Olee Otú Anyị Pụrụ Isi Gboo Mkpa E Nwere Maka Inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze?
1 Kemgbe ọgbakọ ndị Kraịst malitere, ndị na-eso ụzọ Jisọs na-agbakọta ọnụ iji bụrụ ndị Jehova ziri ihe. N’oge ndị ozi, ndị Kraịst na-enwe nzukọ ha ugboro ugboro n’ebe obibi ndị mmadụ. N’ebe ụfọdụ ha kwuru okwu n’ụlọ nzukọ ndị Juu. N’Efesọs, Pọl onyeozi kwuru okwu n’ụlọ mgbakọ dị n’otu ụlọ akwụkwọ ruo afọ abụọ. (Ọrụ 19:8-10; 1 Kọr. 16:19; Faịl. 1, 2) N’otu aka ahụ taa, na Nigeria nakwa n’ebe ndị ọzọ, ọgbakọ dị iche iche na-enwe nzukọ n’ebe obibi ndị mmadụ, n’ogige dị iche iche, ọbụna n’ụlọ ndị a ga-eji mee ihe ruo nwa oge. N’ezie, ma ànyị nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ na anyị enweghị, anyị adịghị echefu ịdị mkpa nke izukọta ọnụ mgbe nile.—Hib. 10:24, 25.
2 Ọgbakọ ụfọdụ ewuwo Ụlọ Nzukọ Alaeze, o dokwara anya na Ụlọ Nzukọ Alaeze e wuru n’ụzọ dị mfe ma bụrụ nke a na-elekọta anya nke ọma na-adọta ndị nwere mmasị. N’akụkụ nile nke ụwa, ụlọ nzukọ ndị dị otú ahụ na-egosipụta na Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ofufe. Ọ bụ nke a mere anyị kwesịrị iji nwee ezi mmasị n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ógbè anyị. Ka ọ dị ugbu a, e nwere mkpa maka ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ọtụtụ mba. Tụkwasị na nke a, kwa ụbọchị, a na-eguzobe ihe karịrị ọgbakọ isii gburugburu ụwa. Na Nigeria, e nwere mkpa iwu ihe dị ka Ụlọ Nzukọ Alaeze 1,800. N’ezie, gịnị bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa otú e si ewu ya? Olee ebe e si enweta ego e ji ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze? Oleekwa otú anyị pụrụ isi gboo mkpa a?
Gịnị bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze?
3 E ji okwu ahụ bụ́ “Ụlọ Nzukọ Alaeze” mee ihe na nke mbụ ya n’izo aka n’ụlọ e wuru na Hawaii na 1935 bụ́ nke otu ọgbakọ na-anọ na ya enwe nzukọ. Aha dị otú ahụ kwesịrị ekwesị n’ihi na nzube bụ́ isi e ji enwe Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ iji kwado nkwusa nke ozi ọma nke Alaeze Chineke. Kemgbe 1935, e wuwo ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze gburugburu ụwa. N’ezie, otú Ụlọ Nzukọ Alaeze ga-adị na-adabere na kọntinent, mba, na ógbè a na-ewu ya. Ka o sina dị, ụlọ nzukọ nile kwesịrị iyirịta ibe ha n’ụzọ ụfọdụ. Ha kwesịrị ịbụ ndị e wuru n’ụzọ dị mfe, ndị e wuru nke ọma, na ndị dị mma maka izukọta ọnụ n’udo iji gee ntị n’ozizi Chineke. Ọ dịghị mkpa na ụlọ ahụ ga-abụ nke furu oké ego.—1 Jọn 2:16.
4 E sepụtara n’ihe ntinye a foto nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ụfọdụ e wuru na Nigeria n’ime afọ ole na ole gara aga. Ọ bụ ezie na ụkpụrụ e ji wuo ha dịgasị iche iche, ha nile machara mma ma bụrụ ndị e wuru nke ọma. Tụkwasị na nke ahụ, Ụlọ Nzukọ Alaeze nile kwesịrị ikwekọ na gburugburu ebe ọ dị, bụrụ ndị e debere ọcha, na ndị a na-elekọta nke ọma. Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe obi ụtọ ịhụ “Kingdom Hall of Jehovah’s Witnesses” (Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova) e dekwasịrị n’ụlọ ndị dị otú ahụ?
