke 3: td 35B Ụbọchị Okike Ọ̀ Bụ Ụbọchị Dị Awa 24?
Nke 4: Ụzọ Isi Nweta Ma Jigide Ọrụ (yp isi 21)
July 23 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 1-10
Abụ nke 5
Nke 1: w86 8/15 p. 26 para. 1 ruo p. 27 para. 17
Nke 2: Abụ Ọma 3:1–4:8
Nke 3: td 34 A N’ihi Gịnị Ka E Ji Kwụgbuo Jisọs n’Elu Osisi?
Nke 4: Họrọ Ọrụ Kasị Mma (yp isi 22)
July 30 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 11-18
Abụ nke 48
Nke 1: w86 10/15 p. 26 para. 1 ruo p. 27 para. 16
Nke 2: Abụ Ọma 11:1–13:6
Nke 3: td 34 B Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Ife Obe Ofufe?
Nke 4: Ihe Mere Inwe Mmekọahụ Tupu Alụmdi na Nwunye Ji Dị Njọ (yp isi 23)
Aug. 6 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 19-26
Abụ nke 117
Nke 1: Nkwurịta Okwu Dị Mma—Isi Ihe Na-eduga n’Ezi Alụmdi na Nwunye (w99 7/15 p. 21-23)
Nke 2: Abụ Ọma 20:1–21:13
Nke 3: td 41A N’ihi Gịnị Ka Mmadụ Ji Anwụ Anwụ?
Nke 4: Ụzọ Isi Zere Mmekọahụ Rụrụ Arụ (yp isi 24)
Aug. 13 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 27-34
Abụ nke 130
Nke 1: Filip—Onye Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Zisaa Ozi Ọma (w99 7/15 p. 24-25)
Nke 2: Abụ Ọma 28:1–29:11
Nke 3: td 41B Gịnị Bụ Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ?
Nke 4: Mmetọ Onwe Onye Ọ̀ Bụ Ihe Dị Oké Njọ? (yp isi 25)
Aug. 20 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 35-39
Abụ nke 18
Nke 1: Nrụgide Ndị Ọgbọ—Ọ̀ Pụrụ Ịbara Gị Uru? (w99 8/1 p. 22-25)
Nke 2: Abụ Ọma 38:1-22
Nke 3: td 41CH Ọ̀ Pụrụ Ikwe Omume Iso Ndị Nwụrụ Anwụ Kwurịta Okwu?
Nke 4: Izere Ọnyà nke Mmetọ Onwe Onye (yp isi 26)
Aug. 27 Ntụleghachi Odide. Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 40-47
Abụ nke 91
Sept. 3 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 48-55
Abụ nke 36
Nke 1: Ekwela Ka Iwe Mee Ka Ị Sụọ Ngọngọ (w99 8/15 p. 8-9)
Nke 2: Abụ Ọma 49:1-20
Nke 3: td 10A Ònye Bụ Ekwensu?
Nke 4: Ihe Mere Ime Ihe n’Eziokwu Ji Bụrụ Ụkpụrụ Kasị Mma (yp isi 27)
Sept. 10 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 56-65
Abụ nke 44
Nke 1: Ekwensu Ọ̀ Na-eme Ka Anyị Daa Ọrịa? (w99 9/1 p. 4-7)
Nke 2: Abụ Ọma 59:1-17
Nke 3: td 10B Ònye Na-achị Ụwa?
Nke 4: Imeri Ịhụnanya Kpuru Ìsì (yp isi 28)
Sept. 17 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 66-71
Abụ nke 210
Nke 1: Họrọ “Ezi Òkè Ahụ” (w99 9/1 p. 30-31)
Nke 2: Abụ Ọma 69:1-19
Nke 3: td 10CH Olee Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Si?
