Iji Ihe Anyị Nwere Kpọrọ Ihe
1 N’ụzọ dị iche n’ebe ụwa dị, Aisaia buru amụma banyere ụbara nri ime mmụọ ndị Chineke ga-enwe n’oge ọgwụgwụ a. Chineke sịrị: “Lee, ndị ohu m ga-eri ihe, ma agụụ ga-agụ unu onwe unu: lee, ndị ohu m ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ma akpịrị ga-akpọ unu onwe unu nkụ.” Jehova ejiriwo ụbara nri ime mmụọ mee ka ndị ya na-aga n’ihu. N’ụzọ dị aṅaa ka Jehova siworo na-enye anyị nri n’ụzọ ime mmụọ?
2 Banyere oge anyị, Jisọs kwere nkwa na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” ga na-enye ndị maara mkpa ime mmụọ ha nri ime mmụọ n’oge ya. (Mat. 5:3; 24:45-47) Òtù ohu ahụ ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi mee nke a.
3 Otu ụzọ bụ́ isi e si na-enye anyị nri n’ụzọ ime mmụọ bụ site na magazin Ụlọ Nche. Anyị nwekwara magazin Teta! nakwa broshuọ, akwụkwọ nta, na akwụkwọ ukwu dị iche iche maka iwuli anyị elu. Ì ji ndokwa ime mmụọ ndị a kpọrọ ihe? Anyị kwesịrị.—Hib. 12:16.
4 A chọpụtawo na akwụkwọ ndị mkpo ha na-esighị ike na-emebi emebi ngwa ngwa karịa ndị nwere mkpo siri ike ma na-egosikwa ihe àmà nke mmebi ngwa ngwa. Otu ụzọ isi gosi na anyị ji ihe ndị anyị nwere kpọrọ ihe bụ ijizi akwụkwọ ndị a ejizi. Ịghọta na o metụtara ihe onwunwe ndị a raara nye kwesịrị ịkpali onye ọ bụla n’ime anyị ichebara okwu a echiche. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịgbalị ịkụziri ụmụ ha ijizi akwụkwọ nile ejizi, na-esetịpụ ezi ihe nlereanya na nke a n’onwe ha. Ọ bụrụ na anyị na-ejizikwu akwụkwọ anyị ejizi, ugboro ole ọ ga-adị mkpa ka anyị gbanwee ha ga-ebelata. Nke a n’aka nke ya na-echekwara Society ego ka e wee nwee ike iji ego ndị a raara nye Chineke rụzuo ihe ka ukwuu.—Jọn 6:12.
5 N’ezie, anyị bụ ndị a gọziri agọzi. Ka anyị nile nọgide na-egosi na anyị ji ihe anyị nwere kpọrọ ihe site n’iwere ndokwa ime mmụọ ndị Jehova na-enye dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa.—Kọl. 3:15, 17.