5 Ònye nwe Ụlọ Nzukọ Alaeze? E wezụga ihe ndị iwu chọrọ, ndị mmadụ n’otu n’otu ma ọ bụ ìgwè dị iche iche nọ n’ọgbakọ ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na ọ bụ ha “nwe” Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ dịghịkwa ọgbakọ ọ bụla “nwe” ya. A raara ya nye Jehova. Ọgbakọ ọ bụla nke wuru ma ọ bụ nweta Ụlọ Nzụkọ Alaeze ha na-akwụ ụgwọ ya enyela onwe ya ihe ọ ga na-elekọta, òtù ndị okenye nwekwara ibu ọrụ nke iji amamihe na-elekọta ojiji e ji ụlọ nzukọ ahụ na-eme ihe ka o wee kwado ọdịmma Alaeze n’ụzọ kasị mma. Ebe ọgbakọ abụọ ma ọ bụ karịa na-ezukọ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ha pụrụ iji otu ígwè okwu, klọọkụ, ihe ndị e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, na ihe ndị ọzọ na-eme ihe. Nke a na-agba àmà imekọrịta ihe ọnụ nke dị n’etiti ọgbakọ ndị ahụ. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịdị na-elekọta ihe ndị a a gbakọrọ aka nwee, na-echeta na nke a na-atụnye ụtụ n’ọdịmma nke ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị.—Mat. 7:12.
Olee Otú E Si Ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze?
6 Ebe ọ bụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze na-adịgasị iche iche site n’otu mba gaa n’ọzọ, ụzọ e si ewu ha na-adịgasịkwa iche iche. A na-arara ụlọ ndị a nye Jehova, ya mere ndị ohu Chineke na-enwe obi ụtọ ikere òkè n’ụzọ afọ ofufo n’owuwu ha. “Ndị gị ga-eji ọchịchọ obi wepụta onwe ha,” ka ọbụ abụ ahụ kwuru.—Ọma 110:3, NW.
7 A maara Ndịàmà Jehova n’ụzọ ziri ezi maka ịnụ ọkụ n’obi ha na ọchịchọ obi ha na-enwe ịrụkọ ọrụ ọnụ. Otu akwụkwọ zoro aka n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, na-asị: “Ọ ga-esi ike ịhụ ndị so n’ìgwè ọ bụla ọzọ ndị na-arụsi ọrụ ike n’okpukpe ha dị ka Ndịàmà na-eme.” Akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ kọrọ hotara okwu ndị na-esonụ nke otu n’ime Ndịàmà Jehova kwuru bụ́ onye nọ na-elekọta owuwu nke otu Ụlọ Mgbakọ: “Mgbe ụfọdụ . . . anyị na-enwe ndị mmadụ n’ebe a karịa ka anyị chọrọ.” Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, otu akwụkwọ akụkọ ahụ kọrọ banyere otu onye dikọn nke kwara arịrị na ọ na-esi ike ka onye ọ bụla bịa maka ọrụ nke “ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị chọọchị Protestant” na-ahụ maka ya.
8 Ọtụtụ ndị nkwusa enyewo oge, ego, na ike ha n’ụzọ dị ukwuu iji nye aka wuo ebe ndị kwesịrị ekwesị a na-anọ efe ofufe. Ee, enyemaka ndị ikom na ndị inyom raara onwe ha nye na-enye n’ụzọ afọ ofufo emewo nnọọ ka igo ndị ọrụ, ma ọ bụ ọbụna enyemaka ndị nwere nkà ghara ịdị mkpa mgbe a na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ Ụlọ Mgbakọ. Ndị ọrụ afọ ofufo na-ele ọrụ dị otú ahụ anya dị ka ịtụnye ụtụ maka ọganihu nke ọdịmma Alaeze, otu ụzọ ahụ ha si ele ozi ubi ha anya. Ha maara ngọzi ime mmụọ bara oké uru nke ha na ndị ọzọ ga-enweta site n’iji ihe owuwu ndị dị otú ahụ eme ihe. Ya mere, ha na-etinye n’ọrụ ụkpụrụ bụ́: “N’efu ka unu natara, nyenụ n’efu.”—Mat. 10:8.