Nke 4: Ụzọ Isi Mara Ma Mmadụ Ọ̀ Dịwo Njikere Iyi Oge (yp isi 29 p. 225-231, 234-235)
Sept. 24 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 72-77
Abụ nke 217
Nke 1: N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Mezuo Nkwa Gị? (w99 9/15 p. 8-11)
Nke 2: Abụ Ọma 73:1-24
Nke 3: td 44 A Nzube Chineke Banyere Ụwa
Nke 4: Ime Onye Na-abụghị Nwoke Ma Ọ Bụ Nwanyị Ibe Gị Enyi—È Nwere Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya? (yp isi 29 p. 232-233)
Oct. 1 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 78-81
Abụ nke 88
Nke 1: Nweta Amamihe, Narakwa Ịdọ Aka ná Ntị (w99 9/15 p. 12-15)
Nke 2: Abụ Ọma 78:1-22
Nke 3: td 44 B A Ga Na-ebi n’Ụwa Mgbe Nile
Nke 4: Ịmata Mgbe Ị Dị Njikere Maka Alụmdi na Nwunye (yp isi 30)
Oct. 8 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 82-89
Abụ nke 221
Nke 1: Timoti—“Ezi Nwa M n’Okwukwe” (w99 9/15 p. 29-31)
Nke 2: Abụ Ọma 88:1-18
Nke 3: td 29A Ụzọ Isi Mata Ndị Amụma Ụgha
Nke 4: Ịmata Ezi Ịhụnanya (yp isi 31 p. 242-247, 250-251)
Oct. 15 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 90-98
Abụ nke 134
Nke 1: Ndị E Wusiri Ike Ịjụ Ihe Ọjọọ (w99 10/1 p. 28-31)
Nke 2: Abụ Ọma 90:1-17
Nke 3: td 19A Ihe Mere Ọgwụgwọ Ime Mmụọ Ji Dị Oké Mkpa
Nke 4: Imeri Obi Mgbawa (yp isi 31 p. 248-249)
Oct. 22 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 99-105
Abụ nke 89
Nke 1: Ịmụta Ụzọ Kasịnụ nke Ịhụnanya (w99-IB 10/15 p. 8-11)
Nke 2: Abụ Ọma 103:1-22
Nke 3: td 19B Alaeze Chineke Ga-eweta Ọgwụgwọ Anụ Ahụ Na-adịgide Adịgide
Nke 4: Ụzọ Isi Mee Mbedo Na-aga nke Ọma (yp isi 32)
Oct. 29 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 106-109
Abụ nke 214
Nke 1: “Jehova Na-enye Amamihe” (w99 11/15 p. 24-27)
Nke 2: Abụ Ọma 107:1-19
Nke 3: td 19CH Iji Okwukwe Agwọ Ọrịa n’Oge A Enweghị Ihe Àmà nke Nkwado Chineke
Nke 4: Ihe Ize Ndụ Ndị Dị ná Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma Ịṅụ Mmanya (yp isi 33)
Nov. 5 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 110-118
Abụ nke 14
Nke 1: Apọkalips —È Kwesịrị Ịtụ Ya Egwu Ka E Kwesịrị Ile Anya Ya? (w99 12/1 p. 5-8)
Nke 2: Abụ Ọma 112:1–113:9
Nke 3: td 19D Ịsụ Asụsụ Dị Iche Iche Bụ Nanị Ndokwa Nwa Oge
Nke 4: Ihe Mere A Ga-eji Zere Ọgwụ Ọjọọ (yp isi 34)
Nov. 12 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 119
Abụ nke 35
Nke 1: Ekwela Ka Ikike Gị Ghọọ Adịghị Ike Gị (w99 12/1 p. 26-29)
Nke 2: Abụ Ọma 119:1-24
Nke 3: td 11A Nanị 144,000 Ga-aga Eluigwe
Nke 4: Na-eme Nhọrọ n’Ihe Ị Na-agụ (yp isi 35)
Nov. 19 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 120-137
Abụ nke 175
Nke 1: w86 12/15 p. 28 para. 1 ruo p. 29 para. 18
Nke 2: Abụ Ọma 120:1–122:9
Nke 3: td 13A Ọkụ Nkịtị Adịghị na Hel
Nke 4: Chịkwaa Àgwà Gị nke Ikiri TV (yp isi 36)
Nov. 26 Ọgụgụ Bible: Abụ Ọma 138-150
Abụ nke 135
Nke 1: w87 3/15 p. 20 para. 1 ruo p. 21 para. 19
Nke 2: Abụ Ọma 139:1-24
Nke 3: td 13B Ọkụ Bụ Ihe Atụ nke Mbibi
Nke 4: Echiche Ziri Ezi Banyere Ntụrụndụ (yp isi 37)
Dec. 3 Ọgụgụ Bible: Ilu 1-7
Abụ nke 132
Nke 1: w87 5/15 p. 29 para. 1-17
Nke 2: Ilu 4:1-27
Nke 3: td 13CH Akụkọ Ọgaranya na Lazarọs—Abụghị Ihe Àmà nke Ịta Ahụhụ Ebighị Ebi
Nke 4: Ihe Ọdịnihu Ga-eweta (yp isi 38)
Dec. 10 Ọgụgụ Bible: Ilu 8-13
Abụ nke 51
Nke 1: w87 5/15 p. 29 para. 18-27
Nke 2: Ilu 13:1-25
Nke 3: td 42A Ndị Kraịst Oge Mbụ Edebeghị Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ Ma Ọ Bụ Krismas
Nke 4: Ụzọ Isi Bịaruo Chineke Nso (yp isi 39)
Dec. 17 Ọgụgụ Bible: Ilu 14-19
Abụ nke 111
Nke 1: w87 5/15 p. 30 para. 1-10
Nke 2: Ilu 16:1-25
Nke 3: td 17A Iji Ihe Oyiyi Efe Ofufe Adịghị Asọpụrụ Chineke
Nke 4: td 17B Ife Ihe Oyiyi So n’Ihe Ndị Mere Israel Ji Daa
Dec. 24 Ọgụgụ Bible: Ilu 20-25
Abụ nke 9
Nke 1: w87 5/15 p. 30 para. 11-29
Nke 2: Ilu 20:1-30
Nke 3: td 17CH Chineke Enyeghị Ohere Maka Ofufe “A Kpaara Ókè”
Nke 4: td 31A A Dịghị Enweta Ezi Ịdị n’Otu Site ná Ngwakọta Okwukwe
Dec. 31 Ntụleghachi Odide. Ọgụgụ Bible: Ilu 26-31
Abụ nke 180