9 Ọ bụrụ na a kpọọ gị ikere òkè n’owuwu nke ebe a na-anọ efe Jehova ofufe n’ihi na i nwere iru eru ime mmụọ na nkà, mee ihe nile i nwere ike ime iji nakwere ọkpụkpọ òkù a. (Ọma 122:1) A chọrọ ka òtù ndị okenye na-agba ndị ọrụ afọ ofufo ume. Ndị okenye pụrụ igosipụta nkwado ha zuru ezu maka ndokwa ọchịchị Chineke a site n’iso ndị ruru eru bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ zukọọ nakwa n’ịgba ha ume iji nkà ha mee ihe n’ijere ụmụnna ha ozi.—Gal. 6:10.
10 Tupu a rụzuo otu ọrụ ihe owuwu n’ụzọ gara nke ọma, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-achọ ịrụsi ọrụ ike ruo ogologo oge; ma Jehova na-agọzi ndị na-eji mkpụrụ obi dum ejere ya ozi. (Kọl. 3:23, 24) Ọ dịghị emekebe, ma, ọ pụrụ ịdị ọgbakọ mkpa ịkwụ ụgwọ maka enyemaka nke ndị ọrụ e goro ego. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, e kwesịrị inwe nkwekọrịta e dere ede n’etiti ndị ọrụ ahụ na ọgbakọ ahụ.—Lee Ụlọ Nche, August 15, 1987, peeji nke 25.
Olee Ebe E Si Enweta Ego Ndị Ahụ?
11 N’adịghị ka chọọchị dị iche iche nke Krisendọm, Ndịàmà Jehova adịghị anakọta ụtụ, arịọ arịrịọ ego, ma ọ bụ akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri. N’ihi ya, a bịa n’onyinye anyị na-enye, anyị na-eji ọchịchọ obi nakwa obi anyị nile enye ihe. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; . . . n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya.”—2 Kọr. 9:7.
12 E wuwo ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze gburugburu ụwa site n’onyinye afọ ofufo ndị a, nke a bụ n’ihi ọtụtụ ndị obi ha kwaliworo iji obi ụtọ na-enye. Otú ahụ ka ọ dị n’ihe banyere Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị e sere n’ihe ntinye a, nakwa ndị ọzọ a ka na-arụ arụ na Nigeria. N’etiti ndị Jehova taa, e nwere ọtụtụ ndị, dị ka nwanyị ogbenye ahụ di ya nwụrụ, na-enye “ego nta” ha n’onyinye. (Mak 12:42) N’otu aka ahụ taa, anyị nwere ndị ọzọ na-egosipụta mmụọ yiri nke Banabas. Mgbe Banabas resịrị otu ibe ala o nwere, ọ bịara ma “weta ego ya, tọgbọ n’ụkwụ ndị ozi.” (Ọrụ 4:37) N’ezie, anyị na-enye onyinye anyị n’emeghị ngosi ọ bụla. (Mat. 6:3, 4) Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na ọtụtụ ọgbakọ enwetala onyinye nke ala ha ga-ewu ihe na ya ma ọ bụ ihe onwunwe a ga-ere ere ma were ihe e retara na ya mee ihe maka ihe owuwu ahụ. Ma ndị ọzọ kwuru na ha ga-enye ihe ndị e ji ewu ụlọ ma ọ bụ iwetara ndị ọrụ ihe owuwu ahụ nri.
13 Ọgbakọ ụfọdụ agbaziriwo ego site n’Ụtụ Ego Society Maka Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ego ndị na-eme ka Society nwee ike inye ego mgbazinye a sitere n’onyinye nke òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ. Òtù Na-achị Isi kwere ka a na-agbazinye ego a n’ọnọdụ ndị ga-eme ka o kwe ụmụnna omume ịkwụghachi ha dị ka ihe ha na-akpata si dị. Ọtụtụ ndị ekwupụtawo obi ekele ha maka ndokwa ịhụnanya a nke na-eme ka e nwee “nhata” nke ego n’etiti ndị “nwebigara ókè” na ndị “ihe kọrọ.” (NW) (2 Kọr. 8:14, 15) Iji lekọta ibu ọrụ a dị arọ, ọgbakọ ndị gbaziiri ego na-arụsi ọrụ ike iji kwụghachi ha. (Gal. 6:5) Ọ bụrụ na ọgbakọ enwee ihe isi ike na-adịru nwa oge n’ịkwụghachi Society ego ọ gbaziiri, ndị okenye ga-eme nke ọma ịgba ọgbakọ ahụ ume imezu nkwa ha kwere.
14 Banyere owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, a na-agba ọgbakọ dị iche iche ume ịghara “ime ka e nwee” mkpa n’ụzọ na-enweghị isi. Dị ka ihe atụ, ọgbakọ abụọ ma ọ bụ atọ dị n’otu ógbè pụrụ iji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe. N’ihi ya, n’ebe ndị e nwere ọtụtụ ọgbakọ, ha nile pụrụ ịgbakọ aka iji wuo otu ụlọ nzukọ kama ọgbakọ nke ọ bụla inwe ụlọ nzukọ nke ya. N’ihi ya, a pụrụ iji ụlọ nzukọ ahụ mee ihe n’ụzọ zuru ezu, ọ ga-akakwa mfe ibu ibu ego ndị dị na ya.
15 Ọ bụrụ na ọgbakọ ekpebie ịmalite iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ụmụnna kwesịrị ịmalite kpọmkwem mgbe ahụ nyewa onyinye maka ya. N’ihi nzube ahụ, ọgbakọ ụfọdụ emepewo ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀ bụ́ ebe ha na-etinye ego maka ihe owuwu ha ga-ewu n’ọdịnihu. N’oge ọgbakọ malitere ikwurịta ma ọ̀ ga-ekwe omume inweta Ụlọ Nzukọ Alaeze, i nwere ike n’onwe gị inye onyinye maka atụmatụ ọrụ ahụ. Tụkwasị na nke a, ị pụrụ ịchọ ikpebi ego ole ị pụrụ ịdị na-enye n’onyinye kwa ọnwa, ị ga-enweta ngọzi Jehova. Ndị okenye pụrụ ịgbalị inweta ihe ọmụma a n’aka ọgbakọ iji nyere ha aka ime atụmatụ maka ọrụ ahụ. Mpempe akwụkwọ e dere ego ole a ga na-enye ma ghara ide aha na ya ezuwo iji mee atụmatụ a. Dabere ná nchọpụta a, ndị okenye pụrụ ịtụ aro ka ọgbakọ mee mkpebi banyere otú a ga-esi kwụghachi ego a ga-agbazite, òkè ọgbakọ ahụ ga-ekere n’owuwu ma ọ bụ ná nlekọta nke Ụlọ Mgbakọ, ma ọ bụ ịkwụ ụgwọ ihe ọ na-efu iji Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eme ihe. Ọ dị nnọọ mkpa ka a tụlee mmefu ndị a dị ka ikike ọgbakọ si dị. Pọl tụrụ aro ka ụmụnna nọ na Kọrint na-agbaso ụkpụrụ nke imechi ihe anya ka ha wee jide n’aka na ha na-eme ezi ihe ndị dị ha n’obi. (1 Kọr. 16:2) N’ihi nke a, ime ihe n’onwe onye, ọzụzụ onwe onye, na mkpebi siri ike dị anyị mkpa.—1 Kọr. 9:23, 25, 27.
Igbo Mkpa Ahụ
16 Iji gboo mkpa e nwere maka inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria nakwa n’ọtụtụ mba ndị ọzọ, Òtù Na-achị Isi eguzobewo usoro ihe omume pụrụ iche. Ebumnobi ya bụ iji gboo mkpa a n’ime afọ ole na ole na-abịanụ. N’alaka ụlọ ọrụ Nigeria, e guzobewo Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ́ ebe e nyere ụmụnna ọrụ ịhazi na idu ndú n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ma na-ahazi usoro ihe omume ahụ. Site ná ngalaba a, e sepụtawo ụkpụrụ ndị dị mma, nweekwa ndepụta nke ngwá ọrụ, a haziwokwa usoro ọzụzụ na-aga n’ihu maka ndị nile na-ekere òkè n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụnna nọ na ngalaba a na-ahazi ọrụ nke ọtụtụ narị ụmụnna bụ́ ndị na-ewepụta onwe ha n’afọ ofufo maka owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na-enyocha atụmatụ ọrụ nke ọ bụla tupu a malite ime ndejupụta ndị kwesịrị ekwesị na ịtụ aro ka e nye nkwado maka ya.
17 Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-enweta ihe ọmụma na ntụziaka site ná ngalaba a, bụ́ nke na-eme ka ha nwee ike inyere ọgbakọ aka inweta ala, ụkpụrụ ụlọ, na ikike maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị òtù nke Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-enyekwara ọgbakọ aka iji ruo eruo inweta enyemaka ego site n’aka Society. A na-agba ọgbakọ ndị na-eme atụmatụ inweta ala ha ga-ewu ihe owuwu ma ọ bụ ndị n’aka nke ọzọ ga-achọ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ume ịkpọtụrụ Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè e kenyere ha ngwa ngwa. A pụrụ isi otú ahụ zere ọtụtụ nsogbu site n’iji ahụmahụ e nwere n’oge gara aga na ntụziaka ndị kasị ọhụrụ Society nyere na-eme ihe. Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè na-akpọtụrụ Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ ndị ga-atụzi aro ka e nwee usoro ihe omume nke ga-eme ka ọgbakọ nwee ike iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mkpirikpi oge site n’enyemaka nke ụmụnna nwere nkà. Ebe ọ bụ na e nwere mkpa dị ukwuu, ọ ga-ewe afọ ụfọdụ tupu ọgbakọ nile dị na Nigeria enwee ike inwe Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị mma ma bụrụ ndị e wuru n’ụzọ dị mfe. N’ihi nke a, a ghaghị inwe ndidi. Otú ọ dị, ka ọgbakọ dị iche iche na-eche ka e mee ihe maka atụmatụ ọrụ ha, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị pụrụ ịkwado atụmatụ ọrụ ahụ site n’inye onyinye.
18 Tụkwasị ná nkwado, ọzụzụ, na nhazi ka ukwuu nke a ga-enye Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè site n’aka Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-eguzobe Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze oge nile ịrụ ọrụ n’okpuru ntụziaka nke ngalaba ọhụrụ a. Iji mejupụta ìgwè ndị a na-ewu ihe owuwu, Society emegheela alaka ọhụrụ nke ozi oge nile pụrụ iche. A na-akpọ ndị ọrụ ahụ ndị ozi owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Dị nnọọ ka ndị ozi oge nile pụrụ iche ndị ọzọ, dị ka ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na ndị Betel meworo, ndị ozi a na-egosipụta mmụọ yiri nke Aịsaịa, na-asị: “Lee m; ziga m.” (Aịsa. 6:8) N’ịbụ ndị maara ụzọ Society si ewu ihe owuwu, ụmụnna ndị a na-enyere ọgbakọ aka nke ukwuu n’iwu nakwa n’iwutọpụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ma ọgbakọ na-achọ iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ hà bụ ndị Komitii Ihe Owuwu Ógbè na-enyere aka ma hà bụ ndị Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enyere aka, atụmatụ ọrụ ihe owuwu ahụ kpọmkwem na-abụkarị atụmatụ ọrụ nke ọgbakọ na-ewu ụlọ nzukọ ahụ. E kwesịrị ile nkwado ọ bụla Society nyere anya dị ka enyemaka. Nke a pụtara na mgbe ọgbakọ na-amalite iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị nile nọ n’ọgbakọ, ma ndị nwere nkà ma ndị na-enweghị nkà, kwesịrị ịkwado ya n’ụzọ kwekọrọ n’usoro ihe omume Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze wepụtara.
19 Ka ọ dị ugbu a, e nwere mkpa inwekwu ndị ọrụ afọ ofufo iji nye aka n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. E zigaworo òtù ndị okenye nile akwụkwọ ndejupụta zuru ezu nke a na-edejupụta iji ghọọ ndị ọrụ afọ ofufo n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị ọrụ afọ ofufo n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche ná ndị ozi owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ihi na a na-akpọ ha iso Ìgwè Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze rụọ ọrụ site n’izu abụọ ruo ọnwa atọ. Ndị ọrụ afọ ofufo dị otú ahụ na-enweta ebe obibi na nri site n’atụmatụ ọrụ ihe owuwu ahụ ha na-enyere aka, ya bụrụkwa na ọ dị mkpa, a pụrụ inyere ha aka ịkwụ ihe ha mefuru n’ime njem. Ọ bụ site ná ndị ọrụ afọ ofufo n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị a ka Society si ahọpụta ndị ozi owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ bụrụ na i nwere mmasị n’ihe ùgwù ije ozi a, ị pụrụ ijekwuru onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ gị, bụ́ onye ga-eme ka ị mara ma ì ruru eru inweta akwụkwọ ndejupụta. Anyị na-achọ karịsịa ụmụnna ruru eru n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị nwere ahụmahụ ụfọdụ n’iwu ihe owuwu. Karịsịa, ụmụnna ndị a kwesịrị ịbụ ndị na-eji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe, ndị dị obi umeala, na ndị dị njikere ikwenyere ndị a họpụtara idu ndú. Ọ bụrụgodị na a kpọghị gị ozugbo, a ga-edebe akwụkwọ ndejupụta gị na faịlụ ruo mgbe e nwere mkpa.
20 Tụkwasị n’ihe ndị a Society meworo, ọ dị mkpa ka e nwee ezi nkwado nke ndị okenye na ọgbakọ. Ụkpụrụ ụlọ na usoro ndị Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze wepụtara nwere ike ghara ịdị otú anyị chọrọ ma ọ bụ ịbụ nke anyị họọrọ. Ndụmọdụ na ntụziaka ndị nnọchiteanya nke Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enye, ka ha na-etinye ntụziaka Society nyere n’ọrụ, pụrụ ịdị iche n’ihe ọgbakọ mere atụmatụ ya ma ọ bụ ihe ha chọrọ. Ụzọ Ìgwè Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze si ewu ihe nwere ike ghara ịbụ ụzọ mawooro anyị ahụ. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ihe mgbaru ọsọ anyị nile abụghị iwuru onye ọ bụla ma ọ bụ ọgbakọ ọ bụla ihe ncheta, kama ọ bụ iji gboo mkpa e nwere maka ebe a na-anọ enwe nzukọ, anyị na-enwe obi ụtọ ịkwado ndị e nyere ọrụ idu ndú n’akụkụ a. (1 Tesa. 5:12, 13; Hib. 13:17) Ee, iji gboo mkpa e nwere ugbu a maka Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ime oge na-eteghị aka, anyị aghaghị ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà, ma ọ̀ bụ iwepụta onwe anyị, oge anyị ma ọ bụ akụ̀ anyị, ma ọ bụ ikwenye n’ihe ụfọdụ.—Fil. 2:2-4.
Ihe Owuwu Ndị Na-ewetara Jehova Otuto
21 Ụlọ Nzukọ Alaeze e wuru n’ụzọ dị mfe na nke e wuru nke ọma, ma bụrụ nke a na-elekọta anya nke ọma, na-ewetara Jehova otuto. A chọrọ ka anyị nile n’otu n’otu nakwa dị ka ọgbakọ nyochaa ihe onwunwe anyị ma hụ ókè anyị pụrụ ịkwadoru owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze. Site n’ịkpọtụrụ Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze site n’aka Kọmitii Ihe Owuwu Ógbè e kenyere unu tupu unu amalite ihe owuwu ọ bụla (ma ọ̀ bụ iwu nke ọhụrụ, iwutọpụ ụlọ nzukọ dịlarị adị, ma ọ bụ iwugharị ma ọ bụ iwusawanye ma ọ bụ ime mgbanwe ụfọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze e wucharala ewucha), unu ga-erite uru site n’ihe ọmụma na ahụmahụ ndị e nweworo enwe. Mkpa e nwere maka inwekwu Ụlọ Nzukọ Alaeze na Nigeria dị ukwuu, anyị kwesịkwara ịdị na-etinye ya n’ekpere anyị. Igbo mkpa a pụrụ ịbụ otu n’ime atụmatụ ihe owuwu kasịnụ anyị nwetụrụla ná mba a. Iji ruo ihe mgbaru ọsọ anyị, anyị nile kwesịrị ịkwado n’ụzọ zuru ezu na iji ọchịchọ obi nara ụkpụrụ nduzi e nyere site n’aka Ngalaba Owuwu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Society. Ka anyị na-akwado ndokwa Society mere maka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị na-aghọta na ọ ga-ewe oge ụfọdụ tupu ọgbakọ nile enwee Ụlọ Nzukọ Alaeze nke ha. Lee ọṅụ anyị ga-enwe mgbe ọgbakọ nile pụrụ izukọ mgbe nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị mma iji bụrụ ndị Jehova ziri ihe, n’ịmara na anyị nile keere òkè n’ime ka nke a kwe omume!—Ọma 122:1; Maị. 4:2.
[Foto dị na peeji nke 3]
Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mma nke nwere oche 185 bụ́ nke e wuru na Warri
[Foto dị na peeji nke 4]
Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mma nke nwere oche 100 bụ́ nke e wuru n’Agbor
[Foto dị na peeji nke 5]
Ụlọ Nzukọ Alaeze dị mma nke nwere oche 150 bụ́ nke e wuru n’Owode-Yewa